Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Egwuregwu Oge Ochie na Ịdị Mkpa nke Mmeri

Egwuregwu Oge Ochie na Ịdị Mkpa nke Mmeri

Egwuregwu Oge Ochie na Ịdị Mkpa nke Mmeri

“ONYE ọ bụla nke na-ekere òkè n’ịsọ mpi na-egosipụta njide onwe onye n’ihe nile.” “Ọ bụrụ na onye ọ bụla asọọ mpi . . . n’egwuregwu, a dịghị ekpukwasị ya okpu mmeri ọ gwụla ma ọ̀ sọwo mpi dị ka ụkpụrụ nduzi si dị.”—1 Ndị Kọrint 9:25; 2 Timoti 2:5.

Egwuregwu Pọl onyeozi zoro aka na ya bụ akụkụ dị mkpa nke ọdịnala Gris oge ochie. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị banyere asọmpi ndị dị otú ahụ na ihe ndị gbara ha gburugburu?

Na nso nso a, e mere ihe ngosi nke egwuregwu Gris, Nike—Il gioco e la vittoria (“Nike— Egwuregwu ahụ na Mmeri Ya”), n’ọgbọ egwuregwu Colosseum nke Rom. * Ihe ngosi ndị ahụ mere ka e nweta azịza ụfọdụ nye ajụjụ ahụ, na-akpalikwa anyị iche otú Onye Kraịst si ele egwuregwu anya.

Ihe Oge Ochie

Ndị Gris abụghị ndị mbụ mere egwuregwu. Ma, n’ihe dị ka na narị afọ nke asatọ O.A., onye Gris na-ede uri bụ́ Homer kọwara ọha mmadụ mmụọ ịbụ dike na nke asọmpi na-akpali, nke ji ike agha na nkà ime egwuregwu kpọrọ oké ihe. Ememe mbụ nke ndị Gris, ka ihe ngosi ahụ kọwara, malitere dị ka ihe omume okpukpe e ji asọpụrụ ndị chi n’ememe olili ozu nke ndị dike. Dị ka ihe atụ, Iliad nke Homer, bụ́ akwụkwọ kasị mee ochie n’ihe odide ndị Gris dị taa, na-akọwa otú ndị dike a ma ama, bụ́ ndị òtù Achilles, si tọgbọ ngwá agha ha n’oge ememe olili ozu Patroclus ma sọọ mpi iji gosi ike ha nwere n’iti ọkpọ, ịgba mgba, ịtụ discus na ubè, na n’ọsọ ụgbọ ịnyịnya.

A bịara mewe ememe ndị yiri nke ahụ na Gris nile. Akwụkwọ nta na-akọ banyere ihe ngosi ahụ na-ekwu, sị: “Ememe ndị ahụ bụ ohere bụ́ isi ndị Gris nwere, ná nkwanye ùgwù nye ndị chi ha, ịhapụ esemokwu ha na-adịghị agwụ agwụ, ndị na-akpatakarịkwa ime ihe ike, ma nwee ike ịgbanwe mmụọ asọmpi e ji mara ha gaa n’ihe omume bụ́ nke udo ma ka bụrụ nke e ji arụpụta ezi ihe: nke egwuregwu asọmpi.”

Ìgwè obodo ndị kwụụrụ onwe ha malitere izukọta ọnụ mgbe nile n’ebe ndị bụ́ isi ha na-anọ efe ofufe iji kwanyere ndị chi ha ùgwù site n’asọmpi egwuregwu. Ka oge na-aga, ememe anọ ndị dị otú ahụ—egwuregwu Olympia na Nemea, bụ́cha ndị a raara nye chi Zus, na egwuregwu Pythia na Isthmus, bụ́ ndị a raara nye chi Apollo na Poseidon n’otu n’otu—dịwanyere mkpa ruo mgbe ha ruru n’ọnọdụ nke ememe ndị Gris nile. Ya bụ, ndị nile na-asọ mpi egwuregwu bụ́ ndị bi n’ebe nile ndị Gris na-achị pụrụ ikere òkè na ha. A chụrụ àjà, kpeekwa ekpere n’ememe ndị ahụ, a kwanyekwaara ndị bụ́ chi ùgwù site n’asọmpi ndị kasị elu n’ụdị egwuregwu ma ọ bụ ọrụ nkà.

