Complutensian Polyglot—Ngwá Ọrụ Nsụgharị Mere Ihe Akụkọ
Complutensian Polyglot—Ngwá Ọrụ Nsụgharị Mere Ihe Akụkọ
N’IHE dị ka n’afọ 1455, e nwere mgbanwe dị ịrịba ama n’obibi Bible. Johannes Gutenberg ji ígwè obibi akwụkwọ bipụta Bible mbụ e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị a na-edogharị edogharị bipụta. N’ikpeazụ, e wepụrụ ihe mgbochi nke meworo ka Bible bụrụ akwụkwọ e ji aka dee nke na-adị ụkọ. Ugbu a, a pụrụ ibipụta Bible n’ọnụ ọgụgụ buru ibu nakwa n’ọnụ ego dịtụ ala. N’oge na-adịghị anya, Bible ga-aghọ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa nile.
Bible Gutenberg dị n’asụsụ Latin. Ma ndị ọkà mmụta nọ na Europe ghọtara n’oge na-adịghị anya na ihe odide Bible a pụrụ ịtụkwasị obi nke dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya—Hibru na Grik—dị ha mkpa. Chọọchị Katọlik lere Vulgate Latin anya dị ka nanị nsụgharị Bible kwesịrị ekwesị, otú ọ dị, e nwere nsogbu abụọ bụ́ isi. Na narị afọ nke 16, ihe ka ọtụtụ apụghị ịghọta Latin. Tụkwasị na nke ahụ, n’ime ihe karịrị otu puku afọ, ihe odide nke Vulgate enwewo ọtụtụ ndehie ihe ndị pụtara ìhè ndị sitere n’idepụtaghachi ya.
Ma ndị nsụgharị ma ndị ọkà mmụta chọrọ Bible n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya, tinyere nsụgharị Latin ka mma. Na 1502, kadinal Jiménez de Cisneros, onye ndụmọdụ nke Isabella nke Mbụ nke Spen n’ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe, kpebiri iji nanị otu akwụkwọ gboo mkpa ha. A bịara mara ngwá ọrụ a e ji eme nsụgharị nke mere ihe akụkọ dị ka Complutensian Polyglot. Cisneros zubere iwepụta Polyglot, ma ọ bụ otu Bible e ji ọtụtụ asụsụ dee, nke nwere ihe odide Hibru, Grik, na nke Latin kasị mma, nweekwa akụkụ ụfọdụ e dere n’Aramaic. Obibi akwụkwọ ka malitere ọhụrụ, n’ihi ya, inwe ụdị akwụkwọ a ga-abụkwa ihe dị ịrịba ama n’obibi akwụkwọ.
Cisneros malitere ọrụ ya tara akpụ site n’ịzụta ọtụtụ ihe odide Hibru ochie, bụ́ ndị e nwere ọtụtụ n’ime ha na Spen. O wekọtakwara ihe odide dịgasị iche iche nke Grik na Latin. Ihe odide Polyglot ga-ehiwe isi na ha. Cisneros nyefere otu ìgwè ndị ọkà mmụta, bụ́ ndị ọ haziri na Mahadum Alcalá de Henares, Spen, nke e guzobere ọhụrụ, ọrụ ịchịkọta ihe odide ahụ. Erasmus nke Rotterdam so ná ndị ọkà mmụta a gwara ka ha nye aka, ma ọkà mmụta asụsụ a a ma ama jụrụ.
