Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ụkọchukwu Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwusa Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Ụkọchukwu Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwusa Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Ụkọchukwu Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwusa Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

“ITINYE aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụrụ inyere ndị ogbenye aka, ka otu achịbishọp bụ́ onye Canada gwara ndị njem ala nsọ . . . Ọ bụrụgodị na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị eyighị ka ò kwekọrọ n’uche Chineke, ‘anyị kwesịrị itinye aka na ya ka anyị wee nwee ike iwetara ndị ogbenye ikpe ziri ezi.’”—Catholic News.

Akụkọ banyere ndị ndú okpukpe ịkwado ntinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị abụghị ihe ọhụrụ; e nwekwara ọtụtụ ndị ndú okpukpe nọ n’ọkwá ọchịchị. Ụfọdụ agbalịwo imezi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ọzọ bụkwa ndị a na-akwanyere ùgwù ma na-echeta n’ihi mgbalị ndị ha mere ịkwalite ihe ndị dị ka ime ka agbụrụ nile hara nhata na ikpochapụ ịgba ohu.

Otú o sina dị, ahụ́ adịghị eru ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ala mgbe ndị okwuchukwu ha na-akwado akụkụ dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. “Ọ bụ ndị na-aga chọọchị Protestant bụ ndị kwuru okwu mgbe ụfọdụ megide ndị ụkọchukwu ha itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị,” ka otu isiokwu na-ekwu banyere nkà mmụta ọchịchị na okpukpe dị n’akwụkwọ bụ́ Christian Century, na-ekwu. Ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe na-eche na chọọchị bụ nnọọ ihe dị nsọ nke na o kwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Nke a na-ewelite ajụjụ ụfọdụ na-akpali mmasị bụ́ ndị na-enye ndị nile nwere ọchịchọ ịhụ ụwa ka mma nsogbu n’obi. Ndị na-ekwusa Iso Ụzọ Kraịst hà pụrụ imezi ndọrọ ndọrọ ọchịchị? * Ikwusa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ̀ bụ ụzọ Chineke ga-esi weta ọchịchị ka mma na ụwa ka mma? Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ malitere dị ka ụzọ ọhụrụ isi dọọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

Otú Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Aha Kraịst Si Malite

N’akwụkwọ bụ́ The Early Church, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henry Chadwick na-ekwu na a ma ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ ama maka “enweghị mmasị [ya] n’inweta ike n’ụwa a.” Ọ bụ “òtù nke na-adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke na-adịghị akpata ọgba aghara, na nke na-eme udo.” Akwụkwọ bụ́ A History of Christianity na-ekwu, sị: “E nwere nkwenye siri ike n’etiti Ndị Kraịst nile na ọ dịghị onye òtù ha kwesịrị ịnọ n’ọkwá ọchịchị . . . Laarị azụ ná mmalite nke narị afọ nke atọ Hippolytus kwuru na omenala Ndị Kraịst oge gara aga na-achọ ka onye majie obodo gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ya dị ka ihe a chọrọ ya n’aka iji sonye na Chọọchị.” Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ, ndị na-achọ ike malitere idu ndú n’ọtụtụ ọgbakọ, na-enye onwe ha utu aha ndị dị elu. (Ọrụ 20:29, 30) Ụfọdụ chọrọ ịbụ ma ndị ndú okpukpe ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbanwe mberede e nwere n’ọchịchị ndị Rom nyere ndị chọọchị dị otú ahụ ohere ha chọrọ.

N’afọ 312 O.A., Eze Ukwu Constantine nke Rom bụ́ onye na-ekpere arụsị malitere ile Iso Ụzọ Kraịst elu ọnụ anya ọma. N’ụzọ na-eju anya, ndị bishọp chọọchị dị njikere iso eze ukwu ahụ na-ekpere arụsị nwee nkwekọrịta iji nweta ihe ùgwù ndị ọ na-enye ha. “Chọọchị nọgidere na-emikpukwu onwe ya n’iso eme mkpebi ndị dị mkpa n’ọchịchị,” ka Henry Chadwick dere. Mmetụta dị aṅaa ka itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere n’ahụ́ ndị ndú okpukpe?

Otú Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Si Metụta Ndị Okwuchukwu

Augustine, bụ́ ọkà mmụta okpukpe Katọlik a ma ama na narị afọ nke ise, bụ onye bụ́ isi kwadoro echiche ahụ bụ́ na Chineke ga-eji ndị ndú okpukpe eme ihe dị ka ndị ọchịchị. Ọ tụrụ anya ịhụ ka chọọchị na-achị mba nile ma na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ udo. Ma ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere, sị: “Akụkọ ihe mere eme nke Europe site na narị afọ nke ise ruo na nke iri na ise bụ n’akụkụ ka ukwuu akụkọ banyere ọdịda nke echiche ukwu a nke inweta ọchịchị ụwa nke Chineke na-eduzi dara.” Krisendọm ewetaghị udo ọbụna na Europe, ma ya fọdụzie n’ụwa nile. Ihe e chere na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst rere ùgwù ya n’anya ọtụtụ mmadụ. Oleezi otú mmiri si baa n’opì ụgbọgụrụ?

