Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

Otú Ị Pụrụ Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

Otú Ị Pụrụ Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

“N’IME afọ iri gara aga, ihe karịrị akwụkwọ 300 na-ekwu banyere ọnọdụ ime mmụọ n’ebe ọrụ—site n’akwụkwọ bụ́ Jesus CEO ruo na nke bụ́ The Tao of Leadership—ejupụtawo n’ebe ndị a na-ere akwụkwọ,” ka akwụkwọ akụkọ U.S.News & World Report na-ekwu. Nke a bụ nanị ihe ngosipụta nke eziokwu bụ́ na n’ọtụtụ mba ndị nwere ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe, e nwere ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị inwe nduzi ime mmụọ ná ndụ na-agụsi agụụ ike. N’ikwu okwu banyere nke a, akwụkwọ achụmnta ego bụ́ Training & Development na-ekwu, sị: “N’oge mgbe nkà na ụzụ na-achịkwa akụkụ nile nke ndụ anyị, anyị na-achọ abamuru ka ukwuu, nzube nke ndụ, na afọ ojuju onwe onye ka ukwuu.”

Otú ọ dị, ebee ka ị pụrụ ịchọta nduzi ime mmụọ na-eju afọ? N’oge ndị gara aga, ndị mmadụ legaara okpukpe e guzobere eguzobe anya inyere ha aka ịchọta “abamuru ka ukwuu” na “nzube” ná ndụ. Taa, ọtụtụ mmadụ agbakụtawo okpukpe a haziri ahazi azụ. Nnyocha e mere ndị isi ọrụ 90 chọpụtara na “ndị mmadụ na-ele okpukpe na ọnọdụ ime mmụọ anya dị ka ihe dịrịtara nnọọ iche,” ka akwụkwọ Training & Development na-ekwu. Ndị e ji mee ihe ná nnyocha ahụ lere okpukpe anya dị ka “òtù na-adịghị ekwe ka ndị ọzọ nọrọ na nke na-akpata nkewa,” ebe ha lere ọnọdụ ime mmụọ anya dị ka “ihe zuru ebe nile na nke na-agụnye mmadụ nile.”

Ọtụtụ ndị na-eto eto nọ ná mba ndị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, ndị dị ka Australia, New Zealand, United Kingdom, na Europe, na-ahụkwa ọdịiche dị n’etiti okpukpe na ọnọdụ ime mmụọ. Prọfesọ Ruth Webber, n’ide ihe n’akwụkwọ bụ́ Youth Studies Australia, na-ekwu, sị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eto eto kweere na Chineke, ma ọ bụ n’ikike ụfọdụ nke karịrị ike mmadụ ma ha adịghị ele chọọchị anya dị ka ihe dị mkpa ma ọ bụ ihe na-enye aka igosipụta ọnọdụ ime mmụọ ha.”

Ezi Okpukpe Na-akwalite Ọnọdụ Ime Mmụọ

Obi abụọ a a na-enwe banyere okpukpe bụ ihe kwere nghọta. Ọtụtụ òtù okpukpe emikpuwo onwe ha n’aghụghọ ọchịchị na ihu abụọ n’ihe metụtara omume, ha akwafuwokwa ọbara nke ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha n’agha okpukpe a na-apụghị ịgụta ọnụ. Otú ọ dị, ka ha na-ajụ òtù okpukpe nke ihu abụọ na aghụghọ merụrụ, ụfọdụ ndị ehiewo ụzọ n’ịjụkwa Bible, bụ́ nke ha chere na-anabata omume ndị dị otú ahụ.

N’ezie, Bible na-akatọ ihu abụọ na mmebi iwu. Jizọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu yiri ili e tere nzu, bụ́ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla. Unu onwe unu, n’otu ụzọ ahụkwa, na-eyi nnọọ ndị ezi omume n’anya ndị mmadụ, ma n’ime unu jupụtara n’ihu abụọ na mmebi iwu.”—Matiu 23:27, 28.

