Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-adị Ọcha n’Omume Site n’Ichebe Obi Gị

Nọgide Na-adị Ọcha n’Omume Site n’Ichebe Obi Gị

Nọgide Na-adị Ọcha n’Omume Site n’Ichebe Obi Gị

“Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—ILU 4:23.

1-3. (a) Olee otú ndị mmadụ si egosikarị na ha ejighị omume ha dị ọcha kpọrọ ihe? Nye ihe atụ. (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inyocha uru omume dị ọcha bara?

IHE osise ahụ pụrụ iyi ihe mgbe ochie. Eleghị anya o kwekọghị n’ihe ndị e ji chọọ ụlọ ahụ mma. Otú o sina dị, ihe àmà na-egosi na ọ dịchaghị onye nwe ya mkpa. E wegara ihe osise ahụ n’ebe a na-ere ahịa mgbuka ka e ree ya dollar 29 (U.S.). Otú ọ dị, afọ ole na ole ka e mesịrị, a chọpụtara na ọnụ ego ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde dollar! Ee, ọ bịara bụrụ ihe osise pụrụ iche. Cheedị otú ọ ga-adị onye mbụ ahụ nwe ya, bụ́ onye ledara akụ̀ a dị oké ọnụ ahịa anya!

2 Ihe yiri ya na-emekarị n’ihe banyere ịdị ọcha n’omume, mmadụ ịbụ onye na-enweghị mmerụ. Ọtụtụ ndị taa na-eleda omume ha dị ọcha anya. Ụfọdụ na-ele ya anya dị ka echiche mgbe ochie, bụ́ nke na-ekwekọghị n’ụzọ ndụ ọgbara ọhụrụ. N’ihi ya, ha na-ere ya ọnụ ego dị ala. Ụfọdụ na-eji omume ha dị ọcha agbanwere imeju agụụ mmekọahụ nwa oge. Ụfọdụ na-atụfu ya iji bụrụ ndị ndị ọgbọ ha ma ọ bụ ndị ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akwanyekwuru ùgwù.—Ilu 13:20.

3 Ọtụtụ ndị na-achọpụta nnọọ mgbe oge gaworo uru omume ha dị ọcha bara n’ezie. Ịtụfu ya na-akpatakarị ọdachi. Dị ka Bible si kwuo ya, ihe na-esi n’omume rụrụ arụ apụta pụrụ ịdị ka nsí, “na-elu ilu dị ka wormwood.” (Ilu 5:3, 4) N’ihi omume rụrụ arụ jupụtara ebe nile taa, olee otú ị pụrụ isi jiri omume gị dị ọcha kpọrọ ihe ma nọgide na ya? Anyị ga-elekwasị anya na nzọụkwụ atọ nwere njikọ ndị anyị pụrụ iwere.

Chebe Obi Gị

4. Gịnị bụ obi ihe atụ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ichebe ya?

4 Isi ihe na-enye aka iji nọgide na-adị ọcha n’omume bụ ichebe obi. Bible na-ekwu, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Gịnị bụ “obi gị” nke e kwuru okwu ya n’ebe a? Ọ bụghị akụkụ ahụ́ nkịtị. Obi a bụ nke ihe atụ. Ọ na-ezo aka ná mmadụ ị bụ n’ime, gụnyere echiche, mmetụta, na mkpali gị. Bible na-ekwu, sị: ‘Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.’ (Deuterọnọmi 6:5) Jizọs kwuru na iwu a karịrị iwu nile. (Mak 12:29, 30) N’ụzọ doro anya, obi anyị a bara uru dị ukwuu. O kwesịrị ka e chebe ya.

