Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ribeka—Nwanyị Dị Uchu nke Na-atụ Egwu Chineke

Ribeka—Nwanyị Dị Uchu nke Na-atụ Egwu Chineke

Ribeka—Nwanyị Dị Uchu nke Na-atụ Egwu Chineke

WEREGODỊ ya na ị pụrụ ịhọtara nwa gị nwoke nwunye. Olee ụdị onye ị ga-ahọta? Olee iru eru ndị ọ ga-enwe? Ị̀ ga-achọ onye mara mma, nwee ọgụgụ isi, nwee obiọma ma na-arụsi ọrụ ike? Ka ị̀ ga-ebu ụzọ chọọ ihe ọzọ?

Ebreham chere nsogbu dị otú a ihu. Jehova ekwewo nkwa ịgọzi ụmụ ya site n’aka nwa ya bụ́ Aịzik. Ka anyị na-amalite ịgụ akụkọ a, Ebreham emewo agadi, ma nwa ya nwoke ka bụ okokporo. (Jenesis 12:1-3, 7; 17:19; 22:17, 18; 24:1) Ebe ọ bụ na Aịzik na nwunye a ka ga-achọta achọta na ụmụ ndị ha pụrụ ịmụta ga-eso nwekọọ ngọzi ahụ, Ebreham mere ndokwa ịchọtara Aịzik nwunye kwesịrị ekwesị. Nke kasị mkpa bụ na ọ ghaghị ịbụ ohu Jehova. Ebe ọ bụ na a pụghị ịchọta nwanyị dị otú ahụ na Kenan, bụ́ ebe Ebreham bi, ọ ghaghị ịchọ ebe ọzọ. Onye e mesịrị họta bụ Ribeka. Olee otú e si chọta ya? Ọ̀ bụ nwanyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịtụle ihe nlereanya ya?

Ịchọ Nwanyị Ruru Ihe A Chọrọ

Ebreham zipụrụ odibo ya nke kasị okenye, eleghị anya Elieza, ka ọ gaa Mesopotemia dị anya, lụtara Aịzik nwunye n’etiti ndị ikwu Ebreham, bụ́ ndị ha na ya so na-efe Jehova. Okwu ahụ dị nnọọ oké mkpa nke na e mere ka Elieza ṅụọ iyi na ọ gaghị achọta onye Kenan ịbụrụ Aịzik nwunye. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na Ebreham siri ọnwụ na nke a.—Jenesis 24:2-10.

Ka o mechara njem ruo obodo ndị ikwu Ebreham, Elieza eduru kamel ya iri rute n’otu olulu mmiri. Were anya nke uche hụ ihe na-emenụ! Ọ bụ ná mgbede, Elieza na-ekpekwa ekpere, sị: “Lee, mụ onwe m na-eguzo n’akụkụ isi iyi mmiri a; ụmụ ndị inyom nke ndị obodo a na-apụtakwa isere mmiri: ka o ruokwa na nwa agbọghọ ahụ onye m ga-asị, Biko, zie ite gị ka m ṅụọ; onye ga-asịkwa, Ṅụọ, ọzọkwa kamel gị ka m ga-eme ka ha ṅụọ: ka ọ bụrụ nwanyị ahụ ka Ị họpụtaworo nye ohu gị, bụ́ Aịzik.”—Jenesis 24:11-14.

Dị ka nwanyị ọ bụla bi n’ógbè ahụ maara, kamel akpịrị na-akpọ nkụ pụrụ ịṅụ mmiri dị ukwuu (ihe ruru 100 lita mmiri). Ya mere, nwanyị ọ bụla ga-ekweta inye kamel iri mmiri aghaghị ịdị njikere ịrụ nnukwu ọrụ. Ya ime nke ahụ ka ndị ọzọ nọ na-ele ya anya ma ghara inyere ya aka ga-egosipụta n’ezie na ọ dị ike, nwee ndidi, dịrị obi umeala ma nwee obiọma n’ahụ́ ma mmadụ ma anụmanụ.

Gịnị meziri? “Tupu o kwusịa okwu, lee, Ribeka na-apụta, bụ́ nwanyị a mụrụ nye Betuel nwa nwoke Milka, bụ́ nwunye Nehoa, nwa nwanne Ebreham, ite ya dịkwa n’ubu ya. Nwa agbọghọ ahụ dị mma nke ukwuu ile anya, nwanyị nke aka-amaghị nwoke, . . . ọ rịda n’isi iyi ahụ, gbajuo ite ya, rịgote. Ohu ahụ wee gbaa ọsọ izute ya, sị, Biko kwe ka m ṅụọ nwantịị mmiri site n’ite gị. Ọ sị, Ṅụọ, onyenwe m: o mee ngwa, zie ite ya n’aka ya, mee ka ọ ṅụọ.”—Jenesis 24:15-18.

