Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Ọganihu

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Ọganihu

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Ọganihu

OZI Jizọs Kraịst malitere n’ụzọ nwere mmetụta siri ike n’ahụ́ ndị mmadụ na narị afọ mbụ. Ozi ya na-enye ume ọhụrụ, na-akụzi ihe ma na-akpali akpali n’ụzọ juru ndị mmadụ anya. Ihe ndị o kwuru metụrụ ọtụtụ ndị nụrụ ya n’ahụ́ n’ụzọ dị ukwuu.—Matiu 7:28, 29.

Jizọs jụrụ itinye aka n’usoro okpukpe na ọchịchị na-emegbu ndị nkịtị nke oge ya n’atụghị egwu, kama nke ahụ, o mere ka ọ dịrị ndị nkịtị mfe ịbịakwute ya. (Matiu 11:25-30) O kwupụtara hoo haa mmetụta juru ebe nile nke ndị ajọ mmụọ na-enwe n’ụwa ma gosipụta ike karịrị nke ha nke Chineke nyere ya. (Matiu 4:2-11, 24; Jọn 14:30) Jizọs ji nkà gosipụta njikọ chiri anya dị n’etiti ahụhụ na mmehie, o jikwa ịhụnanya rụtụ aka n’ebe Alaeze Chineke dị dị ka ihe ga-eweta ahụ́ efe na-adịgide adịgide. (Mak 2:1-12; Luk 11:2, 17-23) N’ikpeazụ, o wepụrụ ọchịchịrị kpuchiworo ụdị onye Nna ya bụ n’ezie ruo ogologo oge, na-eme ka aha Chineke pụta ìhè nye ndị nile nwere mmasị iso Ya nwee mmekọrịta chiri anya.—Jọn 17:6, 26.

Otú ọ dị, ọ bụghị ihe ijuanya na n’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ nke okpukpe na ọchịchị, ndị na-eso ụzọ Jizọs gbasara ozi ya dị ike ngwa ngwa. Nanị n’ime ihe dị ka afọ 30, e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst na-enwe ọganihu n’Africa, Eshia, nakwa na Europe. (Ndị Kọlọsi 1:23) Eziokwu ndị dị mfe Jizọs kụziri mere ka ndị dị umeala n’obi, ndị obi ha zikwara ezi gburugburu Alaeze Ukwu Rom nweta ihe ọmụma.—Ndị Efesọs 1:17, 18.

Otú ọ dị, olee otú ndị nile ahụ na-eso ụzọ ọhụrụ si n’ọnọdụ akụ̀ na ụba, ọdịbendị, asụsụ, na okpukpe dịgasị iche iche ga-esi bịakọta ọnụ ‘n’otu okwukwe’ dị n’otu, dị ka Pọl onyeozi kpọrọ ya? (Ndị Efesọs 4:5) Gịnị ga-eme ka ha nọgide “na-ekwu otu ihe” ka ha wee ghara inwe nkewa? (1 Ndị Kọrint 1:10) N’ihi adịghị n’otu dị n’etiti ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst taa, ọ dị mma anyị inyocha ihe Jizọs n’onwe ya kụziri.

Ihe Ndabere Maka Ịdị n’Otu Ndị Kraịst

Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe n’ihu Pọntịọs Paịlet, ọ kọwara ihe ndabere maka ịdị n’otu nke Ndị Kraịst. O kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.” (Jọn 18:37) N’ihi ya, ịnakwere ozizi Jizọs tinyere akụkụ ndị ọzọ nke Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, na-eme nnọọ ka ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst dị n’otu.—1 Ndị Kọrint 4:6; 2 Timoti 3:16, 17.

Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-enwe ajụjụ ndị sitere n’ezi obi ma ọ bụ nghọtahie n’etiti onwe ha mgbe ụfọdụ. Gịnị ga-enyere ha aka? Jizọs kọwara, sị: “Mgbe ihe ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, ọ ga-eduru unu gaa n’eziokwu nile, n’ihi na ọ gaghị ekwu okwu site ná mkpali nke aka ya, kama ihe ndị ọ na-anụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akpọsakwara unu ihe ndị na-abịanụ.” (Jọn 16:12, 13) N’ụzọ dị otú a, mmụọ nsọ Chineke ga-enyere ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ịghọta eziokwu ahụ ka Chineke na-ekpughe ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. Ọzọkwa, mmụọ ahụ ga-amịpụta mkpụrụ, ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ na udo, bụ́ nke n’aka nke ya, ga-akwalite ịdị n’otu n’etiti ha.—Ọrụ 15:28; Ndị Galeshia 5:22, 23.

Jizọs enyeghị ohere maka nkewa ma ọ bụ ịrọ òtù n’etiti ndị na-eso ụzọ ya; o nyeghịkwa ha ikike ịkọwagharị eziokwu Bible iji kwekọọ n’ọdịbendị ma ọ bụ omenala okpukpe nke ndị ha ga-ezute. Kama nke ahụ, n’abalị ikpeazụ ha na ya nọrọ, o kpesiri ekpere ike, sị: “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị banyere ndị a nanị, kamakwa banyere ndị na-etinye okwukwe na mụ site n’okwu ha; ka ha nile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka ha na anyị wee dị n’otu, ka ụwa wee kwere na i zitere m.” (Jọn 17:20, 21) Mgbe ahụ, ọ bụ ezi ịdị n’otu n’ime mmụọ na n’eziokwu ka a ga-eji amata ndị na-eso ụzọ Kraịst site ná mmalite ruo n’oge anyị. (Jọn 4:23, 24) Otu o sina dị, chọọchị nke taa, adịghị n’otu, kama nke ahụ, ha kewasịrị ekewasị. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Ihe Mere Chọọchị Ji Kewasịa Ekewasịa

Ihe mere nnọọ e ji nwee nkwenkwe na omume dịgasị nnọọ iche n’etiti ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst taa bụ na ha agbasoghị ozizi Jizọs. Otu onye edemede kwuru, sị: “Dị ka ọ dị n’oge gara aga, Ndị Kraịst ọhụrụ taa na-anakwere ihe ndị sitere na Bible bụ́ ndị gboro mkpa ha—ma na-eleghara ihe ọ bụla na-ekwekọghị n’ọdịnala okpukpe nke ha anya.” Nke a bụ nnọọ ihe Jizọs na ndịozi ya buru n’amụma ga-emenụ.