E mere nke kasị ochie na nke a kasị akwanyere ùgwù n’ememe ndị dị otú ahụ, nke a sịrị na ọ malitere na 776 T.O.A., kwa afọ anọ iji sọpụrụ chi Zus n’Olympia. Nke gbara nke abụọ n’ịdị mkpa bụ ememe Pythia. N’ịbụ nke a na-eme n’ihu agbara kasị ewu ewu n’ụwa oge ochie, bụ́ Delphi, a na-emekwa egwuregwu na ya. Ma iji sọpụrụ chi nke uri na egwú, bụ́ Apollo, ihe a kasị eme bụ ịgụ na ịgba egwú.

Egwuregwu Ndị A Na-eme

Ọnụ ọgụgụ egwuregwu a na-eme dị nnọọ nta ma e jiri ha tụnyere egwuregwu mmega ahụ́ ndị a na-eme n’oge a, ọ bụkwa nanị ụmụ nwoke keere òkè. A dịghị eme ihe karịrị egwuregwu iri n’egwuregwu Olympia oge ochie. Ihe ndị a kpụrụ akpụ, ndị a tụrụ atụ, nkume ndị a chọrọ mma, na ihe ndị e sere n’ite ụrọ bụ́ ndị e gosiri na Colosseum gosiri ụfọdụ ha.

E nwere ụdị ọsọ atọ—nke ámá egwuregwu, nke ihe dị ka mita 200; nke ịgba ámá egwuregwu gburugburu ugboro abụọ, nke yiri nke mita 400 nke taa; nke ịgbaru ebe dị anya, ihe dị ka mita 4,500. Ndị na-eme egwuregwu na-agba ọtọ ihu na azụ mgbe ha na-agba ọsọ na mgbe ha na-azụ ahụ́ ha. Ndị na-asọ mpi pentathlon na-asọ mpi n’egwuregwu ise: ịgba ọsọ, ịwụ jọmp, ịtụ discus, ịtụ ubè, na ịgba mgba. Asọmpi ndị ọzọ gụnyere iti ọkpọ na egwuregwu ịlụ ọgụ, bụ́ ndị a kọwara dị ka “egwuregwu ime ihe ike na-agụnye iji aka nkịtị eti ọkpọ na ịgba mgba.” Mgbe ahụ, e nwere ọsọ ụgbọ ịnyịnya nke ịdị anya ya karịrị ịgba ámá egwuregwu gburugburu ugboro asatọ, nke a na-eji obere ụgbọala azụ ya ghere oghe nke ụmụ ịnyịnya abụọ ma ọ bụ anọ ma ọ bụ ịnyịnya ndị toro eto na-adọkpụ, agba.

Iti ọkpọ na-abụ nke ime ihe ike, a na-akụgbukwa mmadụ na ya mgbe ụfọdụ. Ndị na-asọ mpi na-agba n’aka ha akpụkpọ siri ike, ndị nwere iberibe ígwè ndị na-emerụ ahụ́. Ị ga-aghọtazi ihe mere na oti ọkpọ bụ́ Stratofonte enweghịzi ike ịmata ihu ya n’enyo mgbe ọ kụsịrị ọkpọ ruo awa anọ. Ihe ndị a kpụrụ akpụ na nkume ndị a chọrọ mma nke oge ochie na-egosi na a na-enye ndị oti ọkpọ nnukwu nkwarụ.

Na mgba, iwu megidere ijide mmadụ n’akụkụ elu nke ahụ́ ya, ọ bụkwa onye bu ụzọ tụọ ibe ya n’ala ugboro atọ meriri. N’ụzọ megidere nke ahụ, n’egwuregwu ịlụ ọgụ, ọ dịghị ebe a na-apụghị ijide mmadụ aka. Ndị na-ekere òkè na ya pụrụ ịgba ụkwụ, iti ọkpọ, na ịhịji nkwonkwo. Nanị ihe ndị a machibidoro iwu bụ igwu aka n’anya, ịga mbọ́, na ịta arụ. Ihe mgbaru ọsọ nke onye na-eme ya bụ ịtụ onye ibe ya n’ala ma manye ya ikweta na e meriela ya. Ụfọdụ na-ewere ya dị ka “ihe nkiri kasị adọrọ mmasị n’egwuregwu Olympia nile.”

