Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Nọgide Na-abịa na nke Gị?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Nọgide Na-abịa na nke Gị?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Nọgide Na-abịa na nke Gị?

N’ụwa nile, a maara nke ọma otú Ndịàmà Jehova si eji ịnọgidesi ike na-eje ozi ụlọ n’ụlọ ha. Ọ na-eju ụfọdụ ndị anya ihe mere Ndịàmà ji nọgide na-abịa na nke ha, karịsịa ma ọ bụrụ na ha gositụrụ mmasị na mbụ n’ozi Ndịàmà ahụ. Akwụkwọ ozi abụọ si Russia na-enye aka ịkọwa ihe kpatara ya.

“N’ikwu eziokwu,” ka Masha, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 19 nke bi na Khabarovsk na-ekweta, “mgbe mbụ, ana m eze Ndịàmà Jehova dị ka ọrịa.” Otú ọ dị, mgbe ọ gụsịrị magazin ole na ole nke Ndịàmà bipụtara, ọ gbanwere omume ya. “Ọ na-adọrọ nnọọ mmasị ma na-emepe anya,” ka Masha dere, “ma nke kachasị mkpa, ọ na-eme ka ị na-ele ụwa anya n’ụzọ dị iche. Eji m nke nta nke nta malite ịghọta ihe mere e ji nye ụmụ mmadụ ndụ.”

Site n’obodo ukwu nke Ussuriysk, ihe dị ka kilomita 80 n’ebe ugwu Vladivostok, Svetlana dere, sị: “Ọ dịbeghị anya m malitere ịgụ Ụlọ Nche na Teta! Magazin ndị a dị nnọọ mkpa nke ukwuu n’oge anyị a. Ana m enwe mmasị ịgụ isiokwu ya nile. Ha na-adọrọ nnọọ mmasị, na-enye ihe ọmụma ma na-emepe anya. Unu emeela! Unu emeela nnọọ maka ịnọ n’ụwa a na ịrụ ọrụ obiọma dị otú ahụ na nke dị ezigbo mkpa.”

Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-eji ajụjụ ahụ na-akpali iche echiche Pọl onyeozi jụrụ akpọrọ ihe: “N’aka nke ọzọ, olee otú [ndị mmadụ] ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-eme nkwusa?” (Ndị Rom 10:14) Gịnị ma i jiri minit ole na ole gee ntị mgbe ọzọ Ndịàmà ga-abịa na nke gị? Gị onwe gị pụkwara ịnụ ozi nkasi obi ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.