Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi

Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi

Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi

“Ihe na-eme ka a na-achọsi mmadụ ike bụ ebere [ma ọ bụ, “obiọma”] ya.”—ILU 19:22.

1. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji sie ike igosipụta obiọma?

Ị̀ NA-ELE onwe gị anya dị ka onye nwere obiọma? Ọ bụrụ otú ahụ, ibi n’ụwa nke taa pụrụ ịbụ ihe siri ike. N’eziokwu, a kọwara obiọma n’ime Bible dị ka ihe so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” ma gịnị mere o ji esi oké ike igosipụta obiọma ọbụna ná mba ndị a na-asị na ha bụ nke Ndị Kraịst? (Ndị Galeshia 5:22) Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, a pụrụ inwetatụ azịza ya n’ihe Jọn onyeozi dere—ụwa dum dị n’ike aka nke mmụọ ahụ na-enweghị obiọma, bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Jizọs Kraịst kọwara Setan dị ka “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) Ya mere, ụwa a na-achọ iyi onye ọchịchị ya na-enupụ isi, bụ́ onye e ji àgwà ọjọọ mara.—Ndị Efesọs 2:2.

2. Olee ihe ịma aka ndị pụrụ imetụta anyị igosipụta obiọma?

2 Ọ na-emetụta ndụ anyị n’ụzọ dị njọ mgbe ndị ọzọ mesoro anyị ihe n’ụzọ na-adịghị egosi obiọma. Omume enweghị obiọma ahụ pụrụ isite n’aka ndị agbata obi na-ebu iro, ndị a na-amaghị ama na-enweghị omume enyi, ọbụna site n’aka ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị pụrụ, mgbe ụfọdụ, ime ihe n’echeghị echiche. Nrụgide nke iso ndị na-enweghị àgwà ọma na ndị na-eti mkpu ma na-akpọ iyi emekọ ihe na-akpatakarị nkụda mmụọ dị ukwuu. Ndị ọzọ ịghara igosi anyị obiọma pụrụ ime ka anyị onwe anyị ghara inwe omume enyi, anyị pụkwara ịchọ iji omume enweghị obiọma kwụọ ụgwọ omume enweghị obiọma. Nke ahụ pụrụ ọbụna iduga ná nsogbu ahụ́ ike ime mmụọ ma ọ bụ nke anụ ahụ́.—Ndị Rom 12:17.

3. Nsogbu ndị siri ike dị aṅaa ka ndị mmadụ na-eche ihu nke na-etinye ịdị njikere ha igosipụta obiọma n’ule?

3 Ọnọdụ ụwa ndị na-akpata nchekasị pụkwara ime ka o siere anyị ike igosipụta obiọma. Dị ka ihe atụ, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu na-enwe nchekasị n’ihi iyi egwu nke ndị na-eyi ọha egwu na ihe ndị ha na-eme, tinyere egwu na mba dịgasị iche iche pụrụ iji nje ndị na-akpata ọrịa bụ́ ndị a pụrụ iji lụọ agha ma ọ bụ ngwá agha nuklia mee ihe. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ nde mmadụ dara ogbenye, na-enwe nanị obere nri, ụlọ, uwe, na nlekọta ahụ́ ike iji dị ndụ. Ịchụso obiọma na-aghọ ihe ịma aka mgbe ọnọdụ yiri ihe olileanya na-adịghị na ya.—Eklisiastis 7:7.

4. Ná nkwubi okwu dị aṅaa na-ezighị ezi ka ụfọdụ pụrụ iru mgbe ha na-eche banyere igosi ndị ọzọ obiọma?

4 Mmadụ pụrụ ikwubi n’ụzọ dị mfe na igosipụta obiọma abụghị nnọọ ihe kasị mkpa, ọbụna na ọ pụrụ ịbụ mgbaàmà nke adịghị ike. Ọ pụrụ iche na a na-emegbu ya, karịsịa mgbe ndị ọzọ mesoro ya omume n’echebaraghị mmetụta ya echiche. (Abụ Ọma 73:2-9) Otú ọ dị, Bible na-enye anyị nduzi kwesịrị ekwesị mgbe ọ na-asị: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ịdị nwayọọ na obiọma bụ akụkụ abụọ nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ́ ndị nwere njikọ chiri anya ma dị irè mgbe a na-eche ọnọdụ ndị siri ike ma na-ama aka ihu.

