Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ohu Ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi” Agafee Ule!

“Ohu Ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi” Agafee Ule!

“Ohu Ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi” Agafee Ule!

“Oge a kara aka eruwo maka ikpe ahụ ịmalite n’ụlọ Chineke.” —1 Pita 4:17.

1. Gịnị ka Jizọs hụrụ mgbe o nyochara “ohu” ahụ?

NA Pentikọst 33 O.A., Jizọs họpụtara otu “ohu” inye “ezinụlọ” ya nri n’oge kwesịrị ekwesị. Na 1914, e chiri Jizọs Eze, n’oge na-adịghịkwa anya nke ahụ gasịrị, oge ruru maka inyocha “ohu” ahụ. N’akụkụ ka ukwuu, ọ chọpụtara na “ohu” ahụ gosipụtara na ya ‘kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche.’ N’ihi ya, o mere ya “onye na-elekọta ihe nile o nwere.” (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, e nwekwara ajọ ohu, bụ́ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi na onye na-enweghị uche.

“Ajọ Ohu Ahụ”

2, 3. Ebee ka “ajọ ohu ahụ” sitere, oleekwa otú o si malite?

2 Jizọs kwuru banyere otu ajọ ohu ozugbo o kwusịrị banyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na e nwee ka ajọ ohu ahụ si kwuo n’obi ya, sị, ‘Nna m ukwu na-egbu oge,’ wee malite iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị aṅụrụma a ma ama na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya na n’awa ọ na-amaghị, ọ ga-enyekwa ya oké ahụhụ ma nye ya òkè ya n’ebe ndị ihu abụọ nọ. N’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere ezé ya ga-adị.” (Matiu 24:48-51) Okwu ahụ bụ́ “ajọ ohu ahụ” na-adọrọ uche anyị gaa n’okwu Jizọs bu ụzọ kwuo banyere ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. Ee, “ajọ ohu” ahụ sitere n’ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi. * N’ụzọ dị aṅaa?

3 Tupu 1914, ọtụtụ ndị so n’òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya siri ike nke izute Nwoke ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ n’eluigwe n’afọ ahụ, ma olileanya ha emezughị. N’ihi nke a na ihe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị nwere ndakpọ olileanya, mmadụ ole na ole wekwara iwe. Ụfọdụ n’ime ha malitere iji ọnụ ‘na-eti’ ndị bụbu ụmụnna ha ihe ma soro “ndị aṅụrụma a ma ama,” bụ́ òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, na-emekọ ihe.—Aịsaịa 28:1-3; 32:6.

4. Olee otú Jizọs si mesoo “ajọ ohu” ahụ na ndị nile gosipụtara otu mmụọ ahụ ihe?

4 A bịara mara ndị a bụbu Ndị Kraịst dị ka “ajọ ohu” ahụ, Jizọs nyekwara ha “oké” ntaramahụhụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ jụrụ ha, olileanya eluigwe ha funahụkwara ha. Otú ọ dị, e bibighị ha ozugbo. Ha aghaghị ibu ụzọ die oge ịkwa ákwá na ịta ikikere ezé “n’ọchịchịrị dị n’èzí” nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Matiu 8:12) Kemgbe oge ndị mbụ ahụ, mmadụ ole na ole n’etiti ndị e tere mmanụ egosipụtawo mmụọ obi ọjọọ dị otú ahụ, na-esonyere “ajọ ohu” ahụ. Ụfọdụ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ eṅomiwo ekwesịghị ntụkwasị obi ha. (Jọn 10:16) A ga-atụba ndị iro nile dị otú ahụ nke Kraịst n’otu ‘ọchịchịrị ime mmụọ ahụ nke dị n’èzí.’

5. Olee otú ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche si meghachi omume, bụ́ nke dị iche ná mmeghachi omume nke “ajọ ohu” ahụ?

5 Ka o sina dị, ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche nwetara otu ule ahụ dị ka “ajọ ohu ahụ.” Otú ọ dị, kama iwewe iwe, ha bụ ndị a gbaziri. (2 Ndị Kọrint 13:11) E wusiri ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova na ụmụnna ha nọ ike. N’ihi ya, ha anọwo na-abụ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu” “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a na-agba aghara.—1 Timoti 3:15; 2 Timoti 3:1.

Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Ndị Nwere Uche na Ndị Nzuzu

6. (a) Olee otú Jizọs si mee ihe atụ nke inwe uche nke òtù ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Tupu 1914, ozi dị aṅaa ka Ndị Kraịst e tere mmanụ kpọsara?

6 Mgbe o kwusịrị banyere “ajọ ohu ahụ,” Jizọs tụrụ ilu abụọ iji gosi ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-eji gosipụta na ha kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee uche ebe ndị ọzọ na-agaghị eme otú ahụ. * Iji mee ihe atụ nke inwe uche, o kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe ga-adị ka ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke bụ́ ndị buuru oriọna ha pụọ izute nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ. Mmadụ ise n’ime ha dị nzuzu, ma ise nwere uche. N’ihi na ndị nzuzu ahụ buuru oriọna ha ma ha ewereghị mmanụ ọ bụla, ma ndị ahụ nwere uche weere mmanụ n’ihe ha ji agbanye mmanụ tinyere oriọna ha.” (Matiu 25:1-4) Ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke na-echetara anyị Ndị Kraịst e tere mmanụ tupu 1914. Ha agbakọwo na oge nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-abịa eruwela. N’ihi ya, ha ‘pụrụ’ izute ya, na-ekwusa n’atụghị egwu na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ na 1914.—Luk 21:24.

7. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ ji ‘malite ihi ụra’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya?

7 Ha gbakọtara ya. Oge a kara aka nke ndị mba ọzọ gwụrụ n’ezie na 1914, Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst Jizọs malitekwara. Ma nke ahụ bụ n’eluigwe a na-adịghị ahụ anya. N’ụwa, ihe a kpọrọ mmadụ malitere ịta “ahụhụ” e buru amụma ya. (Mkpughe 12:10, 12) Oge ule malitere. N’ịbụ ndị na-aghọtachaghị ihe na-emenụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ chere na “nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-egbu oge.” N’ịbụ ndị nwere mgbagwoju anya na ndị ụwa na-emeso mmeso ọjọọ, ha belatara aka, ọ fọkwara nke nta ka ha kwụsị kpam kpam ịrụ ọrụ nkwusa ihu ọha a haziri ahazi. Dị ka ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke ndị dị n’ilu ahụ, n’ụzọ ime mmụọ, ha “hulatara isi wee malite ihi ụra,” ọbụna dị ka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi sị na ha bụ Ndị Kraịst mere mgbe ndịozi Jizọs nwụsịrị.—Matiu 25:5; Mkpughe 11:7, 8; 12:17.

8. Gịnị dujere ná mkpu bụ́: “Lee nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ!” gịnịkwa ka oge ya ruru ka Ndị Kraịst e tere mmanụ mee?

8 Mgbe ahụ na 1919, ihe a na-atụghị anya ya mere. Anyị na-agụ, sị: “Kpọmkwem n’etiti abalị mkpu dara, ‘Lee nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ! Pụtanụ ka unu zute ya.’ Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ ahụ nile na-amaghị nwoke biliri wee dozie oriọna ha.” (Matiu 25:6, 7) Kpọmkwem mgbe o yiri ka olileanya adịghịzi, a kpọrọ òkù ka a malite ọrụ! Na 1918, Jizọs, bụ́ “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” abịawo n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova inyocha na ime ka ọgbakọ Chineke dị ọcha. (Malakaị 3:1) Ugbu a, ọ dị Ndị Kraịst e tere mmanụ mkpa ịpụ izute ya n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ ahụ. Oge eruwo ka ha “nwuo.”—Aịsaịa 60:1; Ndị Filipaị 2:14, 15.

9, 10. Na 1919, n’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst ji ‘nwee uche,’ ụfọdụ adịkwa ‘nzuzu’?

