Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe merenụ mgbe ihe ahụ e dekọrọ n’Ọpụpụ 4:24-26 weere ọnọdụ, ọ̀ bụkwa ndụ onye nọ n’ihe ize ndụ?

Mozis na nwunye ya bụ́ Zipora na ụmụ ya ndị ikom bụ́ Geshọm na Elieza nọ na-aga Ijipt mgbe ihe a na-esonụ mere: “O ruo n’ụzọ n’ebe ịnọ ọnọdụ abalị, na Jehova zutere ya, chọọ ime ka ọ nwụọ. Zipora wee were ọ́mụ́ bipụ apị nwa ya, mee ka o metụ [ụkwụ ya, NW]; Zipora wee sị, N’ezie di nke ọbara ka ị bụ n’ebe m nọ. O wee hapụ ya ndụ. Mgbe ahụ Zipora sịrị, Di nke ọbara ka ị bụ, banyere obibi úgwù.” (Ọpụpụ 4:20, 24-26) Ọ bụ ezie na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a edochaghị anya, a pụghịkwa ịmata kpọmkwem ihe ọ pụtara, Akwụkwọ Nsọ na-eme ka a ghọtatụ amaokwu ndị a.

Ihe ndekọ ahụ ekwughị kpọmkwem onye ndụ ya nọ n’ihe ize ndu. Otú ọ dị, anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na ọ bụghị ndụ Mozis, n’ihi na ọ ka natasịrị ọrụ n’aka Chineke idupụta ụmụ Izrel n’Ijipt. (Ọpụpụ 3:10) O yighị ka mmụọ ozi Chineke ọ̀ ga-achọ igbu Mozis mgbe ọ na-aga ịrụzu ọrụ ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ ndụ nke otu n’ime ụmụ ya ndị ikom. Iwu e nyere Ebreham tupu mgbe ahụ banyere ibi úgwù kwuru, sị: “Nwoke a na-ebighị úgwù, nke a na-ebighị úgwù n’anụ ahụ́ nke apị ya, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ụmụnna ya. O mebiwo ọgbụgba ndụ m.” (Jenesis 17:14) O yiri ka Mozis ò leghaara ibi nwa ya úgwù anya, nke mere ka mmụọ ozi Jehova chọọ igbu nwatakịrị ahụ.

Ụkwụ ònye ka e metụrụ mgbe Zipora bipụrụ apị nwa ya ka ọ na-agbalị idozi okwu ahụ? Ọ bụ mmụọ ozi Jehova bụ́ onye nwere ikike igbu nwa ahụ a na-ebighị úgwù. Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na Zipora mere ka apị ahụ metụ ụkwụ mmụọ ozi ahụ, na-eche ya n’ihu ya dị ka ihe àmà na-egosi na ya emeela ihe ọgbụgba ndụ ahụ chọrọ.

Okwu Zipora bụ́ “di nke ọbara ka ị bụ n’ebe m nọ” bụ okwu a na-adịghị anụkebe. Gịnị ka ọ na-egosi banyere ya? Site na ya ikweta mezuo ihe ọgbụgba ndụ ibi úgwù ahụ chọrọ, Zipora kwetara na ya na Jehova nwere mmekọrịta ọgbụgba ndụ. Ọgbụgba ndụ Iwu Jehova na ndị Izrel mechara nwee gosiri na a bịa ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, a pụrụ iwere Jehova dị ka di na onye nke ọzọ dị ka nwunye. (Jeremaịa 31:32) N’ihi ya, n’ịkpọ Jehova (site ná mmụọ ozi na-anọchite anya ya) “di nke ọbara,” o yiri ka Zipora ọ̀ na-ekweta na ya ga-erube isi n’ihe ndị ọgbụgba ndụ ahụ chọrọ. Ọ dị ka à ga-asị na ọ nabatawo ọnọdụ onye bụ́ nwunye n’ọgbụgba ndụ ibi úgwù ahụ, ebe Jehova Chineke nọ dị ka di. Otú o sina dị, n’ihi iji obi ike mee ihe iji rube isi n’ihe Chineke chọrọ, ndụ nwa ya anọghịzi n’ihe ize ndụ.