5. Olee akụkụ ụfọdụ ná ndụ bụ́ ebe ndị a chọrọ obiọma?

5 Ebe ọ bụ na igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke dị anyị oké mkpa dị ka Ndị Kraịst, ọ dị mma anyị ịtụle otú anyị pụrụ isi na-egosipụta otu n’ime àgwà ndị ahụ—obiọma. Ò kwere omume ịchụso obiọma n’ụwa nke na-enweghị omume enyi? Ọ bụrụ otú ahụ, olee akụkụ ụfọdụ ebe ndị anyị pụrụ igosi na anyị adịghị ekwe ka mmetụta Setan belata obiọma anyị, karịsịa n’ọnọdụ ndị na-akpata nchekasị? Ka anyị tụlee ịchụso obiọma n’ime ezinụlọ, n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ndị agbata obi anyị nọ, n’ozi anyị, na n’etiti ndị kwere ekwe ibe anyị.

Obiọma n’Ime Ezinụlọ

6. N’ihi gịnị ka obiọma ji dị oké mkpa n’ime ezinụlọ, oleekwa otú a pụrụ isi na-egosipụta ya?

6 Iji nweta ngọzi na nduzi Jehova, mkpụrụ nke mmụọ nsọ dị oké mkpa ma chọọ ka a zụlite ya n’ụzọ zuru ezu. (Ndị Efesọs 4:32) Ka anyị lekwasị anya ná mkpa ọ dị karịsịa ka ndị òtù ezinụlọ na-egosirịta ibe ha obiọma. N’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, di na nwunye kwesịrị igosirịta mmụọ obiọma na nlekọta n’ebe ibe ha nọ nakwa n’ebe ụmụ ha nọ. (Ndị Efesọs 5:28-33; 6:1, 2) Ọ dị mkpa ka obiọma dị otú ahụ pụta ìhè n’otú ndị òtù ezinụlọ si agwarịta ibe ha okwu, ụmụ ana-asọpụrụ ma na-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù, ndị mụrụ ụmụ ana-emesokwa ụmụ ha ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ngwa ịja mma, adịla ngwa ịkatọ akatọ.

7, 8. (a) Ụdị àgwà dị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere ma ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta ezi obiọma n’ime ezinụlọ? (b) Olee otú ezi nkwurịta okwu si atụnye ụtụ ná nkekọ ezinụlọ siri ike? (ch) Olee otú ị pụrụ isi na-egosipụta obiọma n’ime ezinụlọ gị?

7 Igosi ndị nọ n’ezinụlọ anyị obiọma na-agụnye ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “Wepụnụ ha nile n’ezie n’ebe unu nọ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” Kwa ụbọchị, ndị ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iso ibe ha na-ekwurịta okwu n’ụzọ na-egosi nkwanye ùgwù. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nkwurịta okwu bụ isi sekpụ ntị n’ezinụlọ siri ike. Mgbe e nwere nghọtahie, iji dozie esemokwu ahụ, gbalịa idozi nsogbu ahụ kama imeri n’arụmụka. Ndị òtù ezinụlọ nwere obi ụtọ na-agbalịsi ike ịkwalite obiọma na nchebarịtara echiche.—Ndị Kọlọsi 3:8, 12-14.

8 Obiọma bụ àgwà dị mma na nke na-eme ka anyị chọọ imere ndị ọzọ ihe ọma. N’ihi ya, anyị na-achọ ịbụ ndị bara uru, ndị na-echebara ndị ọzọ echiche, nakwa ndị na-enyere ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ aka n’ụzọ dị nro. Ọ na-achọ ma mgbalị onwe onye ma nke a gbakọtara aka mee iji na-egosipụta ụdị obiọma nke na-ewetara ezinụlọ aha ọma. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na ha ga-enweta ngọzi Chineke kama, n’ọgbakọ na n’ógbè ha, ha ga-ewetara Chineke nke obiọma, bụ́ Jehova, nsọpụrụ.—1 Pita 2:12.

Obiọma n’Ebe Ọrụ

9, 10. Kọwaa nsogbu ụfọdụ pụrụ ibilite n’ebe ọrụ ma kwuo otú a pụrụ isi jiri obiọma dozie ha.

