Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?

N’INYE nkọwa zuru ezu banyere ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi na-ede, sị: “N’aka Onyenwe anyị ka m natara ihe ahụ nke m nyefekwara unu, na Onyenwe anyị Jizọs, n’abalị ahụ a gaje ịrara ya nye, weere otu ogbe achịcha, mgbe o nyesịrị ekele, ọ nyawara ya wee sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.’ O mere otu ihe ahụ n’ihe banyere iko ahụkwa, mgbe o risịworo nri anyasị, na-asị: ‘Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke na-adabere n’ọbara m. Nọgidenụ na-eme nke a, n’oge nile unu na-aṅụ ya, iji na-echeta m.’ N’ihi na n’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.”—1 Ndị Kọrint 11:23-26.

Dị ka Pọl na-ekwu, Jizọs guzobere ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ‘n’abalị ahụ Judas Iskarịọt gaje ịrara Jizọs nye’ ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ ndị rụgidere ndị Rom ịkpọgbu Kraịst. Nri ahụ weere ọnọdụ n’uhuruchi Thursday March 31, 33 O.A. Jizọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ n’ehihie Friday, April 1. Ebe ọ bụ na ụbọchị kalenda ndị Juu na-amalite n’uhuruchi nke otu ụbọchị ruo na nke ụbọchị na-eso ya, ma Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọnwụ Jizọs Kraịst weere ọnọdụ n’otu ụbọchị ahụ—Naịsan 14, 33 O.A.

Ndị na-ekere òkè n’achịcha na mmanya ahụ ‘ga-anọgide na-eme nke a’ iji na-echeta Jizọs. Dị ka nsụgharị ọzọ si tinye ya, Jizọs kwuru, sị: “Na-eme nke a dị ka ememe ncheta m.” (1 Ndị Kọrint 11:24, The Jerusalem Bible) A na-akpọkwa Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst.

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Azịza ya dabeere n’ihe e jikọtara ya na ọnwụ ahụ. Jizọs nwụrụ dị ka onye kasị akwado ọbụbụeze Jehova. O si otú a mee ka Setan bụrụ onye ụgha n’ihi ibo ụmụ mmadụ ebubo na ha na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe ha. (Job 2:1-5; Ilu 27:11) Site n’ọnwụ ya dị ka mmadụ zuru okè, Jizọs ‘nyekwara mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Mgbe Adam mere mmehie megide Chineke, ọ tụfuru ndụ mmadụ zuru okè na atụmanya ya. Ma “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’ezie, “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

N’ụzọ dị otú a, e jikọtara ọnwụ Jizọs Kraịst na ngosipụta abụọ kasịnụ nke ịhụnanya—oké ịhụnanya nke Jehova gosiri ihe a kpọrọ mmadụ n’inye Ọkpara ya na ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà nke Jizọs gosiri ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịdị njikere inyefe ndụ mmadụ ya. Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs na-eme ka ngosipụta abụọ a nke ịhụnanya pụta ìhè. Ebe ọ bụ anyị ka e gosiri ịhụnanya a, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosi ekele anyị maka ya? Otu ụzọ isi mee otú ahụ bụ ịnọ ya n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

Ihe Achịcha na Mmanya ahụ Pụtara

Mgbe ọ na-eguzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jizọs ji ogbe achịcha na iko mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe dị ka ihe nnọchianya. Jizọs weere otu ogbe achịcha, ‘mgbe o nyesịkwara ekele, ọ nyawara ya wee sị: “Achịcha nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu.”’ (1 Ndị Kọrint 11:24) A ghaghị ịnyawa achịcha ahụ iji kesaa ma rie ya n’ihi na ọ bụ achịcha na-agbaritụ agbari nke e ji ntụ ọka na mmiri mee, nke a na-etinyeghịkwa ihe na-eko achịcha, ma ọ bụ yist. N’ime Akwụkwọ Nsọ, ihe na-eko achịcha na-ese onyinyo mmehie. (Matiu 16:11, 12; 1 Ndị Kọrint 5:6, 7) Jizọs enweghị mmehie. Ya mere, ahụ́ mmadụ ya zuru okè bụ àjà mgbapụta kwesịrị ekwesị maka ihe a kpọrọ mmadụ. (1 Jọn 2:1, 2) Lee ka o si kwesị ekwesị na ọ bụ achịcha na-ekoghị eko ka e ji mee ihe nnọchianya nke ahụ́ Kraịst na-enweghị mmehie!

Jizọs nyekwara ekele maka iko nke mmanya na-acha ọbara ọbara a na-agwagbughị agwagbu ma kwuo, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke na-adabere n’ọbara m.” (1 Ndị Kọrint 11:25) Mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara nọ n’ime iko na-anọchi anya ọbara Jizọs. Dị nnọọ ka ọbara ehi na ewu e ji chụọ àjà mere ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ dị n’etiti Chineke na mba Izrel dị irè na 1513 T.O.A., otú ahụ ka ọbara Jizọs wụsịrị n’ọnwụ ya ji mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè.

