Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụ Ezie Na M Kpuru Ìsì, Ahụrụ M Ụzọ!

Ọ Bụ Ezie Na M Kpuru Ìsì, Ahụrụ M Ụzọ!

Akụkọ Ndụ

Ọ Bụ Ezie Na M Kpuru Ìsì, Ahụrụ M Ụzọ!

DỊ KA EGON HAUSER SI KỌỌ

Mgbe ọnwa abụọ nke ikpu ìsì n’ụzọ nkịtị gasịrị, e meghere anya m ịhụ eziokwu Bible bụ́ nke m leghawooro anya ná ndụ m nile.

MGBE m chere echiche laa azụ n’ihe karịrị afọ iri asaa, ọtụtụ ihe ná ndụ m na-enye m afọ ojuju dị ukwuu. Ma ọ bụrụ na ọ dị ihe m pụrụ ịgbanwe ná ndụ m, m ga-ahọrọ ka ọ bụrụ na m matara ihe banyere Jehova Chineke n’oge karị.

A mụrụ m na 1927, na Uruguay, bụ́ otu ntakịrị mba dị n’etiti Argentina na Brazil, nke nwekwara ọtụtụ kilomita nke gburugburu ebe ndị mara mma n’Ụsọ Oké Osimiri Atlantic. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi ebe ahụ bụ ụmụ ndị si Ịtali na Spen kwabata. Otú ọ dị, ndị mụrụ m si Hungary kwabata, mgbe m ka na-eto nnọọ eto, anyị bi n’agbata obi dara ogbenye ma na-emekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị mkpa inwe ihe mkpọchi n’ibo ụzọ ma ọ bụ ihe ngebichi na windo anyị. Ajọ mbunobi agbụrụ adịghị n’etiti anyị. Ndị bịara abịa na ndị nwe obodo, ndị ojii na ndị ọcha—anyị nile bụ enyi.

Ndị mụrụ m na-ekpechi Katọlik anya, aghọkwara m nwa okoro na-eje ozi n’ọlta mgbe m dị afọ iri. Mgbe m toruru ogo mmadụ, arụrụ m ọrụ na parish dị n’ógbè anyị ma soro n’òtù na-eje ozi dị ka ndị ndụmọdụ nke bishọp na dayọsis anyị. Ebe m bụ onye ọrụ ahụ́ ike, a kpọrọ m òkù ikere òkè ná nzukọ ọmụmụ ihe nke Chọọchị Katọlik haziri na Venezuela. Dị ka ndị dọkịta bụ́ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị, e kenyere ìgwè anyị ọrụ ịmụ banyere ọgwụ mgbochi ime a na-aṅụ aṅụ bụ́ ndị a nọ na-ewebata ọhụrụ n’ahịa n’oge ahụ.

Mkpali Ndị Mbụ M Nwere Dị Ka Nwa Akwụkwọ Na-amụ Nkà Ọgwụ na Ahụ́ Ike

Mgbe m na-amụ banyere ahụ́ mmadụ, dị ka nwa akwụkwọ na-amụ nkà ọgwụ na ahụ́ ike, amamihe pụtara ìhè n’otú e si mee ahụ́ mmadụ kpaliri mmasị m nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, ikike ahụ́ mmadụ nwere ịgwọ onwe ya na ikike ya ịgbake ma e nwee nnukwu mmerụ ahụ́ juru m anya, dị ka mgbe imeju ma ọ bụ ọgịrịga na-enwe ike itorughachi otú ọ habu mgbe e wepụrụ akụkụ ya ụfọdụ.

N’otu oge ahụ, ahụrụ m ọtụtụ ndị nwere oké ihe ọghọm, ọ na-ewutekwa m mgbe ha nwụrụ n’ihi na a mịnyere ha ọbara. Ruo taa, m ka na-echeta otú o si esi ike iso ndị ikwu nke onye ọrịa ahụ nwụrụ n’ihi nsogbu ndị sitere ná mmịnye ọbara ekwurịta okwu. Ọtụtụ mgbe, a naghị agwa ndị ikwu onye ahụ na ọ bụ ọbara a mịnyere onye ha hụrụ n’anya kpatara ọnwụ ya. Kama nke ahụ, a na-agwa ha na ọ bụ ihe ọzọ kpatara ya. Ọ bụ ezie na ọtụtụ afọ agafewo, m ka na-echeta otú m si enwe obi erughị ala banyere mmịnye ọbara, n’ikpeazụ, ekwubikwara m na e nwere ihe dị njọ banyere mmịnye ọbara. Lee nnọọ ka ọ gaara esi magbuo onwe ya ma a sị na m maara mgbe ahụ iwu Jehova banyere ịdị nsọ nke ọbara! Mgbe ahụ, agaaraghị m enwe obi abụọ banyere ihe m na-ahụ a na-eme.—Ọrụ 15:19, 20.