9 Nye Onye Kraịst, usoro ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị n’ebe ọrụ pụrụ iweta ihe ịma aka n’igosi ndị ọrụ ibe ya obiọma. Nsọrịta mpi n’etiti ndị ọrụ pụrụ ime ka ndị ọrụ ibe mmadụ bụ́ ndị na-aghọ aghụghọ tinye ọrụ ya n’ihe ize ndụ, si otú ahụ mebie aha ọma onye ahụ nwere n’ebe onye were ya n’ọrụ nọ. (Eklisiastis 4:4) Ọ naghị adị mfe igosipụta obiọma n’oge ndị dị otú ahụ. Otú o sina dị, iburu n’uche na ihe na-egosipụta obiọma na-abụkarị ihe kasị mma ime, ohu Jehova kwesịrị ịgbalịsi ike ruo n’ókè o kwere ya mee irite ndị ọ na-esi ike imeta mma n’uru. Igosi nchebara echiche pụrụ inye aka na nke a. Ikekwe ị pụrụ igosi nchebara echiche ma ọ bụrụ na onye ọrụ ibe gị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee onye òtù ezinụlọ na-arịa ọrịa. Ọbụna ịjụ banyere ọdịmma ya pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ebe onye nke ọzọ nọ. Ee, Ndị Kraịst aghaghị ịgbalị ịkwalite nkwekọ na udo ruo nnọọ n’ókè o kwere ha mee. Mgbe ụfọdụ, okwu obiọma nke na-egosi mmasị na nchebara echiche ga-enye aka n’ọnọdụ ahụ.

10 N’oge ụfọdụ, onye were mmadụ n’ọrụ pụrụ ịmanye ndị ọrụ ya ịnakwere echiche ya, ọ pụkwara ịchọ ka mmadụ nile kere òkè n’ihe omume ụfọdụ nke ịhụ mba n’anya ma ọ bụ n’ememe na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe akọ na uche Onye Kraịst na-ekweghị ya kere òkè, nke a pụrụ iduga n’esemokwu. N’oge ahụ, o nwere ike ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ikwuwe ogologo okwu banyere otú ọ ga-adịru ná njọ ikwenye n’ihe onye ahụ were gị n’ọrụ kwuru. E kwuwerị, nye ndị ahụ na-ekweghị na nkwenkwe Ndị Kraịst, ihe ahụ a na-eme pụrụ iyi ihe ziri ezi ime. (1 Pita 2:21-23) Ikekwe, ị pụrụ iji obiọma kọwaa ihe ndị mere na ị gaghị ekere òkè. Ejila okwu mkparị akwụ ụgwọ okwu mkparị. Ọ dị mma Onye Kraịst ịgbaso ndụmọdụ ọma ahụ dị ná Ndị Rom 12:18: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.”

Obiọma n’Ụlọ Akwụkwọ

11. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ndị na-eto eto na-eche ihu n’igosi ụmụ akwụkwọ ibe ha obiọma?

11 Ọ pụrụ ịbụ ezigbo ihe ịma aka nye ndị na-eto eto igosi ụmụ akwụkwọ ibe ha obiọma. Ndị na-eto eto na-achọkarị ka ụmụ akwụkwọ ibe ha nabata ha. Ụmụ okoro ụfọdụ na-eme ihe ike ike iji mee ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ebe ha nọ, na-eru n’ókè nke iji ike ha emegbu ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ. (Matiu 20:25) Ndị na-eto eto ndị ọzọ na-enwe mmasị igosi nkà ha n’agụmakwụkwọ, n’egwuregwu, ma ọ bụ n’ihe omume ndị ọzọ. N’igosipụta nkà ha, ha na-emesokarị ụmụ klas ibe ha na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ihe n’ụzọ na-adịghị egosi obiọma, na-eche n’ụzọ hiere ụzọ na nke a n’onwe ya na-eme n’ụzọ ụfọdụ ka ha ka ndị ọzọ. Onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst ga-akpachara anya ịghara iṅomi ndị dị otú ahụ. (Matiu 20:26, 27) Pọl onyeozi kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma” nakwa na ịhụnanya “adịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” N’ihi ya, iwu ji Onye Kraịst ịgbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’otú o si emeso ụmụ akwụkwọ ibe ya ihe, ọ bụghị ịgbaso ihe nlereanya ọjọọ nke ndị ahụ na-adịghị egosi obiọma.—1 Ndị Kọrint 13:4.

12. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji bụrụ ihe ịma aka nye ndị na-eto eto igosi ndị nkụzi ha obiọma? (b) Ònye ka ndị na-eto eto pụrụ ilegara anya maka enyemaka mgbe a rụgidere ha ime ihe n’ụzọ na-adịghị egosipụta obiọma?