9 Cherekwa o! N’ilu ahụ, ụfọdụ n’ime ụmụ agbọghọ ahụ nwere nsogbu. Jizọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nzuzu ahụ gwara ndị ahụ nwere uche, sị, ‘Nyetụnụ anyị mmanụ unu, n’ihi na oriọna anyị agawala ịnyụ.’” (Matiu 25:8) Ọ bụrụ na mmanụ adịghị, oriọna ndị ahụ agaghị enwu ọkụ. Mmanụ oriọna si otú a na-echetara anyị Okwu eziokwu nke Chineke na mmụọ nsọ ya, bụ́ ihe ndị na-enye ndị na-efe ezi ofufe ike ịghọ ndị na-enye ìhè. (Abụ Ọma 119:130; Daniel 5:14) Tupu 1919, Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere uche ejiwo ịdị uchu chọọ ịghọta uche Chineke maka ha, n’agbanyeghị ọnọdụ adịghị ike ha dịruru nwa oge. N’ihi ya, mgbe a kpọrọ òkù ka e nye ìhè, ha dị njikere.—2 Timoti 4:2; Ndị Hibru 10:24, 25.

10 Otú ọ dị, ụfọdụ ndị e tere mmanụ adịghị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà ma ọ bụ ịgbasi mbọ ike—ọ bụ ezie na ha chọsiri ike ịnọnyere Nwoke ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ. Ya mere, mgbe oge ruru ka ha rụsie ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ, ha adịghị njikere. (Matiu 24:14) Ọbụna ha gbalịrị ịkụda ndị ibe ha na-anụ ọkụ n’obi mmụọ, na-arịọ ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka ha nyetụ ha mmanụ. N’ilu Jizọs, olee otú ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke nwere uche si zaghachi? Ha sịrị: “Ma eleghị anya ọ gaghị ezuchara anyị na unu. Kama nke ahụ, gakwurunụ ndị na-ere ya zụrụ nke unu.” (Matiu 25:9) N’ụzọ yiri nke ahụ, na 1919, Ndị Kraịst e tere mmanụ jụrụ ime ihe ọ bụla nke ga-ebelata ikike ha nwere inye ìhè. N’ihi ya, ha gafere nnyocha.

11. Gịnị mere ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke dị nzuzu?

11 Jizọs na-ekwubi, sị: “Ka [ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ] na-apụ ịga zụrụ ya, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ bịarutere, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ ndị dị njikere sooro ya banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ; e wee mechie ụzọ. N’ikpeazụ ndị fọdụrụ n’ime ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bịakwara, na-asị, ‘Nna anyị ukwu, nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!’ Ná nzaghachi ọ sịrị, ‘Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m unu.’” (Matiu 25:10-12) Ee, ụfọdụ adịghị njikere maka mbịarute nke Nwoke ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ. N’ụzọ dị otú a, ha dara nnyocha ma tụfuo ohere nke ịga ememe agbamakwụkwọ ahụ n’eluigwe. Lee ihe dị mwute nke ahụ bụ!

Ilu Talent Ahụ

12. (a) Gịnị ka Jizọs ji mee ihe atụ nke ikwesị ntụkwasị obi? (b) Ònye bụ nwoke ahụ nke ‘jere mba ọzọ’?

12 Mgbe o mesịrị ihe atụ nke inwe uche, Jizọs gara n’ihu ime ihe atụ nke ikwesị ntụkwasị obi. O kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ ka mgbe nwoke, nke na-achọ ije mba ọzọ, kpọkọtara ndị ohu ya ma nyefee ha ihe ndị o nwere n’aka. O nyere otu onye talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu, onye ọ bụla dị ka ikike ya si dị, o wee jee mba ọzọ.” (Matiu 25:14, 15) Nwoke ahụ dị n’ilu ahụ bụ Jizọs n’onwe ya, bụ́ onye ‘jere mba ọzọ’ mgbe ọ rịgoro n’eluigwe n’afọ 33 O.A. Ma tupu ya arịgoo, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi “ihe ndị o nwere.” N’ụzọ dị aṅaa?

13. Olee otú Jizọs si kwadebe nnukwu ubi a ga-arụ ọrụ na ya ma nye “ndị ohu” ya ikike ịzụ ahịa?

13 N’oge ozi elu ala ya, Jizọs malitere ịkwadebe nnukwu ubi a ga-arụ ọrụ na ya site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ala Izrel dum. (Matiu 9:35-38) Tupu ya ‘ejee mba ọzọ,’ o nyere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ubi ahụ, na-asị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:18-20) Jizọs ji okwu ndị a nye “ndị ohu” ya ikike ịzụ ahịa ruo mgbe ọ ga-alọghachi, “onye ọ bụla dị ka ikike ya si dị.”