Ọzọkwa, Bible na-agba Ndị Kraịst ume ka ha nọpụ iche n’ihe nile metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama ịgba ndị kwere ekwe ume igburịta onwe ha, ọ na-ekwu na ha kwesịrị ịdị njikere ịnwụ n’ihi ibe ha. (Jọn 15:12, 13; 18:36; 1 Jọn 3:10-12) Kama ịbụ “òtù na-adịghị ekwe ka ndị ọzọ nọrọ na nke na-akpata nkewa,” ezi okpukpe, nke dabeere na Bible, bụ nke “na-agụnye mmadụ nile.” Pita onyeozi kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Bible—Ihe A Pụrụ Ịdabere na Ya nke Na-eduga n’Ezi Ahụ́ Ike Ime Mmụọ

Bible na-agwa anyị na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26, 27) Ọ bụ ezie na nke a apụtaghị na ụmụ mmadụ yiri Chineke n’ụzọ nkịtị, ọ pụtara na ụmụ mmadụ nwere ikike nke igosipụta àgwà Chineke, nke na-agụnye ikike nke iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, ma ọ bụ inwe ọnọdụ ime mmụọ.

Ebe ọ dị otú ahụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na Chineke ga-enyekwa anyị ihe anyị ga-eji gboo mkpa ime mmụọ anyị, tinyekwara nduzi kwesịrị ekwesị bụ́ nke anyị pụrụ iji mata ihe ga-abara anyị uru na nke ga-emerụ anyị ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Dị nnọọ ka Chineke kenyere n’ime ahụ́ anyị usoro a haziri nke ọma ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ, nke na-alụso ọrịa ọgụ ma na-enyere anyị aka inwe ezi ahụ́ ike, o nyekwara anyị akọ na uche, ma ọ bụ olu dị n’ime, bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha ma zere omume ndị na-emerụ ahụ́ n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Rom 2:14, 15) Dị ka anyị maara, ka usoro ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ nwee ike ịrụ ọrụ nke ọma, ọ ghaghị ịdị na-enwetazu ihe ndị na-edozi ahụ́. N’ụzọ yiri nke ahụ, ka akọ na uche anyị wee na-arụ ọrụ, ọ dị anyị mkpa iji ezi nri ime mmụọ na-azụ ya.

N’ime ka a mata ụdị nri ga-eme ka anyị nwee ezi ahụ́ ike n’ụzọ ime mmụọ, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” (Matiu 4:4) E dekọrọ ihe Jehova kwuru n’Okwu ya, bụ́ Bible, ọ ‘bakwara uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie.’ (2 Timoti 3:16) Ya mere, ọ dị anyị n’aka itinye mgbalị iji nara nri ahụ na-edozi ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Ruo n’ókè anyị maruru Bible ma na-agbalị itinye ụkpụrụ ya n’ọrụ ná ndụ anyị, n’ókè ahụ ka anyị ga-erite uru n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ́.—Aịsaịa 48:17, 18.

Ò Ruru Mgbalị E Tinyere na Ya?

N’ezie, ọ na-ewe oge iji mee ka ahụ́ ike ime mmụọ anyị kawanye mma site n’ịmụ Bible; o yikwara ka oge ọ̀ na-abụwanye ihe na-esi ike nnweta. Ma ụgwọ ọrụ ya ruru mgbalị e tinyere na ya! Lee otú ụfọdụ ndị ọkachamara ji ọrụ n’aka si kọwaa ihe mere iwepụta oge iji lekọta ahụ́ ike ime mmụọ ha ji dị ha mkpa.

Marina, bụ́ onye dọkịta, na-ekwu, sị: “Ọ dịbeghị nnọọ mgbe m chere echiche banyere ọnọdụ ime mmụọ m ruo mgbe m malitere ịrụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ma malite inwe mmetụta miri emi banyere nhụjuanya nke ndị ọzọ. Abịaziri m ghọta na aghaghị m ikweta na enwere m mkpa ime mmụọ na imeju ya ma ọ bụrụ na m ga-enwe afọ ojuju na obi iru ala, ebe ọ bụ na ndụ gbalụ gbalụ na ọrụ dị n’ịhụ banyere nchegbu nke ndị ọzọ pụrụ ịdị na-anyịgbu onye na-arụ ụdị ọrụ m.

