Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gaghịzi Enwe Ọdachi Ndị Ọnọdụ Ihu Igwe Na-akpata!

A Gaghịzi Enwe Ọdachi Ndị Ọnọdụ Ihu Igwe Na-akpata!

A Gaghịzi Enwe Ọdachi Ndị Ọnọdụ Ihu Igwe Na-akpata!

“NDỊ mmadụ n’oge a enweghịzi nkwanye ùgwù maka ụwa n’ihi oké ọchịchọ ha maka ndụ dị ntụsara ahụ́, inwe ọganihu na akụ̀ na ụba.” E dere ihe a n’ihe e ji fụchie akwụkwọ bụ́ 5000 Days to Save the Planet. Ihe oké ọchịchọ mmadụ kpatara na-emetụta anyị. Ma ihe a na-ekwu banyere oké okpomọkụ nke ụwa ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, otu ihe doro anya—ụmụ mmadụ na-emebi ọmarịcha mbara ala anyị. Nanị olileanya anyị nwere bụ mmezu nke nkwa Bible bụ́ na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

Chineke ga-eji usoro ihe dị nnọọ ọhụrụ dochie usoro ọchịchị rụrụ arụ nke mmadụ. Tupu i lee nke a anya dị ka echiche okpukpe na-enweghị isi, tụlee nke a: Ònye ga-ama ihe dị mbara ụwa mkpa karịa Onye Okike ya? Ọ̀ bụ na o rughịrị ya ịma ihe na-eme ụwa a? Bible na-eme ka o doo anya na o ruuru ya, na-ekwu n’Aịsaịa 45:18 na Jehova bụ “Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” Iji mezuo nzube a, Chineke pụrụ itinye aka n’ihe na-emenụ, ọ ga-emekwa otú ahụ.

Chineke ga-eme nke a site n’iweta ọchịchị ọhụrụ, ma ọ bụ alaeze, ilekọta ụwa. Mgbe Ndị Kraịst na-ekpe ihe ahụ a na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị ma na-ekwu, sị, “Ka alaeze gị bịa,” ha na-arịọ ka ọchịchị a bịa malite ịchị. (Matiu 6:9, 10) Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị Chineke, ga-egosi na ọ ghọtara usoro ndị dị mgbagwoju anya sitere n’okike. N’ihi ya, ọ ga-enwe ike imezi akụkụ ụwa ndị e metọworo ma mebie. Aịsaịa 35:1, 6 na-ekwu, sị: ‘Ala ihe na-adịghị ga-agbawa okooko ọhịa, dị ka rose. N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.’

Ruo Mgbe Chineke Ga-etinye Aka

Mgbe idei mmiri mere na 2002 gasịrị, Helmut Schmidt, onye bụbu onyeisi ala West Germany dere, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ igbochi mmiri itofe ihe mgbochi ya. Ọdachi nọgidere na-eme.” Ọ bụ eziokwu. Mgbe ọnọdụ ihu igwe kpatara ọdachi, ọ dịghị ihe ụmụ mmadụ pụrụ ime ma ọ́ bụghị nanị ịnagide ya otú ha nwere ike. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nsogbu ọdachi ndị dị otú ahụ na-akpata, ha pụrụ inwe mmetụta dị mma. Ha pụrụ ịkpali ndị mmadụ igosi ịhụnanya na obi nwanne maka ndị agbata obi ha. (Mak 12:31) Dị ka ihe atụ, idei mmiri ndị mere na Europe yiri ka hà nwere mmetụta dị otú ahụ n’ebe ụfọdụ nọ. Otu akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Ndị ọrụ afọ ofufo dị njikere ịrụ ọrụ si n’akụkụ nile nke Germany bịa ịrụ ọrụ [enyemaka]. Ọ bụ ọrụ afọ ofufo kasị ukwuu a rụtụrụla kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ.”

Ndị so ná ndị ọrụ afọ ofufo a bụ ọtụtụ Ndịàmà Jehova. Àgwà Ndị Kraịst a kpara bụ ihe atụ nke otú ndụ ga-adị n’okpuru ọchịchị Chineke nke na-abịanụ, bụ́ ebe ịhụnanya na obi nwanne—ọ bụghị oké ọchịchọ na ịchọ ọdịmma onwe onye—ga-adị.—Aịsaịa 11:9. *

Ndị Kraịst pụrụ inweta nkasi obi ná nkwa Chineke kwere ndị Izrel oge ochie, sị: “M ga-enye mmiri ozuzo ala unu na mgbe ya, mmiri ozuzo mbụ na mmiri ozuzo ikpeazụ.” (Deuterọnọmi 11:14) Nkwa ahụ ga-emezukwara ndị ga-enwe ihe ùgwù nke ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke—ụwa nke na-agaghị enwe ọdachi ndị ọnọdụ ihu igwe na-akpata.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụtakwu banyere nkwa Bible nke ọchịchị Alaeze, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Ịchịkwa Ọnọdụ Ihu Igwe N’ụzọ Na-enweghị Atụ

N’ụwa ọhụrụ Chineke, ndị mmadụ agaghị atụ egwu ịbụ ndị oké mmiri ozuzo na-etiwapụ na mberede bibiri ihe ọkụkụ ha. (2 Pita 3:13) Bible na-eme ka o doo anya na Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nwere ike zuru ezu ịchịkwa ihu igwe. Tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ.

Jenesis 7:4: “N’ihi na ọ fọdụrụ ụbọchị asaa, Mụ onwe m gaje ime ka mmiri zosa n’ụwa [iri ụbọchị anọ] ehihie na abalị.”

Ọpụpụ 14:21: “Jehova wee were ifufe Ihu anyanwụ dị ike mee ka oké osimiri ahụ jee n’azụ n’abalị ahụ nile, O wee mee oké osimiri ahụ ka ọ bụrụ ala akọrọ, e wee kewaa mmiri ahụ.”

1 Samuel 12:18: “Samuel wee kpọkuo Jehova; Jehova wee nye égbè eluigwe na mmiri ozuzo ụbọchị ahụ: ndị Izrel nile wee tụọ egwu Jehova na Samuel nke ukwuu.”

Jona 1:4: “Jehova tụbara ifufe dị ukwuu n’oké osimiri, oké ifufe dị ukwuu wee dị n’oké osimiri, e wee chee na ụgbọ ga-etiwa.”

Mak 4:39: “Mgbe ha kwuru nke ahụ, o [Jizọs, n’ịbụ onye Chineke nyere ike] biliri wee baara ifufe ahụ mba ma gwa oké osimiri ahụ, sị: “Shịị! Daa jụụ!” Ifufe ahụ wee dajụọ, ebe nile wee daa jụụ.”

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, anyị agaghị atụ egwu ọnọdụ ihu igwe ndị dị ize ndụ