Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Okpukpe Na-akpata Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Okpukpe Na-akpata Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Okpukpe Na-akpata Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ?

“MGBE okpukpe na-adịghị akwado esemokwu, ọ na-arụ ọrụ dị ka ọgwụ na-akụnwụ akọ na uche ma na-eme ka echiche efu nke achọghị iche nsogbu ha ihu jupụta ụbụrụ ụmụ mmadụ. . . . [Ọ] na-eme ka ụmụ mmadụ ghara inwe echiche ghere oghe, na-enwe nkwenkwe ụgha, jupụta n’ịkpọasị na egwu.” Onye bụbu onye ozi ala ọzọ nke ndị Metọdist bụ́ onye dere ihe ahụ, gbakwụnyere, sị: “Ebubo ndị a bụ eziokwu. E nwere ajọ okpukpe na ezi okpukpe.”—Akwụkwọ bụ́ Start Your Own Religion.

‘Nke ahụ bụ nnọọ nkatọ na-ezighị ezi,’ ka ụfọdụ pụrụ ikwu. Ma ònye pụrụ ịgbagha ihe ndị meworo eme n’ezie? Ruo n’ókè dị ukwuu, okpukpe—bụ́ nke a kọwara dị ka “ijere Chineke ma ọ bụ ikike karịrị mmadụ ozi na ife ya ofufe”—enwewo ihe ndekọ na-awụ akpata oyi. O kwesịrị inyekwu anyị nghọta na ịkwali anyị. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ihe ọ na-eme bụ ịkpali esemokwu, ekweghị ibe nọrọ, na ịkpọasị. Gịnị mere o ji dị otú ahụ?

“Mmụọ Ozi nke Ìhè” nke Na-eduhie Eduhie

Dị ka Bible si kwuo, e nwere azịza dị nnọọ mfe. N’ime ka ọ̀ bụ “mmụọ ozi nke ìhè,” Setan bụ́ Ekwensu eduhiewo ọtụtụ nde ịgbaso ozizi ya kama ịgbaso nke Chineke. (2 Ndị Kọrint 11:14) Jọn onyeozi gosiri na mmetụta Setan zuru ebe nile nke na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Jọn maara na Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.

Gịnị siworo na nke a pụta? Setan emewo ka e nwee usoro okpukpe ndị na-enwe ọdịdị nke ịdị nsọ. Ha nwere “ọdịdị nke iji ‘okpukpe’ akpọrọ ihe” ma mkpụrụ ọjọọ ha na-amịpụta na-agba ezi ọnọdụ ha n’anwụ. (2 Timoti 3:5, J. B. Phillips; Matiu 7:15-20) Kama inye aka gboo mkpa ihe a kpọrọ mmadụ, okpukpe na-aghọ n’ezie akụkụ nke nsogbu ahụ.

Adịla ngwa ikwubi na nke ahụ abụtụghị eziokwu ma ọ bụ na ọ bụ okwu ezi uche na-adịghị na ya. Cheta na kpọmkwem ihe e ji mara aghụghọ bụ na onye a na-aghọgbu adịghị ama. Pọl onyeozi nyere ihe atụ nke a mgbe o dere, sị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụ ha nye ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa nye Chineke.” (1 Ndị Kọrint 10:20) O yiri ka ọ ghaghị ịwụwo ndị ahụ akpata oyi n’ahụ́ iche na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ka ha na-efe. Ha chere na ha na-efe ụdị ụfọdụ nke chi ma ọ bụ chi dị iche iche ndị dị mma ofufe. Ma, n’eziokwu, “ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe,” bụ́ ndị na-akwado Setan ná mgbalị ya iduhie ihe a kpọrọ mmadụ, aghọgbuwo ha.—Ndị Efesọs 6:12.

Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú Setan si nwee ike ịghọgbu ma duhie ọtụtụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst bụ́ ndị họọrọ ileghara ịdọ aka ná ntị Jọn onyeozi banyere mmetụta ọjọọ ahụ anya.—1 Ndị Kọrint 10:12.

Ihe Jizọs Kụziri Sitere n’Aka Chineke

“Ihe m na-ezi,” ka Jizọs Kraịst kwuru, “abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Ee, ihe ọ kụziri sitere n’aka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ya mere, ozizi Jizọs nwere mmetụta dị ike ma na-ewuli elu n’ebe ndị gere ya ntị nọ. Ha ‘akụnwụghị akọ na uche ma ọ bụ mee ka echiche efu nke achọghị iche nsogbu ha ihu jupụta ụbụrụ ụmụ mmadụ.’ N’ụzọ megidere nke ahụ, nkụzi Jizọs tọhapụrụ ndị mmadụ n’ihie ụzọ okpukpe na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, bụ́ ndị sitere n’aka ụwa nke “nọ n’ọchịchịrị n’uche” n’ihi nduhie Ekwensu.—Ndị Efesọs 4:18; Matiu 15:14; Jọn 8:31, 32.