Ndị ọkà mmụta ahụ ji afọ iri chịkọta akwụkwọ ahụ buru ibu, mbipụta ya wekwara afọ anọ ka ha chịkọtachara ya. E nwere nsogbu ná ngwá ọrụ ebe ọ bụ na ígwè obibi akwụkwọ dị na Spen enweghị mkpụrụ akwụkwọ Hibru, Grik, ma ọ bụ Aramaic. N’ihi ya, Cisneros were ọkà n’ibi akwụkwọ, bụ́ Arnaldo Guillermo Brocario, n’ọrụ ịkwadebe mkpụrụ akwụkwọ n’asụsụ ndị a. N’ikpeazụ, ígwè obibi akwụkwọ ndị ahụ malitere ọrụ na 1514. E bichara mpịakọta isii ya na July 10, 1517, nanị ọnwa anọ tupu kadinal ahụ anwụọ. N’ụzọ dị ịtụnanya, e bipụtara ihe dị ka mkpụrụ narị isii nke akwụkwọ ahụ kpọmkwem n’oge Njụta Okwukwe nke Spen kpụ ọkụ n’ọnụ. *
Nhazi nke Akwụkwọ Ahụ
Peeji nke ọ bụla nke Polyglot jupụtara n’ihe ọmụma. N’ime mpịakọta anọ bụ́ ndị bu Akwụkwọ Nsọ Hibru, ihe odide nke Vulgate dị n’etiti peeji nke ọ bụla; ihe odide Hibru dị na kọlụm dị ná mpụga; ihe odide Grik kwa nke nwere nsụgharị Latin ya n’okpuru ya dị na kọlụm nke dị n’ime. Okwu ndị bụ́ isi e si na ha nweta ọtụtụ okwu Hibru dị n’ohere dị n’akụkụ peeji. N’ala ala peeji nke ọ bụla bu Pentateuch, ndị mbipụta gbakwụnyekwara Targum of Onkelos (nchịkọta nke ihe dị n’akwụkwọ ise mbụ nke Bible n’asụsụ Aramaic), tinyere nsụgharị Latin ya.
Mpịakọta nke ise nke Polyglot bu Akwụkwọ Nsọ Grik na kọlụm abụọ. Otu bu ihe odide Grik, nke ọzọ bu ihe odide Latin nke ya na ya kwekọrọ bụ́ nke sitere na Vulgate. E ji mkpụrụ akwụkwọ ndị pere nnọọ mpe bụ́ ndị na-eduga onye na-agụ akwụkwọ ahụ n’okwu ya na ibe ya bụ otu na kọlụm nke ọ bụla, gosi nkwekọrịta dị n’etiti ihe odide nke asụsụ abụọ ahụ. Ihe odide Grik nke Polyglot bụ nchịkọta mbụ zuru ezu nke Akwụkwọ Nsọ Grik, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ,” e bipụtatụworo, bụ́ nke mbipụta nke Erasmus kwadebere sochiri n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị.
Ndị ọkà mmụta ahụ leziri nnọọ anya mgbe ha na-agụgharị ihe odide nke mpịakọta nke ise nke na e nwere nanị ndehie ihe 50. N’ihi nlezianya dị otú ahụ nke ndị ọkà mmụta a, ndị nkatọ nke oge a ekwuwo na ọ ka ihe odide Grik nke Erasmus zie ezie. Ọmarịcha mkpụrụ akwụkwọ Grik ndị e ji mee ihe na ya mere ka ọ maa mma ka ihe odide ndị bu ya ụzọ e ji aka akwụkwọ uncial depụtaghachi. N’akwụkwọ ya bụ́ The Printing of Greek in the Fifteenth Century, R. Proctor na-ekwu, sị: “Ekele na-agara Spen maka ibipụta mkpụrụ akwụkwọ Grik mbụ bụ́ nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ Grik kasị mma e nwetụrụla.”
Mpịakọta nke isii nke Polyglot nwere ọtụtụ ihe enyemaka dịgasị iche iche maka ọmụmụ Bible: akwụkwọ ọkọwa okwu Hibru na nke Aramaic, nkọwa nke aha Grik, Hibru na nke Aramaic, nkọwa nke ụtọ asụsụ Hibru, na ndepụta ntụaka e dere na Latin maka akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na e toro Complutensian Polyglot dị ka “ihe ncheta nke nkà mbipụta akwụkwọ na nkà sayensị nke Akwụkwọ Nsọ.”
