Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lụọ Ezi Ọgụ nke Okwukwe”

“Lụọ Ezi Ọgụ nke Okwukwe”

“Lụọ Ezi Ọgụ nke Okwukwe”

Ị̀ PỤRỤ ichetụ n’echiche onye agha nke obi na-agaghị adị ụtọ mgbe a gwara ya n’oge agha, sị: “Ị ga-ala n’ụlọ gị ka gị na nwunye gị na ụmụ gị nọrịa ruo oge ụfọdụ”?

Otu onye agha n’oge Eze Devid nke Izrel natara ntụziaka dị otú ahụ. Eze n’onwe ya kpọrọ Yuraịa bụ́ onye Het ma gwa ya ka ọ laa. Ma, Yuraịa ekweghị ala n’ụlọ ya. Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji kpaa àgwà a a na-adịghị ahụkebe, Yuraịa zaghachiri na igbe ọgbụgba ndụ, bụ́ nke na-anọchite anya ọnụnọ Chineke, na ndị agha Izrel nọ n’ọgbọ agha. “Ma,” ka ọ jụrụ, “mụ onwe m, m̀ ga-aba n’ụlọ m, iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na isoro nwunye m dinaa?” Nye Yuraịa, nke ahụ bụ arụ n’oge siri ike dị otú ahụ.—2 Samuel 11:8-11.

Omume Yuraịa na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa, n’ihi na anyị na-ebikwa n’oge agha. E nwere agha na-aga n’ihu ugbu a nke dị iche n’agha mba dị iche iche n’ụwa lụworo. Ọ na-eme ka agha ụwa abụọ ahụ ghọọ ihe na-adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ya, gị onwe gị sokwa n’agha ahụ. Ihe ize ndụ ndị dị na ya dị ukwuu, onye iro anyị dịkwa egwu. A dịghị agba égbè n’agha a, a dịghị atụ bọmbụ, ma ọ ka chọkwara nkà dị ukwuu.

Tupu i bulie ngwá agha, ị ghaghị ibu ụzọ mata ma ọgụ ahụ ò ziri ezi, na ihe mere i ji alụ ya. Agha ahụ ò ruru ihe ọ ga-efu? Pọl onyeozi mere ka nzube e ji alụ ọgụ a pụrụ iche doo anya n’akwụkwọ ozi o degaara Timoti: “Lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.” Ee, ị ghaghị ịlụ ọgụ iji chebe, ọ bụghị obodo e wusiri ike, kama “okwukwe”—eziokwu dum nke Ndị Kraịst dị ka e si kpughee ha n’ime Bible. N’ụzọ doro anya, ị ghaghị ịnabata “okwukwe” ahụ n’ụzọ zuru ezu iji lụọrọ ya ọgụ ma merie.—1 Timoti 6:12.

Onye agha maara ihe na-agbalịsi ike ịmata onye iro ya. N’ọgụ a, onye iro ahụ enwewo ahụmahụ ruo ọtụtụ afọ n’ime atụmatụ agha, na-enwe ike na ngwá agha dị nnọọ ukwuu. O nwere ike karịrị nke mmadụ. Ọ dị obi ọjọọ, na-eme ihe ike, bụrụkwa onye na-enweghị ụkpụrụ; ọ bụ Setan. (1 Pita 5:8) Iji ihe agha nkịtị, na aghụghọ nke mmadụ alụso onye iro a ọgụ abaghị uru ọ bụla. (2 Ndị Kọrint 10:4) Gịnị ka ị ga-eji lụọ agha a?

Ngwá agha bụ́ isi bụ “mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke.” (Ndị Efesọs 6:17) Pọl onyeozi gosiri otú nke a dịruru n’irè: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:11, 12) A ghaghị iji nkà na nlezianya jiri ngwá agha dị nkọ otú ahụ, nke na-adịghịkwa egbujọ egbujọ nke na ọ pụrụ ịbami n’echiche na ebumnobi zoro ezo nke mmadụ mee ihe.