E ji okwukwe nke na-egosipụta àgwà ndị mara mma ndị mmụọ nsọ Chineke na-amịpụta mata ezi Ndị Kraịst, ọ bụghị ha ịkpọ onwe ha ndị nsọ. (Ndị Galeshia 5:22, 23; Jems 1:22; 2:26) Nke kasị pụta ìhè n’àgwà ndị a—bụrụkwa akara e ji mara ezi Iso Ụzọ Kraịst—bụ àgwà magburu onwe ya nke ịhụnanya.—Jọn 13:34, 35.

Otú ọ dị, rịba isi ihe a dị mkpa ama: Ma Jizọs ma ndịozi ya adịghị nke tụrụ anya na ọgbakọ Ndị Kraịst ga-adịgide otú ọ dị mgbe e guzobere ya. Ha maara na a ga-enwe ndapụ n’ezi ofufe nakwa na a ga-ekpuchi ezi okpukpe ruo nwa oge.

E Kpuchie Ezi Okpukpe Ruo Nwa Oge

N’ihe atụ ya banyere ọka wit na ata, Jizọs buru amụma na ọ ga-afọ nke nta ka e kpuchie ezi okpukpe kpam kpam ruo nwa oge. Gụọ ihe ndekọ ahụ n’onwe gị na Matiu 13:24-30, 36-43. Jizọs kụrụ ọka wit n’ubi, “ezi mkpụrụ,” bụ́ nke nọchiri anya ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ga-emejupụta ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ ahụ. Ọ dọrọ aka ná ntị na ka oge na-aga, “onye iro,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, ga-akụnye “ata” n’ime ubi ọka wit ahụ—ndị zọọrọ na ha na-agbaso Jizọs Kraịst ma bụrụ n’ezie ndị jụrụ nkụzi ya.

Oge na-adịghị nnọọ anya ka ndịozi Jizọs nwụsịrị, ndị mmadụ pụtara bụ́ ndị gosiri na ha bụ “ata,” na-anabata ozizi gbagọrọ agbagọ nke ụmụ mmadụ karịa “okwu Jehova.” (Jeremaịa 8:8, 9; Ọrụ 20:29, 30) N’ihi ya, a bịara nwee Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja nke e merụrụ emerụ n’ụwa. Ọ bụ ihe Bible kpọrọ “onye ahụ na-emebi iwu”—òtù ndị ụkọchukwu rụrụ arụ bụ́ nke mikpuru onwe ya ‘n’aghụghọ ajọ omume ọ bụla’ na-achịkwa ya. (2 Ndị Tesalonaịka 2:6-10) Jizọs buru amụma na ọnọdụ a ga-agbanwe “ná ngwụsị nke usoro ihe.” A ga-achịkọta Ndị Kraịst yiri ọka n’ịdị n’otu ma a ga-emesị bibie “ata ahụ.”

Ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja a mere e ji nwee “ọtụtụ narị afọ nke oké omume obi ọjọọ” na ọchịchịrị ime mmụọ kpuchiri Krisendọm na narị afọ ndị sochirinụ. N’ibu ụzọ hụ nke a na omume rụrụ arụ na nke ime ihe ike ndị ọzọ e meworo kemgbe ahụ n’aha okpukpe, Pita onyeozi buru amụma n’ụzọ ziri ezi na “n’ihi ndị a [ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst] a ga-ekwujọ ụzọ nke eziokwu.”—2 Pita 2:1, 2.

“Okpukpe nke Ọnụma na Ịkpọasị”

N’ezie, ọ bụghị nanị Krisendọm nyere okpukpe aha ọjọọ. Dị ka ihe atụ, cheedị banyere “ime nsọ nsọ gabigara ókè” nke ndị kweere n’ozizi ndị bụ́ isi, nke onye bụbu nọn bụ́ Karen Armstrong na-ekwu na ọ bụ “ọdịnala nke okpukpe nile” zụliteworo. Dị ka Armstrong si kwuo, otu ule dị mkpa dịịrị okpukpe ọ bụla bụ na o kwesịrị iduga ‘n’omume obi ebere.’ Gịnị bụ ihe ndekọ nke okpukpe ndị kweere n’ozizi ndị bụ́ isi nweworo n’akụkụ a? “Okpukpe kweere n’ozizi ndị bụ́ isi,” ka ọ na-ede, “ọ sọkwa ya bụrụ nke ndị Juu, nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ nke ndị Alakụba, adawo ule a dị mkpa ma ọ bụrụhaala na ọ ghọọ okpukpe nke ọnụma na ịkpọasị.” (The Battle for God—Fundamentalism in Judaism, Christianity and Islam) Ma, ọ̀ bụ nanị okpukpe “ndị kweere n’ozizi ndị bụ́ isi” bụ ndị daworo ule a wee ghọọ “okpukpe nke ọnụma na ịkpọasị”? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụghị nanị ha.