Ribeka Ò Ruru Ihe A Chọrọ?

Ribeka bụ nwa nwa nwanne Ebreham, e wezụgakwa na ọ mara mma, o nwere ezi àgwà. Ọ dịghị ala azụ n’ịgwa onye ọ na-amaghị okwu, ma ọ bụkwanụ na-akpa ndị ọ na-amaghị nso gabiga ókè. O gosiri Elieza ihu ọma mgbe ọ rịọrọ ya mmiri. E kwesịrị ịtụ anya nke ahụ, ebe ọ bụ ihe na-egosi omume ọma. Oleezi maka akụkụ nke abụọ nke ule ahụ?

Ribeka wee, sị: “Ṅụọ, onyenwe m.” Ma nke ahụ abụghị ebe okwu biri. Ribeka gara n’ihu ikwu, sị: “Kamel gị ka m ga-eserekwa mmiri, ruo mgbe ha ga-aṅụjuworị.” O kwere nkwa ime karịa ihe e lere anya dị ka ihe e kwesịrị ime. N’igosipụta ịdị njikere ya, “o mee ngwa, gbapụ mmiri dị n’ite ya n’ime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, ọ gbaa ọsọ ọzọ ruo olulu mmiri isere mmiri, wee sere nye kamel ya nile.” O ji mgbasi ike rụọ ọrụ ahụ. Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị, “nwoke ahụ na-elegide ya anya, na-agba nkịtị.”—Jenesis 24:19-21.

Ka ọ matara na nwa agbọghọ ahụ bụ onye ikwu Ebreham, Elieza kpọrọ isiala iji kelee Jehova. Ọ jụrụ ma è nwere ebe ya na ndị ha na ya so ga-anọ ọnọdụ abalị n’ụlọ nna ya. Ribeka kwuru na e nwere ma gbara ọsọ laa n’ụlọ ịkọ banyere ndị ọbịa ahụ.—Jenesis 24:22-28.

Ka ha gechara akụkọ Elieza, nwanne nwoke Ribeka bụ́ Leban, na nna ya, bụ́ Betuel, chọpụtara na ọ bụ Chineke na-eduzi ihe. N’ezie, Ribeka bụ nwunye a kwadooro Aịzik. “Kuru ya, laa,” ka ha kwuru, “ka ọ ghọọrọ nwa onye nwe gị nwunye, dị ka Jehova kwuworo.” Olee ihe bụ́ echiche Ribeka? Mgbe a jụrụ ya ma ọ̀ ga-achọ ije ozugbo, o ji otu okwu zaa, bụ́ okwu Hibru nke pụtara: “Adị m njikere ije.” Iwu ejighị ya ikweta ịbanye n’alụmdi na nwunye a. Ebreham mere ka nke ahụ doo anya mgbe o kwuru na Elieza ga-apụ n’iyi ọ ṅụụrụ ya “ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị” iso ya lọta. Ma Ribeka n’onwe ya hụrụ aka Chineke n’okwu ahụ. Ya mere, n’egbughị oge, ọ hapụrụ ezinụlọ ya ịlụ nwoke ọ na-ahụtụbeghị. Mkpebi ahụ o ji obi ike mee bụ ngosipụta okwukwe pụtara ìhè. N’ezie, nhọrọ a họọrọ ya ziri ezi!—Jenesis 24:29-59.

Mgbe o zutere Aịzik, Ribeka ji ákwà mkpudo kpuchie ihu ya bụ́ ihe àmà nke ido onwe ya n’okpuru. Aịzik kpọọrọ ya dị ka nwunye ya, obi abụọ adịghịkwa ya na n’ihi àgwà ya ndị magburu onwe ha, ọ malitere ịhụ ya n’anya.—Jenesis 24:62-67.

Ụmụ Ejima

Ribeka amụtaghị nwa ruo ihe dị ka afọ 19. N’ikpeazụ, ọ dịịrị ime ejima, ma ime ahụ siiri ya ike, n’ihi na ụmụ dị ya n’afọ na-agba mgba, nke mere ka Ribeka tikuo Chineke mkpu ákwá. Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ n’oge anyị nwere oké nsogbu ná ndụ anyị. Jehova nụrụ ákwá Ribeka ma mesie ya obi ike. Ọ ga-aghọ nne nke mba abụọ, ‘nke okenye ga-efekwa nke nta.’—Jenesis 25:20-26.

