Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Kwesịrị Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Maka Enyemaka?

Ànyị Kwesịrị Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Maka Enyemaka?

Ànyị Kwesịrị Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Maka Enyemaka?

ZIRI ezi ịkpọku ndị mmụọ ozi n’oge nsogbu? Ọtụtụ ndị na-eche otú ahụ. N’ezie, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “A na-ekpegara . . . ndị mmụọ ozi ekpere . . . ma, ọ bụ nanị n’echiche nke na ha pụrụ ịrịọchitere anyị arịrịọ n’ihu Chineke.” Ànyị kwesịrị ịkpọku ndị mmụọ ozi ka ha rịọchitere anyị arịrịọ?

Okwu Chineke kwuru nanị aha ndị mmụọ ozi Chineke kwesịrị ntụkwasị obi abụọ, bụ́ Maịkel na Gebriel. (Daniel 8:16; 12:1; Luk 1:26; Jud 9) Ebe ọ bụ na e dere aha ndị a na Bible, anyị na-aghọta na mmụọ ozi nke ọ bụla bụ onye bụ́ mmụọ pụrụ iche nke nwere aha, ọ bụghị nanị ike ma ọ bụ ikike na-abụghị onye. Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ jụrụ ikwu aha ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Jekọb rịọrọ otu mmụọ ozi ka o kwuo aha ya, ọ jụrụ ime otú ahụ. (Jenesis 32:29; Ndị Ikpe 13:17, 18) E nyeghị ndepụta nke aha ndị mmụọ ozi na Bible, si otú a na-egbochi ụmụ mmadụ ichebara ha echiche gabiga ókè.

Otu n’ime ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ bụ izi ụmụ mmadụ ozi ndị sitere n’aka Chineke. N’ezie, okwu Hibru na Grik mbụ a sụgharịrị ịbụ “mmụọ ozi” pụtara n’ụzọ nkịtị “onye ozi.” Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi adịghị eje ozi dị ka ndị ogbugbo bụ́ ndị na-ebuga ekpere ụmụ mmadụ n’ocheeze nke Onye Kasị Ihe Nile Elu. Chineke ekpebiwo na a ga na-ekpegara ya ekpere site n’aha Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ onye kwuru, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọrọ Nna m n’aha m, ọ ga-enye ya unu.”—Jọn 15:16; 1 Timoti 2:5.

Jehova Chineke adịghị mgbe ọ na-eji ọrụ n’aka gabiga ókè nke na ọ gaghị ege anyị ntị ma ọ bụrụ na anyị abịakwute ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Bible na-enye ihe mmesi obi ike a: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.