Afọ Ojuju Site n’Inyere Ndị Mmadụ Aka

Ka oge na-aga, aghọrọ m dọkịta na-awa ahụ́ na onye nduzi nke otu ụlọ ọrụ na-enyere ndị ọrụ ahụ́ ike aka nke dị na Santa Lucía. Enwekwara m ibu ọrụ ụfọdụ n’Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Nkà Ihe Ndị Dị Ndụ. Nke a nyere m afọ ojuju dị ukwuu. Enyeere m ndị mmadụ aka n’ọrịa ha, mee ka ha nweta ahụ́ efe site n’ahụhụ ha, zọpụta ndụ ha ọtụtụ oge, nyekwa aka webata ndụ ọhụrụ n’ụwa site n’inyere ndị nne aka mgbe ha na-amụ nwa. N’ihi ahụmahụ ndị m nwere na mbụ n’ihe banyere mmịnye ọbara, ezeere m ya ma waa ọtụtụ puku mmadụ ahụ́ n’ejighị ọbara. Echere m na oké ọbara ọgbụgba dị ka mmiri si na galọn na-ehipụ. Nanị ihe bụ́ ezi ihe ngwọta ya bụ imechi ebe ahụ na-ehi ehi, ọ bụghị ịnọgide na-agbanye mmiri na galọn ahụ.

Ịgwọ Ndị Ọrịa Bụ́ Ndịàmà

Amatawara m Ndịàmà Jehova n’afọ ndị 1960 mgbe ha bidoro bịawa n’ụlọ ahụ́ ike anyị maka ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara. Agaghị m echefu ma ọlị ihe banyere otu onye ọrịa bụ́ ọsụ ụzọ (onye ozi oge nile) aha ya bụ Mercedes Gonzalez. Ọbara kọrọ ya n’ahụ́ nke na ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ mahadum jụrụ ịwa ya ahụ́, na-eche na ọ ga-anwụrịrị. Ọ bụ ezie na ọbara ya na-agbapụsị, anyị wara ya ahụ́ n’ụlọ ahụ́ ike anyị. Ịwa ahụ́ ahụ gara nke ọma, ọ nọgidekwara na-asụ ụzọ ruo ihe karịrị afọ 30 ruo mgbe ọ nwụrụ na nso nso a ka ọ dị afọ 86.

Ana m enwekarị mmasị n’ịhụnanya na mmasị Ndịàmà na-egosi mgbe ha na-elekọta ụmụnna ha Ndị Kraịst nọ n’ụlọ ọgwụ. Mgbe m na-agagharị ịhụ otú ndị ọrịa na-eme, ọ na-atọ m ụtọ ige ha ntị ka ha na-ekwu banyere nkwenkwe ha, ana m anatakwa akwụkwọ ndị ha na-enye m. Ọ dịtụghị mgbe ọ batara m n’obi na n’oge na-adịghị anya, m ga-abụ, ọ bụghị nanị dọkịta ha, kamakwa nwanna ime mmụọ ha.

Mụ na Ndịàmà kpachiwere anya mgbe m lụrụ Beatriz, bụ́ nwa nwanyị otu onye ọrịa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ezinụlọ ya esoroworị Ndịàmà na-akpakọrịta, ka anyị mesịkwara lụọ, ya onwe ya ghọrọ Onyeàmà na-arụsi ọrụ ike. N’aka nke ọzọ, etinyere m isi n’ọrụ m ma bụrụ onye a ma ama ruo n’ókè ụfọdụ n’ihe gbasara ahụ́ ike. O yiri nnọọ ka ndụ ọ̀ na-agaziri m. Ọ dịtụghị mgbe m chere na ụwa m na-aga ikpugharị n’oge na-adịghị anya.

