Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ewusinụ Ibe Unu Ike

Na-ewusinụ Ibe Unu Ike

Na-ewusinụ Ibe Unu Ike

“Ndị a kpọmkwem aghọwokwa ndị enyemaka na-eme ka m dị ike.”—NDỊ KỌLỌSI 4:11.

1, 2. N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya, n’ihi gịnị ka ndị enyi Pọl ji leta ya n’ụlọ mkpọrọ?

Ọ PỤRỤ ịbụ ihe dị ize ndụ ịbụ enyi nke onye na-ahụsi anya n’ụlọ mkpọrọ—ọbụna ma a sị na a tụrụ enyi gị mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi. Ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ pụrụ ịdị na-enyo gị enyo, na-enyo ijeụkwụ gị ọ bụla enyo iji hụ na i meghị mpụ. N’ihi ya, ọ chọrọ obi ike iji na-akpọtụrụ enyi gị ma na-eleta ya n’ụlọ mkpọrọ.

2 Ma, nke a bụ kpọmkwem ihe ụfọdụ ndị enyi Pọl onyeozi mere n’ihe dị ka afọ 1,900 gara aga. Ha alaghị azụ ileta Pọl n’agbụ ụlọ mkpọrọ ya iji nye ya nkasi obi na agbamume dị ya mkpa na iji wusie ya ike n’ụzọ ime mmụọ. Olee ndị bụ́ ndị enyi a na-eguzosi ike n’ihe? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’obi ike, iguzosi ike n’ihe, na ọbụbụenyi ha?—Ilu 17:17.

‘Ndị Enyemaka Na-eme Ka A Dị Ike’

3, 4. (a) Olee ndị bụ́ ndị enyi ise nke Pọl, gịnịkwa ka ha ghọọrọ ya? (b) Gịnị bụ ‘enyemaka na-eme ka a dị ike’?

3 Ka anyị laghachi azụ n’ihe dị ka n’afọ 60 O.A. Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom n’ihi ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. (Ọrụ 24:5; 25:11, 12) Pọl kpọrọ Ndị Kraịst ise aha kpọmkwem bụ́ ndị nyere ya nkwado: Tikikọs, onye nnọchianya ya nke sitere n’ógbè Eshia na ‘ohu ibe ya n’Onyenwe anyị’; Onesịmọs, ‘nwanna na-ekwesị ntụkwasị obi nke a hụrụ n’anya’ onye si Kọlọsi; Arịstakọs, onye Masedonia si Tesalonaịka nakwa onye nwere mgbe ọ bụ “onye mkpọrọ ibe” Pọl; Mak, onye ikwu onye ibe Pọl bụ́ Banabas na onye dere Oziọma ahụ bu aha ya; na Jọstọs, otu n’ime ndị ọrụ ibe onyeozi ahụ “maka alaeze Chineke.” Pọl na-ekwu banyere mmadụ ise a, sị: “Ndị a kpọmkwem aghọwokwa ndị enyemaka na-eme ka m dị ike.”—Ndị Kọlọsi 4:7-11.

4 Pọl kwuru okwu gbara ọkpụrụkpụ banyere enyemaka o nwetara site n’aka ndị enyi ya na-eguzosi ike n’ihe. O ji okwu Grik (pa·re·go·riʹa) a sụgharịrị ịbụ ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike,’ bụ́ nke pụtara nanị n’amaokwu a na Bible, mee ihe. Okwu a nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara, e jikwa ya mee ihe karịsịa mgbe a na-ekwu banyere ọgwụ. * A pụrụ ịsụgharị ya ịbụ ‘ngụgụ obi, mbelata ihe, nkasi obi, ma ọ bụ ahụ́ efe.’ Mwusi ike dị otú ahụ dị Pọl mkpa, ndị ikom ise ahụ nyekwara ya nke ahụ.

Ihe Mere ‘Ndị Enyemaka Na-eme Ka A Dị Ike’ Ji Dị Pọl Mkpa

5. N’agbanyeghị na ọ bụ onyeozi, gịnị dị Pọl mkpa, gịnịkwa na-adị anyị nile mkpa site n’oge ruo n’oge?

5 Ọ pụrụ ịtụ ụfọdụ n’anya iche na mwusi ike dị Pọl, bụ́ onyeozi, mkpa. Otú ọ dị, ọ dị ya mkpa. N’ezie, Pọl nwere okwukwe siri ike, ọ lanarịwokwa ọtụtụ mmerụ ahụ́, ‘ịbụ onye e tiri ihe gabiga ókè,’ ‘ịnọ n’ọnụ ọnwụ ugboro ugboro,’ na ihe mgbu ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Otú o sina dị, ọ bụ mmadụ, mmadụ nile na-enwekwa mgbe ọ na-adị ha mkpa ka a kasie ha obi na ka ndị ọzọ wusie okwukwe ha ike. Nke a bụ eziokwu ọbụna n’ihe metụtara Jizọs. N’abalị ikpeazụ ya, otu mmụọ ozi bịakwutere ya na Getsemeni ma “mee ka ọ dị ike.”—Luk 22:43.

