Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe A Ga-eme Uche Chineke n’Ụwa

Mgbe A Ga-eme Uche Chineke n’Ụwa

Mgbe A Ga-eme Uche Chineke n’Ụwa

MGBE Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe, sị, “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe,” ọ nọ na-ekwu dị ka onye soworo Nna ya bie n’eluigwe. (Matiu 6:10; Jọn 1:18; 3:13; 8:42) N’oge ndụ Jizọs tupu ya aghọọ mmadụ, ọ maara mgbe ihe nile a na-eme ma n’eluigwe ma n’ụwa na-ekwekọ n’uche Chineke. Ndị ahụ bụ oge tọrọ ya ụtọ, ndị ọ rụpụtara ihe buru ibu na ha na ndị wetaara ya afọ ojuju.—Ilu 8:27-31.

Ihe ndị mbụ Chineke kere bụ ndị mmụọ, “ndị mmụọ ozi Ya . . . ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu Ya.” Ha bụ ma nọgide na-abụ “ndị na-ejere Ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ” ma ọ bụ uche ya. (Abụ Ọma 103:20, 21) Nke ọ bụla n’ime ha ò nwere uche nke ya? Ee, mgbe a tọkwara ntọala ụwa, ‘ụmụ Chineke nile malitere itisi mkpu ọṅụ ike.’ (Job 38:7) Mkpu ọṅụ ha gosiri obi ụtọ onwe onye ha nwere n’ihe Chineke zubeworo, ha mekwara ka uche ha kwekọọ na nke ya.

Mgbe Chineke tọsịrị ntọala ụwa, ọ kwadebere ya maka ụmụ mmadụ ibi na ya, n’ikpeazụkwa, o kere nwoke na nwanyị mbụ. (Jenesis, isi 1) Ò kwesịkwara ka e tie mkpu ọṅụ n’ihi nke a? Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu,” ee, ha enweghị ntụpọ, ha zuru okè.—Jenesis 1:31.

Gịnị bụ uche Chineke maka nne na nna anyị mbụ na ụmụ ha? Dị ka Jenesis 1:28 si kwuo, ọ dị mma nke ukwuu: “Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” Iji rụzuo ọrụ ahụ dị ebube, ọ ga-adị nne na nna anyị mbụ mkpa ịnọgide na-adị ndụ—ruo mgbe ebighị ebi—otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụ ha. Ọ dịghị ihe na-egosi na a ga-enwe ọdachi, ikpe na-ezighị ezi, obi mgbawa, ma ọ bụ ọnwụ.

Nke a bụ oge a na-eme uche Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ndị nile mere uche ya ga-enweta obi ụtọ dị ukwuu n’ime otú ahụ. Oleezi otú mmiri si baa n’opì ụgbọgụrụ?

A mara uche Chineke aka n’ụzọ a na-atụghị anya ya. Ee e, ọ bụghị ihe ịma aka a na-agaghị emeri emeri. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ịma aka ahụ mere ka e nwee ogologo oge nke obi mgbawa na iru újú nke ga-eme ka e nwee nnọọ obi abụọ banyere ihe bụ́ uche Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. Nke a anọwo na-emetụta anyị nile. Gịnị bụ ihe ịma aka ahụ?

Uche Chineke n’Oge Nnupụisi

Otu n’ime “ụmụ Chineke” ndị bụ́ mmụọ hụrụ ohere nke iwetara uche Chineke maka mmadụ ihe mkpọbi ụkwụ, nzube ya bụ inwetara onwe ya uru. Ka mmụọ a e kere eke na-atụle ya n’obi ya, otú a ka ọ na-eyiwanye ihe ga-ekwe omume, otú a kwa ka ọ na-adọrọkwu mmasị ya. (Jems 1:14, 15) Ọ pụrụ ichewo na ọ bụrụ na ya enwee ike inweta mmadụ abụọ mbụ ahụ ige ya ntị kama ige Chineke ntị, mgbe ahụ, a ga-amanye Chineke ịnabata ọkaaka ọzọ na–ama ya aka. Ọ pụrụ ichewo na Chineke agaghị egbu ha, n’ihi na nke a ga-apụta na nzube Chineke akụọla afọ n’ala. Kama nke ahụ, Jehova Chineke aghaghị ịgbanwetụ nzube ya, na-anakwere ọnọdụ nke nwa mmụọ a bụ́ onye ihe ndị O kere eke bụ́ mmadụ ga na-eruberezi isi. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, e mesịrị kpọọ onye nnupụisi ahụ Setan, ya bụ, “Onye Nguzogide.”—Job 1:6, ihe odide ala ala peeji nke NW.