Ọdachi Emee

Otu n’ime ihe ndị kasị njọ pụrụ ime onye dọkịta na-awa ahụ́ bụ ya ikpu ìsì. Nke ahụ bụ ihe mere m. Na mberede, akwụsịrị m iji anya m abụọ ahụ ụzọ—ekpuru m ìsì, ọ dịghịkwa otú m ga-esi mara ma m̀ pụrụ ịhụ ụzọ ọzọ. Ka a wasịrị m anya, edina m n’elu àkwà ebe e ji bandeeji kechie anya m abụọ, daakwa nnọọ mbà n’obi. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-abaghịzi uru na onye na-enweghị olileanya ma ọlị ruo n’ókè na m kpebiri igbu onwe m. Ebe ọ bụ na m nọ n’okpukpu ụlọ nke anọ n’ụlọ ọgwụ ahụ, ebiliri m n’àkwà ma dịdara aka n’ahụ́ ụlọ, na-agbalị ịchọta ebe windo dị. Achọrọ m isi ebe ahụ wụpụ ma nwụọ. Otú ọ dị, ahụrụ m onwe m na paseeji ụlọ ọgwụ ahụ, otu onye nọọsụ dukwaara m laghachi n’àkwà m.

Agbalịghị m ime ya ọzọ. Ma n’ihi ìsì m kpuru, anọgidere m na-ada mbà n’obi ma na-ewe iwe ọsọ ọsọ. N’oge a m kpuru ìsì, ekwere m Chineke nkwa na ọ bụrụ na mụ enwee nnọọ ike ịhụ ụzọ ọzọ, m ga-agụ Bible site n’isi ruo n’ọdụ. N’ikpeazụ, amalitere m hụtụwa ụzọ, apụkwara m ịgụ ihe. Ma apụghị m ịga n’ihu n’ọrụ m dị ka dọkịta na-awa ahụ́. Na Uruguay, e nwere otu okwu a na-ekwukarị bụ́ “No hay mal que por bien no venga,” “Ọ dịghị ihe dị nnọọ njọ ruo n’ókè na ihe ọma apụghị isi na ya pụta.” Ana m aga ịhụ ịbụ eziokwu nke okwu ahụ.

Ịmalite Mkpakọrịta Mụ na Ndịàmà n’Ụzọ Dị Njọ

Achọrọ m ịzụta mbipụta The Jerusalem Bible nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo, ma anụrụ m na Ndịàmà Jehova nwere Bible nke dị ọnụ ala karị, bụ́ nke otu Onyeàmà na-eto eto kwere nkwa iweta n’ebe obibi m. N’ụtụtụ echi ya, o wetara Bible ahụ n’ụlọ m. Nwunye m meghere ụzọ ma gwa ya okwu. Eji m mkparị si n’ime ụlọ baa mba sị ya na ọ bụrụ na a kwụwo ya ụgwọ Bible ahụ, o nweghị ihe ọzọ mere ọ ga-eji nọrọ n’ụlọ m na o kwesịrị ịla, ọ bazighị uru ikwu na o mere nke ahụ n’egbughị oge. Ọ gbatatụghị m n’uche na otu onye a ga-emecha n’oge na-adịghị anya rụọ ọrụ dị mkpa ná ndụ m.

Otu ụbọchị, ekwere m nwunye m nkwa nke m na-emezulighị. Ya mere, iji meda ya obi na iji mee ya obi ụtọ, agwara m ya na m ga-eso ya gaa Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst ha na-eme kwa afọ. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, echetara m nkwa m ma soro ya gaa ememe ahụ. Omume enyi e nwere n’ebe ahụ na nnabata e ji obiọma nye m masịrị m. Mgbe ọkà okwu malitere okwu ya, o juru m anya ịhụ na ọ bụ otu nwa okoro ahụ m ji mkparị gwa ka ọ pụọ n’ụlọ m. Okwu ya metụtara m nke ukwuu, o wutekwara m nke ukwuu na m mesoro ya ihe n’ụzọ obi ọjọọ. Olee otú m pụrụ isi kwụọ ụgwọ ihe ahụ m mere?