A sịrị na ịma aka ịlụ ọgụ a kasị mara amara n’oge ochie weere ọnọdụ ná ngwụsị nke egwuregwu Olympia nke afọ 564 T.O.A. Arrhachion, bụ́ onye a na-anyagbu anyagbu, jisiri ike hịjie otu mkpịsị ụkwụ nke onye ya na ya na-alụ ọgụ. N’ịbụ onye nwere oké ahụ́ ụfụ, onye ahụ ya na ya na-alụ ọgụ kwetara na e meriela ya nwa oge tupu Arrhachion anwụọ. Ndị ikpe kwupụtara na ọ bụ ozu Arrhachion meriri!

Ọsọ ụgbọ ịnyịnya bụ egwuregwu a kasị mara amara ma bụrụ nke ndị selitere isi kasị nwee mmasị na ya, ebe ọ bụ na onye meririnụ abụghị onye na-akwọ ụgbọ ịnyịnya ahụ kama onye nwe ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya ndị ahụ. Oge ndị siri ike n’egwuregwu ahụ bụ ná mmalite ya, bụ́ mgbe ndị na-akwọ ụgbọ ịnyịnya ahụ na-aghaghị ịnọ n’ahịrị nke ha, nakwa karịsịa mgbe ha na-achọ ịtụgharị ná ngwụsị nke ahịrị ọ bụla. Ịda iwu egwuregwu ahụ pụrụ ịkpata ihe ọghọm bụ́ nke mere ka egwuregwu a a ma ama bụrụ nke na-akpali akpali karị.

Ihe Nrite

“Ndị nile na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu na-agba,” ka Pọl onyeozi kwuru, “ma nanị otu onye na-enweta ihe nrite.” (1 Ndị Kọrint 9:24) Mmeri bụ nanị ihe a chọrọ. E nyeghị ọlaọcha ma ọ bụ ọla nchara, e nweghị onye nke abụọ ma ọ bụ nke atọ. “Mmeri, ‘Nike,’ bụ ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke onye na-eme egwuregwu,” ka ihe ngosi ahụ kọwara. “Ọ bụ nanị nke a ga-ezu ebe ọ bụ nanị nke a bụ ezi ngosipụta nke àgwà mmadụ, ma nke anụ ahụ́ ma nke omume, o gosipụtakwara ùgwù nke obodo ya.” A chịkọtara echiche ha n’otu ahịrịokwu dị na Homer: “Amụtawo m ịbụ ọkaibe mgbe nile.”

Ihe nrite e nyere onye meririnụ n’Egwuregwu Ndị Gris bụ nnọọ ihe atụ—okpu mmeri e ji ahịhịa mee. Pọl kpọrọ ya “okpu mmeri pụrụ ire ure.” (1 Ndị Kọrint 9:25) Ma, ihe nrite ahụ nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara. Ọ nọchiri anya ikike nke okike bụ́ nke mere ka onye ahụ nwee ike imeri. Mmeri, bụ́ nke a na-eji mkpebi siri ike achụso, adịghị nta karịa inweta ihu ọma nke ndị bụ́ chi. Ihe ngosi ahụ gosiri otú ndị na-akpụ ihe na ndị na-ese ihe n’oge ochie si jiri anya nke uche hụ Nike, bụ́ chi nwanyị mmeri nwere nku nke ndị Gris, ka ọ na ekpuwe onye meririnụ okpu mmeri. Imeri n’egwuregwu Olympia bụ ihe mgbaru ọsọ kasịnụ onye na-eme egwuregwu pụrụ iru.

E ji akwụkwọ oliv ọhịa mee okpu mmeri Olympia—jiri nke osisi pine mee nke Isthmus, nke Pythia bụ nke osisi laurel, e ji nke osisi celery ọhịa mee nke Nemea. Ndị na-ahazi egwuregwu n’ebe ndị ọzọ na-enye ihe nrite ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ iji dọta ndị kasị bụrụ ọkà n’ịsọ mpi. Ọtụtụ ite ụrọ ndị e gosiri n’ihe ngosi ahụ bụ ihe nrite ndị e nwetara n’Egwuregwu Ndị Gris, ndị e mere n’Atens iji kwanyere chi nwanyị bụ́ Athena ùgwù. Ihe nọbu n’ime ite ụrọ ndị a bụ mmanụ Attica. Ihe e sere n’otu akụkụ nke otu n’ime ite ụrọ ndị ahụ na-egosi chi nwanyị ahụ, e dekwara ahịrịokwu bụ́, “ihe nrite maka ndị asọmpi nke Athena,” n’elu ya. Ihe e sere n’akụkụ nke ọzọ bụ otu egwuregwu, eleghị anya nke onye ahụ mere egwuregwu meriri na ya.

