Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe—Ọ̀ Na-enwe Mmetụta Dị Mma Ka Ọ Bụ nke Dị Njọ?

Okpukpe—Ọ̀ Na-enwe Mmetụta Dị Mma Ka Ọ Bụ nke Dị Njọ?

Okpukpe—Ọ̀ Na-enwe Mmetụta Dị Mma Ka Ọ Bụ nke Dị Njọ?

“EJI m Iso Ụzọ Kraịst ụgwọ, ekwenyere m na ọ bụkwa otú ahụ ka ụwa anyị biworo na ya kemgbe afọ 2000 gara aga, ji ya.”—Okwu Mmalite nke akwụkwọ bụ́ Two Thousand Years—The First Millennium: The Birth of Christianity to the Crusades.

Nkwado ahụ e nyere “Iso Ụzọ Kraịst” si n’aka Melvyn Bragg, onye England bụ́ onye edemede na onye mgbasa ozi. Okwu ya na-egosipụta echiche nke ọtụtụ nde ndị bi n’ụwa bụ́ ndị chekwara na ha ji otu okpukpe ma ọ bụ ọzọ ụgwọ dị ukwuu, nakwa na ha kwesịrị iguzosi ike n’ihe nye ya. Ha kwenyesiri ike na okpukpe enwewo mmetụta dị mma ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, otu onye edemede na-ekwu na okpukpe Alakụba “emewo ka e nwee oké mmepeanya . . . [nke] bawooro ụwa nile uru.”

Òkè Okpukpe Na-ekere—Nke Dị Mma Ka Ọ̀ Bụ nke Dị Njọ?

Otú ọ dị, okwu Bragg sochirinụ kpaliri ajụjụ dị mkpa bụ́ ma okpukpe n’ozuzu ya ò nwewo mmetụta dị mma n’ezie. Ọ gbakwunyere, sị: “Iso Ụzọ Kraịst jikwa ụgwọ inye m nkọwa.” Gịnị ka ọ chọrọ ka o nye ya nkọwa banyere ya? “Banyere omume ekweghị ibe nọrọ, mmebi iwu, mmeso ọjọọ, na amaghị nke a na-akọ a kpachaara anya na-eme bụ́kwa ndị jupụtara ‘n’akụkọ ihe mere eme’ ya,” ka ọ na-ekwu.

Ọtụtụ ga-ekwu na omume ekweghị ibe nọrọ, mmebi iwu, mmeso ọjọọ, na amaghị nke a na-akọ a kpachaara anya na-eme emetọwo ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị dị n’ụwa n’akụkọ ihe mere eme nile. Echiche ha bụ na okpukpe na-eme nnọọ ka a ga-asị na ọ na-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru—na ọ na-eji omume ọma na ịdị nsọ ekpuchi ihu abụọ na ụgha jupụtara n’ime ya n’ezie. (Matiu 23:27, 28) “Okwu a na-ahụkarị n’akwụkwọ anyị bụ nke na-ekwu na okpukpe bara uru pụrụ iche n’ihe metụtara mmepeanya,” ka akwụkwọ bụ́ A Rationalist Encyclopædia na-ekwu. “Ọ dịghịkwanụ nke eziokwu nke akụkọ ihe mere eme na-emegide nnọọ karịa ya,” ka ọ gara n’ihu na-ekwu.

I welite akwụkwọ akụkọ ọ bụla taa, ị ga-ahụ nnọọ akụkọ ebe ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-ekwusa banyere ịhụnanya, udo, na obi ebere ma na-afụnwu ọkụ nke ịkpọasị, na-akpọkukwa aha Chineke iji mee ka agha obi ọjọọ ha yie ndị ziri ezi. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ mmadụ ji na-eche na okpukpe bụ nnọọ ihe na-ebibi ihe ná ndụ!

Ọ̀ Gaara Aka Mma Ma Ọ Bụrụ na E Nweghị Okpukpe?

Ọbụna ụfọdụ ekwubiwo dị ka ọkà ihe ọmụma, bụ́ onye England bụ́ Bertrand Russell kwubiri, na ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na, ka oge na-aga, “ụdị nkwenkwe okpukpe ọ bụla [ga-anyụ] ka ọkụ.” N’echiche ha, iwepụ okpukpe bụ nanị ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, ha pụrụ ịhọrọ ichefu na ndị jụrụ okpukpe pụrụ ịkpali ịkpọasị na omume ekweghị ibe nọrọ dị nnọọ ka ndị na-akwado ya. Onye na-ede banyere okpukpe bụ́ Karen Armstrong na-echetara anyị, sị: “Ma ọ́ dịghị nnọọ ihe ọzọ, Oké Mgbukpọ ahụ gosiri na echiche enweghị mmasị n’okpukpe [pụrụ] ịbụ nnọọ ihe na-ebibi ihe dị ka agha ntụte okpukpe ọ bụla.”—The Battle for God—Fundamentalism in Judaism, Christianity and Islam.

Ya mere okpukpe ọ̀ na-enwe mmetụta dị mma n’ezie, ka ọ̀ bụ ya nnọọ na-akpata nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ? Ikpochapụ okpukpe nile ọ̀ bụ ihe ngwọta nke nsogbu ndị ahụ? Tụlee ihe Bible nwere ikwu banyere nke a n’isiokwu na-esonụ. Azịza ya pụrụ ịtụ gị n’anya.