Ọ pụrụ ịbụ na okwu ndị ahụ abụghị nanị ihe mere Ribeka ji hụ nwa ya nke nta bụ́ Jekọb n’anya karị. Ụmụaka abụọ ahụ dị iche. Jekọb bụ “nwoke zuru okè,” ma Ịsọ nwere omume ọ gbasaghị m n’ebe ihe ime mmụọ dị nke na nanị n’ihi otu ugboro nri, o resịrị Jekọb ọnọdụ diọkpara ya, bụ́ ikike o nwere iketa nkwa ndị Chineke kwere. Ịsọ ịlụ ụmụ nwanyị ndị Het abụọ na-egosi enweghị nkwanye ùgwù—ọbụna mkparị—maka ihe ime mmụọ, nke kpataara nne na nna ya obi ilu.—Jenesis 25:27-34; 26:34, 35.

Inwetara Jekọb Ngọzi

Bible ekwughị ma Aịzik ọ̀ maara na Ịsọ aghaghị ife Jekọb. Otú o sina dị, ma Ribeka ma Jekọb maara na ngọzi ahụ bụ nke Jekọb. Ribeka mere ihe ngwa ngwa mgbe ọ nụrụ na Aịzik na-ezube ịgọzi Ịsọ ma o wegara nna ya nri o ji anụ ọ gbatara ná nta sie. Ọ hapụbeghị ikike ime mkpebi ngwa ngwa na ịdị uchu bụ́ ihe e ji mara ya na mgbe agbọghọbịa ya. O nyere Jekọb ‘iwu’ ka o wetara ya ụmụ ewu abụọ. Ọ ga-esi ụdị nri na-amasị di ya. Mgbe ahụ, Jekọb ga-eme ka ọ̀ bụ Ịsọ iji nata ngọzi ahụ. Jekọb jụrụ ime otú ahụ. O yikarịrị ka nna ya ọ̀ ga-amata aghụghọ ahụ ma bụọ ya ọnụ! Ribeka siri ọnwụ. “Ya dịkwasị m, bụ́ nkọcha gị, nwa m,” ka ọ sịrị. Mgbe ahụ, o siri nri ahụ, mee Jekọb ka o yie Ịsọ ma zipụ ya ịhụ di ya.—Jenesis 27:1-17.

E kwughị ihe mere Ribeka ji mee omume dị otú a. Ọtụtụ ndị na akatọ ihe o mere, ma Bible akatọghị ya, Aịzik akatọghịkwa ya ka ọ chọpụtara na Jekọb anatawo ngọzi ahụ. Kama nke ahụ, Aịzik nyekwuru ya ngọzi. (Jenesis 27:29; 28:3, 4) Ribeka maara ihe Jehova buru ụzọ kwuo banyere ụmụ ya. N’ihi ya, o mere ihe iji hụ na Jekọb nwetara ngọzi ruuru ya. O doro anya na nke a kwekọrọ n’uche Jehova.—Ndị Rom 9:6-13.

E Ziga Jekọb Heran

Ugbu a, Ribeka aghasaala atụmatụ Ịsọ site n’ịgwa Jekọb ka ọ gbapụ ruo mgbe iwe nwanne ya gabigara. Ọ rịọrọ Aịzik ka o kweta n’atụmatụ ya, ma o ji obiọma zere ikwute okwu banyere iwe Ịsọ. Kama, o ji akọ rịọ di ya site n’ikwupụta nchegbu ọ ga-enwe ma e nwee ka Jekọb si lụọ onye Kenan. Nanị echiche ahụ zuru ime ka Aịzik kweta inye Jekọb iwu izere alụmdi na nwunye dị otú ahụ na izipụ ya ka ọ gakwuru ndị ezinụlọ Ribeka iji chọta nwunye na-atụ egwu Chineke. E nweghị ihe ndekọ gosiri na Ribeka hụrụ Jekọb anya ọzọ, ma ihe o mere wetaara mba Izrel e mesịrị nwee nkwụghachi ụgwọ dị ukwuu.—Jenesis 27:43–28:2.

Ihe anyị maara banyere Ribeka na-eme ka anyị nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ mara mma nke ukwuu, ma ihe kasị mma banyere ya bụ nsọpụrụ Chineke ya. Ọ bụ ihe Ebreham chọrọ na nwunye nwa. O yiri ka ezi àgwà ya ọ̀ karịrị ọbụna ihe Ebreham tụrụ anya ya. Okwukwe ya na obi ike ya n’ịgbaso nduzi Chineke, na ịnụ ọkụ n’obi ya, obi umeala ya, na mmesapụ aka ya n’ile ọbịa bụ àgwà ndị inyom Ndị Kraịst nile kwesịrị iṅomi. Ihe ndị a bụ àgwà ndị Jehova n’onwe ya na-achọ na nwanyị kwesịrị nṅomi n’ezie.