6, 7. (a) Na Rom, olee ndị mere ihe wutere Pọl, oleekwa ndị gbara ya ume? (b) Ozi ndị dị aṅaa ka ụmụnna Pọl bụ́ Ndị Kraịst jeere ya na Rom, si otú ahụ na-aghọ ‘ndị enyemaka na-eme ka ọ dị ike’?

6 Ọ dịkwa Pọl mkpa ka e wusie ya ike. Mgbe o rutere Rom dị ka onye mkpọrọ, ndị agbụrụ ya anabataghị ya nke ọma. Ndị Juu a n’ozuzu ha anabataghị ozi Alaeze ahụ. Mgbe ndị isi ndị Juu letasịrị Pọl n’ebe e jichiri ya, ihe ndekọ nke Ọrụ Ndịozi na-ekwu, sị: “Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ndị a na-ekwu; ndị ọzọ ekweghị. Ya mere, n’ihi na ha ekwekọrịtaghị, ha malitere ịpụ.” (Ọrụ 28:17, 24, 25) Lee ka enweghị ekele ha maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova na-aghaghị isiwo wute Pọl! Oké mwute o nwere n’ihi nke a pụtara ìhè n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Rom afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, sị: “M nwere oké iru újú na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m. N’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na e doro mụ onwe m iche dị ka onye a bụrụ ọnụ n’ebe Kraịst ahụ nọ maka ụmụnna m [ndị Juu], bụ́ ndị ikwu m dị ka anụ ahụ́ si dị.” (Ndị Rom 9:2, 3) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọtara ezi ndị ibe na-eguzosi ike n’ihe na Rom bụ́ ndị obi ike na ịhụnanya ha medara ya obi. Ha bụ ezigbo ụmụnna ime mmụọ ya.

7 Olee otú ụmụnna ise ahụ si ghọọ ndị enyemaka na-eme ka a dị ike? Ha ekweghị ka agbụ ụlọ mkpọrọ Pọl mee ka ha gbaara ya ọsọ. Kama nke ahụ, ha ji ọchịchọ obi na ịhụnanya jeere Pọl ozi n’onwe ha, na-arụ ọrụ ndị ọ na-apụghị ịrụ n’onwe ya n’ihi ojiji e ji ya. Dị ka ihe atụ, ha rụrụ ọrụ dị ka ndị ozi iwegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi Pọl na ịgwa ha okwu ntụziaka ya; ha wetaara Pọl akụkọ ndị na-agba ume banyere ọnọdụ nke ụmụnna nọ na Rom na n’ebe ndị ọzọ. Eleghị anya, ha wetaara ya ihe ndị dị ya mkpa, dị ka uwe oyi, akwụkwọ mpịakọta, na ihe ndị e ji ede ihe. (Ndị Efesọs 6:21, 22; 2 Timoti 4:11-13) Ọrụ enyemaka nile dị otú ahụ wusiri onyeozi ahụ a tụrụ mkpọrọ ike ma gbaa ya ume, ka ya onwe ya kwa wee nweekwa ike ịbụrụ ndị ọzọ, gụnyere ọgbakọ dum, ‘onye enyemaka na-eme ka a dị ike.’—Ndị Rom 1:11, 12.

Ụzọ Isi Bụrụ ‘Onye Enyemaka Na-eme Ka A Dị Ike’

8. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na Pọl iji ịdị umeala n’obi kweta na ‘enyemaka na-eme ka a dị ike’ dị ya mkpa?

