Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọrọ Na Nche Megide Aghụghọ

Nọrọ Na Nche Megide Aghụghọ

Nọrọ Na Nche Megide Aghụghọ

‘Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site n’aghụghọ efu.’—NDỊ KỌLỌSI 2:8.

1-3. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na aghụghọ egbebawo n’akụkụ nile nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị? (b) N’ihi gịnị ka aghụghọ e nwere n’ụwa na-ekwesịghị iji ju anyị anya?

“MMADỤ ole n’ime unu ka ndị ha na-ekpechitere ọnụ ha na-agwatụbeghị okwu ụgha?” Afọ ụfọdụ gara aga, otu prọfesọ n’okwu iwu duziri otu nnyocha site n’ịjụ ajụjụ ahụ. Gịnị ka a zaghachiri ya? Ọ na-akọwa, sị: “N’ime ọtụtụ puku ndị ọkàiwu, ọ bụ nanị otu onye ka onye ọ na-ekpechitere ọnụ ya na-agwatụbeghị okwu ụgha.” Gịnị kpatara ya? “Ọkàiwu ahụ ka malitere nnọọ ọrụ iwu ọhụrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ, ọ dịbeghịkwa onye ọ bụla nwere okwu ikpe nke ya na kwurịtaworo okwu.” Ahụmahụ a na-egosipụta otu eziokwu dị mwute—ịgha ụgha na aghụghọ juru ebe nile n’ụwa taa.

2 Aghụghọ na-enwe ụdị dị iche iche, o gbebawokwa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke ndụ a na-adị n’oge a. A na-ahụ ọtụtụ ihe atụ nke a n’akụkọ usoro mgbasa ozi—ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị na-agha ụgha banyere ihe ndị ha ga-eme, ndị mpịazi ego na ndị ọkàiwu bụ́ ndị na-eweli uru ụlọ ọrụ na-erite elu gabiga ókè, ndị na-akpọsa ngwá ahịa bụ́ ndị na-eduhie ndị na-azụ ihe, ndị na-agba akwụkwọ n’ụlọikpe bụ́ ndị na-erigbu ụlọ ọrụ ịnshọransị, à ga-ekwu ole ghara ole? E nwekwara nduhie okpukpe. Ndị ụkọchukwu na-eduhie ọha mmadụ site n’izi ozizi ụgha, ndị dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, na Atọ n’Ime Otu.—2 Timoti 4:3, 4.

3 Aghụghọ ndị a nile hà kwesịrị iju anyị anya? Ha ekwesịghị. Banyere ‘ụbọchị ikpeazụ,’ Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:1, 13) Dị ka Ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide echiche ndị na-eduhie eduhie bụ́ ndị pụrụ ịdọpụ anyị n’eziokwu ahụ. Ajụjụ abụọ na-ebilitere onwe ha: N’ihi gịnị ka aghụghọ ji jupụta n’ụwa taa, oleekwa otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịbụ ndị e duhiere?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Ọtụtụ Aghụghọ Taa?

4. Olee otú Bible si akọwa ihe mere aghụghọ ji jupụta n’ụwa?

4 Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe mere aghụghọ ji jupụta n’ụwa a. Jọn onyeozi dere na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) “Ajọ onye ahụ” bụ Setan Ekwensu. Banyere ya, Jizọs kwuru, sị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ obi ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha.” Mgbe ahụ, ọ̀ bụ ihe ijuanya na ụwa a na-egosipụta mmụọ, ụkpụrụ, na àgwà aghụghọ nke onye na-achị ya?—Jọn 8:44; 14:30; Ndị Efesọs 2:1-3.

