Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jee Ozi Gị N’ụzọ Zuru Ezu”

“Jee Ozi Gị N’ụzọ Zuru Ezu”

“Jee Ozi Gị N’ụzọ Zuru Ezu”

“Jechaa ozi gị.”—2 TIMOTI 4:5, Byington.

1, 2. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nile bụ ndị na-ezisa ozi ọma, gịnị ka Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka ndị okenye?

Ị̀ BỤ onye nkwusa Alaeze? Ọ bụrụ otú ahụ, kelee Jehova Chineke maka ihe ùgwù a magburu onwe ya. Ị̀ bụ okenye n’ọgbakọ? Nke ahụ bụ ihe ùgwù ọzọ sitere n’aka Jehova. Ma anyị agaghị echefu ma ọlị na ma agụmakwụkwọ ma ikike ikwu okwu n’ụzọ bụ́ ịgba adịghị nke na-eme ka anyị ruo eruo maka ozi ahụ ma ọ bụ ịbụ ndị nlekọta n’ọgbakọ. Ọ bụ Jehova na-eme ka anyị ruo eruo nke ọma maka ozi a, ọ bụkwa n’ihi na ndị ikom ụfọdụ n’etiti anyị ruru ihe ndị a kapịrị ọnụ Akwụkwọ Nsọ chọrọ mere ha ji nwee ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị nlekọta.—2 Ndị Kọrint 3:5, 6; 1 Timoti 3:1-7.

2 Ndị Kraịst nile raara onwe ha nye na-arụ ọrụ ndị na-ezisa ozi ọma, ọ dị ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, mkpa karịsịa isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ozi ahụ. Chineke na Kraịst, tinyere Ndịàmà Jehova ibe ha, na-ahụ ndị okenye bụ́ “ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.” (1 Timoti 5:17; Ndị Efesọs 5:23; Ndị Hibru 6:10-12) N’ọnọdụ nile, izi ihe nke onye okenye aghaghị ịbụ nke na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na Pọl onyeozi gwara onye nlekọta bụ́ Timoti, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha. Ma, gị onwe gị, nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jee ozi gị n’ụzọ zuru ezu.”—2 Timoti 4:3-5.

3. Gịnị ka ọ dị mkpa ka e mee ka ozizi ụgha wee ghara itinye ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ n’ihe ize ndụ?

3 Iji hụ na ozizi ụgha etinyeghị ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ n’ihe ize ndụ, onye nlekọta aghaghị ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Mụrụ anya n’akụkụ nile, . . . jechaa ozi gị.” (2 Timoti 4:5, Byington) Ee, onye okenye kwesịrị ‘ije ozi ya n’ụzọ zuru ezu.’ Ọ ghaghị ije ya n’ụzọ zuru ezu ma ọ bụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu. Onye okenye nke na-eje ozi ya n’ụzọ zuru ezu na-elebara ibu ọrụ ya nile anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’elegharaghị nke ọ bụla anya ma ọ bụ medebe ya n’ụzọ. Onye dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna n’ihe dị nta.—Luk 12:48; 16:10.

4. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ije ozi ahụ n’ụzọ zuru ezu?

4 Ije ozi anyị n’ụzọ zuru ezu adịghị achọ mgbe nile itinyekwu oge, ma ọ na-achọ iji oge eme ihe nke ọma. Imechi ya anya pụrụ inyere Ndị Kraịst nile aka ịrụpụta ihe n’ozi. Iji tinyekwuo oge n’ozi ubi, ezi nhazi onwe onye dị onye okenye mkpa iji mee ka usoro ihe omume ya ghara imegiderịta ibe ha nakwa iji mara ihe ndị ọ ga-ekenye ndị ọzọ na otú ọ ga-esi mee otú ahụ. (Ndị Hibru 13:17) Dị ka o kwesịrị, onye okenye a na-akwanyere ùgwù na-emekwa òkè nke ya, dị ka Nehemaịa, bụ́ onye keere òkè n’onwe ya n’iwughachi mgbidi Jeruselem. (Nehemaịa 5:16) Ndị ohu Jehova nile kwesịkwara ịdị na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa Alaeze.—1 Ndị Kọrint 9:16-18.

