Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

666—Ọ Bụghị Nanị Ihe Omimi

666—Ọ Bụghị Nanị Ihe Omimi

666—Ọ Bụghị Nanị Ihe Omimi

‘Ka onye ọ bụla ghara inwe ike ịzụ ma ọ bụ ire ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ, aha anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba nke aha ya. Ebe a ka a chọrọ amamihe: Ka onye nke nwere ọgụgụ isi gbakọọ nọmba nke anụ ọhịa ahụ, n’ihi na ọ bụ nọmba nke mmadụ; nọmba ya bụkwa narị isii na iri isii na isii.’—Mkpughe 13:17, 18.

Ọ BỤ isiokwu Bible ole na ole kpaliworo mmasị na nchegbu dị nnọọ ka amụma banyere akara ma ọ bụ aha bụ́ ihe omimi nke “anụ ọhịa ahụ”—nọmba ahụ bụ́ 666. Na telivishọn na Intanet, nakwa n’ihe nkiri sinima, akwụkwọ, na magazin dị iche iche, e nwewo ịkọ nkọ na-adịghị agwụ agwụ banyere akara anụ ọhịa ahụ.

Ụfọdụ ndị kweere na 666 bụ akara nke onye ahụ na-emegide Kraịst e kwuru okwu ya na Bible. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-anọchi anya akara e ji amata mmadụ nke a na-enye ná mmanye, dị ka egbugbu ma ọ bụ akụkụ ahụ́ electronic bụ́ microchip e tinyere n’ime ahụ́ mmadụ nke nwere ọnụ ọgụgụ a na-adịghị ahụ anya bụ́ nke na-eme ka mmadụ bụrụ ohu nke anụ ọhịa ahụ. Ndị ọzọkwa kweere na 666 bụ akara nke popu ndị Katọlik. N’iji ọnụ ọgụgụ e dere otú ndị Rom si ede ihe dochie anya mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’otu ụdị nke utu aha popu bụ́ Vicarius Filii Dei (Onye Nnọchianya Ọkpara Chineke) na ịgbakọtatụ ha, ha na-enweta 666. A na-azọrọkwa na a pụrụ ịgbakọta nọmba ahụ site n’aha Latin nke Eze Ukwu Rom bụ́ Diocletian nakwa site n’ụdị Hibru nke aha ahụ bụ́ Nero Siza. *

Otú ọ dị, nkọwa ndị a e chepụtara echepụta dị nnọọ iche n’ihe Bible n’onwe ya na-ekwu banyere akara anụ ọhịa ahụ, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ. Bible na-ekpughe na ndị nwere akara ahụ ga-enweta iwe Chineke mgbe ọ ga-eweta usoro ihe dị ugbu a ná njedebe. (Mkpughe 14:9-11; 19:20) Ya mere, ịghọta ihe 666 pụtara karịrị nnọọ ịkọwa otu ihe omimi na-akpali akpali. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova Chineke, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya na Isi Iyi nke ìhè ime mmụọ, ahapụghị ndị ohu ná mgbagwoju anya banyere ihe isiokwu a dị mkpa pụtara.—2 Timoti 3:16; 1 Jọn 1:5; 4:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Maka ntụle nke nkà ihe ọmụmụ nke iji anwansi akọwa nọmba, lee Teta! (Bekee), September 8, 2002.