Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihud Agbajie Yok Onye Mmegbu

Ihud Agbajie Yok Onye Mmegbu

Ihud Agbajie Yok Onye Mmegbu

NKE A bụ akụkọ mere eme nke obi ike na iji akọ eme ihe. O mere ihe dị ka afọ 3,000 gara aga. Ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ahụ ji okwu ndị a malite: “Ụmụ Izrel wee meekwa ihe ọjọọ n’anya Jehova ọzọ. Jehova wee mee ka Eglọn, bụ́ eze Moab, dị ike imegide Izrel, n’ihi na ha emewo ihe ọjọọ n’anya Jehova. O wee chịkọtara onwe ya ụmụ Amọn na Amalek, jee tigbuo Izrel, ha wee nweta obodo nkwụ ahụ. Ụmụ Izrel wee fee Eglọn, bụ́ eze Moab, ofufe afọ iri na asatọ.”—Ndị Ikpe 3:12-14.

Ókèala ndị Moab dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan na Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ma ha agafewo osimiri ahụ wee bịa bichie n’ala gbara Jeriko, “obodo nkwụ,” gburugburu, na-eme ka ụmụ Izrel bụrụ ohu ha. (Deuterọnọmi 34:3) Eze Moab bụ́ Eglọn, “nwoke mara abụba nke ukwuu,” ejiriwo aka ike nara Izrel ụtụ buru oké ibu ma na-eweda n’ala ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ abụọ. (Ndị Ikpe 3:17) Otú ọ dị, ụtụ ahụ ọ na-ana meghere ụzọ isi gbuo onye ọchịchị aka ike ahụ.

Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ụmụ Izrel wee tikuo Jehova, Jehova wee mee ka onye nzọpụta biliere ha, bụ́ Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye na-eme aka ekpe. Ụmụ Izrel wee si n’aka ya zigara Eglọn eze Moab onyinye ịnata ihu ọma.” (Ndị Ikpe 3:15) Ọ ghaghị ịbụ Jehova hụrụ na a họpụtara Ihud iwega onyinye ịnata ihu ọma ahụ. E kwughị ma ọ rụtụla ọrụ ahụ. Ma otú Ihud si kwadebe nke ọma maka nzute ahụ na atụmatụ ndị o ji mee ihe na-enye echiche na ọ pụrụ ịbụ na ọ maara ihe ụfọdụ banyere obí eze Eglọn na ihe ọ pụrụ ịtụ anya ya. N’ihe a nile, na ọ na-eme aka ekpe dị nnọọ mkpa.

Nwoke Nwere Nkwarụ Ka Ọ̀ Bụ Dike?

N’ụzọ nkịtị, okwu ahụ bụ́ “aka ekpe” pụtara ‘onye e mechiri aka ya, onye nwere nkwarụ n’aka, ma ọ bụ onye e kere aka nri ya eke.’ Nke a ọ̀ pụtara na Ihud nwere nkwarụ, ikekwe nwee aka nri nwere ọrụsị? Tụlee ihe Bible kwuru banyere ndị ikom “narị asaa a họpụtara ahọpụta” na-eme aka ekpe bụ́ ndị si n’ebo Benjamin. “Onye ọ bụla n’ime ha na-amata otu agịrị isi nkume, ghara ịmahie,” ka Ndị Ikpe 20:16 na-ekwu. O yikarịrị ka à họpụtara ha n’ihi nkà ha n’ịlụ agha. Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible si kwuo, ime “aka ekpe” pụtara onye “na-eji ma aka nri ma aka ekpe eme ihe.”—Ndị Ikpe 3:15,The Douay Version.

N’ezie, a ma ebo Benjamin ama n’ihi ndị ikom ya na-eme aka ekpe. Ihe E Mere nke Mbụ 12:1, 2 na-akọrọ anyị banyere ndị Benjamin bụ́ ‘ndị dike ndị na-enye aka n’agha, na-achị ụta na-eme aka nri, na-emekwa aka ekpe n’ịtụ nkume na n’iwere ụta gbaa àkụ́.’ Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu na a pụrụ ịkụzi nkà dị otú a “site n’ikechi aka nri ụmụaka—ya bụ́ ‘ike aka nri ya ihe’—na ịkụziri ya iji aka ekpe ya eme ihe nke ọma.” A na-azụkarị ndị iro Izrel izute ndị dike na-eme aka nri. N’ihi ya, ihe ka ukwuu n’ọzụzụ onye iro ahụ nwetara pụrụ ịbụ nke na-agaghị aba uru ma ọ bụrụ na o zute onye agha na-eme aka ekpe mgbe ọ na-atụghị anya ya.