N’ezie, Setan ewulitewo alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke e ji ọnụma, ịkpọasị, na oké mwụfu ọbara mara. Bible kpọrọ alaeze ukwu a “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke . . . ụmụ nwanyị akwụna na nke ihe arụ nke ụwa,” e ji nwanyị akwụna nọkwasịrị n’elu usoro ọchịchị yiri anụ ọhịa mee ihe atụ ya. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ọ bụ ya ga-aza ajụjụ banyere “ọbara . . . nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”—Mkpughe 17:4-6; 18:24.

Ọ Bụghị Mmadụ Nile Ka E Duhiere

Otú ọ dị, akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụghị mmadụ nile ka e duhiere. Ọbụna n’oge kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme, ka Melvyn Bragg na-ekwu, “ọtụtụ ndị ezi mmadụ mere ihe dị mma mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị gbara ha gburugburu na-eme ihe ọjọọ.” Ezi Ndị Kraịst nọgidere “na-efe [Chineke] n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:21-24) Ha guzopụrụ iche n’usoro okpukpe zuru ụwa ọnụ bụ́ nke jiri onwe ya gbaa akwụna dị ka “onye na-eme ka ikike agha sikwuo ike.” Ha jụrụ ikwe ka a dọbanye ha ná mmekọrịta na-aga n’ihu nke Chọọchị na Ọchịchị bụ́ nke akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụ “nkwekọrịta nke Setan kama ịbụ nke Jizọs onye Nazaret.”—Two Thousand Years—The Second Millennium: From Medieval Christendom to Global Christianity.

Na nso nso a karị, a marawo Ndịàmà Jehova maka mmetụta dị mma ha na-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ. Iji hụ na okpukpe ụgha emerụghị ha, ha emewo ka nkwenkwe ha na omume ha dabere nanị n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16, 17) Dịkwa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ha agbasowo iwu Jizọs ‘ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 15:17-19; 17:14-16) Dị ka ihe atụ, na Nazi Germany, ha jụrụ imebi ụkpụrụ Ndị Kraịst ha, n’ihi ya kwa bụrụ ndị a na-apụghị ịnakwere dị ka echiche ndị Nazi si dị. Hitler kpọrọ ha asị maka ya. Otu akwụkwọ e ji akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ na-ekwu, sị: “Ndịàmà Jehova . . . gbasoro nkụzi Bible nke ebulighị ngwá agha n’ọnọdụ ọ bụla. Ya mere, ha jụrụ isonye n’òtù ndị agha ma ọ bụ inwe ihe ọ bụla jikọrọ ha na ndị Nazi. Ná mmegwara, ndị SS tụrụ ọtụtụ ezinụlọ nke Ndịàmà Jehova mkpọrọ. E gburu ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke Ndịàmà Jehova [nọ na Germany] n’ogige ịta ahụhụ.”—Germany—1918-45.

N’ezie, ndị ọzọ nwere obi ike si n’okpukpe dịgasị iche iche tara ahụhụ n’ihi nkwenkwe ha. Ma Ndịàmà Jehova mere nke a dị ka òtù okpukpe dị n’otu. Ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ime ha jidesiri ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́ isi ike, nke bụ́: “Irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29; Mak 12:17.

Ihe Na-akpata Nsogbu Ahụ

Ya mere, ọ bụchaghị eziokwu na ọ bụ okpukpe na-akpata nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ okpukpe ụgha na-akpata ya. Ka o sina dị, n’oge na-adịghị anya site n’ugbu a, Chineke na-ezube iwepụ okpukpe ụgha nile. (Mkpughe 17:16, 17; 18:21) Iwu ọ na-enye onye ọ bụla hụrụ ikpe ziri ezi na ezi omume n’anya, bụ: “Ndị nke m sinụ n’ime ya [ya bụ, Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha], pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya. N’ihi na mmehie ya akpụkọtawo nnọọ ọnụ ruo eluigwe, Chineke echetawokwa ajọ omume ndị o mere.” (Mkpughe 18:4, 5) Ee, okpukpe nke ‘na-akwado esemokwu, na-akụnwụ akọ na uche ụmụ mmadụ, na-eme ka echiche efu nke achọghị iche nsogbu ha ihu jupụta ụbụrụ ụmụ mmadụ, na-emekwa ka ndị mmadụ ghara inwe echiche ghere oghe, na-enwe nkwenkwe ụgha ma jupụta n’ịkpọasị na egwu’ na-akpasu Chineke iwe!

Ka ọ dịgodị, Chineke na-achịkọta ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ime okpukpe dị ọcha. Ọ bụ okpukpe nke na-agbaso ụkpụrụ na nkụzi nke Onye Okike na-ahụ n’anya, bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi ma dị obi ebere. (Maịka 4:1, 2; Zefanaịa 3:8, 9; Matiu 13:30) Ị pụrụ iso na ya. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma banyere otú a pụrụ isi mata okpukpe dị ọcha, nwere onwe gị idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ, ma ọ bụ gwa onye ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova ka o nyere gị aka.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị sitere ná nzụlite nile enwetawo ọṅụ n’okpukpe dị ọcha