“M na-esozi Ndịàmà Jehova amụ Bible. Ọmụmụ ihe a na-enyere m aka inyocha omume na ebumnobi m n’ụzọ na-arụpụta ihe ma na-azụ echiche m ịbụ nke zikwuru ezi, ka m wee nwee ike ime ka ndụ m guzozie eguzozie. Ana m achọta afọ ojuju dị ukwuu n’ọrụ m. Ma ọ bụ ọmụmụ Bible m meworo ka ahụ́ ike uche m kawanye mma, na-enyere m aka ịchịkwa echiche ndị na-ezighị ezi, ibelata obi erughị ala, na ijikwu ndidi na ọmịiko na-emeso ndị ọzọ ihe. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ abawokwara alụmdi na nwunye m uru. Karịsịa, abịawo m mara Jehova ma na-enweta n’ụzọ dị nta, mmụọ nsọ ya nke ọ na-enye n’ụba, bụ́ nke meworo ka ndụ m bakwuo uru.”

Nicholas, bụ́ onye na-ese ụkpụrụ ụlọ, na-ekwu, sị: “Tupu m malite iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, enweghị m mmasị n’ihe ime mmụọ. Ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ bụ nanị inwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ m họọrọ. Ọmụmụ Bible m akụziworo m na e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ nakwa na ime uche Jehova na-eweta ezi obi ụtọ na-adịgide adịgide.

“Ọrụ m wetaara m afọ ojuju, ma ọ bụ Bible kụziiri m ịdị mkpa nke ime ka ndụ m dị mfe site n’ilekwasị anya n’ihe ime mmụọ. Site n’ime otú ahụ, mụ na nwunye m ezerewo ọtụtụ nchekasị ndị a na-enweta site n’ibi ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Anyị enwewokwa ọtụtụ ezi ndị enyi site n’iso ndị jikwa ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ná ndụ na-akpakọrịta.”

Vincent, bụ́ onye ọkàiwu, na-ekwu, sị: “Inweta ezigbo ọrụ pụrụ ime ka mmadụ nwetatụ afọ ojuju. Otú ọ dị, achọpụtawo m na a chọrọ ihe karịrị nnọọ nke ahụ iji nweta obi ụtọ na afọ ojuju. Tupu mụ aghọta ihe Bible na-akụzi n’isiokwu a, echetara m mgbe m chọpụtara na ndụ enweghị isi—ịbụ onye a mụrụ, itolite, ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ịrụ ọrụ iji nweta ihe ndị dị mkpa n’ụzọ ihe onwunwe nke mmadụ ga-eji zụọ ụmụ ya, ịzụlite ha ịgbaso otu usoro ndụ ahụ, na imesị kaa nká ma nwụọ.

“Ọ bụ nanị mgbe m sosịrị Ndịàmà Jehova mụọ Bible ka m nwetara azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị m nwere banyere nzube nke ndụ. Ọmụmụ Bible m enyeworo m aka ịbịa mara Jehova dị ka onye na ịzụlite ịhụnanya miri emi n’ebe ọ nọ. Nke a na-enye m ihe ndabere maka ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike n’ụzọ ime mmụọ ka m na-agbalị ibi ndụ m n’ụzọ kwekọrọ n’ihe m maara bụ́ nzube ya. Ugbu a, ma mụ ma nwunye m nwere afọ ojuju nke ịma na anyị ji ndụ anyị na-eme ihe n’ụzọ kasị baa uru.”

Gị onwe gị pụkwara ịmata nzube nke ndụ site n’ịmụ Bible. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka. Dị ka Marina, Nicholas, na Vincent, ị pụrụ inweta afọ ojuju nke na-abịa site n’ịmụ banyere Jehova na nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu na maka gị onwe gị. Ọ bụghị nanị na ị ga-enwe ọṅụ nke imeju mkpa ime mmụọ gị ugbu a kamakwa ị ga-enwe atụmanya nke ịnụ ụtọ ndụ agwụghị agwụ n’ezi ahụ́ ike zuru okè—atụmanya nke dịịrị nanị “ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Ekpere bụ otu ụzọ isi zụlite ọnọdụ ime mmụọ anyị. Jizọs wepụtara oge iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, na-akụziri ha ihe a na-akpọkarị Ekpere Onyenwe Anyị. Gịnị ka ekpere ahụ pụtara nye gị taa? Olee otú ị pụrụ isi rite uru na ya? Ị ga-achọta azịza ha n’isiokwu abụọ na-esonụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Marina

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Nicholas

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Vincent