Olee Ndị Ga-ekere Òkè?

Iji mata ndị kwesịrị ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ pụtara na ndị so na ya. Bible na-ekwu, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe Mụ na ụlọ Izrel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ . . . M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị: . . . M ga-agbaghara ajọ omume ha, M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.”—Jeremaịa 31:31-34.

Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mere ka o kwe omume iso Jehova Chineke nwee mmekọrịta pụrụ iche. Site n’ọgbụgba ndụ a, otu òtù ụmụ mmadụ ghọrọ ndị ya, ọ ghọkwaara ha Chineke. E dere iwu Jehova n’ime ha, n’ime obi ha, ọbụnakwa ndị na-abụghị ndị Juu e biri úgwù n’anụ ahụ́ pụrụ ịbata ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke ha na Chineke. (Ndị Rom 2:29) Luk onye so dee Bible na-ede banyere nzube Chineke ‘iche ihu Ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ isite n’etiti ha wepụta otu ndị maka aha ya.’ (Ọrụ 15:14) Dị ka 1 Pita 2:10 si kwuo, ‘o nwere mgbe ha na-abụghị otu ndị, ma ugbu a ha bụ ndị Chineke.’ Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka n’ebe ha nọ dị ka “Izrel nke Chineke,” ya bụ, Izrel ime mmụọ. (Ndị Galeshia 6:16; 2 Ndị Kọrint 1:21) Ya mere, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ ọgbụgba ndụ nke dị n’etiti Jehova Chineke na Izrel ime mmụọ.

N’abalị ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ, Jizọs n’onwe ya sokwara ha gbaa ọgbụgba ndụ dị iche. “Mụ na unu na-agbakwa ndụ,” ka ọ gwara ha, “dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze.” (Luk 22:29) Nke a bụ ọgbụgba ndụ Alaeze. Ọnụ ọgụgụ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè e mere ka ha sonye n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ dị 144,000. Mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe, ha ga-eso Kraịst chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4) Ya mere, ndị ha na Jehova Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ sokwa Jizọs Kraịst nọrọ n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ. Ọ bụ ha bụ nanị ndị ruru eru ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

Olee otú ndị ahụ a họọrọ ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ si amara na ha na Chineke nwere mmekọrịta pụrụ iche nakwa na ha bụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe? Pọl na-akọwa, sị: “Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị [ọnọdụ uche anyị] na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ma ọ bụrụhaala na anyị atakọọ ahụhụ ka e wee mee ka anyị nwekọọ ebube.”—Ndị Rom 8:16, 17.

Site na mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, Chineke na-ete ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe mmanụ. Nke a na-eme ka o doo ha anya na ha bụ ndị nketa Alaeze ahụ. Ọ na-eme ka Ndị Kraịst e tere mmanụ nwee olileanya eluigwe. Ha na-ewere ya na ọ bụ ha ka a na-agwa ihe nile Bible na-ekwu banyere ndụ eluigwe. Ọzọkwa, ha dị njikere ịchụ ihe nile jikọtara ha na ụwa n’àjà, gụnyere ndụ n’elu ụwa na mmekọrịta nile nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst e tere mmanụ na-aghọta na ndụ na Paradaịs elu ala ga-adị ebube, nke a abụghị olileanya ha. (Luk 23:43) Ọ bụghị n’ihi echiche okpukpe ndị na-ezighị ezi kama ọ bụ n’ihi ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ha nwere olileanya eluigwe a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, n’ihi ya kwa, na-ekere òkè n’ụzọ ziri ezi n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ.

Ka e were ya na mmadụ ejighị nnọọ n’aka na ya so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na o nwetaghị ihe àmà nke mmụọ nsọ Chineke na ọ bụ onye ya na Kraịst na-eketakọ ihe? Mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ya ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ. N’ezie, ọ gaghị atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ amara ụma wepụta onwe ya dị ka onye a kpọrọ ịbụ onye eze na onye nchụàjà n’eluigwe mgbe ọ na-enweghị ọkpụkpọ dị otú ahụ n’ezie.—Ndị Rom 9:16; Mkpughe 22:5.

Ugboro Ole Ka A Ga Na-echeta Ya?