5. Olee mmetụta anyị kwesịrị inwe banyere ozi ahụ?

5 Lee ọrụ na-enye ọṅụ anyị nwere dị ka ndị nkwusa nke Alaeze eluigwe ahụ e guzobere eguzobe! N’ezie, anyị ji ihe ùgwù anyị nke ikere òkè n’ikwusa ozi ọma n’elu ụwa dum mmadụ bi tupu ọgwụgwụ eruo kpọrọ ihe. (Matiu 24:14) Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, anyị pụrụ inweta agbamume site n’okwu Pọl bụ́: “Anyị nwere akụ̀ a [ozi ahụ] n’arịa e ji ụrọ kpụọ, ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ee, anyị pụrụ ijere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anakwere—ma, ọ bụ nanị site n’ike na amamihe nke ọ na-enye.—1 Ndị Kọrint 1:26-31.

Igbukepụ Ebube Chineke

6. Ọdịiche dị aṅaa bịara dị n’etiti Izrel anụ ahụ́ na Izrel ime mmụọ?

6 N’izo aka n’ebe Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ, Pọl kwuru na Chineke mere “ka anyị ruo eru nke ọma ịbụ ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” Onyeozi ahụ gosiri ọdịiche dị n’etiti ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke e so Izrel ime mmụọ gbaa site n’aka Jizọs Kraịst na ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ nke e so Izrel anụ ahụ́ gbaa site n’aka Mozis. Pọl gbakwụnyere na mgbe Mozis bu mbadamba nkume ebe e dere Iwu Iri ahụ si n’Ugwu Saịnaị rịdata, ihu ya na-egbukepụ nnọọ egbukepụ nke na ndị Izrel apụghị ilegide ya anya. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ihe ka njọ mere n’ihi na “e mere ka ike iche echiche ha nyụọ nkọ,” e nweekwa ákwà mkpuchi nke kpuchiri obi ha. Otú ọ dị, mgbe ha laghachikwuuru Jehova site n’iji obi dum fee ya ofufe, e wepụrụ ákwà ahụ. N’izozi aka n’ozi e nyere ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Pọl na-ekwu, sị: “Anyị [nile] na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo n’ihu a na-ekpuchighị ákwà.” (2 Ndị Kọrint 3:6-8, 14-18; Ọpụpụ 34:29-35) “Atụrụ ọzọ” Jizọs nke taa nwekwara ihe ùgwù nke igbukepụ ebube Jehova.—Jọn 10:16.

7. Olee otú ụmụ mmadụ pụrụ isi na-egbukepụ ebube Chineke?

7 Olee otú ụmụ mmadụ na-eme mmehie pụrụ isi gbukepụ ebube Chineke ebe ọ na-adịghị onye ọ bụla pụrụ ịhụ ihu ya anya ma dị ndụ? (Ọpụpụ 33:20) E wezụga ebube Jehova, e nwekwara nzube ya dị ebube igosipụta site n’Alaeze ya oruru o ruuru ya ịchị. Eziokwu ndị metụtara Alaeze ahụ so ‘n’ihe ndị dị ebube nke Chineke,’ bụ́ ihe ndị ndị ahụ a wụsara mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A. malitere ịkpọsa. (Ọrụ 2:11) Site ná nduzi nke mmụọ nsọ ahụ, ha jeliri ozi e kenyere ha n’ụzọ zuru ezu.—Ọrụ 1:8.

