Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Liberia—Mmụba Alaeze n’Agbanyeghị Agha

Liberia—Mmụba Alaeze n’Agbanyeghị Agha

Liberia—Mmụba Alaeze n’Agbanyeghị Agha

AGHA obodo akpaala mkpamkpa na Liberia ruo ihe karịrị afọ iri. Ka ọ na-erule n’etiti afọ 2003, ndị agha nnupụisi akwarawo mgbọ banye n’isi obodo ya bụ́ Monrovia. A manyere ọtụtụ Ndịàmà Jehova ịgbapụ n’ebe obibi ha, mgbe ụfọdụ ha emewo otú ahụ ugboro ugboro. A kwakọọrọ ihe onwunwe ndị mmadụ ugboro ugboro.

N’ụzọ dị mwute, e gburu ọtụtụ puku mmadụ mgbe ahụ a na-alụ ọgụ n’isi obodo ahụ. Abụọ n’ime ha bụ Ndịàmà, otu nwanna nwoke na otu nwanna nwanyị. Olee otú ụmụnna ndị ọzọ si nagide ihe isi ike ahụ, gịnịkwa ka e mere iji nyere ha aka?

Enyemaka Maka Ndị Nọ ná Mkpa

N’oge nsogbu a nile, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Liberia haziri ihe enyemaka maka ndị nọ ná mkpa. E wegara nri, ihe ndị dị mkpa e ji ebi n’ụlọ, na ọgwụ. N’oge ndị agha nnupụisi ahụ weghaara ọdụ ụgbọ mmiri, nri bịara kọọ ụkọ. Alaka ahụ ebuwo ụzọ hụ na ihe dị otú a ga-eme wee kwakọba ihe ndị dị mkpa maka puku Ndịàmà abụọ gbagara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dịgasị n’obodo ahụ. Ụmụnna ndị ahụ kere nri ahụ nke nta nke nta nke mere ka o zuoro ha ruo mgbe e mepekwara ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Alaka dị na Belgium na Sierra Leone jikwa ụgbọelu bubata ọgwụ, alaka ndị dị na Britain na France butekwara ákwà.

N’agbanyeghị ọnọdụ ndị a dị oké njọ, ụmụnna anyị nọgidere na-enwe nchekwube na ihu ọchị. Ihe otu onye gbapụrụ n’ụlọ ya ugboro atọ kwuru na-egosipụta uche nke ọtụtụ n’ime ha. Ọ sịrị: “Ndị a bụ ọnọdụ ndị anyị na-ekwusa banyere ha; anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ.”

Mmeghachi Omume n’Ebe Ozi Ọma ahụ Dị

N’agbanyeghị oké ọgba aghara dị n’obodo ahụ nile, Ndịàmà nọgidere na-arụpụta ihe ndị magburu onwe ha n’ubi. Na January 2003, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze e nwetụrụla nke bụ́ 3,879, na February kwa, ha duziri ọmụmụ Bible ebe obibi dị 15,227.

Ndị mmadụ na-adị ngwa imeghachi omume n’ozi ọma ahụ. Otu ihe atụ nke a sitere n’otu obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ. Otu ọgbakọ mere atụmatụ ime Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst n’otu nnukwu ime obodo bụ́ Bewahn, bụ́ ebe ga-ewe ihe dị ka awa ise iji ruo ya n’ụkwụ site n’ebe ha na-ezukọ. Tupu ụmụnna agawa n’obodo ahụ ịkpọ ndị mmadụ òkù maka Ememe Ncheta ahụ, ha nyere onyeisi obodo Bewahn akwụkwọ ịkpọ òkù. Mgbe ọ natara ya, o weere Bible ya, gakwuru ndị obodo, gụọrọ ha otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, na-agba ha ume ịbịa Ememe Ncheta ahụ. Ya mere, mgbe ndị nkwusa ahụ rutere, ha chọpụtara na a rụọrọla ha ọrụ ha! Onyeisi obodo ahụ na ụmụ ya, na ndị nwunye ya abụọ bịara Ememe Ncheta ahụ. Ná ngụkọta, mmadụ 27 bịara. Kemgbe ahụ, onyeisi obodo ahụ ahapụla Chọọchị Metọdist, malite iso Ndịàmà na-amụ ihe, nyekwa ala maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Mgbanwe Obi