14. Gịnị mere na a dịghị atụ anya ka mmadụ nile na-azụ ahịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha nhata?

14 Okwu ahụ na-egosi na Ndị Kraịst nile na narị afọ mbụ enweghị otu ọnọdụ ma ọ bụ ohere ha nhata. Ụfọdụ, dị ka Pọl na Timoti, nwere ohere ikere òkè zuru ezu dị ka o kwere mee n’ọrụ nkwusa na nke izi ihe. Ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ nke ndị ọzọ kpaara nnọọ nnwere onwe ha ime ihe ókè. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ ndị ohu, ndị ọzọkwa na-arịa ọrịa, mee agadi, ma ọ bụ nwee ibu ọrụ ezinụlọ. N’ezie, e nwere ihe ùgwù ụfọdụ nke ọgbakọ bụ́ ndị na-adịghịrị ndị nile na-eso ụzọ. Ndị inyom e tere mmanụ na ụfọdụ ndị ikom e tere mmanụ ezighị ihe n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:34; 1 Timoti 3:1; Jems 3:1) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ha, e kenyere ndị nile e tere mmanụ na-eso ụzọ Kraịst—ndị ikom na ndị inyom—ọrụ nke ịzụ ahịa, iji ohere na ọnọdụ ha na-eme ihe n’ụzọ bara uru n’ozi Ndị Kraịst. Ndị ogbo ha nke oge a na-eme otu ihe ahụ.

Oge Nnyocha Amalite!

15, 16. (a) Olee mgbe oge ruru maka ime mpịazi? (b) Ohere ọhụrụ ndị dị aṅaa nke ‘ịzụ ahịa’ ka e nyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi?

15 Ilu ahụ gara n’ihu, na-asị: “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha ewee mee mpịazi.” (Matiu 25:19) Na 1914—n’ezie ogologo oge ka afọ 33 O.A. gasịrị—Kraịst Jizọs malitere ọnụnọ ya dị ka eze. Mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, na 1918, ọ bịara n’ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke ma mezuo okwu Pita bụ́: “Oge a kara aka eruwo maka ikpe ahụ ịmalite n’ụlọ Chineke.” (1 Pita 4:17; Malakaị 3:1) Oge ruru maka ime mpịazi.

16 Gịnị ka ndị ohu ahụ, ụmụnna Jizọs e tere mmanụ, ji “talent” nke Eze ahụ mee? Site n’afọ 33 O.A. gaa n’ihu, gụnyere afọ ndị bu 1914 ụzọ, ọtụtụ n’ime ha anọwo na-arụsi ọrụ ike ‘n’azụmahịa’ Jizọs. (Matiu 25:16) Ọbụna n’oge Agha Ụwa Mbụ, ha gosiri ọchịchọ siri ike ijere Nna ha Ukwu ozi. Ugbu a, o kwesịrị ekwesị inye ndị kwesịrị ntụkwasị obi ohere ọhụrụ ‘ịzụ ahịa.’ Oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a eruwo. A ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile. A ghaghị iwe “ihe ubi nke ụwa.” (Mkpughe 14:6, 7, 14-16) A ghaghị ịchọta ndị ikpeazụ so n’òtù ọka wit ahụ, chịkọtakwa “oké ìgwè mmadụ” nke atụrụ ọzọ ahụ.—Mkpughe 7:9; Matiu 13:24-30.

17. Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi si ‘banye n’ọṅụ nke nna ha ukwu’?

17 Oge owuwe ihe ubi bụ oge ọṅụ. (Abụ Ọma 126:6) Mgbe ahụ, o kwesịrị ekwesị na mgbe Jizọs nyekwuru ụmụnna ya e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ọrụ na 1919, o kwuru, sị: “I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Banye n’ọṅụ nke nna gị ukwu.” (Matiu 25:21, 23) Ọzọkwa, ọṅụ nke Nna Ukwu ahụ dị ka Eze e chiri ọhụrụ nke Alaeze Chineke karịrị ihe anyị pụrụ ichetụ n’echiche. (Abụ Ọma 45:1, 2, 6, 7) Òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi so nwee ọṅụ ahụ site n’ịnọchi anya Eze ahụ na ịmụba ihe ndị o nwere n’ụwa. (2 Ndị Kọrint 5:20) A na-ahụ ọṅụ ha n’okwu amụma nke Aịsaịa 61:10: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m; n’ihi na Ọ chịrịwo uwe nzọpụta yikwasị m.”