5. Olee otú obi pụrụ isi baa uru ma dị ize ndụ n’otu oge ahụ?

5 Otú ọ dị, Bible na-ekwukwa na “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Olee otú obi pụrụ isi dịrị aghụghọ—ihe ize ndụ nye anyị? Dị ka ihe atụ, ụgbọala bụ ihe bara uru, ọbụna bụrụ ihe na-azọpụta ndụ mgbe e nwere ọnọdụ mberede. Ma ọ bụrụ na onye na-akwọ ụgbọala adịghị achịkwa ya achịkwa, na-eduzi ihe e ji anya ya mgbe nile, otu ụgbọala ahụ pụrụ ịghọ n’ụzọ dị mfe ihe na-egbu mmadụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ gwụla ma i chebere obi gị, ọchịchọ na mkpali gị nile ga na-achịkwa gị, ndụ gị ga-etinyekwa isi n’ọdachi. Okwu Chineke na-asị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu: ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Ilu 28:26) Ee, ị pụrụ ije ije n’amamihe ma gbanahụ ọdachi ma ọ bụrụ na i jiri Okwu Chineke na-eduzi onwe gị, dị nnọọ ka ị ga-ele anya na map okporo ụzọ tupu ị malite ime njem.—Abụ Ọma 119:105.

6, 7. (a) Gịnị bụ ịdị nsọ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị ndị ohu Jehova mkpa? (b) Olee otú anyị si mara na ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ igosipụta ịdị nsọ Jehova?

6 Obi anyị agaghị echewe banyere omume dị ọcha n’enweghị nduzi. Anyị aghaghị iduzi ya n’ụzọ ahụ. Otu ụzọ isi mee otú ahụ bụ ịtụgharị uche n’ezigbo uru omume dị ọcha bara. Àgwà a na ịdị nsọ nwere njikọ chiri anya, bụ́ nke na-egosi ịdị ọcha, enweghị mmerụ, na izere mmehie. Ịdị nsọ bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa nke so n’àgwà ndị e ji mara Jehova Chineke. Ọtụtụ narị amaokwu Bible jiri àgwà ahụ mee ihe n’ihe banyere Jehova. N’ezie, Bible na-ekwu na “Ịdị nsọ bụ nke Jehova.” (Ọpụpụ 28:36, NW) Otú ọ dị, olee ihe gbasara anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na àgwà ahụ dị elu?

7 N’Okwu ya, Jehova na-agwa anyị, sị: “Unu aghaghị ịdị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” (1 Pita 1:16) Ee, anyị pụrụ iṅomi ịdị nsọ nke Jehova; anyị pụrụ ịdị ọcha n’ihu ya, nọgide na-adị ọcha n’omume. Ya mere, mgbe anyị zeere omume ndị na-adịghị ọcha, na ndị na-emerụ mmadụ, anyị na-agbalị inweta ihe ùgwù dị elu nke na-akpalikwa akpali—nke igosipụta àgwà mara mma nke Chineke Kachasị Ihe Nile Elu! (Ndị Efesọs 5:1) Anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị emeli nke ahụ, n’ihi na Jehova bụ Nna Ukwu maara ihe ma nwee ezi uche, bụ́ onye na-adịghị achọ n’aka anyị ihe karịrị ihe anyị nwere ike ime. (Abụ Ọma 103:13, 14; Jems 3:17) N’eziokwu, ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ na n’omume chọrọ mgbalị. Otú ọ dị, Pọl onyeozi kwuru na ‘izi ezi na ịdị ọcha kwesịrị Kraịst ahụ.’ (2 Ndị Kọrint 11:3) Ọ̀ bụ na anyị ejighị Kraịst na Nna ya ụgwọ ime mgbalị nile iji nọgide na-adị ọcha n’omume? E kwuwerị, ha egosiwo anyị ịhụnanya dị ukwuu karịa ka anyị nwere ike ịkwụghachi. (Jọn 3:16; 15:13) Ọ bụ ihe ùgwù igosipụta ekele anyị site n’ibi ndụ dị ọcha na nke omume ọma. Site n’inwe echiche dị otú a banyere omume anyị dị ọcha, anyị ga-eji ya kpọrọ ihe, na-echebe obi anyị.

8. (a) Olee otú anyị pụrụ isi na-azụ obi ihe atụ? (b) Gịnị ka mkparịta ụka anyị pụrụ ikpughe banyere anyị?