8. Gịnị ka Pọl kpebisiri ike ime n’ihe banyere ozi ahụ?

8 Pọl kpebisiri ike ịghara ikwe ka ihe ọ bụla gbochie ya ije ozi ya n’ụzọ zuru ezu. O dere, sị: “Ebe anyị nwere ozi a dị ka ebere nke e meere anyị si dị, anyị adịghị ada mbà; ma anyị ajụwo ihe nzuzo ndị a ga-emere ihere, n’adịghị eje ije n’aghụghọ, n’adịghịkwa agwagbu okwu Chineke, kama site n’ime ka eziokwu ahụ pụta ìhè, anyị na-eme ka akọ na uche mmadụ ọ bụla nakwere anyị n’anya Chineke.” (2 Ndị Kọrint 4:1, 2) Site n’ihe Pọl kpọrọ “ozi a,” e mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè, a gbasakwara ìhè ime mmụọ ahụ ruo mba ndị ọzọ.

9, 10. Olee otú ọ ga-esi kwe omume igbukepụ ebube Jehova?

9 Banyere Isi Iyi nke ìhè nkịtị na nke ime mmụọ, Pọl na-ede, sị: “Chineke bụ onye sịrị: ‘Ka ìhè nwupụta n’ọchịchịrị,’ ya onwe ya enwuwokwa n’obi anyị iji were ihe ọmụma ahụ dị ebube banyere Chineke nye ha ìhè site n’ihu Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 4:6; Jenesis 1:2-5) Ebe ọ bụ na e nyewo anyị ihe ùgwù na-enweghị atụ nke ịbụ ndị ozi Chineke, ka anyị na-edebe onwe anyị ọcha iji wee nwee ike ịdị na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo.

10 Ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ apụghị ịhụ ebube Jehova ma ọ bụ mgbukepụ ya site n’aka Jizọs Kraịst, bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu. Ma, dị ka ndị ohu Jehova, anyị na-enweta ìhè ahụ dị ebube site n’Akwụkwọ Nsọ ma na-egbukepụrụ ya ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ndị nọ ugbu a n’ọchịchịrị ime mmụọ ga-agbanahụ mbibi, ìhè nke sitere n’aka Chineke dị ha mkpa. N’ihi ya, anyị ji oké ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi na-erube isi n’iwu Chineke bụ́ ikwe ka ìhè site n’ọchịchịrị nwupụta iji nye Jehova otuto.

Kwe Ka Ìhè Gị Na-enwu n’Ọmụmụ Bible Ebe Obibi

11. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ikwe ka ìhè anyị na-enwu, oleekwa otu ụzọ anyị si eme nke a n’ozi anyị?

11 Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa. A pụghị izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu. Ndị mmadụ na-amụnye oriọna ma dọba ya, ọ bụghị n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna, ọ na-enwukwasịkwa ndị nile nọ n’ime ụlọ. N’otu aka ahụ, kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:14-16) Àgwà ọma anyị pụrụ ime ka ndị ọzọ nye Chineke otuto. (1 Pita 2:12) Akụkụ dịgasị iche iche nke ọrụ izisa ozi ọma anyị na-enye anyị ọtụtụ ohere ikwe ka ìhè anyị na-enwu. Otu n’ime ebumnobi anyị ndị bụ́ isi bụ igbukepụ ìhè ime mmụọ sitere n’Okwu Chineke site n’iduzi ọmụmụ Bible ndị dị irè. Nke a bụ ụzọ dị nnọọ mkpa anyị si eje ozi anyị n’ụzọ zuru ezu. Aro ndị dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka iduzi ọmụmụ Bible nke na-eru n’obi ndị na-achọ eziokwu ahụ?