12 Ndị na-eto eto kwesịkwara iji obiọma na-emeso ndị nkụzi ha ihe. Ọ na-atọ ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ụtọ ịkpasu ndị nkụzi ha iwe. Ha na-eche na ha wara anya mgbe ha hapụrụ ịkwanyere ndị nkụzi ha ùgwù site n’itinye aka n’ihe omume ndị na-emebi iwu ụlọ akwụkwọ. Site n’ịkakwasị ndị ọzọ anya, ha pụrụ ime ka ha sonyere ha. Mgbe onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst jụrụ isonyere ha, ọ pụrụ ịbụ onye a ga-akwa emo ma ọ bụ mesoo mmeso ọjọọ. Iche ọnọdụ ndị dị otú ahụ ihu n’otu afọ agụmakwụkwọ pụrụ itinye mkpebi Onye Kraịst mere ịdị na-egosipụta obiọma n’ule. Otú ọ dị, buru n’uche otú ọ dịruru mkpa ịbụ ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe. Jide n’aka na ọ ga-enyere gị aka site na mmụọ ya n’oge ndị a siri ike ná ndụ.—Abụ Ọma 37:28.

Obiọma n’Ebe Ndị Agbata Obi Nọ

13-15. Olee ihe ndị pụrụ igbochi mmadụ igosi ndị agbata obi ya obiọma, oleekwa otú a pụrụ isi merie ihe ịma aka ndị a?

13 Ma ì bi n’otu ọnụ ụlọ, n’ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ, ma ọ bụ n’ebe ọzọ, ị pụrụ iche echiche ụzọ ndị ị pụrụ isi na-egosipụta obiọma na nchebara echiche n’ọdịmma nke ndị agbata obi gị. Ọzọkwa, nke a anaghị adị mfe mgbe nile.

14 Gịnị ma ọ bụrụ na ndị agbata obi gị nwere ajọ mbunobi n’ebe ị nọ n’ihi agbụrụ, mba, ma ọ bụ okpukpe gị? Gịnị ma ọ bụrụ na ha na-akpaso gị àgwà ọjọọ mgbe ụfọdụ ma ọ bụ na-eleghara gị anya kpam kpam? Dị ka ohu Jehova, igosipụta obiọma ruo n’ókè o kwere mee ga-aba uru. Ị ga-adị nnọọ iche dị ka onye na-enye ume ọhụrụ, bụ́ ihe na-ewetara Jehova otuto n’ezie—onye bụ́ onye nlereanya n’igosipụta obiọma. Ị maghị ma onye agbata obi gị ọ̀ ga-agbanwe àgwà ya n’ihi obiọma gị. Ọ pụrụ ọbụna ịghọ onye na-eto Jehova.—1 Pita 2:12.

15 Olee otú a pụrụ isi gosipụta obiọma? Otu ụzọ bụ site n’àgwà a na-akpa n’ime ezinụlọ ka mmadụ nile na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ndị agbata obi pụrụ ịhụ nke a. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe ike imere onye agbata obi gị ihe ọma. Cheta na obiọma pụtara inwe mmasị miri emi n’ọdịmma nke ndị ọzọ.—1 Pita 3:8-12.

Obiọma n’Ozi Anyị

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka obiọma ji dị mkpa n’ozi anyị na-eje maka ọha? (b) Olee otú a pụrụ isi na-egosipụta obiọma n’akụkụ dịgasị iche iche nke ozi ubi?

16 E kwesịrị iji obiọma mara ozi Ndị Kraịst anyị ka anyị na-eme mgbalị siri ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ ha, n’ebe ọrụ ha, na n’ebe ọha na eze na-anọ. Anyị kwesịrị icheta na anyị na-anọchi anya Jehova, onye na-egosipụta obiọma mgbe nile.—Ọpụpụ 34:6.

17 Olee ihe ndị a gụnyere ná mgbalị gị igosipụta obiọma n’ozi gị? Dị ka ihe atụ, ka ị na-agba àmà okporo ámá, ị pụrụ igosipụta obiọma site n’igbu ya nkenke ma na-echebara ndị mmadụ echiche ka ị na-agakwuru ha. Akụkụ ụzọ na-ejupụtakarị ná ndị ji ụkwụ aga, ya mere, na-elezi anya ka ị ghara ịnọchi ụzọ. Ọzọkwa, mgbe ị na-agba àmà n’ógbè azụmahịa, gosipụta obiọma gị site n’igbu ya nkenke, na-echeta na ndị na-ere ahịa ga-eresị ndị bịara ịzụ ihe ahịa.