Eleghị anya ị maara na usuu ndị agha pụrụ inwe ngwá agha ndị kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ, ma ngwá agha ndị ahụ agaghị aba uru ma ọ bụrụ na ndị agha ahụ enweghị nkà ndị e ji eji ha eme ihe. N’otu aka ahụ, ntụziaka dị gị mkpa iji jiri mma agha gị mee ihe n’ụzọ dị irè. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ị pụrụ inweta ọzụzụ site n’aka ndị agha kasị nwee ahụmahụ. Jizọs kpọrọ ndị agha a na-azụ ndị ọzọ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ ndị e nyefere ọrụ nke inye ndị na-eso ụzọ ya nri ime mmụọ ndị bịara n’oge ha, ma ọ bụ ntụziaka. (Matiu 24:45) Ị pụrụ ịmata ohu a ọtụtụ ndị mejupụtara site n’ịtụle ịdị uchu o ji na-akụzi ihe na ịdọ aka ná ntị ọ na-enye n’oge ya banyere atụmatụ nke onye iro. Ihe àmà na-egosi na ohu ahụ bụ ndị òtù e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nke ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova.—Mkpughe 14:1.

Ohu a ọtụtụ ndị mejupụtara emewo ihe karịrị nanị izi ihe. O gosiwo mmụọ nke Pọl onyeozi, bụ́ onye degaara ọgbakọ dị na Tesalonaịka akwụkwọ, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nro n’etiti unu, dị ka mgbe nne na-enye nwa ara na-elezi ụmụ nke aka ya anya. Ya mere, n’inwe mmetụta dị nro maka unu, ọ masịrị anyị inye unu, ọ bụghị nanị ozi ọma Chineke, kamakwa mkpụrụ obi anyị onwe anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8) Ọ dịzi n’aka Onye Kraịst nke ọ bụla bụ́ onye agha iji ọzụzụ ịhụnanya ahụ mee ihe.

Ekike Agha Zuru Ezu

E mepụtara ekike agha ihe atụ zuru ezu iji chebe gị. Ị pụrụ ịchọta ndepụta nke ekike agha a ná Ndị Efesọs 6:13-18. Onye agha nọ na nche agaghị anwa anwa pụọ n’ọgbọ agha ma ọ bụrụ na ekike agha ya ezughị ezu ma ọ bụ chọọ nrụzi.

Ekike agha nile nke Onye Kraịst dịcha ya mkpa, ma ọta ukwu bụ́ okwukwe bara uru karịsịa. Ọ bụ ya mere Pọl ji dee, sị: “Karịsịa ihe nile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.”—Ndị Efesọs 6:16.

Ọta ukwu ahụ, bụ́ nke pụrụ ikpuchi ahụ́ nile, na-anọchi anya àgwà bụ́ okwukwe. Ị ghaghị inwe okwukwe siri ike ná nduzi Jehova ma kweta n’enweghị obi abụọ ọ bụla na nkwa ya nile ga-emezu. O kwesịrị ịdị gị ka è mezuchaalarị nkwa ndị ahụ. Ya adịkwala mgbe ị ga-enwe obi abụọ na a ga-ebibi usoro ụwa Setan nile n’oge na-adịghị anya, na a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, nakwa na a ga-eweghachi ndị na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke n’izu okè.—Aịsaịa 33:24; 35:1, 2; Mkpughe 19:17-21.

Otú ọ dị, n’ọgụ a pụrụ iche a na-alụ ugbu a, ọ dị ihe ọzọ dị gị mkpa—enyi. N’oge agha, a na-amalite ọbụbụenyi siri ike ka ndị òtù agha na-agbarịta ibe ha ume ma na-echeberịta ibe ha, ọbụna na-azọpụta ibe ha mgbe ụfọdụ n’ọnwụ. Ọ bụ ezie na inwe ndị enyi bara uru, iji lanarị n’agha a, ọbụbụenyi nke gị na Jehova n’onwe ya dị gị mkpa karịa nke onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere Pọl ji jiri okwu ndị a mechie ndepụta ya nke ihe ndị mejupụtara ekike agha: “Ka unu ji ụdị ọ bụla nke ikpe ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na-anọgide n’ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ.”—Ndị Efesọs 6:18.

Ọ na-amasị anyị ịnọnyere ezi enyi anyị. Anyị na-agbalị isoro ya na-anọkọ. Site n’ịdị na-agwa Jehova okwu n’ekpere mgbe nile, ọ na-aghọ onye dị adị nye anyị, enyi a pụrụ ịtụkwasị obi. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Ụzọ Aghụghọ nke Onye Iro

Mgbe ụfọdụ, ịlụso ụwa a ọgụ pụrụ iyi ịga ije n’ọhịa ebe e liri ogbunigwe aghara aghara. A pụrụ ịwakpo gị site n’akụkụ ọ bụla, onye iro ahụ na-achọkwa ijide gị na mberede. Otú ọ dị, jide n’aka na Jehova enyewo gị nchebe nile dị gị mkpa.—1 Ndị Kọrint 10:13.