Cisneros bu n’uche ka akwụkwọ a “mee ka e nweghachi mmasị n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke jụworo oyi n’oge a,” ma ọ chọghị ime ka ndị nkịtị nweta Bible. O chere na “a ghaghị izochi nnọọ Okwu Chineke ka ndị nkịtị wee ghara ịghọta ya.” O kwenyekwara na “e kwesịrị inwe Akwụkwọ Nsọ nanị n’asụsụ ochie atọ Chineke kwere ka e jiri dee ihe n’elu isi Ọkpara ya a kpọgidere n’obe.” * N’ihi nke a, Complutensian Polyglot enweghị nsụgharị ọ bụla n’asụsụ Spanish.
Ọdịiche Dị n’Etiti Vulgate na Asụsụ Ndị Mbụ
Ọdịdị nke Polyglot mere ka e nwee nghọtahie ụfọdụ n’etiti ndị ọkà mmụta rụrụ ọrụ na ya. Ọkà mmụta a ma ama bụ́ onye Spen, bụ́ Antonio de Nebrija, * hụrụ maka idepụtaghachi ihe odide Vulgate nke ga-adị na Bible Polyglot. Ọ bụ ezie na Chọọchị Katọlik lere Vulgate nke Jerome anya dị ka nanị nsụgharị kwesịrị ekwesị, Nebrija hụrụ mkpa ọ dị iji Vulgate ahụ tụnyere ihe odide ndị mbụ nke Hibru, Aramaic, na Grik. Ọ chọrọ idezi ndehie ihe pụtara ìhè ndị dị na Vulgate ndị e nwere mgbe ahụ.
Iji dezie ihe ọ bụla na-ekwekọghị ekwekọ n’etiti Vulgate na asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible, Nebrija gbara Cisneros ume, sị: “Mụnyeghachi ọkụ abụọ nke okpukpe anyị, asụsụ Hibru na nke Grik. Nye ndị tinyere onwe ha n’ọrụ a ụgwọ ọrụ.” Ọ tụkwara aro na-esonụ: “Mgbe ọ bụla e nwere ihe dị iche n’ihe odide Latin nke Agba Ọhụrụ, anyị kwesịrị ịgaghachi n’ihe odide nke Grik. Mgbe ọ bụla e nwere ihe ndị na-emegiderịta ibe ha n’ihe odide dịgasị iche iche nke Latin ma ọ bụ n’etiti ihe odide Latin na Grik nke Agba Ochie, anyị kwesịrị ịchọ nke bụ́ eziokwu site n’ihe odide Hibru ziri ezi.”
Olee otú Cisneros si zaghachi? N’okwu mbuụzọ o dere na Bible Polyglot, Cisneros kwuru hoo haa ihe bụ́ echiche ya. “Anyị tinyere nsụgharị Latin nke Jerome a gọziri agọzi n’etiti nke Ụlọ Nzukọ ahụ [ihe odide Hibru] na nke Chọọchị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa [ihe odide Grik], dị nnọọ ka a kpọgidere ndị ohi ahụ n’akụkụ abụọ nke Jizọs, bụ́ onye nọchiri anya Chọọchị Rom ma ọ bụ nke Latin.” N’ụzọ dị otú a, Cisneros ekweghị ka Nebrija dezigharịa Vulgate Latin ka o kwekọọ n’ihe odide nke asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible. N’ikpeazụ, Nebrija kpebiri ịhapụ ọrụ ahụ kama itinye aha ya ná mbipuṭaghachi ahụ gbara ọrụ.
Comma Johanneum
Ọ bụ ezie na Bible Polyglot nke Alcalá de Henares ghọrọ n’ezie nzọụkwụ dị ịrịba ama n’ibipụta ihe odide ka mma n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible, mgbe mgbe, e ji ọdịnala kpọrọ ihe karịa ihe ọmụma. E ji Vulgate kpọrọ oké ihe nke na a manyere ndị bipụtara ya ọtụtụ ugboro idezi ihe odide Grik nke “Agba Ọhụrụ” iji hụ na o kwekọrọ na nke Latin kama idezi nke Latin ikwekọ na nke Grik. Otu n’ime ihe atụ nke a bụ ihe odide hiere ụzọ nke a maara dị ka comma Johanneum. * Ọ dịghị ihe odide mbụ Grik ọ bụla nwere okwu a, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na a gbakwụnyere ya ọtụtụ narị afọ ka Jọn desịrị akwụkwọ ozi ya; ọ dịghịkwanụ n’ihe odide Latin kasị ochie nke Vulgate. Ya mere, Erasmus wepụrụ ndehie ihe a ‘n’Agba Ọhụrụ’ Grik ya.