12. Olee otú ekpere na ọrụ nke iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi si nwee njikọ?

12 Ikpegara Jehova ekpere banyere nke a na-egosipụta ọchịchọ siri ike anyị nwere iduzi ọmụmụ Bible. Ọ na-egosikwa na anyị hụrụ mkpa ọ dị inyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma Chineke. (Ezikiel 33:7-9) Jehova aghaghị ịza ekpere anyị, ọ ghaghịkwa ịgọzi mgbalị siri ike anyị na-eme n’ozi ahụ. (1 Jọn 5:14, 15) Ma anyị adịghị ekpe ekpere nanị maka ịchọta onye anyị ga-eduziri ọmụmụ Bible ebe obibi. Mgbe anyị guzobesịrị ọmụmụ ihe ahụ, ikpe ekpere na ịtụgharị uche banyere mkpa ụfọdụ nke onye a na-amụrụ Bible ga-enyere anyị aka iduzi ọmụmụ ihe nke ọ bụla n’ụzọ dị irè.—Ndị Rom 12:12.

13. Gịnị pụrụ inyere anyị aka iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị irè?

13 Iji duzie ọmụmụ Bible ebe obibi dị irè, anyị aghaghị ịkwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka anyị eruchaghị eru, ọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enye aka ikiri otú onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si eduzi ihe ọmụmụ kwa izu. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ inwe ike isonyere ndị nkwusa Alaeze ndị rụpụtaworo ezi ihe n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ezie, àgwà na ụzọ izi ihe nke Jizọs Kraịst kwesịrị ka anyị tụlee ya karịsịa.

14. Olee otú anyị pụrụ isi ruo n’obi onye anyị na-amụrụ Bible?

14 Ọ na-atọ Jizọs ụtọ ime uche Nna ya nke eluigwe na ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke. (Abụ Ọma 40:8) Ọ dị nwayọọ n’obi ma nwee ihe ịga nke ọma n’iru n’obi ndị na-ege ya ntị. (Matiu 11:28-30) N’ihi ya, ka anyị na-agbalịsi ike iru n’obi ndị anyị na-amụrụ Bible. Iji wee nwee ike ime nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịkwadebe maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla, na-eburu kpọmkwem ọnọdụ nke onye ahụ a na-amụrụ ihe n’uche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o kweghị na Bible, anyị aghaghị ime ka o kweta na Bible bụ eziokwu. Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na ọ ga-adị anyị mkpa ịgụ ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ha.

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Bible Aka Ịghọta Ihe Atụ

15, 16. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nyere onye anyị na-amụrụ ihe bụ́ onye na-aghọtaghị ihe atụ e ji mee ihe na Bible aka? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ihe atụ e ji mee ihe n’akwụkwọ anyị esiere onye anyị na-amụrụ Bible ike ịghọta?

15 Ọ pụrụ ịbụ na onye anyị na-amụrụ Bible aghọtaghị otu ihe atụ e ji mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ ghọtaghị ihe Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru banyere idebe oriọna n’elu ihe ndọba oriọna. (Mak 4:21, 22) Jizọs na-ezo aka na mpanaka oge ochie nke nwere owu na-enwu ọkụ. A na-edebe oriọna dị otú ahụ n’elu ihe ndọba oriọna pụrụ iche, n’ihi ya kwa, ọ pụrụ inye ìhè n’otu akụkụ nke ụlọ. Ime nnyocha banyere okwu bụ́ “Oriọna” na “Ihe Ndọba Oriọna” n’akwụkwọ dị ka Insight on the Scriptures pụrụ ịdị mkpa iji mee ka ihe atụ Jizọs doo anya. * Ma lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ inye onye anyị na-amụrụ Bible nkọwa kwere nghọta na nke ga-atọ ya ụtọ!

16 Ọ pụrụ ịbụ na ihe atụ e ji mee ihe n’akwụkwọ e ji amụ Bible siiri onye anyị na-amụrụ ihe ike ịghọta. Wepụta oge iji kọwaa ya, ma ọ bụ jiri ihe atụ ọzọ nke na-akọwa otu ihe ahụ mee ihe. Ikekwe otu akwụkwọ na-emesi ike na inwe ezi onye ibe na mgbalị a haziri ahazi dị mkpa n’alụmdi na nwunye. Iji mee ihe atụ nke a, a pụrụ izo aka n’onye na-eme egwuregwu nke si na poolu e kenyere n’eriri tụpụ onwe ya ma dabere n’ebe onye ọzọ nọ ịghọta ya. N’ọnọdụ ya, eleghị anya a pụrụ iji otú ndị na-esi na gwongworo atụtu ji si arụkọ ọrụ ọnụ site n’ịtụrụ ibe ha ji ndị ahụ mgbe ha na-ebutusị ha mee ihe atụ nke ezi onye ibe na mgbalị a haziri ahazi.

