Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi n’Etiti Ndị Na-asụ Bekee na Mexico

Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi n’Etiti Ndị Na-asụ Bekee na Mexico

Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi n’Etiti Ndị Na-asụ Bekee na Mexico

N’IJI oge o ji na-eche ndị ha na ya so eme njem n’Atens mee ihe, Pọl onyeozi gbara àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi. Bible na-akọ, sị: ‘Ọ malitere kwa ụbọchị n’ọma ahịa iso ndị ọ dabara na ọ hụrụ na-atụgharị uche.’ (Ọrụ 17:17) Mgbe o si Judia na-aga Galili, Jizọs gbaara nwanyị Sameria àmà n’akụkụ olulu mmiri mgbe ọ na-anọghị n’ozi. (Jọn 4:3-26) Ị̀ na-eji ohere ọ bụla ekwu banyere oziọma Alaeze Chineke?

A na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma n’ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi n’etiti ndị na-asụ Bekee na Mexico. Ndị na-eme njem nleta na-eje eleta ebe ezumike, ụmụ akwụkwọ mahadum na-abịa ma na-ala, ndị ala ọzọ nọ ezumike nká na Mexico na-agakarịkwa n’ogige ntụrụndụ na n’ụlọ nri. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova maara asụ Bekee enwewo nkà n’ụzọ ha na ndị dị otú ahụ ga-esi malite mkparịta ụka. N’ezie, ha na-achọ ohere iji gwa onye ọ bụla yiri onye ala ọzọ ma ọ bụ onye na-asụ Bekee okwu. Ka anyị hụ ka ha si eme ya.

Ọtụtụ mgbe, nanị ihe ndị si mba ọzọ bụ́ ndị na-agbara ndị na-asụ Bekee àmà na-eme bụ ịkọwara ndị o doro anya na ha si ala ọzọ onwe ha ma jụọ ha ebe ha si bịa. Nke a na-edugakarị n’ịjụ ihe Onyeàmà ahụ na-eme na Mexico, na-enyekwa ya ohere ikwu banyere nkwenkwe Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Gloria, bụ́ onye na-eje ozi ebe e nwere mkpa ka ukwuu n’etiti ndị na-asụ Bekee n’Oaxaca, chọpụtara na ọ na-adị nnọọ mfe ịmalite mkparịta ụka n’ụzọ a. Mgbe o si n’ebe ezumezu obodo ahụ bụ́ ebe ọ nọ mee nkwusa mgbe ọ na-anọghị n’ozi na-alọta, otu di na nwunye si England kwụsịrị Gloria. Nke nwanyị tiri mkpu, sị: “Apụghị m ikweta na m na-ahụ nwanyị isi ojii n’okporo ámá Oaxaca!” Kama iwe iwe, Gloria chịrị ọchị, ha malitekwara ịkpa nkata banyere ihe ọ bịara ime na Mexico. Nwanyị ahụ gwara Gloria ka ọ bịa n’ebe obibi ya ṅụọ kọfị. Ka ha yichara agba, Gloria nyere ya magazin Ụlọ Nche na Teta!, ma nwanyị ahụ jụrụ, na-asị na ya bụ onye na-ekweghị na Chineke dị. Gloria gwara ya na ya na-enwe obi ụtọ ịgwa ndị na-ekweghị na Chineke dị okwu, nakwa na ya ga-achọ ịnụ ihe bụ́ echiche ya n’isiokwu magazin ahụ bụ́ “Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe—Hà Dị Anyị Mkpa?” Nwanyị ahụ naara ya, na-asị: “Ọ bụrụ na i mee ka m kweta, mgbe ahụ ị rụpụtala ihe n’ezie.” Ha nwere ọtụtụ mkparịta ụka ndị mara mma mgbe ha nọkọrọ ṅụọ kọfị. Di na nwunye ahụ mesịrị laghachi England, ma nkwurịta okwu ha nọgidere na-aga n’ihu site n’ozi electronic.

Gloria malitekwara iso Saron, bụ́ nwa akwụkwọ si Washington, D.C., na-enwe nkwurịta okwu bụ́ onye so ụmụ nwanyị obodo ahụ na-arụ ọrụ afọ ofufo n’Oaxaca iji nwetazuo akara ugo mmụta master ya. Ka ọ jasịrị Saron mma maka ọrụ ọma ya, Gloria kọwaara ya ihe ọ na-eme na Mexico. Nke a dugara ná mkparịta ụka dị mma banyere Bible na ihe Chineke ga-emere ọ bụghị nanị ndị ogbenye kamakwa mmadụ nile. Saron kwuru na ọ bụ ihe na-eju anya na ọ bụ ezie na ya na Ndịàmà ekwutụbeghị okwu na United States, otu n’ime ndị mbụ ya matara na Mexico bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova! Saron kwetara ịmụ Bible ma malite ịbịa nzukọ Ndị Kraịst ozugbo.