8 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ a banyere Pọl na ndị ọrụ ibe ya ise? Ka anyị tụlee otu ihe mmụta: Ọ chọrọ obi ike na ịchụ onwe onye n’àjà iji gbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka n’oge ha nwere ihe isi ike. Ọzọkwa, ọ chọrọ ịdị umeala n’obi iji kweta na enyemaka dị anyị mkpa mgbe anyị onwe anyị nwere ihe isi ike. Ọ bụghị nanị na Pọl kwetara na enyemaka dị ya mkpa, kama o ji ekele nakwere enyemaka ahụ ma jaa ndị nyere ya mma. O leghị ịnakwere enyemaka site n’aka ndị ọzọ anya dị ka ihe àmà nke adịghị ike ma ọ bụ iweda onwe ya ala, anyị ekwesịghịkwa ile ya anya otú ahụ. Anyị ikwu na enyemaka na-eme ka a dị ike adịghị anyị mkpa ga-apụta na anyị nwere ike karịrị nke mmadụ. Cheta, ihe nlereanya Jizọs na-egosi na ọbụna mmadụ zuru okè pụrụ iti mkpu maka enyemaka mgbe ụfọdụ.—Ndị Hibru 5:7.

9, 10. Ezi ihe dị aṅaa pụrụ isi na ya pụta mgbe mmadụ kwetara na enyemaka dị ya mkpa, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a pụrụ inwe n’ebe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ na n’ọgbakọ nọ?

9 Ọ pụrụ ịrụpụta ezi ihe mgbe ndị nwere ibu ọrụ kwetara na o nwere ihe ndị ha na-agaghị emeli nakwa na ha chọrọ nkwado nke ndị ọzọ. (Jems 3:2) Nkweta dị otú ahụ na-ewusi nkekọ dị n’etiti ndị nwere ibu ọrụ na ndị ha na-elekọta ike, na-eme ka a na-enwe nkwurịta okwu sitere n’obi na nke na-enweghị ihe mgbochi. Ịdị umeala n’obi nke ndị dị njikere ịnakwere enyemaka na-abụrụ ndị nọ n’ọnọdụ ndị yiri nke ha ihe nlereanya. Ọ na-egosi na ndị na-edu ndú bụ ụmụ mmadụ na ndị a pụrụ ịbịaru nso.—Eklisiastis 7:20.

10 Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdịrị ụmụaka mfe karị ịnakwere enyemaka nke ndị mụrụ ha iji nagide nsogbu na ọnwụnwa mgbe ha maara na ndị mụrụ ha chekwara ihe ịma aka ndị yiri ndị nke ha ihu mgbe ha bụ ụmụaka. (Ndị Kọlọsi 3:21) N’ụzọ dị otú a, a pụrụ imeghe ụzọ nkwurịta okwu n’etiti ndị nne na nna na ụmụaka. A pụrụ ikwurịta ihe ngwọta ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị irè karị, nakwerekwa ha ngwa ngwa karị. (Ndị Efesọs 6:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị òtù ọgbakọ ga-adị njikere karị ịnabata enyemaka sitere n’aka ndị okenye mgbe ha ghọtara na ndị okenye na-enwekwa nsogbu, ụjọ, na ihe mgbagwoju anya. (Ndị Rom 12:3; 1 Pita 5:3) Ọzọkwa, ezi nkwurịta okwu pụrụ isochi, a pụkwara inyerịta ndụmọdụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, nke a pụrụ ịrụpụta iwusirịta okwukwe ike. Cheta, mwusi ike dị ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.—2 Timoti 3:1.

11. N’ihi gịnị ka ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’ ji dị ọtụtụ ndị mkpa taa?

11 N’agbanyeghị ebe anyị bi, ndị anyị bụ, ma ọ bụ afọ ole anyị dị, anyị nile ga-eche nsogbu ihu ná ndụ mgbe ụfọdụ. Nke a bụ ihe ya na ụwa taa so aga. (Mkpughe 12:12) Ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-akpata nsogbu anụ ahụ́ na nke uche na-anwale otú okwukwe anyị siruru n’ike. Ọnọdụ ndị na-anwa mmadụ ọnwụnwa pụrụ ibilite n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ime ezinụlọ, ma ọ bụ n’ọgbakọ. Ọ pụrụ ịbụ ọrịa siri ike ma ọ bụ mkpasasị uche e nwere n’oge gara aga ga-akpata ya. Ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ, okenye, ma ọ bụ enyi ejiri obiọma nye agbamume site n’ikwu okwu ndị e chere echiche kwuo na ime ihe ndị na-enye aka—leenụ ka nke ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ! Ọ dị ka ọgwụ e tere onye ahụ́ na-agbakasị! Ya mere, ọ bụrụ na ị chọpụta otu n’ime ụmụnna gị nke nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, bụụrụ ya onye enyemaka na-eme ka a dị ike. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na e nwere nsogbu siri ike nke na-akụda gị mmụọ, rịọ ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ maka enyemaka.—Jems 5:14, 15.