N’ime ihe kwekọrọ n’ọchịchọ ya, Setan gakwuuru nwanyị ahụ. Ọ gbara ya ume ileghara uche Chineke anya na inwere onwe ya n’ụzọ omume, na-ekwu, sị: ‘Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ. Unu ga-adị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Jenesis 3:1-5) Nye nwanyị ahụ, nke a yiri nnwere onwe, ọ nakwerekwaara ya dị ka ihe yiri ka ọ̀ bụ ụzọ ndụ ka mma. Ka oge na-aga, o mere ka di ya kweta isonyere ya.—Jenesis 3:6.

Nke a abụghị uche Chineke maka mmadụ abụọ ahụ. Ọ bụ uche nke ha. Ọ ga-ewetakwa oké ọdachi. Chineke adịlarị mbụ gwa ha na ime otú ahụ ga-eduga n’ọnwụ ha. (Jenesis 3:3) E keghị ha inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị na Chineke. (Jeremaịa 10:23) Tụkwasị na nke ahụ, ha ga-aghọ ndị na-ezughị okè, ha ga-ebufezi ụmụ ha ezughị okè na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Setan apụghị ịgbanwe ihe ndị a.

Ihe omume ndị a hà gbanwere nzube Chineke, ma ọ bụ uche ya maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa ruo mgbe ebighị ebi? Ee e. (Aịsaịa 55:9-11) Ma ha welitere ihe iseokwu ndị ọ dị mkpa ka e dozie: Ihe a kpọrọ mmadụ hà pụrụ ‘ịdị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ,’ dị ka Setan zọọrọ? Ya bụ, ọ bụrụ na e nye anyị oge zuru ezu, ànyị pụrụ ikpebi n’onwe anyị, ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, ihe bara uru na ihe na-emerụ ahụ́ n’akụkụ nile nke ndụ? Ò kwesịrị ka e rubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu n’ihi na ụzọ o si achị kasị mma? Ò kwesịrị ka e mee ihe kwekọrọ n’uche ya n’ụzọ zuru ezu? Gịnị bụ azịza gị?

E nwere nanị otu ụzọ a pụrụ isi dozie ihe iseokwu ndị a n’ihu ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi: Hapụ ndị na-achọ nnwere onwe ka ha nwaa ma hà pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Nanị igbu ha agaghị edozi ihe iseokwu ndị ahụ e welitere. Ikwe ka agbụrụ mmadụ dịgide ruo ogologo oge ga-edozi okwu n’ihi na ihe ndị ga-esi na ya pụta ga-edo anya. Chineke gosiri na ya ga-esi otú a dozie okwu mgbe ọ gwara nwanyị ahụ na ọ ga-amụ ụmụ. Ezinụlọ mmadụ ga-esi otú a malite. N’ihi nke a, anyị dị ndụ taa!—Jenesis 3:16, 20.

Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Chineke ga-ekwe ka ụmụ mmadụ na nwa mmụọ nnupụisi ahụ mee nnọọ ihe sọrọ ha. Chineke agbahapụghị ọbụbụeze ya, ma ọ bụ hapụ nzube ya. (Abụ Ọma 83:18) O mere ka nke a doo anya site n’ibu amụma banyere nchifịa a ga-emesị chifịa onye kpalitere nnupụisi ahụ na nkagbu a ga-akagbu mmetụta ọjọọ ya nile. (Jenesis 3:15) N’ihi ya, site ná mmalite, e kwere ezinụlọ mmadụ nkwa ahụ́ efe.

Ka ọ dịgodị, nne na nna mbụ anyị ajụwo, gbochiekwa ụmụ ha ga-amụ n’ọdịnihu ịnọ n’okpuru ịchịisi Chineke. Chineke igbochi ihe ọjọọ nile ga-esi ná mkpebi ha pụta ga-achọ na ọ ga-amanye ha ime uche ya n’ọnọdụ nile. Ya na ekweghị ka ha nweretụ onwe ha ga-abụ otu ihe.

N’ezie, ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ịhọrọ ịchịisi Chineke. Ha pụrụ ịmụta ihe bụ́ uche Chineke maka ụmụ mmadụ n’oge a na ime ihe kwekọrọ na ya n’ụzọ chiri anya ruo n’ókè o kwere ha mee. (Abụ Ọma 143:10) Ka o sina dị, ha agaghị agbanahụli nsogbu kpam kpam ebe ọ bụ na e dozibeghị ihe iseokwu nke nnwere onwe zuru ezu nke ihe a kpọrọ mmadụ.