5. Olee otú Setan siworo na-agbasi mbọ ike n’aghụghọ ya n’oge ọgwụgwụ a, oleekwa ndị o lekwasịrị anya karịsịa?

5 N’oge ọgwụgwụ a, Setan na-agbasi mbọ ike. A chụdawo ya n’ụwa. Ọ maara na oge ya dị mkpirikpi, ọ na-ewekwa “oké iwe.” N’ikpebisi ike ibibi ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere ya mee, ọ “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9, 12) Setan abụghị onye na-eduhie ndị mmadụ mgbe ụfọdụ. Kama nke ahụ, ọ dịghị ezu ike ná mgbalị ya iduhie ihe a kpọrọ mmadụ. * Ọ na-eji usoro nduhie ọ bụla ọ hụrụ eme ihe—gụnyere aghụghọ—iji mee ka uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì ma mee ka ha pụọ n’ebe Chineke nọ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Onye a bụ́ aka ochie n’aghụghọ siri ọnwụ iripịa ndị na-efe Chineke ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24; 1 Pita 5:8) Ya adịla mgbe ọ bụla ị ga-echefu na Setan zọọrọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Apụrụ m ime ka onye ọ bụla gbakụta Chineke azụ.’ (Job 1:9-12) Ka anyị tụlee “ụzọ aghụghọ” ụfọdụ nke Setan na otú anyị ga-esi nọrọ na nche megide ha.—Ndị Efesọs 6:11, Jewish New Testament.

Nọrọ na Nche Megide Nduhie nke Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ

6, 7. (a) Gịnị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ pụrụ ịzọrọ? (b) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi n’ụzọ doro anya ihe bụ ebumnobi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ?

6 Ọ dịwo anya Setan jiwere ndapụ n’ezi ofufe na-eme ihe ná mgbalị ya ịrata ndị ohu Chineke. (Matiu 13:36-39) Ndị si n’ezi ofufe dapụ pụrụ ịzọrọ na ha na-efe Jehova nakwa na ha kweere na Bible, ma ha na-ajụ akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ ya. Ọbụna ụfọdụ na-alaghachi na nkwenkwe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nke “Babilọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:5; 2 Pita 2:19-22) Site ná nduzi Chineke, ndị dere Bible ji okwu ndị dị ike kpughee ebumnobi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na ụzọ ndị ha si eme ihe.

7 Gịnị bụ ebumnobi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha enweghị afọ ojuju nanị n’ịhapụ okpukpe ha leburu anya dị ka nke bụ́ eziokwu. Mgbe mgbe, ha na-achọ ịkpọrọ ndị ọzọ. Kama ịga na-eme ndị na-eso ụzọ nke ha, ọtụtụ n’ime ndị si n’ezi ofufe dapụ na-achọ ‘ịdọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ [ya bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst] iso ha n’azụ.’ (Ọrụ 20:29, 30) Banyere ndị ozizi ụgha, Pọl onyeozi nyere ịdọ aka ná ntị a dị ngwa, sị: “Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya.” (Ndị Kọlọsi 2:8) Nke ahụ ọ́ dịghị akọwa ihe ọtụtụ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbalị ime? Dị ka onye ntọrọ mmadụ bụ́ onye na-atọrọ onye na-amaghị ihe na-aganụ pụọ n’ezinụlọ ya, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-achọkwa isi n’ìgwè atụrụ ahụ kpọpụ ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị chere na ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ bu ezi ihe n’obi.

8. Ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị si n’ezi ofufe dapụ si emezu ebumnobi ha?

8 Ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị si n’ezi ofufe dapụ si emezu ebumnobi ha? Ha na-ejikarị nkọwahie, okwu ndị na-abụchaghị eziokwu, na ụgha chara acha eme ihe. Jizọs maara na ndị “na-ekwu ụdị ajọ okwu ụgha dị iche iche” megide ụmụazụ ya ga-aghọgbu ha. (Matiu 5:11, Today’s English Version) Ndị mmegide dị otú ahụ nwere obi ọjọọ ga-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu n’ebumnobi nke iduhie ndị ọzọ. Pita onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-eji “okwu nrafu” eme ihe, na-agbasa ‘ozizi nduhie’ ma ‘na-agbagọ Akwụkwọ Nsọ’ iji mezuo ebumnobi ha. (2 Pita 2:3, 13; 3:16) N’ụzọ dị mwute, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-enwe ihe ịga nke ọma ‘n’ikpu okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu.’—2 Timoti 2:18.