Ọtụtụ ndị ala ọzọ akwagala n’ebe ezumike dị n’akụkụ mmiri na Mexico, na-achọ inwe mmetụta nke ịnọ na paradaịs. Laurel na-eji nke a amalite mkparịta ụka n’Acapulco, na-ajụ ndị mmadụ ma Acapulco ò yiri paradaịs karịa ebe ha si bịa, na-ajụkwa ihe na-amasị ha banyere ya. Mgbe ahụ, ọ na-akọwa na n’oge na-adịghị anya, ụwa nile ga-abụ ezigbo paradaịs. Ụzọ mkparịta ụka a dugara n’ọmụmụ Bible nke ya na otu nwanyị Canada o zutere n’ọfịs onye na-agba ụmụ anụ ọgwụ. Ụzọ njekwu yiri nke a ọ̀ pụrụ ịdị irè n’ebe i bi?

ʽN’okporo Ámá na n’Ámá Obodo’

Ọtụtụ oge, a na-amalite mkparịta ụka n’okporo ámá na n’ámá obodo site n’ịjụ, sị: “Ị̀ na-asụ Bekee?” Ọtụtụ ndị Mexico na-asụ Bekee n’ihi ọrụ ha ma ọ bụ n’ihi na ha ebitụla na United States.

Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà jekwuuru otu agadi nwanyị bụ́ onye otu nọọsụ na-akwagharị n’oche nkwagharị. Ha jụrụ nwanyị ahụ ma ọ̀ na-asụ Bekee. O kwuru na ya na-asụ n’ihi na ya biri na United States ọtụtụ afọ. Ọ natara Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ ndị ọ na-agụtụbeghị mbụ ma nye ha aha ya, bụ́ Consuelo, na adres ya. Mgbe ha jere ileta ya ka ụbọchị anọ gasịrị, ha chọpụtara na ebe ahụ bụ ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike bụ́ nke ndị nọn Katọlik na-elekọta. Na mbụ, o siri ike inweta Consuelo n’ihi na ndị nọn ahụ na-enyo ha enyo ma kwuo na Consuelo apụghị ịnabata ha. Di na nwunye ahụ rịọrọ ndị nọn ahụ ka ha gwa Consuelo na ha bịara, chọọkwa ikele ya. Consuelo gwara di na nwunye ahụ ka ha batawa. Kemgbe ahụ, nwanyị a dị afọ 86 anọwo na-eji ọṅụ na-enwechi ọmụmụ Bible anya, n’agbanyeghị okwu ọjọọ ndị nọn ahụ na-ekwu. Ọ bịakwala ụfọdụ nzukọ Ndị Kraịst.

Ilu 1:20 na-ekwu, sị: “Amamihe na-eti mkpu n’èzí; N’ámá nile ka ọ na-eme ka olu ya daa ụda.” Rịba ama ka nke ahụ si mee n’ámá obodo nke San Miguel de Allende. N’isi ụtụtụ otu ụbọchị, Ralph jekwuuru otu nwoke na-akatachabeghị ahụ́ bụ́ onye nọ ọdụ na bench. O juru nwoke ahụ anya nke ukwuu na e nyere ya Ụlọ Nche na Teta!, ọ kọkwaara Ralph akụkọ ndụ ya.

Ọ bụ onye so lụọ agha Vietnam bụ́ onye nwere mkpaghasị uche n’ihi nrụgide mmetụta uche o nwere n’ihi ịhụ ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’oge ije ozi agha ya. E si n’ihu agha kpọga ya n’ogige ndị agha. N’ebe ahụ, e kenyere ya ọrụ ịsa ozu ndị agha nwụrụ anwụ iji kwado ha maka iji ụgbọ mmiri bulaa ha United States. Ugbu a, ka afọ 30 gasịrị, ọ ka na-arọ nrọ ọjọọ mgbe mgbe ma na-atụ nnọọ egwu. N’ụtụtụ ahụ, ka ọ nọ ọdụ n’ámá ahụ, ọ nọ na-ekpe ekpere n’obi ya maka enyemaka.

