Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Pụrụ Ịzọpụta Chọọchị?

À Pụrụ Ịzọpụta Chọọchị?

À Pụrụ Ịzọpụta Chọọchị?

“NDỊ bi na Britain ka kwere na Chineke ma ha achọghị inyefe Kraịst onwe ha,” ka Stephen Tirwomwe, bụ́ ụkọchukwu bụ́ onye Uganda na-ekwu. Ihe dị ka afọ 20 gara aga, ọ lanarịrị oké mgbukpọ nke e mere na chọọchị ya dị na Uganda. Taa, ọ na-eji minit iri ekwu okwuchukwu ya na klọb ụmụ nwoke dị na Leeds, England, tupu ndị na-ege ya ntị agawa ịgba chaa chaa.

N’ofe nke ọzọ nke Atlantic, Chọọchị Anglịkan e guzobere ọhụrụ n’America nwere nsogbu ime mmụọ yiri nke ahụ. “United States nwere ugbu a ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ndị na-asụ Bekee n’ụwa bụ́ ndị na-adịghị aga chọọchị na ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe,” ka ógbè Intanet nke chọọchị ahụ na-ekwu. “Obodo anyị na-aghọwanye ebe a chọrọ enyemaka nke ndị ozi ala ọzọ.” N’ịbụ ndị nwere nkụda mmụọ n’ihi na mgbalị ha mere iji gbanwee chọọchị ha kụrụ afọ n’ala, òtù ọhụrụ ahụ hapụrụ omenala ha ma soro ndị ndú si Eshia na Africa malite “iburu ozi ọma gaa United States.”

Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ndị ozi ala ọzọ si Africa, Eshia, na Latin America ji ‘na-azọpụta mkpụrụ obi’ n’ala ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst dị na Europe na n’Ebe Ugwu America?

Ònye Na-azọpụta Onye?

Ruo ihe karịrị narị afọ anọ, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị Europe ji okpukpe kpọrọ ihe sooro ndị ọchịchị na-agbasa ebe ndị ha na-achị banye n’Africa, Eshia, Pacific, na Ebe Ndịda America. Ha gawara ime ka ndị a sị na ha bụ ndị ọgọ mmụọ nakwere okpukpe ha ná mba ndị ahụ. Ka oge na-aga, America na ebe ndị ọ na-achị, bụ́ ndị a na-ekwu na ọ bụ ụkpụrụ Ndị Kraịst na-achịkwa ha, sonyeere ndị ogbo ha bụ́ ndị Europe ma mesịa nwee ihe ịga nke ọma karịa ha n’iguzobe chọọchị mgbasa ozi ọma nke ha n’akụkụ nile nke ụwa. Ugbu a, egwú adagharịala.

“Ebe [Iso Ụzọ Kraịst elu ọnụ] hiwere isi agbanweela,” ka Andrew Walls, onye hiwere ma na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ebe A Na-amụ Banyere Iso Ụzọ

Kraịst nke Ebe Ndị Na-adịghị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-ekwu. Na 1900, pasent 80 nke ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst bụ ndị Europe ma ọ bụ ndị Ebe Ugwu America. Otú ọ dị, taa, pasent 60 nke ndị nile na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst bi n’Africa, Eshia, na Latin America. Otu akwụkwọ akụkọ e bipụtara na nso nso a na-ekwu, sị: “Chọọchị Katọlik ndị dị na Europe na-adabere n’ebe ndị ụkọchukwu si Philippines na India nọ,” ọzọkwa, “otu n’ime ndị ụkọchukwu isii na-eje ozi ugbu a na parish Katọlik ndị dị n’America si mba ọzọ bịa.” Ndị Africa na-agbasa ozi ọma na Netherlands, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Ghana, na-ewere onwe ha dị ka “ndị na-eje ozi ala ọzọ na kọntinent na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe.” Ndị na-agbasa ozi ọma sikwa Brazil na-ejezi agha ntụte n’akụkụ dịgasị iche iche nke Britain. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ụgbọ ndị ozi ala ọzọ bụ́ Ndị Kraịst echigharịala.”

Nsogbu Na-eru Ka Mmiri

Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na a chọrọ ndị ozi ala ọzọ na kọntinent Europe na nke Ebe Ugwu America bụ́ ndị na-aghọwanye ndị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe. “Na Scotland, ọ bụ ihe na-erughị pasent 10 nke Ndị Kraịst na-agachi chọọchị anya,” ka otu magazin na-ebu akụkọ na-ekwu. Ndị na-eme otú ahụ na France na Germany dị ole na ole ọbụna karị. Mgbe a gbara ha ajụjụ, “ọ bụ ihe dị ka pasent 40 nke ndị America na pasent 20 nke ndị Canada kwuru na ha na-agachi chọọchị anya,” ka akwụkwọ akụkọ ọzọ na-ekwu. N’ụzọ dị iche, e kwuru na ndị na-aga chọọchị na Philippines fọrọ nke nta ka ha ruo pasent 70, ọ dịkwa otú ahụ ná mba ndị ọzọ ka na-emepe emepe.

Nke kadị dị ịrịba ama bụ na o yiri ka ndị na-aga chọọchị n’Ebe Ndịda Ụwa hà na-agbaso ọdịnala chọọchị karịa ndị bi n’Ebe Ugwu Ụwa. Dị ka ihe atụ, mgbe a jụrụ ndị Katọlik na United States na Europe ihe bụ́ echiche ha, ha kwuru nnọọ na ha atụkwasịghịzi ikike nke ndị ụkọchukwu obi ma kwusie ike na o kwesịrị ka ndị nkịtị na-ekerekwu òkè nakwa ka ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke nwee ikike ha nhata. Ndị Katọlik nọ n’Ebe Ndịda Ụwa n’aka nke ha kwenyesiri nnọọ ike n’ọdịnala chọọchị ahụ n’okwu ndị a. Ka ọnụ ọgụgụ nke chọọchị na-anọgide na-amụba n’ebe ndịda, e nwewela ihe ga-akpata esemokwu n’ọdịnihu. Philip Jenkins, ọkà mmụta n’akụkọ ihe mere eme na okpukpe, na-ebu amụma, sị: “O yikarịrị ka na mgbe ọ na-erule afọ iri ma ọ bụ iri afọ abụọ, ọ dịghị nke ọ bụla n’akụkụ abụọ a mejupụtara Iso Ụzọ Kraịst zuru ụwa ọnụ nke ga-anabata ibe ya dị nnọọ ka ezigbo Ndị Kraịst.”

N’ihi ihe ndị a na-emenụ, Walls na-ekwu na otu ihe chọrọ nnọọ nlebara anya bụ “otú Ndị Kraịst bụ́ ndị Africa, Eshia, Latin America, Ebe Ugwu America na Europe pụrụ isi nọkọọ n’otu chọọchị, na-enwe n’ezie otu okwukwe.” Gịnị ka i chere? Chọọchị ọ̀ ga-alanarị n’ụwa nke kewasịrị ekewasị? Gịnị bụ ihe ndabere maka ịdị n’otu nke ezi Ndị Kraịst? Isiokwu na-esonụ ga-enye azịza ha ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, tinyere ihe àmà doro anya nke na-egosi na òtù Ndị Kraịst dị n’otu anọworị na-enwe ọganihu n’ụwa nile.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ebe a bụbu chọọchị bụzi ụlọ oriri na nkwari

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto AP/Nancy Palmieri