8 Anyị na-echebekwa obi anyị site n’ụzọ anyị si eri nri. Ọ dị anyị mkpa iji ezigbo nri ime mmụọ na-azụ uche na obi anyị, na-elekwasị anya n’ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:2) Ọbụna mkparịta ụka anyị kwesịrị igosipụta na ọ bụ ebe ahụ ka anyị lekwasịrị anya. Ọ bụrụ na e ji ikwurịta ihe anụ ahụ́ na ihe ndị rụrụ arụ mara anyị, anyị na-ekpughe ihe bụ́ ọnọdụ nke obi anyị. (Luk 6:45) Kama nke ahụ, ka e jiri ikwurịta ihe ime mmụọ na ihe ndị na-ewuli elu mara anyị. (Ndị Efesọs 5:3) Iji chebe obi anyị, e nwere ajọ ihe ize ndụ ndị anyị na-aghaghị izere. Ka anyị tụlee abụọ n’ime ha.

Gbanahụ Ịkwa Iko

9-11. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji dịkwuoro ndị na-eleghara ndụmọdụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 6:18 anya mfe itinye aka n’omume dị oké njọ? Nye ihe atụ. (b) Ọ bụrụ na anyị na-agbanahụ ịkwa iko, gịnị ka anyị na-ezere? (ch) Ihe nlereanya dị aṅaa dị mma ka nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job setịpụụrụ anyị?

9 Jehova kpaliri Pọl onyeozi idetu ndụmọdụ ụfọdụ bụ́ ndị nyewooro ọtụtụ ndị aka ichebe obi ha ma nọgide na-adị ọcha n’omume. Pọl kwuru, sị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrint 6:18) Rịba ama na o mere ihe karịrị nanị ikwu, sị, “Zere ịkwa iko.” Ndị Kraịst kwesịrị ime ihe karịrị nke ahụ. Ha kwesịrị ịgbanahụ omume rụrụ arụ ndị dị otú ahụ, dị nnọọ ka ha ga-agbanahụ ọnọdụ ndị na-eyi ndụ egwu. Ọ bụrụ na anyị eleghara ndụmọdụ ahụ anya, anyị ga-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe itinye aka n’omume dị oké njọ na ịkwụsị inwe ihu ọma Chineke.

10 Iji maa atụ: Otu nne sachara obere nwa ya nwoke ahụ́ ma yiwe ya uwe n’ịkwadebe maka otu ememe dị mkpa. Nwata ahụ jụrụ ma ya nwere ike ịga gwurie egwu n’èzí tupu ezinụlọ ahụ apụwa, mama ya kwenyekwara—ma ọ dabeere ma ọ bụrụ na nwata ahụ ga-eme otu ihe. Mama ya kwuru, sị: “Agakwala nso n’apịtị ahụ dị n’èzí. Ọ bụrụ na i tee onwe gị apịtị, aga m enye gị ntaramahụhụ.” Otú ọ dị, ka minit ole na ole gasịrị, nne ahụ ahụ nwata ahụ ka ọ na-aga n’ọnụ ọnụ ebe apịtị ahụ dị. Apịtị etebeghị ya n’ahụ́. N’agbanyeghị nke ahụ, o leghaara ịdọ aka ná ntị nke mama ya anya ka ọ ghara ịga nso n’apịtị ahụ, nsogbu na-agakwa ịpụta. (Ilu 22:15) Ọtụtụ ndị na-eto eto na ndị toworo eto bụ́ ndị kwesịrị ilezi anya karịa na-ehie ụzọ n’ụzọ yiri nke ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

11 N’oge a mgbe imerime mmadụ nyefeworo onwe ha n’aka “agụụ mmekọahụ na-eme ihere,” e nwewo ụlọ ọrụ nke ọrụ ya bụ nanị ire ihe ndị metụtara mmekọahụ rụrụ arụ. (Ndị Rom 1:26, 27) Ihe otiti nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ejupụtawo n’ọtụtụ magazin, akwụkwọ, vidio, na n’Intanet. Ndị họọrọ iji ihe ndị dị otú ahụ na-emejupụta uche ha adịghị agbanahụ ịkwa iko ma ọlị. Ha ji ya na-egwuri egwu, na-aga n’ọnụ ọnụ ebe apịtị dị, na-eleghara ịdọ aka ná ntị nke Bible anya. Kama ichebe obi ha, ha ji ihe onyinyo ndị pụtara ìhè ndị pụrụ iwe ọtụtụ afọ tupu ha apụọ n’uche na-emerụ obi ha. (Ilu 6:27) Ka anyị mụta ihe site n’aka Job kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ onye ya na anya ya gbara ndụ—nwere nkwekọrịta—ịghara ikwe ka ọ hụ ihe ndị pụrụ ịnwa ya ime ihe ọjọọ. (Job 31:1) N’ezie, nke ahụ bụ ihe nlereanya anyị ga-agbaso!

12. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi ‘gbanahụ ịkwa iko’ n’oge mbedo?

12 Ọ dị oké mkpa karịsịa ‘ịgbanahụ ịkwa iko’ mgbe a na-eme mbedo. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge ọṅụ, nke jupụtara n’olileanya na atụmanya, ma ọtụtụ ndị na-achọ ịlụ di na nwunye na-emebi ya site n’iji omume rụrụ arụ na-egwuri egwu. Ka ha na-eme otú ahụ, ha na-anapụ ibe ha ezi ntọala maka ezi alụmdi na nwunye—mmekọrịta dabeere n’ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe nanị, njide onwe onye, na nrubeisi nye Jehova Chineke. Otu di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst tinyere aka n’omume rụrụ arụ mgbe ha na-eme mbedo. Ka ha lụsịrị di na nwunye, onye nke bụ́ nwunye kwetara na akọ na uche ya ka na-ama ya ikpe, ọbụna mebie ọṅụ nke ụbọchị agbamakwụkwọ ya. O kwupụtara, sị: “Arịọwo m Jehova mgbaghara ọtụtụ ugboro, ma n’agbanyeghị na afọ asaa agafewo kemgbe ahụ, akọ na uche m nọgidere na-ama m ikpe.” Ọ dị oké mkpa ka ndị mere mmehie dị otú ahụ chọọ enyemaka nke Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. (Jems 5:14, 15) Otú ọ dị, ọtụtụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-eji amamihe eme ihe ma zere ihe ize ndụ ndị a n’oge mbedo. (Ilu 22:3) Ha na-akpara ngosipụta nke ịhụnanya ha ókè. Ha na-akpọrọ onye ọzọ mgbe ha na-eme mkpapụ ma zere ịnọ nanị ha n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ.

13. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst na-ekwesịghị iji soro onye na-adịghị ejere Jehova ozi na-eme mbedo?

13 Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eso ndị na-adịghị ejere Jehova ozi eme mbedo yiri ka hà ga-eche ihe ịma aka ndị dị egwu ihu. Dị ka ihe atụ, olee otú gị na onye na-ahụghị Jehova Chineke n’anya ga-esi na-enwe mmekọrịta? Ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst na nanị ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ụkpụrụ ya maka omume dị ọcha ùgwù na-enwe nkekọ. Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?”—2 Ndị Kọrint 6:14.

14, 15. (a) Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi ka ụfọdụ ndị na-enwe banyere ihe “ịkwa iko” pụtara? (b) “Ịkwa iko” na-agụnye omume ndị dị aṅaa, oleekwa otú Ndị Kraịst pụrụ isi ‘gbanahụ ịkwa iko’?

14 Ihe ọmụma dịkwa oké mkpa. Anyị apụghị ịgbanahụ ịkwa iko n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na anyị amaghị ihe ọ bụ n’ezie. Ụfọdụ ndị n’ụwa taa nwere echiche na-ezighị ezi banyere ihe “ịkwa iko” pụtara. Ha na-eche na ha pụrụ igbo agụụ mmekọahụ ha n’ebe ọzọ na-abụghị n’alụmdi na nwunye ma ọ bụrụhaala na ha ezere inwe mmekọahụ kpọmkwem. Ọbụnadị ụfọdụ ụlọ ọrụ ahụ́ ike ndị a na-akwanyere ùgwù ndị na-achọ ibelata ọnụ ọgụgụ nke ịdị ime a na-achọghị nke ndị dị afọ iri na ụma agbawo ndị ntorobịa ume ka ha na-eme ihe ndị dịtụ iche n’ịkwa iko bụ́ ndị na-adịghị arụpụta ịdị ime. N’ụzọ dị mwute, ndụmọdụ dị otú ahụ hiere ụzọ. Izere ịdị ime n’alụghị di na ịnọgide na-adị ọcha n’omume abụghị otu ihe, “ịkwa iko” pụtakwara ihe karịrị nnọọ nke ahụ.