Otú Ọgbakọ Pụrụ Isi Nye Aka

12. Gịnị ka onye nke ọ bụla nọ n’ọgbakọ pụrụ ime iji wusie ụmụnna ya ike?

12 Ndị nile nọ n’ọgbakọ, gụnyere ndị na-eto eto, pụrụ ime ihe iji wusie ndị ọzọ ike. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, gị ịgachi nzukọ na ozi ubi anya na-enye aka nke ukwuu n’iwusi okwukwe nke ndị ọzọ ike. (Ndị Hibru 10:24, 25) Gị ịnọgidesi ike n’ozi dị nsọ bụ ihe àmà nke iguzosi ike n’ihe gị nye Jehova, na-egosikwa na ị mụ anya n’ụzọ ime mmụọ n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ọ pụrụ ịbụ na gị na ha na-alụ. (Ndị Efesọs 6:18) Iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ pụrụ iwusi ndị ọzọ ike.—Jems 2:18.

13. N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji bụrụ ndị na-adịghị ejekwa ozi, gịnịkwa ka a pụrụ ime iji nyere ha aka?

13 Mgbe ụfọdụ, nrụgide nke ndụ ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ pụrụ ime ka ụfọdụ ndị kwụsịtụ ije ozi ubi ma ọ bụ bụrụ ndị na-adịghị ejekwa ozi. (Mak 4:18, 19) O nwere ike anyị agaghị ahụ ndị na-adịghị ejekwa ozi ná nzukọ ọgbakọ. N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka hà ka hụrụ Chineke n’anya n’obi ha. Gịnị ka a pụrụ ime iji wusie okwukwe ha ike? Ndị okenye pụrụ iji obiọma nye aka site n’ịdị na-eleta ha. (Ọrụ 20:35) A pụkwara ịgwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ka ha nye aka. Nleta ịhụnanya ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ kpọmkwem ọgwụ a chọrọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji tụteghachi ndị ahụ na-adịghị ike n’okwukwe.

14, 15. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere banyere iwusi ndị ọzọ ike? Nye ihe atụ nke otu ọgbakọ nke tinyere ndụmọdụ ya n’ọrụ.

14 Bible na-agba anyị ume ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà, na-akwado ndị na-adịghị ike.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ikekwe ‘mkpụrụ obi ndị ahụ dara mbà’ chọpụtara na obi ike ha na-ebelata ebelata nakwa na ha apụghị imeri ihe mgbochi ndị na-eche ha ihu ma ọ bụrụ na e nyeghịrị ha aka. Ị̀ pụrụ inyere ha aka? A sụgharịwo okwu ahụ bụ́ “na-akwadonụ ndị na-adịghị ike” ịbụ “ijidesi ike” ma ọ bụ “ịrapara n’ahụ́” ndị na-adịghị ike. Jehova hụrụ atụrụ ya nile n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. Ọ dịghị ele ha anya dị ka ndị na-abachaghị uru, ọ dịghịkwa nke ọ chọrọ ka ọ kpafuo. Ị̀ pụrụ inyere ọgbakọ aka ‘ijidesi ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ike’ ruo mgbe ha dịrị ike karị?—Ndị Hibru 2:1.

15 Otu okenye letara otu di na nwunye bụ́ ndị ghọworo ndị na-adịghị ejekwa ozi ruo afọ isii. Okenye ahụ na-ede, sị: “Obiọma na nchegbu ịhụnanya ọgbakọ dum gosiri ha nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ha nke na ọ kpaliri ha ịlaghachi n’ìgwè atụrụ ahụ.” Olee otú nleta nke ndị òtù ọgbakọ dị nwanna nwanyị ahụ bụ́bu onye na-adịghị ejekwa ozi? Ọ na-ekwu ugbu a, sị: “Ihe nyeere anyị aka ịmaliteghachi ije ozi bụ na ma ụmụnna nwoke ndị letara anyị ma ụmụnna nwanyị ndị so ha bịa adịghị nke katọrọ anyị. Kama nke ahụ, ha gosiri nghọta ma nye anyị agbamume ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ.”

16. Ònye dị njikere mgbe nile inyere ndị chọrọ mwusi ike aka?

16 Ee, Onye Kraịst nwere obi eziokwu na-enwe obi ụtọ ịbụrụ ndị ọzọ onye enyemaka na-eme ka a dị ike. Ka ọnọdụ na-agbanwekwa ná ndụ anyị, anyị onwe anyị pụrụ ịbụ ndị ụmụnna ga-emere ihe na-ewusi ike. Otú ọ dị, ọ pụrụ ikwe omume na n’oge mkpa, a gaghị enwe enyemaka sitere n’aka mmadụ. Otú o sina dị, e nwere Isi Iyi nke ike bụ́ onye na-anọ ya mgbe nile, onye dị njikere mgbe nile inye aka—Jehova Chineke.—Abụ Ọma 27:10.

