Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe Ọ̀ Pụrụ Ịgwọ Onye Ọrịa?

Okwukwe Ọ̀ Pụrụ Ịgwọ Onye Ọrịa?

Okwukwe Ọ̀ Pụrụ Ịgwọ Onye Ọrịa?

MGBE anyị na-arịa ọrịa, anyị na-achọ ahụ́ efe na ọgwụgwọ. Eleghị anya, site na Bible, ị maara na mgbe mgbe, Jizọs Kraịst gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche, na-ewetara ọtụtụ ndị ọrịa ahụ́ efe. Olee otú ọgwụgwọ ndị a si were ọnọdụ? Ọ bụ site ‘n’ike nke Chineke,’ ka Bible na-ekwu. (Luk 9:42, 43; Ọrụ 19:11, 12) N’ihi ya, ọ bụ mmụọ nsọ sitere n’aka Chineke kpatara ọgwụgwọ ahụ, ọ bụghị nanị okwukwe nke onye ahụ. (Ọrụ 28:7-9) Ọ bụ ya mere na Jizọs achọghị ka ndị ọrịa kwupụta okwukwe ha n’ebe ọ nọ ka o wee gwọọ ha.

Ị pụrụ iche, sị: ‘Ọgwụgwọ ọrụ ebube ọ̀ bụzi ihe mgbe ochie, ka a ga-enwe ụdị ọgwụgwọ ndị ahụ sitere n’aka Jizọs ọzọ? Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị na-arịa ọrịa ndị na-egbu mgbu ma ọ bụ ndị na-enweghị ọgwụgwọ?’

Bible na-akọwa na n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, ike nke Chineke ga-eme ka e nwee ụdị ọgwụgwọ ọrụ ebube ndị ahụ sitere n’aka Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa ọzọ. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ igosi gị mgbe na otú Chineke ga-esi rụzuo ihe ọ na-enweghị onye ji okwukwe agwọ ọrịa pụrụ ịrụzu ya—iwepụ ọrịa nile, nakwa ọnwụ. Ee, Chineke ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.’—Aịsaịa 25:8.