“Okwu Nzuzo” Ịgwa Eze

Ihe mbụ Ihud mere bụ imere “onwe ya mma agha”—mma agha nwere ihu abụọ nke dị nnọọ mkpụmkpụ nke na o nwere ike izo ya n’okpuru uwe ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ tụrụ anya na a ga-enyocha ya. A na-eyikarị mma agha n’akụkụ aka ekpe, ebe ndị na-eme aka nri ga-enwe ike ịmịrị ya ozugbo. Ebe ọ bụ na ọ na-eme aka ekpe, Ihud zoro ngwá agha ya “n’okpuru uwe mwụda ya, n’apata ụkwụ aka nri ya,” ebe ọ na-eyikarịghị ka ndị nche eze hà ga-enyocha. Ya mere, n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, “o weta onyinye ịnata ihu ọma ahụ nso Eglọn eze Moab.”—Ndị Ikpe 3:16, 17.

A kọwaghị ihe nile mere ná mmalite n’obí Eglọn. Nanị ihe Bible kwuru bụ: “O ruo mgbe [Ihud] wetasịrị onyinye ịnata ihu ọma ahụ nso, na o zilagara ndị na-ebu onyinye ịnata ihu ọma ahụ.” (Ndị Ikpe 3:18) Ihud nyesịrị onyinye ịnata ihu ọma ahụ, dupụ ndị na-ebu onyinye ịnata ihu ọma ahụ n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe obibi Eglọn ma lọghachite ka ọ gwasịrị ha lawa. N’ihi gịnị? Ọ̀ kpọ ndị ikom ahụ bịa ka ha chebe ya, n’ihi ịgbaso iwu, ka ọ̀ kpọ ha ikekwe nanị dị ka ndị na-ebu onyinye ịnata ihu ọma? Ọ̀ chọkwara ka ha nọrọ n’ebe dị nchebe tupu o mee ihe o zubere ime? N’agbanyeghị ihe o bu n’uche, Ihud ji obi ike laghachi nanị ya.

“[Ihud] si n’arụsị a pịrị apị ndị dị na Gilgal laghachi, sị, Okwu nzuzo ka m nwere ịgwa gị, eze.” Akwụkwọ Nsọ akọwaghị otú o si nwee ike ịbanyeghachi iji hụ Eglọn. Ọ̀ bụ na ndị nche ekwesịghị inyowo ya enyo? Hà chere na otu onye Izrel abụghị ihe ize ndụ nye onye nwe ha? Ihud ịbịa nanị ya ò nyere echiche na ọ bịara ịgba ndị obodo ya mgba okpuru? Nke ọ bụla ọ bụ, Ihud chọrọ ka ya na nanị eze kwurịta okwu, o nwetakwara ihe ọ chọrọ.—Ndị Ikpe 3:19.

Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ihud wee bịakwute [Eglọn], ma ya onwe ya na-anọdụ nanị ya n’ime ụlọ elu ọjụjụ oyi nke o nwere. Ihud wee sị, Okwu Chineke ka m nwere ịgwa gị.” Ihud adịghị ekwu banyere ozi ọnụ si n’aka Chineke. Ihe Ihud bu n’uche bụ iji mma agha ya mee ihe. Ikekwe, n’ịtụ anya ịnụ ozi sitere n’aka chi ya bụ́ Kemọsh, eze ahụ wee “si n’ocheeze ya bilie.” N’otu ntabi anya, Ihud mịịrị ngwá agha ya ma manye ya n’afọ Eglọn. O yiri ka mma agha ahụ enweghị ihe ntụbichi n’isi ya. N’ihi nke a, “isi mma wee sorokwa ihu mma baa, abụba wee gbochipụ ihu mma, . . . [nsị] wee pụọ n’otule ya,” ma ọ bụ site n’ebe a mapuru ya afọ.— Ndị Ikpe 3:20-22.