Onye iro pụrụ ilekwasị anya n’ịgbagha eziokwu Bible bụ́ ndị okwukwe gị dabeere na ha. Ndị si n’ezi ofufe dapụ pụrụ iji okwu ire ụtọ, ịja mma efu, na echiche gbagọrọ agbagọ nwaa imeri gị. Ma onye si n’ezi ofufe dapụ ebughị ọdịmma gị n’obi. Ilu 11:9 na-ekwu, sị: “Ọnụ ya ka onye e merụrụ emerụ [ma ọ bụ onye si n’ezi ofufe dapụ] ji ebibi mmadụ ibe ya: ma ihe ọmụma ka a ga-eji dọpụta ndị ezi omume.”

Ọ ga-abụ ihie ụzọ iche na ọ dị gị mkpa ige ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị ma ọ bụ ịgụ ihe ndị ha dere iji gbaghaa arụmụka ha. Echiche ha gbagọrọ agbagọ nke dị ka nsí pụrụ imerụ gị ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ ma mebie okwukwe gị dị ka ure anụ ahụ́ na-agbasa ngwa ngwa. (2 Timoti 2:16, 17) Kama nke ahụ, gbasoo ụzọ Chineke si emeso ndị si n’ezi ofufe dapụ ihe. Job kwuru banyere Jehova, sị: “Onye e merụrụ emerụ [ma ọ bụ onye si n’ezi ofufe dapụ] agaghị abịa n’ihu Ya.”—Job 13:16.

Onye iro pụrụ ịnwale ụzọ ọzọ, nke gawooro ya nke ọma ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ bụrụ na a rafuo usuu ndị agha nọ n’ahịrị ịhapụ ahịrị ha itinye aka n’omume rụrụ nnọọ arụ, nke a pụrụ ịkpata ọgba aghara.

Ihe ntụrụndụ nke ụwa a, ndị dị ka ihe nkiri sinima ndị na-egosi omume rụrụ arụ, ihe omume telivishọn na egwú ndị na-ada oké ụda, bụ ihe ụrà dị irè. Ụfọdụ na-azọrọ na ha pụrụ ikiri ihe nkiri ndị rụrụ arụ ma ọ bụ gụọ akwụkwọ na-akọ banyere omume rụrụ arụ n’adịghị ihe ọ bụla ọ ga-eme ha. Ma otu onye nke na-ekirikarị sinima ndị na-egosi nnọọ mmekọahụ ji ezi obi kweta, sị: “Ị gaghị echefu ihe nkiri ahụ echefu, ka ị na-echekwu banyere ha, otú ahụ ka ị na-achọkwu ime ihe ndị ị hụrụ . . . Ihe nkiri ahụ na-eme ka i chee na ọ dị ihe na-efunahụ gị n’ezie.” Ò kwesịrị ekwesị itinye onwe anyị n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e ji ụzọ aghụghọ a merụọ ahụ́?

Akụ́ ụta ọzọ dị n’ebe nkwakọba ngwá agha nke onye iro bụ ndọrọ nke ihe onwunwe. Ọ pụrụ isi ike ịhụ ihe ize ndụ dị na ya n’ihi na anyị nile nwere mkpa ihe onwunwe. Ụlọ, nri na uwe dị anyị mkpa, ọ dịghịkwa njọ inwe ihe ndị mara mma. Ihe ize ndụ dị na ya bụ otú mmadụ si ele ya anya. Ego pụrụ ịghọ ihe dị oké mkpa karịa ihe ime mmụọ. Anyị pụrụ ịghọ ndị hụrụ ego n’anya. Ọ dị mma ka anyị chetara onwe anyị na akụ̀ na ụba nwere ike a kpaara ókè. Ọ na-adịru nanị nwa oge, ebe akụ̀ ime mmụọ na-adịru ebighị ebi.—Matiu 6:19, 20.

Ọ bụrụ na ndị agha adaa mbà n’obi, ohere ha nwere imeri na-ebelata. “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 24:10) Nkụda mmụọ bụ ngwá agha Setan jiworo mee ihe n’ụzọ dị irè. Ikpuru “olileanya nke nzọpụta dị ka okpu ígwè” ga-enyere gị aka ịlụso nkụda mmụọ ọgụ. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Gbalịa ime ka olileanya gị sie ike dị ka nke Ebreham. Mgbe a gwara ya ka o jiri nanị otu nwa o nwere, bụ́ Aịzik, chụọ àjà, Ebreham alaghị azụ ime ya. O kweere na Chineke ga-emezu nkwa Ya nke ịgọzi mba nile site ná mkpụrụ ya, nakwa na Chineke pụrụ ime ka Aịzik si n’ọnwụ bilie ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa iji mezuo nkwa ahụ.—Ndị Hibru 11:17-19.

