Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ohu Chineke Dị Ka Osisi—N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa?

Ndị Ohu Chineke Dị Ka Osisi—N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa?

Ndị Ohu Chineke Dị Ka Osisi—N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa?

N’IKWU banyere onye na-enwe obi ụtọ n’ụkpụrụ Bible ma na-eji ya eme ihe ná ndụ ya, ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:1-3) N’ihi gịnị ka ntụnyere a ji daba adaba?

Osisi pụrụ ịdị nnọọ ndụ ruo ogologo oge. Dị ka ihe atụ, e kwuru na ụfọdụ osisi oliv ndị dị n’ógbè Mediterenian anọwo site n’ihe dị ka otu puku afọ ruo puku afọ abụọ. N’otu aka ahụ, osisi baobab ndị dị n’ebe etiti Africa na-adị ndụ ruo ogologo oge, e kwetakwara na otu osisi bristlecone pine nke dị na California dị ihe dị ka afọ 4,600. N’oké ọhịa, osisi ndị toro eto na-abakarịrị gburugburu ha uru. Dị ka ihe atụ, osisi ndị toro eto na-abụrụ osisi ndị ka na-epupụta epupụta ndò, mkpá akwụkwọ ndị na-esi n’osisi ndị ahụ ada na-eme ka ala dị n’okpuru ha na-eme ihe.

A na-ahụkarị osisi ndị kachasị ogologo n’ụwa ka ha na-etokọ ọnụ n’oké ọhịa, bụ́ ebe osisi ndị ahụ na-akwado ibe ha. Ebe ọ bụ na mkpọrọgwụ ha na-atụhịkọta, ọtụtụ osisi nọkọtara ọnụ pụrụ ịnagide oké ifufe nke ọma karịa nke nọ nanị ya n’ala ahịhịa. Inwe nnukwute mkpọrọgwụ na-enyekwara osisi aka inweta mmiri na ihe ndị na-edozi ahụ́ ga-ezuru ya site n’ala. N’ọnọdụ ụfọdụ, mkpọrọgwụ ndị ahụ pụrụ ịbami n’ime ala ọbụna karịa ogo nke osisi ahụ, ma ọ bụ mkpọrọgwụ ndị ahụ pụrụ ịgbasapụ nnọọ agbasapụ karịa alaka osisi ahụ.

Ọ pụrụ ịbụ na Pọl onyeozi zoro aka n’osisi mgbe ọ na-akọwa na Ndị Kraịst kwesịrị ‘ịnọgide na-eje ije n’ịdị n’otu nke ha na Kraịst, bụrụ ndị gbanyere mkpọrọgwụ na ndị a na-ewuli elu n’ime ya na ndị a na-eme ka ha gbasie ike n’okwukwe.’ (Ndị Kọlọsi 2:6, 7) N’ezie, Ndị Kraịst pụrụ ịkwụsị ike nanị ma ọ bụrụ na ha agbanyesie mkpọrọgwụ ike na Kraịst.—1 Pita 2:21.

N’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka a pụrụ iji ndị ohu Chineke tụnyere osisi? Dị nnọọ ka osisi ndị dị n’ọdọ osisi si enweta nkwado nke osisi ndị nọ ha nso, otú ahụ ka ndị nile nọ ọgbakọ Ndị Kraịst nso si enweta nkwado nke ndị kwere ekwe ibe ha. (Ndị Galeshia 6:2) Ndị Kraịst tozuru okè, bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị nwere mkpọrọgwụ ime mmụọ gbasapụrụ agbasapụ, na-enyere ndị kwere ekwe ọhụrụ aka ịkwụsi ike n’okwukwe, ọbụna mgbe ha na-eche mmegide yiri oké ifufe ihu. (Ndị Rom 1:11, 12) Ndị Kraịst ọhụrụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’okpuru “ndò” nchebe nke ndị ohu Chineke ndị ka nwee ahụmahụ. (Ndị Rom 15:1) Ndị òtù nile nke ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ na-eritekwa uru site ná nri ime mmụọ na-ewusi ike na-esite n’aka “osisi oak nke ezi omume,” bụ́ ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ.—Aịsaịa 61:3.

Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ na ndị ohu Chineke nile nwere atụmanya nke inweta mmezu nke nkwa ahụ dị n’Aịsaịa 65:22, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị.”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

Godo-Foto