17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Jizọs n’ihe banyere ime ihe atụ?

17 Inye ihe atụ ọzọ n’ọnọdụ nke e ji mee ihe chọrọ ime nkwadebe n’oge. Ma, nke ahụ bụ otu ụzọ isi gosi mmasị onwe onye n’ebe onye a na-amụrụ Bible nọ. Jizọs ji ihe atụ ndị dị mfe mee ka okwu ndị siri ike doo anya. Ozizi Elu Ugwu ya bụ ihe atụ nke a, Bible na-egosikwa na ozizi ya nwere mmetụta dị mma n’ahụ́ ndị na-ege ya ntị. (Matiu 5:1–7:29) Jizọs ji ndidi kọwaa ihe ọ na-ekwu n’ihi na o nwere mmasị miri emi n’ebe ndị ọzọ nọ.—Matiu 16:5-12.

18. Gịnị bụ aro a tụrụ banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ anyị?

18 Mmasị anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ ga-akpali anyị iso ha “tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ.” (Ọrụ 17:2, 3) Nke a chọrọ ịmụ ihe na ikpe ekpere na iji akwụkwọ ndị “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” na-ebipụta na-eme ihe. (Luk 12:42-44) Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi hotara ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ. * N’ihi enweghị ohere buru ibu, ihe e mere ụfọdụ n’ime ha bụ nanị izo aka na ha. Mgbe a na-amụ Bible, ọ dị mkpa ịgụ na ịkọwa ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a e zoro aka na ha. E kwuwerị, ọ bụ n’Okwu Chineke ka ozizi anyị dabeere, o nwekwara ike dị ukwuu. (Ndị Hibru 4:12) Na-ezo aka na Bible n’oge nile nke ihe ọmụmụ ọ bụla, na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị na paragraf eme ihe ugboro ugboro. Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe Bible na-ekwu banyere isiokwu ma ọ bụ omume ụfọdụ. Gbalịsie ike igosi onye ahụ otú ọ pụrụ isi rite uru site n’irubere Chineke isi.—Aịsaịa 48:17, 18.

Na-ajụ Ajụjụ Ndị Na-akpali Iche Echiche

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jiri ajụjụ mmata uche mee ihe mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible? (b) Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na otu isiokwu chọkwuru ntụle?

19 Ojiji Jizọs ji ajụjụ mee ihe n’ụzọ nkà nyeere ndị mmadụ aka ịtụgharị uche. (Matiu 17:24-27) Ọ bụrụ na anyị ajụọ ajụjụ mmata uche ndị na-adịghị emechu onye anyị na-amụrụ Bible ihu, azịza ya pụrụ ikpughe ihe ọ na-eche banyere okwu ụfọdụ. Anyị pụrụ ịchọpụta na ọ ka nwere echiche ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na o kweere n’Atọ n’Ime Otu. N’isi nke 3, akwụkwọ Ihe Ọmụma mere ka ọ pụta ìhè na okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” adịghị na Bible. Akwụkwọ ahụ hotara ma zoo aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na Jehova dị iche na Jizọs nakwa na mmụọ nsọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ, ọ bụghị onye. Ịgụ na ikwurịta akụkụ Bible ndị a pụrụ izu. Ma gịnị ma ọ bụrụ na a chọkwuru nkọwa? Ikekwe mgbe ọzọ unu mụsịrị ihe, a pụrụ iwepụta oge ụfọdụ iji nwee nkwurịta okwu ga-aba uru n’isiokwu a dị ka a tụlere ya n’akwụkwọ ọzọ nke Ndịàmà Jehova, dị ka broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? Mgbe e mesịrị, anyị pụrụ ịmaliteghachi ọmụmụ ihe ahụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