Ọtụtụ ndị sị na ha na-ekwusa Iso Ụzọ Kraịst bu ezi ihe n’obi banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ha na-ahụtazi onwe ha ka ha na-etinye aka n’ihe ọjọọ. A ma Martin Luther, bụ́ onye nkwusa na onye nsụgharị nke Bible, ama n’ihi mgbalị ndị o mere iji dozigharịa Chọọchị Katọlik. Otú ọ dị, nguzogide o ji anya ike guzogide ozizi chọọchị mere ka ndị na-enupụ isi n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akwanyere ya ùgwù. Ọtụtụ ndị kwụsịrị ịkwanyere Luther ùgwù mgbe ya onwe ya malitekwara ịkwado ihe ndị metụtara ọchịchị. Na mbụ, ọ kwadoro ndị nọ n’ọkwá dị ala bụ́ ndị na-enupụrụ ndị a ma ama na-emegbu ha isi. Mgbe ahụ, mgbe nnupụisi ahụ ghọrọ ime ihe ike, ọ gbara ndị ahụ a ma ama ume ịkwụsị nnupụisi ahụ, bụ́ nke ha mere, na-egbu ọtụtụ puku mmadụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị nọ n’ọkwá dị ala lere ya anya dị ka onye sabo. Luther gbakwara ndị a ma ama ume ná nnupụisi nke ha megide eze ukwu bụ́ onye Katọlik. N’ezie, ndị Protestant, dị ka a bịaziri mara ụmụazụ Luther, hiwere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị site ná mmalite. Olee otú ike si metụta Luther? O mebiri ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na na mbụ, o megidere ịmanye ndị na-ekweghị n’otu echiche okpukpe ime otú ahụ, o mesịrị gbaa ndị enyi ya bụ́ ndị ọchịchị ume igbu ndị na-emegide ime ụmụaka baptizim site n’ịgba ha ọkụ.

John Calvin bụ ụkọchukwu a ma ama na Geneva, ma ọ bịara nwee mmetụta dị ukwuu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe Michael Servetus kọwara na Atọ n’Ime Otu enweghị ihe ndabere ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ, Calvin ji ike ọchịchị ya kwado ogbugbu nke Servetus, bụ́ onye a gbara ọkụ n’elu osisi. Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ ịgbahapụ ozizi Jizọs!

Ikekwe, ndị ikom a chefuru ihe Bible na-ekwu na 1 Jọn 5:19: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” Hà nwere ezi ebumnobi nke imezi ọchịchị nke oge ha, ka ọ̀ bụ atụmanya nke inweta ike na ndị enyi nọ n’ọkwá dị elu dọọrọ ha? Otú o sina dị, ha kwesịrị ichetaworị okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nke onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems: “Ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-edebe onwe ya n’ọnọdụ ịbụ onye iro nke Chineke.” (Jems 4:4) Jems maara na Jizọs ekwuwo banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:14.

Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ bụ ezie na ụfọdụ matara na Ndị Kraịst ekwesịghị itinye aka n’ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa, ọtụtụ ekwenyeghị n’ịnọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, “abụghị akụkụ nke ụwa” n’ezie. Ha na-azọrọ na nnọpụiche dị otú ahụ na-egbochi Ndị Kraịst igosi ịhụnanya maka ndị ọzọ n’ụzọ pụtara ìhè. Ha kweere na ndị ndú chọọchị kwesịrị ikwu okwu megide nrụrụ aka na ikpe na-ezighị ezi na ime ihe iji mee ka ha kwụsị. Ma nnọpụiche nke Jizọs kụziri banyere ya ọ̀ na-emegide n’ezie inwe nchegbu ziri ezi banyere ndị ọzọ? Onye Kraịst ọ̀ pụrụ ịnọpụ iche n’okwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekewasị ndị mmadụ ma n’otu aka ahụ nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ dị irè? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A kọwawo ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka ihe omume ndị e jikọtara ha na ịchị mba ma ọ bụ ógbè, karịsịa arụmụka ma ọ bụ esemokwu dị n’etiti ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị nọ n’ọkwá ọchịchị ma ọ bụ ndị na-achọ ịbanye n’ọchịchị.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị ndú chọọchị kwenyeere ndị ọchịchị, dị ka Eze Ukwu Constantine, Iji nweta ike ọchịchị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Gịnị mere e ji dọta ndị ndú okpukpe a ma ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

Augustine

Luther

Calvin

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Augustine: Foto ICCD; Calvin: Ihe osise Holbein sere, site n’akwụkwọ bụ́ The History of Protestantism (Mpiakọta nke 3)