Onye ahụ so lụọ agha naara akwụkwọ ndị ahụ, nakwerekwa ịkpọ òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka ọ bịasịrị nzukọ, o kwuru na n’ime awa abụọ ahụ ya nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya nwere udo nke mbụ ya n’ime afọ 30. Nwoke a nọrọ na San Miguel de Allende nanị izu ole na ole, ma e duziiri ya ọtụtụ ọmụmụ Bible, ya agaakwa nzukọ nile ruo mgbe ọ lara. E mere ndokwa ka ọmụmụ ihe ya na-aga n’ihu.

Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi n’Ebe Ọrụ na n’Ụlọ Akwụkwọ

Ị̀ na-eme ka a mata gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ebe ị na-arụ ọrụ? Adrián, bụ́ onye na-enye ndị bịara ezumike ụlọ ná ngo na Cape San Lucas, na-eme otú ahụ. N’ihi ya, onye ya na ya na-arụkọ ọrụ bụ́ Judy na-akọ, sị: “Nanị afọ atọ gara aga, ọ bụrụ na ị gwa m na m ga-aghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, m gaara asị gị, ‘Nke ahụ agaghị eme eme!’ Ma ekpebiri m na achọrọ m ịgụ Bible. Echere m, sị, ‘Ọ̀ ga-arakwanụ ahụ́, ebe ọ bụ na ịgụ ihe na-amasị m?’ Otú ọ dị, echeghị m na agụruru m peeji isii tupu m chọpụta na enyemaka dị m mkpa. Nanị onye m pụrụ icheta ga-enyere m aka bụ onye ọrụ ibe m aha ya bụ Adrián. M na-enwe mmasị mụ na ya ikwurịta okwu n’ihi na ọ bụ nanị ya bụ onye nọ ebe ahụ bụ́ ezigbo mmadụ n’ezie.” Ozugbo ahụ, Adrián tụrụ aro ka ya na onye ọ na-achọ ịlụ, bụ́ Katie, bịa zaa ajụjụ nile Judy nwere. Katie maliteere ya ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, Judy ghọrọ Onyeàmà e mere baptizim.

Olee banyere ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi n’ụlọ akwụkwọ? Ndịàmà abụọ na-amụ asụsụ Spanish n’otu mahadum ma ha abịaghị akwụkwọ otu ụbọchị iji gaa mgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe ha lọghachiri n’ụlọ akwụkwọ, a gwara ha ka ha jiri asụsụ Spanish kọọ ihe ha gara. Ha jiri ohere ahụ gbaa àmà otú ha nwere ike n’asụsụ Spanish. Onye nkụzi ha, bụ́ Silvia, gosiri mmasị dị ukwuu n’amụma Bible. O kwetara iji Bekee mụọ Bible, ugbu a kwa, ọ bụ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ọtụtụ ndị n’ezinụlọ ya na-amụkwa ihe. Silvia na-ekwu, sị: “Achọtara m ihe m nọworo na-achọ ná ndụ m nile.” Ee, ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi pụrụ ịmịpụta ezi mkpụrụ.

Iji Ohere Ndị Ọzọ Eme Ihe

Ịbụ onye na-ele ọbịa nke ọma pụrụ iduga n’ịgba àmà. Jim na Gail, bụ́ ndị na-eje ozi na San Carlos, Sonora, chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. Otu nwanyị bụ́ onye na-akpọgharị ụmụ nkịta ya n’elekere isii nke ụtụtụ kwụsịrị n’ihu ụlọ ha ịja mbara èzí ha mma. Jim na Gail kpọrọ ya ka ọ bata ṅụọ kọfị. Na nke mbụ ya n’ime afọ 60, ọ nụrụ banyere Jehova na olileanya nke ndụ ebighị ebi. A maliteere ya ọmụmụ Bible.

N’otu aka ahụ, Adrienne na-emeso ndị ọbịa ihe n’obiọma. Ọ nọ na-eri ihe n’otu ụlọ nri dị na Cancún mgbe otu nwata nwoke bịakwutere ya ma jụọ ya ma ò si Canada. Mgbe ọ zara na ya si, ọ kọwara na ya na nne ya na-agbalị inyere nwanne ya nwanyị aka ide ihe odide ụlọ akwụkwọ e nyere ya banyere ndị Canada. Nne ya, bụ́ onye na-asụ Bekee, bịarutere nso. Mgbe o jisịrị ndidi zaa ajụjụ ya banyere ndị Canada, Adrienne kwuru, sị: “Ma e nwere ihe dị mkpa n’ezie mere m ji si Canada bịa ebe a—inyere ndị mmadụ aka ịmụ Bible. Ị̀ ga-enwe mmasị na nke ahụ?” Nwanyị ahụ zaghachiri na ya ga-enwe mmasị. Ọ hapụwo chọọchị ya afọ iri tupu mgbe ahụ, ọ nọwokwa na-agbalị ịmụ Bible n’onwe ya. O nyere Adrienne adres ya na nọmba fon ya, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible na-enye afọ ojuju.