18. Gịnị mere ụfọdụ agafeghị nnyocha, gịnịkwa si na ya pụta?

18 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị agafeghị nnyocha. Anyị na-agụ, sị: “Onye nke ahụ nataworo otu talent pụtara wee sị, ‘Nna m ukwu, amaara m gị dị ka onye aka ike, nke na-aghọrọ ihe n’ebe ọ na-akụghị ma na-ekpokọta n’ebe ọ na-afụchaghị. Ya mere atụrụ m egwu, m wee pụọ zoo talent gị n’ala. Werekwa ihe gị.’” (Matiu 25:24, 25) N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ esoghị “zụọ ahịa” ahụ. Tupu 1914, ha ejighị ịnụ ọkụ n’obi soro ndị ọzọ kerịta olileanya ha, ha achọghịkwa ịmalite na 1919. Olee otú Jizọs si meghachi omume ná mkparị ha? Ọ napụrụ ha ihe ùgwù ha nile. ‘A tụpụrụ ha n’ọchịchịrị dị n’èzí bụ́ ebe ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’—Matiu 25:28, 30.

Nnyocha ahụ Ka Na-aga n’Ihu

19. N’ụzọ dị aṅaa ka usoro nnyocha ahụ si na-aga n’ihu, gịnịkwa ka Ndị Kraịst nile e tere mmanụ kpebisiri ike ime?

19 N’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị ga-aghọ ndị ohu e tere mmanụ nke Kraịst n’oge ọgwụgwụ ejewebereghị Jehova ozi mgbe Jizọs malitere ime nnyocha na 1918. Nnyocha ahụ ọ̀ kwara ha? Ọ dịghị ma ọlị. Usoro nnyocha ahụ malitere n’agbata 1918 na 1919 bụ́ mgbe ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche dị ka otu òtù, gafere ule ahụ. A na-anọgide na-enyocha Ndị Kraịst e tere mmanụ n’otu n’otu ruo mgbe a ga-akasị ha akara. (Mkpughe 7:1-3) N’ịghọta nke a, ụmụnna Kraịst e tere mmanụ kpebisiri ike ịnọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi ‘na-azụ ahịa.’ Ha kpebisiri ike inwe uche, nọgide na-enwe mmanụ buru ibu ka ìhè ha wee na-enwusi ike. Ha maara na mgbe onye ọ bụla n’ime ha nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, Jizọs ga-anabata ya n’ebe obibi eluigwe.—Matiu 24:13; Jọn 14:2-4; 1 Ndị Kọrint 15:50, 51.

20. (a) Gịnị ka atụrụ ọzọ ahụ taa kpebisiri ike ime? (b) Gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ maara?

20 Oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ eṅomiwo ụmụnna ha e tere mmanụ. Ha maara na ihe ọmụma ha nwere banyere nzube Chineke na-eweta ibu ọrụ dị ukwuu. (Ezikiel 3:17-21) N’ihi ya, site n’enyemaka nke Okwu na mmụọ nsọ Jehova, ha onwe ha kwa nọgidere na-enwe mmanụ buru ibu site n’ịmụ ihe na ịga nzukọ. Ha na-ekwekwa ka ìhè ha na-enwu, na-ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa na nke izi ihe, sikwa otú ahụ soro ụmụnna ha e tere mmanụ ‘na-azụ ahịa.’ Otú ọ dị, Ndị Kraịst e tere mmanụ maara nke ọma na ọ bụ ha ka e nyere talent ndị ahụ. Ha aghaghị ime mpịazi otú ha si lekọta ihe ndị Onyenwe ha nwere n’ụwa. Ọ bụ ezie na ha dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ, ha agaghị enyefe oké ìgwè mmadụ ahụ ibu ọrụ ha. N’iburu nke a n’uche, ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche nọgidere na-edu ndú n’ilekọta azụmahịa nke Eze ahụ, na-enwe ekele maka nkwado nke ndị raara onwe ha nye so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. Ndị a ghọtara ibu ọrụ nke ụmụnna ha e tere mmanụ ma na-agụ ya dị ka ihe ùgwù ịrụ ọrụ n’okpuru nlekọta ha.