Jehova—Isi Iyi Kasịnụ nke Ike

17, 18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si wusie Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ike?

17 Mgbe a kpọgidere ya n’osisi, Jizọs tiri mkpu, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” (Luk 23:46) Mgbe o kwusịrị nke ahụ, ọ nwụrụ. Nanị awa ole na ole tupu mgbe ahụ, e jidere ya, ezigbo ndị enyi ya gbahapụkwara ya ma gbalaga n’ihi ụjọ. (Matiu 26:56) A hapụrụ nanị Jizọs na otu Isi Iyi nke ike—Nna ya nke eluigwe. Otú ọ dị, ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ abụghị n’efu. E ji nkwado Jehova n’onwe ya ji iguzosi ike n’ihe nye Jizọs kwụghachi ya ụgwọ maka iguzosi ike n’ihe ya.—Abụ Ọma 18:25; Ndị Hibru 7:26.

18 N’oge nile nke ozi elu ala Jizọs, Jehova nyere Ọkpara ya ihe dị ya mkpa iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo mgbe o kubiri ume. Dị ka ihe atụ, kpọmkwem ka e mesịrị Jizọs baptizim, bụ́ nke kara akara mmalite nke ozi ya, ọ nụrụ olu Nna ya ka ọ na-ekwupụta nnwapụta ya ma na-emesi ya ike na Ya hụrụ ya n’anya. Mgbe nkwado dị Jizọs mkpa, Jehova zipụrụ ndị mmụọ ozi ịbịa mee ka ọ dị ike. Mgbe Jizọs chere ule kasịnụ ihu ná ngwụsị nke ndụ elu ala ya, Jehova nụrụ ekpere na arịrịọ ya. N’ezie, ihe a nile bụ ihe enyemaka mere ka Jizọs dị ike.—Mak 1:11, 13; Luk 22:43.

19, 20. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jehova ga-ewusi anyị ike n’oge anyị nọ ná mkpa?

19 Jehova chọkwara ịbụ Isi Iyi nke ike anyị. (2 Ihe E Mere 16:9) Ezi Isi Iyi nke ịba ụba nke ike na ume dị ukwuu pụrụ ịghọrọ anyị onye na-eme ka anyị dị ike mgbe anyị nọ ná mkpa. (Aịsaịa 40:26) Agha, ịda ogbenye, ọrịa, ọnwụ, ma ọ bụ ezughị okè nke anyị pụrụ ime ka anyị nwee oké nrụgide. Mgbe ọnwụnwa ndị a na-enwe ná ndụ yiri ka hà na-akarị ike anyị dị ka “onye iro dị ike,” Jehova pụrụ ịbụrụ anyị ike na ume. (Abụ Ọma 18:17; Ọpụpụ 15:2) O nwere ihe enyemaka dị ike maka anyị—mmụọ nsọ ya. Site na mmụọ ya, Jehova pụrụ inye “onye dara mbà ike” ka o wee nwee ike ‘ifego elu na nkù dị ka ugo.’—Aịsaịa 40:29, 31.

20 Mmụọ Chineke bụ ike kasịnụ n’eluigwe na ala. Pọl kwuru, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.” Ee, Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya pụrụ inye anyị “ike karịrị ike nkịtị” ka anyị wee nwee ike idi nsogbu ndị na-egbu mgbu ruo mgbe e mere “ihe nile ka ha dị ọhụrụ” na Paradaịs o kwere ná nkwa nke dị ezi nso.—Ndị Filipaị 4:13; 2 Ndị Kọrint 4:7; Mkpughe 21:4, 5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words, nke W. E. Vine dere, na-ekwu, sị: “Ụdị ngwaa nke okwu ahụ [pa·re·go·riʹa] na-apụta ọgwụ nke e ji eme ka ahụ́ mgbakasị dajụọ.”

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú ụmụnna nọ na Rom si bụụrụ Pọl ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’?

• Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi bụrụ ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’ n’ọgbakọ?

• Olee otú Jehova si bụrụ Isi Iyi anyị kasịnụ nke ike?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụmụnna ghọọrọ Pọl ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’ site n’iji iguzosi ike n’ihe nye ya nkwado, agbamume na ijere ya ozi n’onwe ha

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị okenye na-ebute ụzọ n’iwusi ìgwè atụrụ ahụ ike