Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Gịnị na-egosi na Jizọs nwere ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị?

Bible kwuru otú ahụ na Matiu 13:55, 56 nakwa na Mak 6:3. Okwu Grik bụ́ (adelphos) a na-ahụ n’ebe ahụ, bụ́ nke a na-eji eme ihe “n’ụzọ na-apụta mmekọrịta n’ụzọ anụ ahụ́ ma ọ bụ n’ụzọ iwu, [adịghịkwa] ihe ọzọ ọ na-apụta ma ọ́ bụghị onye nne ji ya na mmadụ.” (The Catholic Biblical Quarterly, January 1992)—12/15, peeji nke 3.

Ụdị mgbanwe dị aṅaa ka a na-ahụ n’ọdịdị nke agha, gịnịkwa bụ isi ihe ndị kpataworo ha ọtụtụ mgbe?

N’ime afọ ndị na-adịbeghị anya, agha ndị wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ nhụjụanya na-abụkarị agha obodo—agha ndị na-adị n’etiti ụmụ amaala na-emegiderịta onwe ha n’otu mba. Ịkpọasị agbụrụ na nke ebo, esemokwu okpukpe, ikpe na-ezighị ezi na ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị socha n’ihe ndị na-akpata ya. Ihe ọzọ na-akpata ya bụ anyaukwu maka ikike na ego.—1/1, peeji nke 3-4.

Olee otú anyị si mara na Jizọs ebughị n’uche ka Ndị Kraịst na-ekpeghachi ekpere nlereanya ahụ dị ka ihe a na-agụ n’isi?

Jizọs nyere ihe nlereanya nke ekpere a n’Ozizi Elu Ugwu ya. Ihe dị ka ọnwa 18 ka nke ahụ gasịrị, o kwughachiri isi ihe ndị dị mkpa dị ná ntụziaka mbụ o nyere banyere ekpere. (Matiu 6:9-13; Luk 11:1-4) Otu ihe pụtara ìhè bụ na o kwughachighị ya kpọmkwem otú o si kwuo ya na mbụ, bụ́ nke na-egosi na ọ dịghị akụzi ekpere okpukpe a ga na-agụ n’isi.—2/1, peeji nke 8.

Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ebee ka nduru ahụ chọtara akwụkwọ osisi oliv o webatara n’ụgbọ ahụ?

Anyị amaghị otú nnu dịruru ná mmiri iju mmiri ahụ ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ya. Ma osisi oliv abụwo osisi a maara na ọ na-epuliteghachi ọbụna ka e gbutuchara ya. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ nagidere mmiri iju mmiri ahụ ma pupụta akwụkwọ ka e mesịrị.—2/15, peeji nke 31.

N’oge agha obodo Nigeria, ebe a nochibidoro Biafra, olee otú Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ahụ si nweta nri ime mmụọ?

E zigara otu onye ọrụ bekee ịrụ ọrụ na Europe, onye nke ọzọkwa na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọelu Biafra. Ha abụọ bụcha Ndịàmà. Ha wepụtara onwe ha maka ọrụ dị ize ndụ nke iwebata nri ime mmụọ na Biafra, si otú a mee ka ọtụtụ ụmụnna rite uru ruo mgbe agha ahụ biri na 1970.—3/1 peeji nke 27.

Gịnị ka Udo Westphalia rụpụtara, oleekwa otú aka okpukpe si banye na ya?

Ndozigharị ahụ kewara Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ gaa n’okpukpe atọ—Katọlik, Lutheran, na nke Calvin. E hiwere Òtù Protestant na Njikọ Katọlik ná mmalite narị afọ nke 17. Mgbe ahụ, esemokwu okpukpe malitere na Bohemia ma gbasaa ghọọ nsọrịta mpi maka ike ọchịchị n’etiti mba dị iche iche. Ndị ọchịchị bụ́ ndị Katọlik na ndị nke Protestant, sọrịtara mpi inweta ike ọchịchị na uru ahịa. N’ikpeazụ, e nwere okwu udo n’ógbè Westphalia nke Germany. Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise gasịrị, a bịanyere aka n’Akwụkwọ Nkwekọrịta Udo Westphalia na 1648, na-eweta Agha Afọ Iri Atọ ahụ ná njedebe, na-akakwa akara nguzobe nke Europe nke oge a dị ka kọntinent nwere ọtụtụ mba ndị kwụụrụ onwe ha.—3/15, peeji nke 20-23.

Olee ihe akara, ma ọ bụ aha, “anụ ọhịa ahụ” pụtara—nọmba ahụ bụ́ 666?

A kpọtụrụ akara a aha ná Mkpughe 13:16-18. Anụ ọhịa ahụ pụtara ọchịchị ụmụ mmadụ, anụ ọhịa ahụ inwekwa “nọmba nke mmadụ” na-egosi na ọchịchị dị iche iche na-egosipụta ọnọdụ nke ụmụ mmadụ dara ada. Nọmba ahụ bụ́ 6 a gbakwụnyere 60, gbakwụnyekwa ya 600 na-egosi na o rughị eru ma ọlị n’anya Chineke. Ndị nwere akara a na-enye mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị nsọpụrụ n’ụdị ofufe, ma ọ bụ na-elegara ya anya maka nzọpụta.—4/1, peeji nke 4-7.