20 Ka e were ya na azịza onye anyị na-amụrụ ihe nyere mgbe anyị jụrụ ya ajụjụ mmata uche bụ nke anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ ọbụna nke na-akụda mmụọ. Ọ bụrụ na o metụtara ise siga, ma ọ bụ okwu ọzọ chọrọ mkpachara anya, anyị pụrụ ịtụ aro ka anyị gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ ma kwurịta nke ahụ mgbe e mesịrị. Ịmara na onye ahụ anyị na-amụrụ ihe ka na-ese siga ga-enyere anyị aka ịchọta ihe ọmụma ndị e biri ebi ndị pụrụ inyere ya aka inwe ọganihu ime mmụọ. Ka anyị na-agbalị iru n’obi onye anyị na-amụrụ ihe, anyị pụrụ ikpe ekpere ka Jehova nyere ya aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.

21. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị emee ka ụzọ anyị si ezi ihe kwekọọ ná mkpa ụfọdụ nke onye anyị na-amụrụ Bible?

21 Site n’ime ezi nkwadebe na site n’enyemaka Jehova, obi abụọ adịghị ya na anyị ga-enwe ike ime ka ụzọ anyị si ezi ihe kwekọọ ná mkpa ụfọdụ nke onye ahụ anyị na-amụrụ Bible. Ka oge na-aga, anyị nwere ike inyere ya aka ịzụlite ịhụnanya miri emi maka Chineke. Anyị nwekwara ike inwe ihe ịga nke ọma n’ime ka o nwee nkwanye ùgwù na ekele maka nzukọ Jehova. Leekwa ka o si bụrụ ihe na-enye afọ ojuju mgbe ndị anyị na-amụrụ Bible kwetara na ‘Chineke nọnyeere anyị n’ezie’! (1 Ndị Kọrint 14:24, 25) N’ihi ya, ka anyị na-eduzi ọmụmụ Bible ndị dị irè ma na-eme ihe nile anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Akụ̀ nke A Ga-eji Kpọrọ Ihe

22, 23. Gịnị dị mkpa iji jee ozi anyị n’ụzọ zuru ezu?

22 Iji jee ozi anyị n’ụzọ zuru ezu, anyị aghaghị ịdabere n’ike Chineke na-enye. N’izo aka n’ebe ozi a dị, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Anyị nwere akụ̀ a n’arịa e ji ụrọ kpụọ, ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.”—2 Ndị Kọrint 4:7.

23 Ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ, anyị dị ka arịa ndị e ji ụrọ kpụọ bụ́ ndị na-esighị ike. (Jọn 10:16) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova pụrụ inye anyị ike dị mkpa iji jezuo ozi anyị n’agbanyeghị nrụgide ndị anyị na-enweta. (Jọn 16:13; Ndị Filipaị 4:13) N’ihi ya, ka anyị tụkwasị Jehova obi kpam kpam, jiri akụ̀ anyị bụ́ ozi a kpọrọ ihe, ma jee ozi anyị n’ụzọ zuru ezu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 18 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji jee ozi ha n’ụzọ zuru ezu?

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ọmụmụ Bible ebe obibi anyị dịkwuo irè?

• Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Bible aghọtaghị otu ihe atụ ma ọ bụ ya adị mkpa ka e nyekwuo ihe ọmụma n’otu isiokwu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ezi ihe n’ọgbakọ ma na-enye aka ịzụ ndị kwere ekwe ibe ha n’ozi

[Foto dị na peeji nke 18]

Iduzi ọmụmụ Bible dị irè bụ otu ụzọ isi kwe ka ìhè anyị na-enwu