15 Okwu Grik bụ́ por·neiʹa, nke a sụgharịrị ịbụ “ịkwa iko,” nwere nnọọ ọtụtụ ihe ọ pụtara. Ọ na-emetụta mmekọahụ nke ndị na-abụghị di na nwunye ma na-elekwasị anya n’iji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Por·neiʹa na-agụnye ọtụtụ omume ndị dị ka iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ, mmekọahụ otule, na imetụgharị aka n’akụkụ ahụ́ onye ọzọ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị—omume ndị a na-ejikọtakarị ha na ụlọ akwụna. Ndị chere na omume ndị dị otú ahụ abụghị “ịkwa iko” na-eduhie onwe ha, ha adabawokwa n’ọnyà Setan. (2 Timoti 2:26) Tụkwasị na nke ahụ, ịnọgide na-adị ọcha n’omume pụtara ihe karịrị nnọọ izere omume ọ bụla bụ́ ịkwa iko. Iji ‘gbanahụ ịkwa iko,’ anyị aghaghị izere ụdị ọ bụla nke adịghị ọcha nke mmekọahụ na omume rụrụ arụ bụ́ ndị pụrụ iduga n’ajọ mmehie nke por·neiʹa. (Ndị Efesọs 4:19) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-anọgide na-adị ọcha n’omume.

Zere Ihe Ize Ndụ nke Ime Mfegharị

16. N’ebe dị aṅaa ka igosipụta ịhụnanya mmekọahụ bụ ihe kwesịrị ekwesị, dị ka e gosiri n’ihe atụ dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ?

16 Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-adị ọcha n’omume, ihe ize ndụ ọzọ ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya banyere ya bụ ime mfegharị. Ụfọdụ pụrụ isi ọnwụ na ime mfegharị adịghị ihe o mere, na ọ bụ ihe ntụrụndụ na-adịghị emerụ ahụ́ nke nwoke na nwanyị na-enwe. N’ezie, e nwere oge na ebe e kwesịrị igosipụta ịhụnanya mmekọahụ. A hụrụ ka Aịzik na Ribeka “na-egwuri egwu,” o dokwara ndị na-ahụ ha anya na ha abụghị nanị nwanne na nwanne. (Jenesis 26:7-9) Otú ọ dị, ha bụ di na nwunye. Ha igosirịta onwe ha mmetụta ịhụnanya kwesịrị ekwesị. Ya na ime mfegharị abụghị otu ihe.

17. Gịnị bụ ime mfegharị, oleekwa otú a pụrụ isi chịkwaa nsogbu ahụ?

17 A pụrụ isi otú a kọwaa ime mfegharị: Igosi mmasị ịhụnanya mgbe a na-ebughị n’obi n’ezie ịlụ di na nwunye. Ụmụ mmadụ e kere eke dị mgbagwoju anya, n’ihi ya, e nwere ọtụtụ ụzọ e si eme mfegharị, ụfọdụ n’ime ha apụtachaghị nnọọ ìhè. (Ilu 30:18, 19) Ya mere, iwu a kapịrị ọnụ apụghị n’ezie ịchịkwa nke ahụ. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ihe ka elu—mmadụ iji ezi obi na-enyocha onwe ya na iji nlezianya na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

18. Gịnị na-akpali ụfọdụ ndị ime mfegharị, n’ihi gịnịkwa ka ime mfegharị ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ́?