“Zipụ Nri Gị n’Elu Mmiri”

Ikwu banyere eziokwu Bible n’oge ọ bụla na-edugakarị n’ịgbara ndị na-enwetụbeghị ma ọ bụ ndị nwerela nanị ohere dị nta ịnụ ozi Alaeze ahụ àmà. N’otu ụlọ oriri na-ekwo ekwo dị n’obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Zihuatanejo, otu Onyeàmà kpọrọ ndị ala ọzọ abụọ ka ha bịa nọrọ n’oche dị na tebụl ya, n’ihi na ụlọ oriri ahụ juru eju. Di na nwunye a ejiriwo ụgbọ mmiri na-aga site n’otu ebe ruo ebe ọzọ ruo afọ asaa. Ha kwuru na ihe banyere Ndịàmà Jehova adịghị amasị ha. Ka ha zutesịrị n’ụlọ oriri ahụ, Onyeàmà ahụ jere leta di na nwunye ahụ n’ụgbọ ha ma gwa ha ka ha bịa n’ebe obibi ya. Ha naara magazin 20 na akwụkwọ ukwu 5 ma kwe nkwa ịchọ Ndịàmà n’ebe ọzọ ụgbọ mmiri ha ga-akwụsị.

Jeff na Deb hụrụ otu ezinụlọ ku nwa ọhụrụ nwanyị mara mma n’ụlọ ebe ndị mmadụ na-anọ eri nri n’ụlọ ahịa dị na Cancún. Mgbe ha kwuru okwu banyere nwa ọhụrụ ahụ, nne na nna ya kpọrọ ha òkù ịbịa soro ha taa pizza. Ọ bịara bụrụ na ezinụlọ a si India. Ha anụtụbeghị banyere Ndịàmà Jehova nke ha ji ahụ akwụkwọ anyị. Ha ji akwụkwọ Ndịàmà pụọ n’ụlọ ahịa ahụ.

Ihe yiri nke ahụ mekwara n’àgwàetiti dịdebere ụsọ oké osimiri Yucatán. Di na nwunye lụrụ ọhụrụ bụ́ ndị China rịọrọ Jeff ka o see ha foto, bụ́ nke o ji obi ụtọ mee. Mgbe ahụ, ọ chọpụtara na ọ bụ ezie na ha bi na United States kemgbe afọ 12, ha ahụtụbeghị ma ọ bụ nụ ihe banyere Ndịàmà Jehova! Ha nwere mkparịta ụka dị mma. Jeff gbara ha ume ịchọ Ndịàmà ma ha laruo.

A pụrụ inwe ememe pụrụ iche n’ógbè unu nke pụrụ ịbụ ohere iji gbaa àmà n’oge a na-anọghị n’ozi. Mgbe president United States bịara leta president Mexico n’ụlọ ya dị nso na Guanajuato, ndị nta akụkọ si n’akụkụ nile nke ụwa bịara nta akụkọ n’ebe ahụ. Otu ezinụlọ nke Ndịàmà kpebiri iji ohere a mee ihe site n’ime nkwusa na Bekee. Mmeghachi omume ndị ha nwetara dị mma. Dị ka ihe atụ, otu onye nta akụkọ edewo akụkọ banyere ọtụtụ agha, dị ka ndị a lụrụ na Kosovo na Kuwait. Onye ọrụ ibe ya nwụrụ ka o ku ya n’aka mgbe otu onye nọ na nzuzo gbara ya égbè. Mgbe ọ nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ, onye nta akụkọ ahụ anya mmiri juru anya kelere Chineke maka ime ka ọ mata na ndụ nwere nzube. O kwuru na ọ bụ ezie na ya agaghị ahụ di na nwunye Ndịàmà ahụ ọzọ, na ya ga-eburu ozi ọma a si na Bible n’obi.

Dị ka a pụrụ ịhụ, a pụghị ịmatacha ihe ga-esi n’ịgba àmà dị otú ahụ pụta. Otú ọ dị, Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Zipụ nri gị n’elu mmiri: n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya.” O kwukwara, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.” (Eklisiastis 11:1, 6) Ee, jiri ịnụ ọkụ n’obi ‘na-ezipụ nri gị’ n’elu ọtụtụ mmiri ma jiri mmesapụ aka “ghaa mkpụrụ gị,” dị ka Pọl na Jizọs mere nakwa dị ka Ndịàmà oge a na-eje ozi n’etiti ndị na-asụ Bekee na Mexico na-eme.