Nlanahụ Gara Were Were

N’egbuweghị oge iji mịkwara mma agha ya, “Ihud wee pụọ n’ụzọ mbata mechibido ya ọnụ ụzọ ime ụlọ elu ahụ, kpachie ha. Ma mgbe ya onwe ya pụsịrị, ndị ohu [Eglọn] batara, ha wee hụ, ma lee, a kpachiwo ọnụ ụzọ ime ụlọ elu ahụ. Ha sị, Ọ bụ nanị na ọ na-ekpuchi ụkwụ ya abụọ n’ime ụlọ ọjụjụ oyi ya.”—Ndị Ikpe 3:23, 24.

Gịnị bụ “ọnụ ụzọ mbata” ebe Ihud si gbapụ? “A maghị ihe [okwu Hibru ahụ] pụtara kpọmkwem,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, ma “a tụwo arọ na ọ pụrụ ịbụ ‘veranda nwere ogidi,’ ‘paseeji dị n’akụkụ ụlọ nke a pụrụ isi na ya banye n’ime ụlọ ndị ọzọ.’” Ihud ọ̀ gbachiri ụzọ n’ime, ma si n’ụzọ ọzọ gbapụ? Ka ò ji mkpịsị ugodi o nwetara n’ahụ́ eze ahụ nwụrụ anwụ si n’èzí kpọchie ya? Ka ọ̀ gaara nnọọ ka ọ dịghị ihe merenụ gafere ndị nche ahụ? Akwụkwọ Nsọ ekwughị. Otú ọ dị, ụzọ ọ bụla Ihud si mee ya, ndị ohu Eglọn echeghị ozugbo ahụ na e nwere ihe merenụ mgbe ha hụrụ na ọnụ ụzọ kpọchiri akpọchi. Ha chere nanị na ọ ga-abụ na eze ahụ “na-ekpuchi ụkwụ ya abụọ.”

Ka ndị ohu eze ka nọ na-egbu oge, Ihud lanahụrụ. Mgbe ahụ, ọ kpọkọrọ ndị obodo ya ma sị: “Gbasoonụ m n’azụ n’ihi na Jehova enyewo ndị iro unu bụ́ ndị Moab, n’aka unu.” Site n’ịnọchi ebe ndị dị mkpa e si agabiga Jọdan, ndị ikom Ihud nọchibidoro ụzọ ndị Moab na-enweghị onye ndú ga-esi gbalaa ala nna ha. N’ụzọ dị otú a, ndị Izrel “wee tigbuo Moab na mgbe ahụ, ihe ha ka [puku ndị ikom iri], nwoke ọ bụla nke buru ibu, na nwoke ọ bụla bụ́ dimkpa. Ọ dịghịkwa nwoke ọ bụla wepụgara onwe ya. E wee mee ka Moab huru ala n’okpuru aka Izrel n’ụbọchị ahụ. Ala ahụ wee dị jụụ iri afọ asatọ.”—Ndị Ikpe 3:25-30.

Ihe Ndị Anyị Pụrụ Ịmụta

Ihe mere n’ụbọchị Ihud na-akụziri anyị na mgbe anyị mere ihe dị njọ n’anya Jehova, ihe ọjọọ na-esi na ya apụta. N’aka nke ọzọ, Jehova na-enyere ndị ji nchegharị chigharịkwute ya aka.

Atụmatụ Ihud gara nke ọma, ọ bụghị n’ihi na ọ dị akọ, ma ọ bụ n’ihi na ndị iro ya amaghị nke a na-akọ. Mmezu nke nzube Chineke abụghị n’aka mmadụ ka ọ dị. Ihe bụ́ isi mere Ihud ji nwee ihe ịga nke ọma bụ na o nwere nkwado Chineke ebe ọ bụ na o mere ihe kwekọrọ n’uche Ya a na-apụghị igbochi egbochi nke ịgbapụta ndị Ya. Chineke kpọlitere Ihud, “mgbe Jehova mere ka ndị ikpe biliere [ndị ya], Jehova nọnyekwaara onyeikpe ahụ.”—Ndị Ikpe 2:18; 3:15.