Mmetụta nke nhọrọ onwe onye pụtara ìhè ná mmalite. Ken, bụ́ nwa mbụ a mụrụ n’ezinụlọ mmadụ, gburu Ebel nwanne ya n’ihi na “ọrụ ya dị njọ, ma ndị nke nwanne ya ziri ezi.” (1 Jọn 3:12) Nke a abụghị uche Chineke, n’ihi na Chineke dọrọ Ken aka ná ntị ma mesịa nye ya ntaramahụhụ. (Jenesis 4:3-12) Ken họọrọ nnwere onwe n’ụzọ omume bụ́ nke Setan na-enye; n’ụzọ dị otú ahụ, o “sitere n’ajọ onye ahụ.” Ndị ọzọ mekwara otú ahụ.

Mgbe ihe karịrị afọ 1,500 mbụ nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ gasịrị, “e bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:11) Ọ dị mkpa ka e mee ihe ngwa ngwa iji chebe ụwa pụọ ná mbibi. Chineke mere ihe site n’iweta iju mmiri zuru ụwa ọnụ na ichebe otu ezinụlọ na-eme ezi omume ka dị ndụ—Noa, nwunye ya, ụmụ ya na ndị nwunye ha. (Jenesis 7:1) Anyị nile sitere n’eriri ha.

Kemgbe ahụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Chineke enyewo ndị ji obi eziokwu na-achọ ịma uche ya nduzi. O nyere ndị ikom na-eguzosi ike n’ihe mmụọ ya idekọ okwu ya maka onye ọ bụla chọrọ nduzi ya. E dekọrọ okwu ndị ahụ n’ime Bible. (2 Timoti 3:16) O ji ịhụnanya kwere ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi soro ya nwee mmekọrịta, ọbụna bụrụ ndị enyi ya. (Jems 2:23) O nyekwara ha ike dị ha mkpa iji nagide ule ndị siri ike ihe a kpọrọ mmadụ nwetaworo n’ime ọtụtụ narị afọ ndị a nke nnwere onwe. (Abụ Ọma 46:1; Ndị Filipaị 4:13) Lee obi ekele anyị pụrụ inwe n’ihi ihe a nile!

‘Ka E Mee Uche Gị’—N’ụzọ Zuru Ezu

Ihe Chineke meworo ruo ugbu a abụghị ihe nile o bu n’uche maka ihe a kpọrọ mmadụ. Onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi dere, sị: “Ma e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Okwu ihe atụ a na-ezo aka n’ọchịchị ọhụrụ ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ na ọha mmadụ ọhụrụ bụ́ ndị ga-anọ n’okpuru ọchịchị ahụ.

N’ikwu ya n’ụzọ doro anya, Daniel onye amụma dere, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Amụma a na-ekwu banyere njedebe nke usoro ihe a ike gwụworo na mgbanwe a ga-eji Alaeze ma ọ bụ ọchịchị Chineke gbanwee ya. Lee ozi ọma nke a bụ! Esemokwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ́ ndị mejupụtara ụwa nke taa n’ihe ike, bụ́kwa ndị na-eyi egwu ibibi ụwa ọzọ ga-apụ n’anya otu ụbọchị.

Olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?” Dị ka otu akụkụ nke azịza ya, Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:3, 14.

Ọ bụ ihe a maara n’ebe nile na a na-arụ ọrụ nkwusa a n’ụwa nile. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ka a na-arụ ya n’agbata obi gị. N’akwụkwọ ya bụ́ These Also Believe, Prọfesọ Charles S. Braden na-ede, sị: “N’ụzọ nkịtị, Ndịàmà Jehova ejiriwo ịgba àmà ha gazuo ụwa. . . . Ọ dịghị otu òtù okpukpe nọ n’ụwa nke gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi na nnọgidesi ike ná mgbalị ya ịgbasa ozi ọma Alaeze ahụ karịa Ndịàmà Jehova.” Ndịàmà ji ịdị uchu na-akpọsa ozi ọma a n’ihe karịrị ala 230 na n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ asụsụ 400. A rụtụbeghị ọrụ a e buru n’amụma n’ụzọ zuru ụwa ọnụ otú ahụ mbụ. Ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na oge eruwela ka Alaeze ahụ bịa nọchie ọchịchị mmadụ.

Alaeze ahụ Jizọs kwuru na a ga-ekwusa banyere ya bụ nke ahụ ọ kụziiri anyị ikpe ekpere banyere ya n’ekpere nlereanya ya: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ee, Alaeze ahụ bụ ngwá ọrụ Chineke ga-eji mezuo nzube ya, uche ya, maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa.

Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ka Mkpughe 21:3, 4 zaa ya: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.’” Mgbe ahụ, a ga-eme uche Chineke n’ụwa na n’eluigwe n’ezie—n’ụzọ zuru ezu. * Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịbụ akụkụ ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 26 Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ịmụtakwu banyere Alaeze Chineke, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ deta akwụkwọ n’otu n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 2 nke magazin a.

[Foto dị na peeji nke 5]

Nnwere onwe pụọ n’uche Chineke wetara ọdachi