9, 10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịbụ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ duhiere? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-adịghị eji echegbu onwe anyị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka a nụchaa nghọta anyị banyere nzube Chineke?

9 Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịbụ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ duhiere? Ọ bụ site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke, bụ́ nke na-asị: “Unu na-elegide ha anya bụ́ ndị na-akpata nkewa na ọnọdụ ndị na-akpata ịsụ ngọngọ bụ́ nke megidere ozizi unu mụtaworo, na-ezerekwanụ ha.” (Ndị Rom 16:17) Anyị ‘na-ezere ha’ site n’ịjụ echiche ha—ma hà ji ọnụ ha kwuo ya, bie ya n’akwụkwọ, ma ọ bụ tinye ya n’Intanet. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji mee otú ahụ? Nke mbụ, ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke gwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ, anyị nwekwara obi ike na Jehova na-ebu ọdịmma anyị kasịnụ n’obi mgbe nile.—Aịsaịa 48:17, 18.

10 Nke abụọ, anyị hụrụ nzukọ ahụ nke kụziwooro anyị eziokwu ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị meworo nnọọ ka anyị dị iche n’ebe Babilọn Ukwu ahụ dị n’anya. N’otu oge ahụ, anyị na-aghọta na ihe ọmụma anyị nwere banyere nzube Chineke ezughị okè; a nụchawo nghọta anyị n’afọ ndị gafeworonụ. Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe nwere afọ ojuju ichere Jehova maka nnụcha nile dị otú ahụ. (Ilu 4:18) Ka ọ dịgodị, anyị agaghị agbahapụ nzukọ nke Chineke nwere mmasị iji na-eme ihe, n’ihi na anyị na-ahụ ihe àmà doro anya nke ngọzi ya n’ebe ọ dị.—Ọrụ 6:7; 1 Ndị Kọrint 3:6.

Nọrọ na Nche Megide Nduhie Onwe Onye

11. N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ji enwe ọchịchọ iduhie onwe ha?

11 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ nke Setan na-adị ngwa iji eme ihe—nduhie onwe onye. “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa,” ka Jeremaịa 17:9 na-ekwu. Jems dekwara, sị: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà.” (Jems 1:14) Ọ bụrụ na a rafuo obi anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ pụrụ iche anyị mmehie n’ihu n’ụzọ na-adọrọ adọrọ, na-eme ka o yie ihe na-adọrọ mmasị na ihe na-adịghị emerụ ahụ́. Echiche dị otú ahụ na-eduhie eduhie, n’ihi na mmadụ ịdaba ná mmehie ga-edugarịrị ná mbibi.—Ndị Rom 8:6.

12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nduhie onwe onye pụrụ isi mata anyị n’ọnyà?

12 Nduhie onwe onye pụrụ ịmata anyị n’ọnyà n’ụzọ dị mfe. Obi nke dị aghụghọ pụrụ ile àgwà ọjọọ anya dị ka ihe na-adịghị ihe o mere ma ọ bụ na-agọpụrụ mmehie dị oké njọ. (1 Samuel 15:13-15, 20, 21) Obi anyị na-adịghị ekwe nghọta pụkwara ịchọ ụzọ isi mee ka àgwà a na-enyo enyo yie ihe na-adịchaghị njọ. Were ihe metụtara ntụrụndụ dị ka ihe atụ. Ntụrụndụ ụfọdụ ziri ezi ma na-enye obi ụtọ. Otú ọ dị, ihe ka ukwuu n’ihe ụwa a na-enye—n’ihe nkiri sinima na n’usoro ihe omume telivishọn na n’ógbè Intanet—na-asọ oyi ma rụọ arụọ. Ọ dị mfe anyị ikwenye na anyị pụrụ ikiri ihe ntụrụndụ ndị rụrụ arụ ma ghara imerụ ahụ́. Ọbụna ụfọdụ na-eche, sị, “Ọ dịghị enye akọ na uche m nsogbu, ya mere, gịnị dị njọ na ya?” Ma ndị dị otú ahụ ji ‘echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha.’—Jems 1:22.