Obodo dị iche iche nke ndị Gris ghọkwara obodo ndị a ma ama n’ihi ndị obodo ha na-eme egwuregwu, bụ́ ndị mmeri ha mere ka ha bụrụ ndị dike n’obodo ha. A na-eji ngagharị mmeri eme ememe nlọta nke ndị meririnụ. A na-eguzobe ihe oyiyi ha dị ka àjà ekele nye ndị bụ́ chi—nsọpụrụ nke a na-adịghị enyekarị mmadụ nkịtị—ndị na-agụ uri na-agụkwa uri banyere ike ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-enye ndị mmeri ọkwá mbụ n’ememe ọha na eze, a na-akwụkwa ha ụgwọ site n’akpa ego ọha na eze.

Ụlọ Egwuregwu na Ndị Na-eme Egwuregwu na Ha

E weere egwuregwu asọmpi dị ka ihe dị mkpa n’ịzụ ndị ga-abụ ndị soja obodo. Obodo Gris nile nwere ụlọ egwuregwu nke ha, bụ́ ebe a na-azụ ahụ́ ụmụ okorobịa, na-akụzikwara ha nkà mmụta na nkà okpukpe. A na-ewu ụlọ egwuregwu ndị ahụ gburugburu nnukwu ọgbọ egwuregwu ndị ghere oghe, bụ́ ndị veranda ndị nwere ogidi na ebe ndị e kpuchiri elu ha ekpuchi bụ́ ndị e ji mee ihe dị ka ọbá akwụkwọ na ọnụ ụlọ klas gbara gburugburu. Karịsịa, ụmụ okorobịa si n’ezinụlọ ndị bara ọgaranya, bụ́ ndị pụrụ itinye oge ha n’agụmakwụkwọ kama ịrụ ọrụ, na-aga ebe ndị dị otú ahụ mgbe mgbe. N’ebe ndị a, ndị na-asọ mpi egwuregwu na-abịa akwadebe onwe ha ruo ogologo oge maka egwuregwu site n’enyemaka nke ndị nkụzi, bụ́ ndị ga-agwakwa ha ụdị nri ndị ha ga na-eri, hụkwa na ha zeere mmekọahụ.

Ihe ngosi ahụ e mere na Colosseum nyere ndị ọbịa ohere igosi mmasị n’ihe a tụrụ atụ ndị na-egosi ndị na-eme egwuregwu nke oge ochie, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ihe ndị Gris tụrụ bụ́ ndị e mepụtaghachiri n’oge ndị Rom. Ebe ọ bụ na n’echiche nke ndị Gris oge ochie, izu okè anụ ahụ́ na izu okè omume bụ otu, bụrụkwa nanị ndị selitere isi nwere ha, ahụ́ ndị a na-eme egwuregwu bụ́ ndị nwere ọdịdị dị mma n’anya bụ ihe na-egosi na ha ruru ihe a chọrọ n’ụzọ nkà ihe ọmụma. Ndị Rom ji ha kpọrọ ihe dị ka ọrụ nkà, ndị e ji ọtụtụ n’ime ha chọọ ámá egwuregwu, ebe ịsa ahụ́, ụlọ ndị ọgaranya, na obí eze dị iche iche mma.

N’etiti ndị Rom, ihe ngosi nke ebe a na-eme ihe ike na-ewukarị ewu, ya mere a bịa n’egwuregwu ndị Gris nile a na-eme na Rom, ndị a kasị nwee mmasị na ha bụ iti ọkpọ, ịgba mgba, na egwuregwu ịlụ ọgụ. Ndị Rom na-ewere egwuregwu ndị ahụ, ọ bụghị dị ka asọmpi n’etiti mmadụ abụọ há nhata iji mata nke ka ike, kama dị ka ihe ntụrụndụ nkịtị. A gbahapụrụ echiche mbụ ahụ e nwere nke ile egwuregwu anya dị ka ebe ndị dike a ma ama na-eme egwuregwu na-emekọ egwuregwu ọnụ dị ka akụkụ nke agụmakwụkwọ ha. Kama nke ahụ, ndị Rom weziiri egwuregwu ndị Gris dị ka mmega ahụ́ na-akwalite ahụ́ ike a na-eme tupu a saa ahụ́ ma ọ bụ egwuregwu a na-ekiri ekiri nke ndị nkịtị bụ́ ọkà n’ime egwuregwu na-eme, n’ụzọ yiri nnọọ asọmpi ọgụ ọnwụ.