Adala Mbà n’Agha Ahụ

Ike pụrụ ịmalite ịgwụ ụfọdụ ndị jiworo obi ike lụọ ọgụ ruo ogologo oge, n’ihi ya kwa, ha agharazie ịmụ anya otú ha mụbu n’ọgụ ha. Ihe nlereanya Yuraịa, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite nke isiokwu a, pụrụ inyere ndị nile na-alụ ọgụ a aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi. Ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị agha aghaghị idi ụkọ, bụrụ ndị nọ n’ihe ize ndụ ma ọ bụ bụrụ ndị oyi na ndị agụụ ji. Dị ka Yuraịa, anyị achọghị iche echiche banyere ntụsara ahụ́ ndị anyị pụrụ inwe ugbu a ma ọ bụ malite inwe ọchịchọ nke ibi ndụ ntụsara ahụ́. Anyị chọrọ ịnọgide na-eso ná ndị agha zuru ụwa ọnụ nke Jehova ma nọgide na-alụ ọgụ ruo mgbe anyị nwetara ngọzi ndị dị ebube bụ́ ndị nọ na-echere anyị.—Ndị Hibru 10:32-34.

Ọ ga-abụ ihe dị ize ndụ ịkwụsị ịnọ na nche, ikekwe na-eche na mwakpo ikpeazụ ka dị anya. Ihe atụ nke Eze Devid mere ka ihe ize ndụ dị na ya pụta ìhè. N’ihi ihe ụfọdụ, o soghị usuu ndị agha ya gaa agha. N’ihi ya, Devid mere mmehie dị oké njọ nke kpataara ya nhụsianya na ahụhụ ná ndụ ya nile fọdụrụnụ.—2 Samuel 12:10-14.

Ò kwesịrị ekwesị ịlụ ọgụ a, iche ihe isi ike nke agha ihu, ịnagide ịkwa emo, na ileghara ihe ụtọ ụwa ndị a na-enyo enyo anya? Ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ọgụ ahụ na-ekweta na ihe ụwa nwere inye pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ, ma e leruo ya anya, a na-ahụ na o nweghị ihe dị na ya. (Ndị Filipaị 3:8) Ọzọkwa, ihe ụtọ ndị ahụ na-ewetakarị ihe mgbu na ndakpọ olileanya n’ikpeazụ.

Onye Kraịst nke so n’ọgụ ime mmụọ a na-eso ezi ndị enyi na-enwe mmekọrịta chiri anya, na-enwekwa akọ na uche dị ọcha, na olileanya dị ebube. Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-atụ anya iso Kraịst Jizọs bie ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:54) Ihe ka ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst na-alụ ọgụ a nwere olileanya nke ndụ zuru okè na paradaịs elu ala. N’ezie, ihe mgbata n’ọsọ ndị dị otú ahụ kwesịrị àjà ọ bụla a chụrụ iji nweta ha. N’adịghịkwa ka agha ụwa, anyị ji n’aka na anyị ga-emeri n’ọgụ a ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 11:1) Otú ọ dị, ihe ọ ga-apụtara usoro ihe a nke dị n’aka Setan bụ mbibi ebighị ebi.—2 Pita 3:10.

Ka ị na-alụ ọgụ a, cheta okwu Jizọs bụ́: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) O meriri site n’ịnọ na nche na iguzosi ike n’ezi ihe n’okpuru ule. Anyị pụkwara ime otú ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

A dịghị agba égbè, a dịghị atụ bọmbụ, ma ọ ka chọkwara nkà dị ukwuu

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]

Anyị ji n’aka na anyị ga-emeri n’ọgụ a ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi

[Foto dị na peeji nke 26]

Okpu ígwè bụ́ nzọpụta ga-enyere gị aka ịlụso nkụda mmụọ ọgụ

Jiri ọta ukwu bụ́ okwukwe menyụọ “akụ́ ụta nile na-ere ọkụ” nke Setan

[Foto dị na peeji nke 28]

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso”

[Foto dị na peeji nke 29]

Anyị kwesịrị inwe okwukwe na nkwa Chineke ga-emezu