13, 14. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na akọ na uche anyị adịghị abụ ihe nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe nile? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide nduhie onwe onye?

13 Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide nduhie onwe onye? Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa icheta na a pụghị ịtụkwasị akọ na uche mmadụ obi mgbe nile. Tụlee ihe metụtara Pọl onyeozi. Tupu ya aghọọ Onye Kraịst, ọ kpagburu ụmụazụ Kraịst. (Ọrụ 9:1, 2) Ọ pụrụ ịbụ na akọ na uche ya enyeghị ya nsogbu n’oge ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, e duhiewo akọ na uche ya. “Amaghị m nke a na-akọ, emekwara m ihe n’enweghị okwukwe,” ka Pọl kwuru. (1 Timoti 1:13) Ya mere, na ihe ntụrụndụ ụfọdụ adịghị enye akọ na uche anyị nsogbu abụghị nnọọ ihe na-egosi na ihe anyị na-eme ziri ezi. Ọ bụ nanị ezi akọ na uche e ji Okwu Chineke zụọ nke ọma pụrụ ịbụ ihe nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi.

14 Ọ bụrụ na anyị ga-ezere nduhie onwe onye, e nwere aro ụfọdụ ndị ga-enyere anyị aka bụ́ ndị ọ dị mkpa ka anyị buru n’uche. Jiri ekpere na-enyocha onwe gị. (Abụ Ọma 26:2; 2 Ndị Kọrint 13:5) Iji ezi obi enyocha onwe gị pụrụ imeghe anya gị ịhụ mkpa ọ dị ime mgbanwe n’otú i si eche echiche ma ọ bụ n’ụzọ gị. Na-ege ndị ọzọ ntị. (Jems 1:19) Ebe ọ bụ na echiche mmadụ na-emetụtakarị nnyocha onwe onye ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’ihe Ndị Kraịst ibe anyị tozuru okè ji ezi obi kwuo. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-eme mkpebi ma ọ bụ na-eme ihe n’ụzọ ndị kwere ekwe ibe gị tozuru okè ma nwee ahụmahụ na-enyo enyo, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ pụrụ ịbụ na a zụbeghị akọ na uche m nke ọma ka ọ̀ ga-abụ na obi m na-eduhie m?’ Jiri Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na-azụ onwe gị mgbe nile. (Abụ Ọma 1:2) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ime ka echiche, àgwà, na mmetụta gị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke.

Nọrọ na Nche Megide Ụgha Setan

15, 16. (a) Ná mgbalị ndị ọ na-eme iduhie anyị, ụgha ndị dị aṅaa ka Setan ji eme ihe? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ụgha ndị dị otú ahụ duhiere?

15 Setan na-eji ụgha dị iche iche eme ihe ná mgbalị ya iduhie anyị. Ọ na-agbalị ime ka anyị kwenye na inwe ihe onwunwe na-eweta obi ụtọ na afọ ojuju ma, nke ahụ na-abụkarị ụgha. (Eklisiastis 5:10-12) Ọ ga-amasị ya ime ka anyị kwere na ajọ ụwa a ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụ ezie na e nwere ihe àmà doro anya na anyị na-ebi ‘n’ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Setan na-akwalite echiche bụ́ na e nweghị ihe dị njọ n’ịchụso ụzọ ndụ rụrụ arụ, ọ bụ ezie na ndị na-achọ ihe ụtọ na-aghọrọkarị ajọ mkpụrụ. (Ndị Galeshia 6:7) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ụgha ndị dị otú ahụ duhiere?