Àgwà ụmụnna anyị sokwa gbanwee otú ụfọdụ ndị mmegide si ele eziokwu ahụ anya. Tụlee ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Opoku. Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche zutere ya n’ozi ubi ma nye ya otu magazin Ụlọ Nche. Opoku nwere mmasị n’otu isiokwu dị na magazin ahụ ma o jighị ego. Mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ kọwasịrị na a dịghị ere ya ere, ọ hapụụrụ ya magazin ahụ ma mee ndokwa ịlọghachi. Mgbe ọ bịara nletaghachi, Opoku jụrụ onye ọsụ ụzọ ahụ, sị: “Ị̀ maara onye m bụ? Ọtụtụ ndị òtù unu bi n’obodo Harper maara m. Ana m adị na-achụpụ ụmụ unu n’ụlọ akwụkwọ!” Ọ kọwaziri na ya bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ kọleji dị n’obodo ahụ nakwa na ya akpagbuwo ụmụ Ndịàmà Jehova n’ihi na ha adịghị ekele ọkọlọtọ.

Otú ọ dị, ngosipụta atọ nke ịhụnanya Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova mere ka Opoku lebagharịa omume ya anya. Nke mbụ, ọ hụrụ otú Ndịàmà si lekọta otu nwanna nwoke ime mmụọ ha bụ́ onye na-arịasi ọrịa ike. Ọbụna ha mere ndokwa ka ọ nata ọgwụgwọ ná mba dịdebere nke ha. Opoku cheburu na nwanna ahụ na-arịa ọrịa bụ “nnukwu mmadụ” n’etiti Ndịàmà ma mesịa chọpụta na ọ bụ nanị Onyeàmà nkịtị. Nke abụọ, n’afọ ndị 1990, Opoku bụ onye gbagara ọsọ ndụ na Côte d’Ivoire. Otu ụbọchị mgbe mmiri na-agụ ya, ọ gara ịzụrụ mmiri n’aka otu nwa okorobịa. Opoku ji akwụkwọ ego ọnụ ego ya buru ibu, nwa okorobịa ahụ enweghịkwa ụfọ ego ọ ga-enyeghachi ya, n’ihi ya, o nyere Opoku mmiri ahụ n’anaghị ya ego. Mgbe o nyere Opoku mmiri ahụ, nwa okorobịa ahụ jụrụ ya, sị: “Ị̀ na-eche na anyị ga-emesị hụ mgbe ndị dị ka mụ na gị ga na-enye ibe ha ihe n’anaghị ego?” Opoku gwara ya na ya na-eche na ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nwa okorobịa ahụ kwetakwara na ya bụ. Mmesapụ aka na obiọma nwanna nwoke a metụrụ ya n’ahụ́. N’ikpeazụ, njikere onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche dị ịhapụrụ ya magazin n’anaghị ya ego mere ka Opoku kweta na otú ya si ele Ndịàmà anya ezighị ezi, na ọ dịkwa mkpa ka ya mee mgbanwe. O nwere ọganihu ime mmụọ ma bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ugbu a.

Ọ bụ ezie na ụmụnna ndị nọ na Liberia nọgidere na-eche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu, ha tụkwasịrị Chineke obi ma jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ozi ọma nke ọnọdụ ndị ka mma n’okpuru ịchịisi ezi omume nke Alaeze Chineke. Jehova agaghị echefu ịrụsi ọrụ ike ha na ịhụnanya ha gosiri maka aha ya.—Ndị Hibru 6:10.

[Map ndị dị na peeji 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MONROVIA

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

N’oge nsogbu, ndị Jehova na-enye ndị nọ ná mkpa ma ihe enyemaka ime mmụọ ma nke anụ ahụ́