18. Olee òkè iji akọ eme ihe na-ekere n’igosipụta obiọma n’ozi anyị?

18 Na-eji akọ eme ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ. Anọla ọdụ gabiga ókè, karịsịa ma ọ bụrụ na ihu igwe adịghị mma. Ị̀ pụrụ ịchọpụta mgbe ike gwụwara onye ị bịara na nke ya ma ọ bụ ọbụna mgbe ọnụnọ gị gbakasịwara ya ahụ́? Ikekwe n’akụkụ ụwa ebe i bi, Ndịàmà Jehova na-abịakarị mgbe mgbe. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, na-egosi nchebara echiche n’ụzọ pụrụ iche, na-egosipụta obiọma ma na-enwe omume enyi mgbe nile. (Ilu 17:14) Gbalịa ịghọta ihe mere onye nwe ụlọ ji ghara ige ntị n’ụbọchị ahụ. Cheta na otu n’ime ụmụnna gị Ndị Kraịst ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị yikarịrị ka ọ̀ ga-aga n’ụlọ ahụ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na i zute onye na-akparị mmadụ, tinye mgbalị pụrụ iche igosipụta obiọma. Ekwela ka olu gị laa elu ma ọ bụ gbarụọ ihu gị, kama kwuo okwu n’ụzọ dị nwayọọ. Onye Kraịst nwere obiọma adịghị achọ ịdọba onye nwe ụlọ n’ịgba égbè ọnụ. (Matiu 10:11-14) Ikekwe onye ahụ ga-ege ntị n’ozi ọma ahụ n’ụbọchị ọzọ.

Obiọma ná Nzukọ Ọgbakọ

19, 20. N’ihi gịnị ka obiọma ji dị mkpa n’ọgbakọ, oleekwa otú a pụrụ isi na-egosipụta ya?

19 Ọ dịkwa mkpa igosi ndị kwere ekwe ibe anyị obiọma. (Ndị Hibru 13:1) Ebe anyị bụ akụkụ nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, obiọma dị mkpa ná mmeso anyị na-emeso ibe anyị.

20 Ọ bụrụ na ọgbakọ so otu ọgbakọ, ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị, eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ọ bụ ihe dị mkpa iji obiọma na-emeso ndị nọ n’ọgbakọ ndị nke ọzọ ihe, na-akwanyere ha ùgwù n’otú i si emeso ha ihe. Nsọrịta mpi adịghị ekwe ka a rụkọọ ọrụ ọnụ mgbe a bịara n’ịhazi oge ndị e ji enwe nzukọ nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa dị ka idebe ihe ọcha ma ọ bụ nrụzigharị. Nwee obiọma ma na-echebara ndị ọzọ echiche ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ndịrịta iche nke echiche. N’ụzọ dị otú a, obiọma ga-ejupụta ebe nile, Jehova ga-agọzikwa n’ezie mmasị ị na-egosi n’ọdịmma nke ndị ọzọ.

Nọgide Na-egosipụta Obiọma

21, 22. N’ikwekọ ná Ndị Kọlọsi 3:12, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?

21 Obiọma bụ àgwà nke na-emetụta akụkụ nile nke ndụ anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka ọ bụrụ akụkụ dị mkpa nke àgwà Ndị Kraịst anyị. Igosi ndị ọzọ obiọma kwesịrị ịghọ àgwà anyị.

22 Ka anyị nile na-egosi ndị ọzọ obiọma kwa ụbọchị ma si otú ahụ na-etinye n’ọrụ n’otu n’otu okwu Pọl onyeozi bụ́: “Dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị dị nsọ a hụkwara n’anya, yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị na-eme ka ọ na-esiri Onye Kraịst ike igosipụta obiọma?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa mmadụ igosipụta obiọma n’ime ezinụlọ ya?

• Olee ụfọdụ ihe ịma aka ndị na-eme ka ọ na-esi ike igosipụta obiọma n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, na n’ebe ndị agbata obi nọ?

• Kọwaa otú Ndị Kraịst pụrụ isi na-egosipụta obiọma n’ozi ha na-eje maka ọha.

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Mmadụ nile nọ n’ime ezinụlọ igosipụta obiọma na-akwalite ịdị n’otu na ịrụkọ ọrụ ọnụ

[Foto dị na peeji nke 19]

Ị pụrụ igosipụta obiọma mgbe onye ọrụ ibe gị ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ ya dara ọrịa

[Foto dị na peeji nke 20]

Jehova na-akwado ndị ji iguzosi ike n’ihe na-egosipụta obiọma n’agbanyeghị ịkwa emo

[Foto dị na peeji nke 21]

Inyere onye agbata obi nọ ná mkpa aka bụ igosipụta obiọma