Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na ndị Livaị enweghị ihe nketa n’Izrel oge ochie, olee otú Hanamel onye Livaị pụrụ isi resị nwanne nna ya onye Livaị bụ́ Jeremaịa ubi, dị ka e kwuru na Jeremaịa 32:7?

Banyere ndị Livaị, Jehova gwara Erọn, sị: “Ị gaghị eketa ihe n’ala [ndị Izrel], ọ dịghịkwa òkè ị ga-enwe n’etiti ha [ndị Izrel].” (Ọnụ Ọgụgụ 18:20) Ka o sina dị, e kenyere ndị Livaị obodo 48 na ebe ịta nri ha n’ebe dịgasị iche iche n’Ala Nkwa ahụ. Obodo Jeremaịa bụ Anatọt, bụ́ otu n’ime obodo ndị e kenyere “ụmụ Erọn, bụ́ onye nchụàjà.”—Joshua 21:13-19; Ọnụ Ọgụgụ 35:1-8; 1 Ihe E Mere 6:54, 60.

Na Levitikọs 25:32-34, anyị na-ahụ na Jehova nyere ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ ndị na-achịkwa “ike mgbapụta” nke ala ndị Livaị. O yiri ka ezinụlọ ọ bụla nke ndị Livaị hà ga-enwe ikike n’ihe metụtara inwe ihe nketa ụfọdụ a kapịrị ọnụ, iji ha eme ihe, na ire ha. N’ụzọ ezi uche dị na ya, nke ahụ ga-agụnye ire na ịgbara ala. * N’ọtụtụ ụzọ, ndị Livaị nwere ma jiri ala mee ihe n’ụzọ yiri otú ndị Izrel sitere n’ebo ndị ọzọ mere.

Eleghị anya, ihe nketa nke ala dị otú ahụ nke ndị Livaị na-esite n’otu ọgbọ agafere ọgbọ ọzọ. Otú ọ dị, a bịa n’ihe banyere “ike mgbapụta,” ọ bụ nanị n’etiti onye Livaị na onye Livaị ibe ya ka ọ ga-adị. O yikwara ka ire na ịgbapụta ala ọ̀ bụ nanị ala ndị dị n’ime obodo ka o metụtara, ebe ọ bụ na a gaghị ere “ọhịa nke ebe ịta nri nke obodo ha” n’ihi na ọ bụ “ihe onwunwe ebighị ebi ka ọ bụụrụ ha.”—Levitikọs 25:32, 34.

Ya mere, ihe àmà na-egosi na ubi ahụ Jeremaịa gbapụtara n’aka Hanamel bụ ụdị ala a pụrụ ịgbapụta agbapụta. Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị n’ime obodo. Jehova n’onwe ya gbara akaebe na “ubi” ahụ a na-ekwu okwu ya bụ nke Hanamel nakwa na Jeremaịa nwere ‘ike ịgbapụta ya.’ (Jeremaịa 32:6, 7) Jehova ji mgbapụta ala a mee ihe n’ụzọ ihe atụ iji mesikwuo nkwa ya ike na ndị Izrel ga-alọghachi inwetaghachi ala nketa ha mgbe oge ije biri n’ala ọzọ ha na Babilọn gasịrị.—Jeremaịa 32:13-15.

E nweghị ihe ọ bụla gosiri na Hanamel nwetara ala ahụ dị n’Anatọt n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ dịghị ihe na-egosi na ọ dara iwu Jehova n’ịgwa Jeremaịa ka ọ bịa zụrụ ubi a dị n’Anatọt ma ọ bụkwanụ na Jeremaịa ji ike mgbapụta ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịzụ ubi ahụ.—Jeremaịa 32:8-15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Na narị afọ mbụ O.A., Banabas onye Livaị rere ala ya ma nye ihe o retara na ya n’onyinye iji nyere ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ ná mkpa na Jeruselem aka. Ọ pụrụ ịbụ na ala ahụ dị na Palestaịn ma ọ bụ na Saịprọs. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nanị ala ili ozu Banabas nwetara n’ógbè Jeruselem.—Ọrụ 4:34-37.