Site N’enyemaka O Nwetara Na Bible, O Guzogidere Ọnwụnwa
Site N’enyemaka O Nwetara Na Bible, O Guzogidere Ọnwụnwa
Ọnwụnwa jupụtara n’ụwa taa. Ijigidesi ụkpụrụ Bible ike adịghị mfe. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka irube isi na ndụmọdụ Bible bụ́: “Gbanahụnụ ịkwa iko.”—1 Ndị Kọrint 6:18.
Otu n’ime Ndịàmà Jehova, onye anyị ga-akpọ Sebastian, rụrụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ ndị Scandinavia dị na Poland. Ọ ghaghị ịgbasi mgba ike iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.
A bịara mara Sebastian dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ndị nlekọta ọrụ ya, n’igosi ekele maka ịrụsi ọrụ ike na àgwà ọma ya, kwụghachiri ya ụgwọ site n’inye ya ihe ùgwù dịgasị iche iche. Otú ọ dị, ọ bịara bụrụ na ihe ùgwù ndị a gụnyere ya ịnọ ná nzukọ achụmnta ego ebe a na-egosi ihe ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo.
N’oge na-adịghị anya, Sebastian malitere inwe obi abụọ. “Nna m ukwu maara na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ bụ nke ahụ mere o ji tụkwasị m obi ma na-adabere n’ebe m nọ. Ọ bụrụ na mụ ajụ ịga, a ga-achụ m n’ọrụ, bụ́ ọrụ siiri m nnọọ ike ịchọta. Gịnị ma ọ bụrụ na mụ abụrụ nanị onye nkiri?”
Mgbe ahụ, Sebastian chọpụtara ihe ọzọ. A ga-achọ ka ọ “na-elekọta” ndị ahịa si mba ndị ọzọ site n’ịkpọta “ụmụ agbọghọ” maka nzube rụrụ arụ, bụ́ ndị ga na-esonyere ha n’oge mgbede. Gịnị ka ọ ga-eme?
Sebastian kpebiri ichetara onye nlekọta ọrụ ya ihe bụ́ echiche ya dabeere na Bible n’ihe banyere omume rụrụ arụ. N’oge na-adịghị anya, ọ bịara doo anya na ebe Sebastian na-arụ ọrụ ekwesịghị ya nakwa n’ikpeazụ ọ ghaghị ịkwụsị ọrụ ya. Ọ chọtara ọrụ ọhụrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala na ya ma bụrụ nke na-enweghị ọnwụnwa ndị dị otú ahụ. Ugbu a, o nwere akọ na uche dị ọcha.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ arụgide gị isonye ma ọ bụ ịkwado omume rụrụ arụ? Ị̀ ga-adị njikere ime mgbanwe dị mkpa? Nke ahụ bụ ihe Josef oge ochie mere, dị ka a kọrọ na Jenesis 39:7-12.