16 Rite uru site n’ihe atụ ndị dị na Bible. Bible nwere ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ndị mmadụ bụ́ ndị ụgha Setan duhiere. Ha hụrụ ihe onwunwe n’anya, chefuo oge ha bi na ya, ma ọ bụ mikpuo onwe ha n’omume rụrụ arụ—bụ́cha ndị rụpụtara ajọ ihe. (Matiu 19:16-22; 24:36-42; Luk 16:14; 1 Ndị Kọrint 10:8-11) Mụta ihe site n’ihe atụ ndị nke oge a. N’ụzọ dị mwute, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ Ndị Kraịst akwụsịla inwe echiche nke ịdị ngwa ma bịa kwere na e nwere ezigbo ihe na-efunahụ ha n’ihi ijere Chineke ozi. Ha pụrụ ịhapụ eziokwu ahụ iji chụsoo ụzọ ndụ nke a sị na ọ bụ ihe ụtọ. Otú ọ dị, ndị dị otú ahụ nọ “n’ebe nile na-alọ alọ,” n’ihi na n’ikpeazụ àgwà asọpụrụghị Chineke ha ga-akpatara ha ọdachi. (Abụ Ọma 73:18, 19) Anyị bụ ndị maara ihe ịmụta ihe site n’ihie ụzọ nke ndị ọzọ.—Ilu 22:3.

17. N’ihi gịnị ka Setan ji akwalite ụgha bụ́ na Jehova ahụghị anyị n’anya ma ọ bụ jiri anyị kpọrọ ihe?

17 E nwere ụgha ọzọ nke Setan jiworo mee ihe n’ụzọ dị irè—ụgha bụ́ na Jehova ahụghị anyị n’anya nakwa na o jighị anyị kpọrọ ihe. Setan ejiwo ọtụtụ puku afọ mụọ ihe banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ maara nke ọma na ịda mbà n’obi pụrụ ịkụda anyị mmụọ. (Ilu 24:10) N’ihi ya, ọ na-akwalite ụgha bụ́ na anyị abaghị uru n’anya Chineke. Ọ bụrụ na ‘a kwada anyị,’ anyị ekwenyekwa na Jehova adịghị eche banyere anyị, anyị pụrụ ịbụ ndị a nwara ịda mbà n’obi. (2 Ndị Kọrint 4:9) Nke ahụ bụ nnọọ ihe Onye Nduhie ukwu ahụ chọrọ! Oleezi otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịbụ ndị ụgha a nke Setan duhiere?

18. Olee otú Bible si emesi anyị obi ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?

18 Na-atụgharị uche n’ihe Bible na-ekwu banyere ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Okwu Chineke na-eji ihe atụ ụfọdụ ndị na-emetụ n’ahụ́ eme ihe iji mesie anyị obi ike na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme ma hụ anyị n’anya n’otu n’otu. Ọ na-etinye anya mmiri gị na “karama akpụkpọ” ya, nke pụtara na ọ na-ahụ ma na-echeta anya mmiri na-agba gị ka ị na-agbalị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Abụ Ọma 56:8) Ọ maara mgbe ‘obi gị tiwara etiwa,’ ọ nọkwa gị nso n’oge ndị dị otú ahụ. (Abụ Ọma 34:18) Ọ maara ihe nile banyere gị, gụnyere ọnụ ọgụgụ nke “ntutu nile nke isi [gị].” (Matiu 10:29-31) Karịsịa, Chineke “nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya” n’ihi gị. (Jọn 3:16; Ndị Galeshia 2:20) Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri gị ike ikwere na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú a metụtara gị kpọmkwem. Otú ọ dị, anyị aghaghị ikwere okwu Jehova. Ọ chọrọ ka anyị kwere na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ bụghị nanị dị ka otu ìgwè kama n’otu n’otu.

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịghọta na ịjụ ụgha Setan bụ́ na Jehova ahụghị anyị n’anya? (b) Olee otú otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị siworo nyere ndị dara mbà n’obi aka?