Agwara m nwunye m ka ọ kpọọ ya òkù iri nri mgbede n’ụlọ anyị, ma ọ tụụrụ m aro, sị: “Í cheghị na ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ gị kpọrọ ya? Nọrọ nnọọ ebe a, ọ ga-abịakwute anyị.” Ihe o kwuru bụ eziokwu. Ọ bịarutere ebe anyị nọ, kelee anyị ma jiri obi ụtọ kweta ịbịa.

Mkparịta ụka anyị nwere ná mgbede ahụ ọ bịara leta anyị bụ mmalite nke ọtụtụ mgbanwe nye m. O gosiri m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahụ Nke Nedubà ná Ndu Ebighị-Ebi, * egosikwara m ya mkpụrụ isii nke otu akwụkwọ ahụ. Ndị ọrịa dị iche iche bụ́ Ndịàmà enyewo m ha n’ụlọ ọgwụ, ma ọ dịtụbeghị nke m gụrụ. Mgbe anyị na-eri nri na mgbe anyị risịrị nri, ruokwa n’ime ime abalị, ajụrụ m ya ọtụtụ ajụjụ—ndị o jicha Bible zaa. Nkwurịta okwu ahụ ruru n’isi ụtụtụ echi ya. Tupu ọ lawa, nwa okorobịa ahụ kwere nkwa iji akwụkwọ Ezi-Okwu ahụ duziere m ọmụmụ Bible. Anyị ji ọnwa atọ mụchaa akwụkwọ ahụ ma gaa n’ihu n’akwụkwọ bụ́ “Babylon the Great Has Fallen!” God’s Kingdom Rules! * Ka anyị mụsịrị nke ahụ, araara m ndụ m nye Jehova Chineke, e mekwara m baptizim.

Inweghachi Mmetụta nke Ịba Uru

N’ihi ikpu ìsì n’ụzọ nkịtị, e meghere ‘anya nke obi m’ gaa n’eziokwu Bible ndị m leghawooro anya ruo mgbe ahụ! (Ndị Efesọs 1:18) Ịbịa mara Jehova na nzube ịhụnanya ya gbanwere ndụ m kpam kpam. Ana m enwe mmetụta nke ịba uru ọzọ ma nwee obi ụtọ. Ana m enyere ndị mmadụ aka ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ ime mmụọ, na-egosikwa ha otú ha ga-esi mee ka ndụ ha dịkwuo ogologo ruo afọ ole na ole n’usoro ihe a na ruo mgbe nile ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ.

Anọgidewo m na-enweta ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ n’ihe banyere nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, emewokwa m nnyocha banyere ihe ize ndụ nke ọbara, ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ, ihe ndị ruuru ndị ọrịa, na banyere ụkpụrụ ndị metụtara ndụ. Enwewo m ọtụtụ ohere iso ndị ọrụ ahụ́ ike kerịta ihe ọmụma ndị a mgbe a kpọrọ m òkù ikwu okwu n’isiokwu ndị a ná nzukọ ọmụmụ ihe ndị ọrụ ahụ́ ike. Na 1994, agara m nzukọ ezumezu mbụ e mere banyere usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara na Rio de Janeiro, Brazil, ma kwuo okwu n’ihe a ga-eme mgbe e nwere oké ọbara ọgbụgba. Akụkụ ụfọdụ nke okwu ahụ dị n’otu isiokwu m dere bụ́ “Una propuesta: Estrategias para el Tratamiento de las Hemorragias” (“Aro Bara Uru Maka Igbochi Oké Ọbara Ọgbụgba”), bụ́ nke e bipụtara na magazin nkà ọgwụ na ahụ́ ike bụ́ Hemoterapia.

Iguzosi Ike n’Ezi Ihe n’Agbanyeghị Nrụgide

Na mbụ, obi abụọ m na-enwe banyere mmịnye ọbara gbakwasịkarịrị ụkwụ n’ihe ọmụma sayensị. Otú ọ dị, mgbe mụ onwe m ghọrọ onye ọrịa n’ụlọ ọgwụ, achọpụtara m na ọ dịghị mfe ịjụ ịnara ọbara ma jigidesie okwukwe m ike mgbe ndị dọkịta na-arụgidesi m ike. Ka m nwechara oké nkụchi obi, aghaghị m iji ihe karịrị awa abụọ kọwaara otu dọkịta na-awa ahụ́ ihe bụ́ nguzo m. Ọ bụ nwa otu n’ime ndị ezigbo enyi m, o kwukwara na ya agaghị ekwe ka m nwụọ ma ọ bụrụ na ya echee na mmịnye ọbara pụrụ ịzọpụta ndụ m. Ekpegaara m Jehova ekpere n’ime obi m, na-arịọ ya ka o nyere dọkịta a aka ịghọta ma kwanyere mkpebi m ùgwù ma ọ bụrụgodị na o kwenyeghị na ya. N’ikpeazụ, dọkịta ahụ kwere nkwa ime ihe m chọrọ.