18 Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị ma eleghị anya ga-ekweta na obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nwere mmasị ịhụnanya n’ebe anyị nọ. Ọ bụ ihe e bu pụta ụwa. Ma ànyị na-eme mfegharị ka e wee nwee mmasị dị otú ahụ n’ebe anyị nọ—iwelitetụkwu nnọọ ùgwù anyị ma ọ bụ ịkpali onye ọzọ inwe mmetụta dị otú ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ànyị echewo echiche banyere ihe mgbu anyị pụrụ ịdị na-akpata? Dị ka ihe atụ, Ilu 13:12 na-ekwu, sị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Ọ bụrụ na anyị amara ụma soro onye ọzọ na-eme mfegharị, eleghị anya anyị amaghị kpọmkwem mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ onye ahụ. Onye ahụ pụrụ ịdị na-atụ anya ịmalite ime mbedo na ọbụna ịbanye n’alụmdi na nwunye n’ikpeazụ. Ndakpọ olileanya nke pụrụ isi na ya pụta pụrụ ịgbawa obi. (Ilu 18:14) Ịma ụma jiri mmetụta ndị ọzọ na-egwuri egwu bụ omume obi ọjọọ.

19. Olee otú ime mfegharị pụrụ isi tinye alụmdi na nwunye nke Ndị Kraịst n’ihe ize ndụ?

19 Ọ dị mkpa karịsịa ịnọ na nche megide ime mfegharị mgbe a bịara n’ebe ndị lụrụ di na nwunye nọ. Igosi mmasị ịhụnanya n’ebe onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye nọ—ma ọ bụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye igosi mmasị dị otú ahụ n’ebe onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nọ—dị njọ. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ Ndị Kraịst echewo n’ụzọ hiere ụzọ na ọ dịghị njọ ịzụlite mmetụta ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha nọ. Ụfọdụ na-akọrọ “enyi” dị otú ahụ izu nzuzo ha, ọbụna na-akọrọ ha ihe nzuzo miri emi ndị ha na-adịghị akọrọ onye òtù ọlụlụ ha. N’ihi ya, mmetụta ịhụnanya etolitewo duga n’ịdabere n’ebe onye ahụ nọ maka igbo mkpa mmetụta uche bụ́ nke pụrụ ime ka alụmdi na nwunye gharazie isi ike na ọbụna ibibi ya. Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ga-eme nke ọma icheta ịdọ aka ná ntị amamihe dị na ya nke Jizọs nyere banyere ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye—ọ na-amalite n’obi. (Matiu 5:28) N’ihi ya, ka anyị na-echebe obi anyị ma zere ọnọdụ ndị pụrụ ịrụpụta ajọ ihe ndị dị otú ahụ.

20. Olee otú anyị kwesịrị ikpebi isi na-ele omume anyị dị ọcha anya?

20 N’ezie, ọ dịghị mfe ịnọgide na-adị ọcha n’omume n’ụwa taa nke omume rụrụ arụ jupụtara. Otú ọ dị, cheta na ọ dị nnọọ mfe ịnọgide na-adị ọcha n’omume karịa ịdịghachi ọcha n’omume ozugbo a tụfusịrị ya. N’ezie, Jehova pụrụ ‘ịgbaghara n’ụba,’ o nwekwara ike ime ka ndị chegharịrị n’ezie dị ọcha pụọ ná mmehie ha. (Aịsaịa 55:7) Otú ọ dị, Jehova adịghị echebe ndị mere omume rụrụ arụ pụọ n’ihe ndị na-esi n’omume ha pụta. Ihe ndị na-esi na ha apụta pụrụ ịnọ ọtụtụ afọ, ọbụna ruo ogologo ndụ onye ahụ. (2 Samuel 12:9-12) Ihe ọ sọkwara ya ya mee, nọgide na-adị ọcha n’omume site n’ichebe obi gị. Na-ele omume gị dị ọcha n’ihu Jehova Chineke anya dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa—ekwela ka o funahụ gị ma ọlị!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ ịdị ọcha n’omume, n’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa?

• Olee otú anyị pụrụ isi chebe obi anyị?

• Gịnị ka ịgbanahụ ịkwa iko gụnyere?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere ime mfegharị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Ụgbọala pụrụ ịdị ize ndụ ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ya nke ọma

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị eleghara ịdọ aka ná ntị anya?

[Foto dị na peeji nke 13]

Mbedo dị ọcha na-enye ọṅụ ma na-ewetara Chineke nsọpụrụ