Ndị dere Polyglot lere ya anya dị ka ihe jọgburu onwe ya iwepụ amaokwu nke bụworo
akụkụ nke ihe odide ochie Vulgate ruo ọtụtụ narị afọ. N’ihi ya, ha hapụrụ okwu ndị ahụ na-ezighị ezi n’ihe odide Latin ma kpebie ịsụgharị ya ma tinye ya n’ihe odide Grik ka kọlụm abụọ ahụ wee kwekọọ.Ihe Ndabere Maka Nsụgharị Bible Ndị Ọhụrụ
Uru Complutensian Polyglot bara adabereghị nanị n’eziokwu ahụ bụ́ na o nwere ihe odide mbụ zuru ezu e biri ebi nke Akwụkwọ Nsọ Grik na nke Septuagint. Dị nnọọ ka “Agba Ọhụrụ” Grik nke Erasmus si ghọọ Ihe Odide A Nakweere nke Akwụkwọ Nsọ Grik (ebe ọtụtụ nsụgharị nke asụsụ ndị ọzọ dabeere), ihe odide Hibru nke Polyglot ghọrọ ihe odide bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Aramaic dabeere na ya. * William Tyndale jiri Polyglot a mere ihe odide Hibru bụ́ isi o ji mee nsụgharị Bible ya gaa na Bekee.
Ya mere, ọrụ bụ́ ịgba nke ìgwè ahụ bipụtara Complutensian Polyglot rụrụ tụnyere ụtụ dị ukwuu n’inwekwu ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ. E bipụtara ya mgbe mmasị na-amụbawanye amụbawanye e nwere na Bible na Europe malitere ime ka a sụgharịa ya gaa n’asụsụ ndị nkịtị. Polyglot ghọrọ nzọụkwụ ọzọ ná nchepụta ndị tụnyere ụtụ ná nnụcha na nchekwa nke ihe odide Grik na nke Hibru. Ihe a nile kwekọrọ ná nzube nke Chineke ka ‘okwu ọnụ a nụchara anụcha nke Jehova,’ bụ́ ‘okwu Chineke anyị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’—Abụ Ọma 18:30; Aịsaịa 40:8; 1 Pita 1:25.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 E bipụtara mkpụrụ 600 n’akwụkwọ, bipụtakwa mkpụrụ 6 n’akpụkpọ anụ. Na 1984, e bipụtara mkpụrụ ole na ole ndị yiri mbipụta mbụ ya.
^ par. 14 E lere Nebrija anya dị ka onye Spen mbụ ghọrọ ọkà mmụta asụsụ. Na 1492, o bipụtara Gramática castellana mbụ (Ụtọ Asụsụ nke Asụsụ Castilian). Afọ atọ ka e mesịrị, o kpebiri iji ndụ ya fọdụrụnụ mụọ Akwụkwọ Nsọ.
^ par. 18 Ihe ahụ na-ezighị ezi a gbakwụnyere agbakwụnye nke a na-achọta ná nsụgharị Bible ụfọdụ na 1 Jọn 5:7 na-agụ, sị, “n’eluigwe, Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ: atọ a bụkwa otu.”
^ par. 21 Maka akụkọ banyere akwụkwọ Erasmus, lee Ụlọ Nche, March 15, 1983, peeji nke 8-11.
[Foto dị na peeji nke 29]
Kadinal Jiménez de Cisneros
[Ebe E Si Nweta Foto]
Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid
[Foto dị na peeji nke 30]
Antonio de Nebrija
[Ebe E Si Nweta Foto]
Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]
Biblioteca Histórica. Universidad Complutense de Madrid