Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Ndị Mmadụ n’Ebe Ọrụ Ha

Ịchọta Ndị Mmadụ n’Ebe Ọrụ Ha

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịchọta Ndị Mmadụ n’Ebe Ọrụ Ha

GỊNỊ ka ndịozi bụ́ Matiu, Pita, Andru, Jems, na Jọn nwekọrọ ọnụ? Jizọs kpọrọ ha nile mgbe ha nọ n’ebe ọrụ ha. Pita, Andru, Jems, na Jọn nọ n’ọrụ ịkụ azụ ha mgbe Jizọs kpọrọ ha, na-asị: “Soronụ m.” Matiu nọ n’ụlọ nnakọta ụtụ mgbe a kpọrọ ya ka ọ bịa ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.—Matiu 4:18-21; 9:9.

Ịgbara ndị mmadụ àmà n’ebe ọrụ ha pụrụ ịbụ ihe na-akwụghachi ụgwọ. N’ịghọta nke a, Ndịàmà Jehova na Japan mere mgbalị siri ike na nso nso a ikere òkè n’akụkụ a nke ozi ahụ. Olee ihe ndị si na ya pụta? N’ime ọnwa ole na ole, e mere ọtụtụ puku nletaghachi, a malitekwara ihe ruru ọmụmụ Bible 250. Tụlee ahụmahụ ndị na-esonụ.

Otu onye ozi oge nile na Tokyo zutere manịja nke otu ụlọ nri bụ́ onye ya na otu Onyeàmà kwurịtara okwu ihe dị ka afọ 30 gara aga mgbe ọ bụ nwa akwụkwọ. Ọ bụ ezie na manịja ahụ aghọtaghị ihe ka ukwuu n’ihe ha kwurịtara n’oge ahụ, ọ malitere inwe mmasị na Bible. Ugbu a a tụtere mmasị ya, ọ nakweere ọmụmụ Bible n’egbughị oge bụ́ nke e ji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-eduzi. * Ọzọkwa, ọ malitere usoro nke ịgụ Bible n’onwe ya n’uhuruchi ọ bụla tupu ya alakpuo ụra.

Otu onye ozi bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche letara otu ọfịs. Ọ bụ ezie na manịja ọfịs ahụ anọghị ya, nwa agbọghọbịa nke zara fon manịja ahụ jụrụ, sị, “Ọ̀ ga-amasị gị ka mụ na gị kwurịta okwu?” Mgbe ha nwesịrị nkwurịta okwu dị nkenke na fon, nwanyị ahụ pụtara ma kwuo na ya nwere mmasị ịgụ Bible. Onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche mere ndokwa ịbịaghachi iwetara ya Bible, ọ malitekwaara ya ọmụmụ Bible, bụ́ nke ha na-anọ n’ogige ntụrụndụ dị nso n’ọfịs ahụ enwe n’isi ụtụtụ tupu nwanyị ahụ agawa ọrụ.

N’ọfịs ọzọ, otu nwoke hụrụ ka onye ọrụ ibe ya naara magazin Ụlọ Nche na Teta! ma tufuo ha ozugbo Onyeàmà ahụ pụrụ. Mgbe nwoke a laruru n’ụlọ, ọ gwara nwunye ya bụ́ Onyeàmà ihe ahụ merenụ ma kwuo na ọ bụrụ na ọ bụ ya na ya gaara egetụ ntị. Nwa ya nwanyị, bụ́ onye nụpeere ihe ahụ o kwuru, kọọrọ Onyeàmà na-eme nkwusa n’ógbè azụmahịa ahụ ihe ahụ papa ya kwuru. Onyeàmà ahụ letara di nwanyị ahụ ngwa ngwa n’ọfịs ma malitere ya ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, nwoke ahụ malitere ịbịachi nzukọ Sunday anya.

Ịgbara ndị mmadụ àmà n’ebe ọrụ ha ewetawo ọtụtụ abamuru ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị nkwusa na Japan enwewo nkà n’ime nletaghachi n’ebe azụmahịa, ụlọ mmepụta ihe, na n’ọfịs. Ọzọkwa, site n’ụzọ ịgba àmà a, e nwetawo ọtụtụ ndị na-adịghị ejekwa ozi ma malitere ha ọmụmụ ihe. E nwewo ihe ndị dị ịrịba ama si na ya pụta. Otu ọgbakọ dị n’ebe etiti Tokyo nyere ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible dị 108 na nso nso a, nke ahụ karịrị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ha nyere otu afọ gara aga.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.