È kwesịrị ịdị na-eme ememe ncheta nke ọnwụ Jizọs kwa izu ma ọ bụ ikekwe ọbụna kwa ụbọchị? Kraịst guzobere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, e gbukwara ya n’ụzọ na-ezighị ezi n’Ụbọchị Ememe Ngabiga. N’ịbụ nke a na-eme otu ugboro n’afọ, na Naịsan 14, e ji Ememe Ngabiga echeta nnapụta nke Izrel n’agbụ Ijipt. (Ọpụpụ 12:6, 14; Levitikọs 23:5) Ya mere, e kwesịrị ịdị na-eme ememe ncheta nke ọnwụ “Kraịst bụ́ àjà ememe ngabiga anyị” nanị otu ugboro n’afọ ọ bụla, ọ bụghị kwa izu ma ọ bụ kwa ụbọchị. (1 Ndị Kọrint 5:7) N’ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Ndị Kraịst na-agbaso otu usoro ahụ Jizọs gbasoro mgbe o guzobere ya.

Gịnịzi ka okwu Pọl ndị a pụtara: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute”? (1 Ndị Kọrint 11:26) N’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, Pọl ji okwu pụtara “oge ọ bụla,” ma ọ bụ “mgbe ọ bụla” mee ihe. N’ụzọ dị otú a, ọ nọ na-ekwu na mgbe ọ bụla Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekere òkè n’ihe nnọchianya ahụ, ha ga na-egosipụta okwukwe ha n’àjà mgbapụta Jizọs.

Ndị Kraịst e tere mmanụ ga na-eme ememe ncheta ọnwụ Kraịst “ruo mgbe ọ ga-abịarute.” A ga-anọgide na-eme ememe a ruo mgbe Jizọs ga-abịarute ịnabata ụmụazụ ya e tere mmanụ n’eluigwe site ná mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ mmụọ n’oge “ọnụnọ” ya. (1 Ndị Tesalonaịka 4:14-17) Nke a kwekọrọ n’okwu Kraịst gwara ndịozi 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ọ bụrụ na mụ agaa wee kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.”—Jọn 14:3.

Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?

Ọ̀ dị mkpa ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta iji rite uru n’àjà Jizọs ma nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa? Ee e. Ọ dịghị ihe e kwuru na Bible na-enye echiche na ọ dị mgbe ndị na-atụ egwu Chineke, ndị dị ka Noa, Ebreham, Sera, Aịzik, Rebeka, Josef, Mozis na Devid ga-ekere òkè n’ihe nnọchianya ndị a mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ. Ma, ha na ndị nile ọzọ chọrọ ịdị ndụ agwụghị agwụ n’ụwa ga-egosipụta okwukwe na Chineke na Kraịst nakwa ná ndokwa Jehova nke àjà mgbapụta Jizọs. (Jọn 3:36; 14:1) Iji nweta ndụ ebighị ebi, gị onwe gị kwa aghaghị igosipụta ụdị okwukwe ahụ. Gị ịnọ ya n’ememe ncheta nke ọnwụ Kraịst na-echetara gị oké àjà ahụ, o kwesịkwara ime ka ekele i nwere maka ya mikwuo emie.

Jọn onyeozi mesiri mkpa nke àjà Jizọs dị ike mgbe ọ sịrị: “M na-edetara unu [ndị e tere mmanụ ibe m] ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume. Ọ bụkwa àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị nanị maka nke anyị kamakwa maka nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) Ndị ahụ e tere mmanụ pụrụ ikwu na àjà Jizọs bụ ihe ime udo iji kpuchie mmehie ha. Ma, ọ bụkwa àjà maka mmehie nke ụwa dum, na-eme ka ndụ ebighị ebi kwe omume maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi!

Ị̀ ga-anọ ya n’April 4, 2004 iji mee ememe ncheta ọnwụ Jizọs? Ndịàmà Jehova ga-eme ememe a n’ụlọ nzukọ ha dị iche iche gburugburu ụwa. Ọ bụrụ na ị gaa, ị ga-erite uru site n’ige ntị n’okwu dị oké mkpa sitere na Bible. A ga-echetara gị ihe ndị Jehova Chineke na Jizọs Kraịst mewooro anyị. Ọ ga-abụkwa ihe na-enye afọ ojuju n’ụzọ ime mmụọ iso ndị nwere nsọpụrụ miri emi maka Chineke na Kraịst nakwa maka àjà mgbapụta Jizọs gbakọta. Ememe ahụ ga-ewusi nnọọ ọchịchọ gị nke ịbụ onye ga-anata obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ike, bụ́ nke ga-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịga. Bịa maka ememe a na-enye obi ụtọ nke na-ewetara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nsọpụrụ ma na-atọ ya ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 5]

E jikọtara ọnwụ Jizọs na ngosipụta abụọ kasịnụ nke ịhụnanya

[Foto dị na peeji nke 6]

Achịcha ahụ na-ekoghị eko na mmanya ahụ bụ ihe nnọchianya dabara adaba nke ahụ́ Jizọs na ọbara ọ wụfuru bụ́ ndị na-enweghị mmehie