Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ị Dị Ebube Karịa Ugwu Nile’

‘Ị Dị Ebube Karịa Ugwu Nile’

Ịma Mma Nke Ihe Okike Jehova

‘Ị Dị Ebube Karịa Ugwu Nile’

ỊNỌ n’elu Ugwu Fuji na-ekiri ka chi na-abọ bụ ahụmahụ a na-apụghị ichefu echefu. Anyanwụ na-acha ọkụ ọkụ na-etiwapụ na mbara igwe, na-eme ka a na-ahụ snow ahụ na-acha ọcha na nkume ahụ na-acha ntụ ntụ si n’ugwu na-agbọpụ ọkụ pụta nke ọma. Ka ụbọchị ọzọ na-amalite, onyinyo a na-ahụ nke ọma nke ugwu ahụ na-eru ọtụtụ kilomita ngwa ngwa, gafere ugwu nta na ndagwurugwu dị iche iche.

Dị ka Ugwu Fuji—nke a na-edebu ná mkpụrụ akwụkwọ ndị pụtara “enweghị oyiri”—ugwu ndị dị ebube na-atụ anyị n’anya mgbe nile. N’ezie, ịdị ukwuu ha pụrụ ime ka anyị dị umeala n’obi! Ugwu na-adị nnọọ ebube nke na ọtụtụ mmadụ kweere na ọnụ ọnụ ugwu, bụ́ ebe alụlụ na igwe ojii na-ekpuchikarị, bụ ebe obibi nke ndị bụ́ chi.

Nanị Chi nke ọnụ ọnụ ugwu na-eto n’ezie bụ Onye Okike ukwu ha, bụ́ Jehova. Ọ bụ nanị ya bụ “Onye na-akpụ ugwu nile.” (Emọs 4:13) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa bụ ugwu, mgbe Chineke kekwara mbara ala anyị, o tinyere ike nke mesịrị mee ka e nwee ọnụ ọnụ ugwu na usoro ugwu ndị na-adọrọ mmasị. (Abụ Ọma 95:4) Dị ka ihe atụ, e kweere na ọ bụ oké nrugharị nke ihe ndị dị n’ime ala nakwa nchigharị nke akụkụ dị iche iche nke ala mere ka e nwee usoro ugwu Himalaya na nke Andes.

Anyị bụ́ ụmụ mmadụ aghọtaghị n’ụzọ zuru ezu otú ugwu si malite na ihe mere e ji nwee ha. N’ezie, anyị apụghị ịza ajụjụ ndị a a jụrụ onye ezi omume bụ́ Job: “Olee ebe ị nọ mgbe M [Jehova] tọrọ ntọala ụwa? . . . N’elu gịnị ka e mere ka ụkwụ ya nile bamie?”—Job 38:4-6.

Otú ọ dị, anyị maara na ndụ anyị na-adabere n’ugwu. A kpọwo ha ihe ndị si n’okike na-echekwa mmiri, ebe ọ bụ na mmiri nke osimiri ndị bụ́ isi sitere n’ugwu, ọkara nke ndị bi n’ụwa na-adaberekwa n’ebe ugwu dị maka inweta mmiri. (Abụ Ọma 104:13) Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo, “isii n’ime osisi 20 ndị na-emepụta nri sitere n’ugwu.” Mgbe a ga-enwe ezi njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere nkwa ya, “ọtụtụ ọka ga-adị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16; 2 Pita 3:13.

Nye ọtụtụ ndị, ịkpọtụ ugwu aha na-echetara ha usoro ugwu Alps nke Europe. Ọnụ ọnụ ugwu ndị a, tinyere Ugwu Civetta e gosiri ebe a, na-agba akaebe dị mma banyere Onye Okike ha. (Abụ Ọma 98:8) Ha na-eto Jehova, bụ́ onye “na-eji ike Ya mee ka ugwu nile guzosie ike.”—Abụ Ọma 65:6. *

Ịma mma nke usoro ugwu Alps na-awụ ibobo n’ahụ́ n’ezie, ha na ọnụ ọnụ ha ndị ice na-ekpuchi, mkpọda ha ndị snow na-ekpuchi, ndagwurugwu na ọdọ mmiri ha, nakwa ala ahịhịa ha. Eze Devid kọwara Jehova dị ka “Onye na-eme ka ugwu nile puo ahịhịa.”—Abụ Ọma 147:8.

Usoro ugwu—dị ka ugwu ndị a dị na Guilin, China—pụrụ iyi ndị na-adịghị adọrọ mmasị dị ka usoro ugwu Alps, ma ha mara mma n’ụdị nke ha. N’akụkụ Osimiri Li, e nwere ọtụtụ nkume limestone kapịrị ọnụ bụ́ ndị ịma mma ha na-adọrọ mmasị nke ndị nleta. Ikiri ka mmiri si n’ugwu ndị a alụlụ juru na-eruda pụrụ ichetara mmadụ okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Gị [Jehova] Onye na-ezipụ isi iyi dị iche iche ka ha baa na ndagwurugwu; n’etiti ugwu ka ha na-eru.”—Abụ Ọma 104:10.

N’ụzọ ziri ezi, ugwu na-adọrọ mmasị anyị n’ihi na anyị na-aghọta na ha bụ akụkụ dị ebube nke ndokwa ịhụnanya nke Onye Okike mere maka ọdịmma na ọṅụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ịdị egwu ha, a pụghị iji ugwu tụnyere ịdị ebube nke Jehova. N’ezie, ọ ‘dị ebube karịa ugwu nile.’—Abụ Ọma 76:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, March/April.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Pasent 10 nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa bi n’ebe ndị dị n’ugwu. Ma nke ahụ abụghị ihe mgbochi a na-apụghị imeri emeri nye ndị na-agbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ndị Kraịst a bụ́ ndị ozi na-arụsi nnọọ ọrụ ike n’ógbè ndị dị n’ugwu. “Leekwa, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta!”—Aịsaịa 52:7.

“Ugwu nile dị elu dịịrị ewu ọhịa,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 104:18) Ewu ọhịa, dị ka Nubian ibex, ndị nwere mpi ndị mara mma, so n’anụ ndị kasị bụrụ ndị na-adịghị azọhie ụkwụ n’ime anụ nile bi n’ugwu. Ha na-agafe ebe ndị dị nnọọ warawara ma yie ebe a na-apụghị ịgafe agafe. E kere nnọọ ibex ibi n’ebe mmadụ na-apụghị iru. Nke a bụ n’ụzọ ụfọdụ n’ihi otú e si mee ụkwụ ya. Ịdị arọ nke ewu ahụ pụrụ ime ka ọbụ ụkwụ ya gbasaa, na-eme ka anụ ahụ ghara ịda mgbe ọ na-eguzo ma ọ bụ na-aga ije n’elu nkume ndị dị warawara. N’ezie, ibex bụ ihe okike magburu onwe ya!

[Foto dị na peeji nke 9]

Ugwu Fuji, Honshu, Japan