N’oge ọzọ, aghaghị m iwepụ otu nnukwu akpụ n’akụkụ ahụ́ m bụ́ prostate. Ọbara gbara m nke ukwuu. Ọzọkwa, ahụrụ m onwe m ka m na-akọwa ihe mere m ji jụ mmịnye ọbara, ọ bụkwa ezie na ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ọbara m gbapụrụ, ndị ọrụ ahụ́ ike ebe ahụ kwanyeere mkpebi m ùgwù.

Mgbanwe Omume

Dị ka onye so n’Òtù Mba Nile Maka Ụkpụrụ Ndị Metụtara Ndụ, enwewo m afọ ojuju nke ịhụ mgbanwe omume n’akụkụ nke ndị ọrụ ahụ́ ike na ndị ọrụ iwu n’ihe banyere ihe ndị ruuru onye ọrịa. A na-ejizi nkweta dabeere n’ihe ọmụma edochi anya omume ịtụ ihe ga-emenụ nke ndị dọkịta nweburu. Ugbu a, ha na-ahapụzi ndị ọrịa iso mee nhọrọ n’otú a ga-esi gwọọ ha. A naghịzi ele Ndịàmà Jehova anya dị ka ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè, ndị na-ekwesịghị inye nlekọta ahụ́ ike. Kama nke ahụ, a na-ele ha anya dị ka ndị ọrịa maara nke a na-akọ bụ́ ndị kwesịrị ka a kwanyere ihe ndị ruuru ha ùgwù. Ná nzukọ ọmụmụ ihe ndị ọrụ ahụ́ ike na n’ihe omume telivishọn, ndị prọfesọ a ma ama ekwuwo, sị: “N’ihi mgbalị nke Ndịàmà Jehova, anyị aghọtawo ugbu a . . . ” “Anyị amụtawo n’aka Ndịàmà . . . ” nakwa “Ha akụziworo anyị imeziwanye ihe.”

E kwuwo na ndụ ka ihe nile mkpa n’ihi na ọ bụrụ na ndụ adịghị, nnwere onwe na ùgwù abaghị uru ọ bụla. Ọtụtụ ndị taa na-anakwere echiche ka elu nke ụkpụrụ iwu, na-aghọta na onye ọ bụla nwere ikike ịchọ ihe ruuru ya ma bụrụ nanị onye pụrụ ikpebi ihe kwesịrị ibute ụzọ n’ihe ndị ruuru ya n’ọnọdụ ọ bụla. N’ụzọ dị otú a, a na-enye ùgwù, nnwere onwe ime mkpebi, na nkwenkwe okpukpe ọnọdụ mbụ. Ọ bụ ihe ruuru onye ọrịa ikpebi otú a ga-esi gwọọ ya. Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ, nke Ndịàmà Jehova hiwere, enyeworo ọtụtụ ndị dọkịta aka inwe ọganihu ná nghọta ha banyere okwu ndị a.

Nkwado ndị ezinụlọ m nọgidere na-enye m enyewo m ohere ịbụ onye bara uru n’ọrụ Jehova nakwa nke ije ozi dị ka okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Dị ka m kwuru na mbụ, ihe m kasị akwa ụta banyere ya bụ amataghị onye Jehova bụ n’oge karị ná ndụ m. Otú ọ dị, enwere m ekele dị ukwuu na o meghere anya m ịhụ olileanya dị ebube nke ibi ndụ n’okpuru ndokwa Alaeze Chineke, ebe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 24 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 34 Ka a na-akwadebe isiokwu a, Nwanna Egon Hauser nwụrụ. Ọ nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, anyị sokwa ya na-aṅụrị ọṅụ na olileanya ya bụ nke e ji n’aka.

[Foto dị na peeji nke 24]

N’afọ ndị 30 m, mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ dị na Santa Lucía

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m bụ́ Beatriz, na 1995