Ndị Kraịst na Egwuregwu Ndị Ahụ

Egwuregwu ndị ahụ ịbụ ihe omume okpukpe bụ otu ihe mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ jiri jụ ha, n’ihi na ‘olee nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?’ (2 Ndị Kọrint 6:14, 16) Olee maka egwuregwu nke taa?

N’ụzọ doro anya, a dịghị eme egwuregwu ndị nke oge a iji sọpụrụ chi dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ. Ma, ọ́ bụghị eziokwu na mmasị a na-enwe n’egwuregwu ụfọdụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke okpukpe, dị ka ọ dị n’oge ochie? Ọzọkwa, dị ka akụkọ e nwetara n’afọ ole na ole gara aga gosiworo, iji merie, ndị na-eme egwuregwu na-aṅụ ọgwụ ndị na-eme ka e mee nke ọma bụ́ ndị na-etinye ọnọdụ ahụ́ ike ha, ọbụnakwa ndụ ha, n’ihe ize ndụ.

Nye Ndị Kraịst, inweta ihe mgbaru ọsọ anụ ahụ́ nwere abamuru dị nnọọ nta. Àgwà ime mmụọ nke “mmadụ zoro ezo nke obi” bụ ihe ndị na-eme ka anyị maa mma n’anya Chineke. (1 Pita 3:3, 4) Anyị maara na ọ bụghị mmadụ nile na-ekere òkè n’egwuregwu taa nwere mmụọ asọmpi obi ọjọọ, ma ọtụtụ nwere ya. Iso ha na-akpakọrịta ọ̀ ga-enyere anyị aka ịgbaso agbamume Akwụkwọ Nsọ nke ‘ịghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi?’ Ma ọ bụ, mkpakọrịta dị otú ahụ ọ́ gaghị akpata “ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa”?—Ndị Filipaị 2:3; Ndị Galeshia 5:19-21.

Ọtụtụ n’ime egwuregwu ndị na-eme ha na-emetụ ndị ogbo ha ahụ́ yikarịrị ka hà ga-abụ ndị a ga-eme ihe ike na ha. Onye ọ bụla nke egwuregwu ndị dị otú ahụ na-amasị kwesịrị icheta okwu dị n’Abụ Ọma 11:5: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.”

Ọ bụrụ na e debe ya n’ọnọdụ kwesịrị ya, egwuregwu mmega ahụ́ pụrụ ịdị na-enye obi ụtọ, Pọl onyeozi kwukwara na “ọzụzụ nke ahụ́ bara uru nke nta.” (1 Timoti 4:7-10) Otú ọ dị, mgbe o kwuru banyere egwuregwu ndị Gris, Pọl zoro aka na ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị nanị iji mee ihe atụ nke mkpa ọ dị Ndị Kraịst inwe àgwà ndị dị ka njide onwe onye na ntachi obi. Ihe mgbaru ọsọ Pọl na-agbalịsi ike iru karịsịa bụ inweta “okpu mmeri” nke Chineke na-enye nke bụ́ ndụ ebighị ebi. (1 Ndị Kọrint 9:24-27; 1 Timoti 6:12) A bịa na nke ahụ, o setịpụụrụ anyị ihe nlereanya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Nike bụ okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mmeri.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 31]

Oti Ọkpọ Na-ezu Ike

Ọla nchara a bụ́ nke narị afọ nke ise T.O.A. na-egosi mmetụta na-ebibi ihe nke iti ọkpọ oge ochie nwere, bụ́ nke, dị ka akwụkwọ na-egosi ihe banyere mba Rom si kwuo, “a na-eto nnọgidesi ike nke oti ọkpọ, . . . bụ́ onye na-alụ ọgụ na-agwụ ike, bụ́ ebe ‘mmerụ ahụ́ na-alara mmerụ ahụ́,’ dị ka ezi ihe nlereanya.” “A na-agbakwụnye ihe àmà nke ọgụ a lụrụ n’oge na-adịbeghị anya n’ihe àmà nke ndị a lụrụ n’oge gara aga,” ka nkọwa ahụ gara n’ihu na-ekwu.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ọsọ ụgbọ ịnyịnya bụ egwuregwu a kasị mara amara n’egwuregwu oge ochie

[Foto dị na peeji nke 30]

Ndị na-ese ihe n’oge ochie ji anya nke uche hụ Nike, bụ́ chi nwanyị mmeri, ka ọ na ekpuwe onye meririnụ okpu mmeri