Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

MGBE ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga nọ ná nhụjuanya, ha kpekusiri Chineke ekpere ike maka nduzi. Otú ọ dị, ha mekwara ihe iji belata nhụjuanya ahụ, dị ka site n’iji akọ mee ihe iji gbanahụ ndị mmegbu. Dị ka ihe atụ, ịdabere n’ebe Jehova nọ na mgbalị onwe onye nyeere Devid aka ịnagide ahụhụ ya. Gịnị banyere anyị taa?

Mgbe ị nọ ná nhụjuanya, o yikarịrị ka ị na-eme ihe iji dozie nsogbu gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nweghị ọrụ, ọ̀ bụ na ị naghị etinye mgbalị iji chọta ọrụ nke ga-akwagide gị na ezinụlọ gị? (1 Timoti 5:8) Ma ọ bụ, ọ bụrụ na i nwere nsogbu ahụ́ ike, ọ̀ bụ na ị naghị achọ enyemaka ahụ́ ike zuru ezu? Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na Jizọs, bụ́ onye Chineke nyere ike ịgwọ ụdị ọrịa nile, kwetara na ‘ndị ahụ́ na-enye nsogbu nwere mkpa maka dibịa.’ (Matiu 9:12) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ọ bụghị mgbe nile ka a ga-ewepụ nhụjuanya gị; ọ pụrụ ịbụ na ị ga-anọgide na-edi ha ruo n’ókè ụfọdụ.

Gịnị ma i kpegara Jehova Chineke ekpere maka ọnọdụ ahụ? Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-achọ ọrụ, iji ekpere dabere n’ebe Chineke nọ ga-enyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa ọ bụla nke ịnakwere ọrụ megidere ụkpụrụ Bible. Anyị ga-ezerekwa ịbụ ndị anyaukwu ma ọ bụ ịhụ ego n’anya ‘duhiere pụọ n’okwukwe.’ (1 Timoti 6:10) N’ezie, mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị mkpa banyere nchegbu nke ọrụ ma ọ bụ ezinụlọ ma ọ bụ ahụ́ ike, anyị pụrụ ịnakwere agbamume Devid bụ́: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

Ekpere e ji ezi obi kpee ga-enyekwara anyị aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi ka nhụjuanya anyị wee ghara ịnyịgbu anyị. Ezi Onye Kraịst, bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” N’ụzọ dị aṅaa ka ekpere e ji ezi obi kpee pụrụ isi kasie anyị obi? “Udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Udo nke Chineke “karịrị echiche nile.” Ya mere, ọ pụrụ ime ka anyị kwụsie ike mgbe mmetụta uche na-enye nsogbu na-anyịgbu anyị. Ọ ‘ga-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche,’ si otú ahụ na-enyere anyị aka izere imeghachi omume ọkụ ọkụ na n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, bụ́ nke pụrụ ime ka nhụjuanya anyị ka njọ.

Ekpere pụrụ ọbụna imetụta ihe ga-esi n’otu ọnọdụ pụta. Mgbe Pọl onyeozi ghọrọ onye mkpọrọ na Rom, o ji obi umeala rịọ Ndị Kraịst ibe ya ka ha na-ekpe ekpere n’ihi ya. Gịnị mere Pọl ji rịọ arịrịọ a? “M na-agba unu ume ime nke a karịsịa,” ka o degaara ha, “ka e wee weghachi m n’ebe unu nọ n’isi nso karị.” (Ndị Hibru 13:19) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Pọl maara na Jehova ịnụ arịrịọ nke ndị kwere ekwe ibe ya nọgidere na-arịọ pụrụ imetụta mgbe a ga-atọhapụ ya.—Faịlimọn 22.

Ekpere ọ̀ ga-agbanwe ihe ga-esi ná nhụjuanya anyị pụta? Ọ pụrụ ime otú ahụ. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na Jehova Chineke nwere ike ọ gaghị aza ekpere anyị n’ụzọ ga-aka amasị anyị. Pọl kpere ekpere ọtụtụ ugboro banyere “ogwu n’anụ ahụ́” ya, ikekwe nsogbu anụ ahụ́. Otú ọ dị, kama iwepụ nhụjuanya ahụ, Chineke gwara Pọl, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:7-9.

Ya mere, o nwere ike nhụjuanya anyị agaghị akwụsị ozugbo. Otú ọ dị, anyị ga-enwe ohere iji gosipụta na anyị dabeere n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ. (Jems 1:2-4) Jide n’aka na ọ bụrụgodị na Jehova Chineke ewepụghị nhụjuanya anyị, ọ “ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka [anyị] wee nwee ike idi ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na a kpọrọ Jehova “Chineke nke nkasi obi nile, bụ́ onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Chineke pụrụ inye anyị ihe dị anyị mkpa iji tachie obi, anyị nwekwara olileanya nke ndụ ebighị ebi.

Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwe nkwa na Jehova “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Ụwa nke nhụjuanya na-adịghị na ya ò yiri nnọọ ihe na-agaghị ekwe omume? Ọ pụrụ ma ọ bụrụ na nhụjuanya amawo gị ahụ́. Otú o sina dị, nnwere onwe pụọ n’ụjọ na ọdachi bụ ihe Chineke kweworo ná nkwa, nzube ya ga-emezurịrịkwa.—Aịsaịa 55:10, 11.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Site n’obi nkoropụ gaa n’ahụ́ efe