Dị ka ihe atụ, site n’ike mmụọ nsọ, Pọl onyeozi degaara onye nlekọta ibe ya bụ́ Timoti akwụkwọ ozi, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.” À ga-eduhie Ndị Kraịst nile? Ee e. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ma, gị onwe gị, nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jee ozi gị n’ụzọ zuru ezu.” (2 Timoti 4:3-5; Luk 21:8; Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:1-3) Timoti na Ndị Kraịst ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi gbasoro ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ.

Ezi Ndị Kraịst Ka Dị n’Otu

Dị ka Timoti, ezi Ndị Kraịst na-enwe uche ziri ezi site n’ịjụ echiche mmadụ na site n’ime ka nkwenkwe ha dabere nanị n’Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Jọn 4:1) N’iṅomi Ndị Kraịst narị afọ mbụ, Ndịàmà Jehova na-eje ozi ha n’ụzọ zuru ezu n’ihe karịrị ala 230, na-ewegara ndị mmadụ n’ebe nile ozi mbụ ahụ Jizọs kpọsara, bụ́ ozi ọma nke Alaeze ahụ. Tụlee ụzọ anọ dị mkpa ha si jiri ịdị n’otu na-eṅomi Jizọs ma na-agbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst n’agbanyeghị ebe ha bi.

Nkwenkwe ha dabeere n’Okwu Chineke. (Jọn 17:17) Otu ụkọchukwu parish dị na Belgium dere banyere ha, sị: “Otu ihe anyị pụrụ ịmụta site n’aka ha [Ndịàmà Jehova] bụ ịdị njikere ha n’ige Okwu Chineke ntị na obi ike ha n’ịgba àmà banyere ya.”

Ha na-elegara Alaeze Chineke anya dị ka ihe ga-edozi nsogbu ndị zuru ụwa ọnụ. (Luk 8:1) Na Barranquilla, Colombia, otu Onyeàmà gwara Antonio, bụ́ onye na-akwadosi otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ike okwu. Onyeàmà ahụ adụnyeghịrị ya úkwù, ọ kwadoghịkwa echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ. Kama nke ahụ, o kwere nkwa ịmụrụ Antonio na ụmụnne ya ndị nwanyị Bible n’efu. N’oge na-adịghị anya, Antonio ghọtara na ọ bụ Alaeze Chineke n’ezie bụ nanị olileanya dịịrị ndị ogbenye bi na Colombia na n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.

Ha na-asọpụrụ aha Chineke. (Matiu 6:9) Mgbe mbụ Ndịàmà Jehova zutere Maria, bụ́ onye Katọlik nwere ezi obi bi n’Australia, o nyere Ndịàmà ahụ ohere igosi ya aha Chineke n’ime Bible. Olee otú o si meghachi omume? “Oge mbụ m hụrụ aha Chineke n’ime Bible, ebere m ákwá. Ịmara na m pụrụ n’ezie ịmata na iji aha aka Chineke na-eme ihe, kpaliri nnọọ mmasị m.” Maria nọgidere na-amụ Bible, na nke mbụ ya kwa ná ndụ ya, ọ matara ụdị onye Jehova bụ ma nwee ike iso ya nwee mmekọrịta na-adịgide adịgide.

Ha bụ ndị ịhụnanya mere ka ha dị n’otu. (Jọn 13:34, 35) Otu uche akwụkwọ akụkọ dị na The Ladysmith-Chemainus Chronicle, Canada, kwuru, sị: “Ma ì nwere nkwenkwe okpukpe ma ọ bụ na i nweghị, ị ga-eweliri Ndịàmà Jehova 4,500 aka elu, bụ́ ndị rụrụ ọrụ ehihie na abalị otu izu na ọkara gara aga iji wuo Ụlọ Mgbakọ dị square mita 2,300 na Cassidy . . . Iji ihu ọchị mee nke a n’arụghị ụka, n’enweghị nghọtahie nakwa n’achọghị otuto onwe onye bụ akara nke ezi Iso Ụzọ Kraịst.”

Ya mere, tụgharịa uche n’ihe àmà ndị ahụ. Ka ndị ọkà mmụta okpukpe nke Krisendọm, ndị ozi ala ọzọ, na ndị na-aga chọọchị nọgidere na-agbaso nsogbu ndị na-ebilite na chọọchị ha mgba, ezi Iso Ụzọ Kraịst na-enwe ọganihu gburugburu ụwa. N’ezie, ezi Ndị Kraịst na-eje ozi e kenyere ha nke ime nkwusa na ịkụzi Okwu Chineke. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ọ bụrụ na i so ná “ndị na-eze ume ndị na-asụkwa ude” n’ihi ihe arụ na-eme ugbu a ma bụrụ onye adịghị n’otu e nwere n’etiti okpukpe dị iche iche nke Krisendọm na-enye nsogbu, anyị na-akpọ gị òkù isonyere Ndịàmà Jehova n’ofufe Ndị Kraịst dị n’otu nke onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Ezikiel 9:4; Aịsaịa 2:2-4.