Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka 1 Ndị Kọrint 10:8 ji na-ekwu na ndị Izrel 23,000 dara n’otu ụbọchị n’ihi ịkwa iko, ebe Ọnụ Ọgụgụ 25:9 na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ahụ dị 24,000?

E nwere ihe ole na ole pụrụ ịkpata ọdịiche ahụ e nwere n’ọnụ ọgụgụ e nyere n’amaokwu abụọ a. Nke kasị mfe pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ahụ kpọmkwem dị n’agbata 23,000 na 24,000, nke na a pụrụ ịsị na ọ bụ nke ọ bụla n’ime ha.

Tụlee ihe ọzọ pụrụ ịkpatawo ya. Pọl onyeozi kpọtụrụ ihe ndekọ banyere ndị Izrel na Shittim uche dị ka ihe atụ ịdọ aka ná ntị nye Ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie bụ́ obodo ukwu nwere aha ọjọọ n’ihi ụzọ ndụ ya rụrụ arụ. O dere, sị: “Ka anyị gharakwa ịnọgide na-akwa iko, dị ka ụfọdụ n’ime ha kwara iko, wee bụrụ ndị daranụ, puku iri abụọ na atọ n’ime ha n’otu ụbọchị.” N’ikwu kpọmkwem banyere ndị Jehova gburu n’ihi na ha kwara iko, Pọl nyere ọnụ ọgụgụ ha dị ka 23,000.—1 Ndị Kọrint 10:8.

Otú ọ dị, Ọnụ Ọgụgụ isi 25 na-agwa anyị na “Izrel wee kekọta onwe ya n’ahụ́ Bel-peoa: iwe Jehova wee dị ọkụ megide Izrel.” Mgbe ahụ, Jehova nyere Mozis iwu igbu “ndị isi nile nke ndị [ya].” Mozis n’aka nke ya, nyere ndị ikpe iwu imezu iwu ahụ. N’ikpeazụ, mgbe Fineas mere ngwa ngwa igbu onye Izrel ahụ kpọbatara otu nwanyị Midian n’ọmụma ụlọikwuu ahụ, ‘e gbochiri ihe otiti ahụ.’ Ihe ndekọ ahụ ji okwu a mechie: “Ndị nwụrụ n’ihe otiti ahụ dị puku mmadụ iri abụọ na anọ.”—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9.

O yiri ka ọnụ ọgụgụ ahụ e nyere n’Ọnụ Ọgụgụ ọ̀ gụnyere “ndị isi nile nke ndị [Izrel]” bụ́ ndị ndị ikpe gburu na ndị Jehova n’onwe ya gburu. O nwere ike ịbụ na ndị isi ahụ bụ́ ndị nwụrụ n’aka ndị ikpe ahụ dị otu puku, nke mere ka ọnụ ọgụgụ ha ruo 24,000. Ma ndị isi, ma ọ bụ ndị ndú a, hà kwara iko, sonye n’ememe ahụ, ma ọ bụ kwadoo ndị mere ya, ikpe mara ha n’ihi na ha “na-ekekọta onwe ha n’ahụ́ Bel-peoa.”

Banyere okwu ahụ bụ́ “na-ekekọta,” otu akwụkwọ ntụaka Bible na-ekwu na ọ pụrụ ịpụta “ikekọta onwe onye n’ahụ onye ọzọ.” Ndị Izrel bụ ndị raara onwe ha nye Jehova, ma mgbe ha ‘kekọtara onwe ha n’ahụ́ Bel-peoa,’ ha gbubiri mmekọrịta ha na Chineke nwere dị ka ndị raara onwe ha nye ya. Ka ihe dị ka afọ 700 gasịrị, site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Hozia, Jehova kwuru banyere ndị Izrel, sị: “Ha onwe ha bịakwutere Bel-peoa, kewapụta onwe ha nye ihere ahụ, ghọọ ihe arụ dị ka ihe ahụ ha hụrụ n’anya.” (Hosea 9:10) Ndị nile mere otú ahụ kwesịrị inweta ikpe ọmụma Chineke. N’ihi ya, Mozis chetaara ụmụ Izrel, sị: “Anya unu na-ahụ ihe ahụ nke Jehova mere n’okwu Bel-peoa: n’ihi na nwoke ọ bụla nke jesoro Bel-peoa, Jehova bụ́ Chineke gị, ekpochapụwo ya n’etiti gị.”—Deuterọnọmi 4:3.