19 Chọpụta ma jụ ụgha ahụ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na mmadụ na-agha ụgha, ị pụrụ ichebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye e duhiere. N’otu aka ahụ, nanị ịmara na Setan na-achọ ka i kwere na Jehova ahụghị gị n’anya pụrụ n’onwe ya ịbụ ihe enyemaka dị ike. N’imeghachi omume n’otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche banyere ụzọ aghụghọ Setan, otu Onye Kraịst kwuru, sị: “Amatụghị m na Setan na-agbalị iji mmetụta m akụda m mmụọ. Ịmara nke a mere ka m nwee nkwali ịlụso mmetụta ndị a ọgụ.”

20 Tụlee ahụmahụ nke otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’otu mba dị n’Ebe Ndịda America. Mgbe ọ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ na nke ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị dara mbà n’obi, ọ na-ajụkarị ha, sị, ‘Ì kwere n’Atọ n’Ime Otu?’ Onye ahụ dara mbà n’obi na-azakarị, sị, ‘Mbanụ,’ na-aghọta na nke a bụ otu n’ime ụgha Setan. Okenye ahụ na-ejegharị ejegharị na-ajụzi, sị, ‘Ì kwere n’ọkụ ala mmụọ?’ Onye ahụ azaakwa, ‘Mbanụ!’ Okenye ahụ na-ejegharị ejegharị na-agwazi ha na e nwere ụgha ọzọ nke Setan bụ́ nke a na-adịghị aghọta ngwa ngwa otú ahụ. Ọ na-adọrọ uche ha gaa na peeji nke 249, paragraf nke 21, nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, * bụ́ nke gbara ụgha bụ́ na Jehova ahụghị anyị n’anya n’otu n’otu n’anwụ. Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị na-akọ ihe ndị dị mma na-esi n’isi otú a na-enyere ndị dara mbà n’obi aka ịghọta na ịjụ ụgha a nke Setan apụta.

Chebe Onwe Gị Megide Nduhie

21, 22. Gịnị mere anyị na-ejighị bụrụ ndị na-amaghị ụzọ aghụghọ nke Setan, gịnịkwa ka anyị kpebisiri ike ime?

21 N’ọgwụgwụ nke ụbọchị ikpeazụ a, a ga-atụ anya na Setan ga-anọgide na-aghara ụmụ mmadụ ọtụtụ ụgha ma na-eduhie ha. Anyị nwere ekele na Jehova ahapụghị anyị n’ọnọdụ nke amaghị nduhie nke Setan. Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ekpughe nnọọ usoro arụrụala Ekwensu ji eme ihe. (Matiu 24:45) Agha e yiri eyi adịghị eri ngwụrọ.—2 Ndị Kọrint 2:11.

22 Ya mere, ka anyị nọgide na-eche nche megide echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ka anyị kpebisie ike izere ọnyà dị aghụghọ nke nduhie onwe onye. Ka anyị chọpụtakwa ma jụ aghụghọ nile nke Setan. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-echebe mmekọrịta anyị na “Chineke nke eziokwu,” bụ́ onye kpọrọ aghụghọ asị.—Abụ Ọma 31:5; Ilu 3:32.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Banyere ụdị ngwaa nke a sụgharịrị ịbụ “na-eduhie” ná Mkpughe 12:9, otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu na ọ “na-egosi ihe a na-eme mgbe nile nke mawooro mmadụ ahụ́.”

^ par. 20 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ nduhie n’ụwa taa?

• Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịbụ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ duhiere?

• Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ọchịchọ ọ bụla nke nduhie onwe onye?

• Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ụgha Setan duhiere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Eduhiela onwe gị n’ihe metụtara ntụrụndụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

N’ichebe onwe gị megide nduhie onwe onye, jiri ekpere na-enyocha onwe gị, na-ege ndị ọzọ ntị, jirikwa Okwu Chineke na-azụ onwe gị mgbe nile