21. Agbamume dị aṅaa metụtara Ndị Kraịst nile site n’oge dị tupu 1919 ruo n’oge anyị?

21 Ya mere, ọ bụ ezie na ilu abụọ a mere ka a ghọtakwuo ihe ndị mere na 1919 ma ọ bụ na gburugburu oge ahụ, ụkpụrụ dị na ha metụtara ezi Ndị Kraịst nile n’ụbọchị ikpeazụ a dum. N’ụzọ dị otú a, ọ bụ ezie na ná mbụ agbamume Jizọs nyere mgbe ọ tụsịrị ilu nke ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke metụtara Ndị Kraịst e tere mmanụ tupu 1919, ụkpụrụ dị na ya ka metụtara Onye Kraịst ọ bụla. N’ihi ya, ka anyị nile ṅaa ntị n’okwu Jizọs bụ́: “Ya mere nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ awa ọ ga-abụ.”—Matiu 25:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 N’ụzọ yiri nke a, mgbe ọnwụ ndịozi gasịrị, “nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri” si n’etiti ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ pụta.—Ọrụ 20:29, 30.

^ par. 6 Maka ntụle ọzọ nke ilu Jizọs, lee akwụkwọ bụ́ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, isi nke 5 na nke 6.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee mgbe Jizọs nyochara ụmụazụ ya, gịnịkwa ka ọ chọpụtara?

• N’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ji zụlite mmụọ nke “ajọ ohu ahụ”?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere uche n’ụzọ ime mmụọ?

• N’iṅomi ụmụnna e tere mmanụ nke Jizọs, n’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi nọgide ‘na-azụ ahịa’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 16]

OLEE MGBE JIZỌS GA-ABỊA?

Na Matiu isi 24 na 25, e kwuru na Jizọs ‘bịara’ n’echiche dị iche iche. Ọ dịghị ya mkpa isi n’ebe ọ nọ pụọ n’ụzọ nkịtị iji ‘bịa.’ Kama nke ahụ, ọ ‘bịara’ n’echiche nke ichigharịkwuru ihe a kpọrọ mmadụ ma ọ bụ ụmụazụ ya, mgbe mgbe maka ikpe. N’ihi ya, na 1914, ọ ‘bịara’ ịmalite ọnụnọ ya dị ka Eze e chiri echichi. (Matiu 16:28; 17:1; Ọrụ 1:11) Na 1918, ọ ‘bịara’ dị ka onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ ma malite ikpe ndị na-azọrọ na ha na-ejere Jehova ozi ikpe. (Malakaị 3:1-3; 1 Pita 4:17) N’Amagedọn, ọ ‘ga-abịa’ imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị iro Jehova.—Mkpughe 19:11-16.

Ọbịbịa (ma ọ bụ, mbịarute) e kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro na Matiu 24:29-44 na 25:31-46 bụ “n’oké mkpagbu ahụ.” (Mkpughe 7:14) N’aka nke ọzọ, ọbịbịa nke e kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro na Matiu 24:45 ruo 25:30 nwere ihe jikọrọ ya na ya ikpe ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya ikpe site na 1918 gaa n’ihu. Ọ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya ikwu, dị ka ihe atụ, na ịkwụghachi ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ, ikpe ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ndị dị nzuzu ikpe, na ikpe ohu ahụ dị umengwụ, bụ́ onye zochiri talent Nna ya Ukwu, ikpe ga-ewere ọnọdụ mgbe Jizọs ‘bịara’ n’oge oké mkpagbu ahụ. Nke ahụ ga-apụta na a ga-ahụ na ọtụtụ ndị e tere mmanụ ekwesịghị ntụkwasị obi n’oge ahụ n’ihi ya kwa, a ga-edochi ha. Otú ọ dị, Mkpughe 7:3 na-egosi na a ‘ga-akasịworị’ ndị ohu Kraịst nile e tere mmanụ akara n’oge ahụ.

[Foto dị na peeji nke 14]

“Ajọ ohu” ahụ anataghị ngọzi na 1919

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke maara ihe dị njikere mgbe nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ bịarutere

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ‘azụwo ahịa’

Ohu ahụ dị umengwụ emebeghị otú ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndị ahụ e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ nọgidere na-ekwe ka ìhè ha na-enwu