Ndị Ntorobịa, Ùnu Na-eme Atụmatụ Maka Ọdịnihu?
Ndị Ntorobịa, Ùnu Na-eme Atụmatụ Maka Ọdịnihu?
“Mụ onwe m maara echiche nile nke Mụ onwe m na-eche banyere unu, . . . echiche nke udo, ọ bụghị nke ihe ọjọọ, inye unu ọdịnihu na ntụkwasị obi [ma ọ bụ, “olileanya”].”—JEREMAỊA 29:11.
1, 2. Ụzọ ndị dị aṅaa dịrịtara iche ka a pụrụ isi lee oge ntorobịa anya?
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị toworo eto na-ele oge ntorobịa anya dị ka oge magburu onwe ya ná ndụ. Ha na-echeta ume ọrụ na ịnụ ọkụ n’obi ha nwere mgbe ha na-eto eto. Ha na-eji obi ụtọ echeta oge mgbe ha nwere ibu ọrụ dị nnọọ ole na ole, oge mgbe ha na-ekpori nnọọ ndụ ma nwee ogologo ndụ nke ohere jupụtara na ya.
2 Eleghị anya unu bụ́ ndị na-eto eto nwere echiche megidere nke ahụ. Ọ pụrụ isiri unu ike ime ihe banyere mgbanwe ndị a na-enwe n’ahụ́ na ná mmetụta uche n’oge ntorobịa. N’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ iche nrụgide siri ike nke ndị ọgbọ ihu. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ime mgbalị siri ike iji jụ ọgwụ ike, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, na omume rụrụ arụ. Ọtụtụ n’ime unu na-echekwa ihe ndị metụtara nnọpụiche ma ọ bụ ihe ndị ọzọ metụtara okwukwe unu ihu. Ee, oge ntorobịa pụrụ ịbụ oge siri ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ oge e nwere ọtụtụ ohere. Ajụjụ bụ, Olee otú ị pụrụ isi jiri ohere ndị ahụ mee ihe?
Nụrụ Ụtọ Oge Ntorobịa Gị
3. Ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Solomọn nyere ndị ntorobịa?
3 Ndị toworo eto ga-agwa gị na oge ntorobịa adịghị adịte aka, ha kwukwara eziokwu. Nanị afọ ole na ole na-abịa abịa, ị gaghịzi abụ onye ntorobịa. Nụrụ ụtọ ya mgbe ị ka bụ ya! Nke ahụ bụ ndụmọdụ nke Eze Solomọn, bụ́ onye dere, sị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị, na n’ọhụhụ ụzọ nke anya gị abụọ.” Otú ọ dị, Solomọn dọrọ ndị ntorobịa aka ná ntị, sị: “Ma wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ́ gị gabiga.” O kwukwara, sị: “N’ihi na okorobịa na mgbe dimkpa bụ ihe efu.”—Eklisiastis 11:9, 10.
4, 5. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị na-eto eto na-akwadebe maka ọdịnihu? Nye ihe atụ.
4 Ị̀ ghọtara ihe Solomọn bu n’uche? Iji maa atụ, chee banyere onye na-eto eto nke natara onyinye buru ibu, eleghị anya ihe nketa. Gịnị ka ọ ga-eji ya mee? Ọ pụrụ irifusị ya n’ikpori ndụ—dị nnọọ ka nwa mmefu nke ilu Jizọs. (Luk 15:11-23) Ma, gịnị ga-eme mgbe ego ahụ gwụrụ? N’ezie, ọ ga-akwa ụta na ya emewo nnọọ iberibe! N’aka nke ọzọ, ka e were ya na o ji onyinye ahụ mee atụmatụ maka ọdịnihu, ikekwe jiri amamihe tinye ihe ka ọtụtụ n’ime ya n’azụmahịa. N’ikpeazụ, mgbe ọ ga na-erite uru n’azụmahịa ahụ, ì chere na ọ ga-akwa ụta na ya erifusighị ego ya nile n’ikpori ndụ n’oge ntorobịa ya? Ọ dịghị ma ọlị!
5 Lee oge ntorobịa gị anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke, nke ahụ bụkwa ihe ọ bụ n’ezie. Olee otú ị ga-esi jiri ya mee ihe? Ị pụrụ imefusị ume ọrụ na ịnụ ọkụ n’obi ahụ nile n’imeju ọchịchọ onwe onye, site n’ikpori nnọọ ndụ n’echeghị echiche banyere ọdịnihu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ‘oge okorobịa na mgbe dimkpa nke gị’ ga-abụ “ihe efu” n’ezie. Lee ka ọ ga-esi ka mma iji oge ntorobịa gị kwadebe maka ọdịnihu!
6. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa nke Solomọn na-enye ndị ntorobịa nduzi? (b) Gịnị ka Jehova ga-achọ imere ndị na-eto eto, oleekwa otú onye na-eto eto pụrụ isi rite uru na nke a?
Eklisiastis 12:1) Nke a bụ isi ihe na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma—na-ege Jehova ntị ma na-eme uche ya. Jehova gwara ndị Izrel oge ochie ihe ọ chọrọ imere ha: “Mụ onwe m maara echiche nile nke Mụ onwe m na-eche banyere unu, . . . echiche nke udo, ọ bụghị nke ihe ọjọọ, inye unu ọdịnihu na ntụkwasị obi [ma ọ bụ, “olileanya”].” (Jeremaịa 29:11) Jehova chọkwara inye gị “ọdịnihu na ntụkwasị obi [ma ọ bụ, “olileanya”].” Ọ bụrụ na i cheta ya n’omume, echiche, nakwa ná mkpebi gị, ị ga-enweta ọdịnihu na olileanya ahụ.—Mkpughe 7:16, 17; 21:3, 4.
6 Solomọn kwupụtara ụkpụrụ nke pụrụ inyere gị aka iji oge ntorobịa gị mee ihe kasị mma. O kwuru, sị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” (‘Bịaruo Chineke Nso’
7, 8. Olee otú onye na-eto eto pụrụ isi bịaruo Chineke nso?
7 Jems gbara anyị ume icheta Jehova mgbe ọ sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Jehova bụ Onye Okike, Eze eluigwe, onye ruru eru inweta ofufe na nsọpụrụ nile. (Mkpughe 4:11) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị abịaruo ya nso, ọ ga-abịaru anyị nso. Mmasị ịhụnanya dị otú ahụ ọ́ dịghị eme ka i nwee obi ụtọ?—Matiu 22:37.
8 Anyị na-abịaru Jehova nso n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Na-anọgidesinụ ike n’ekpere, na-amụ anya na ya n’inye ekele.” (Ndị Kọlọsi 4:2) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, zụlite àgwà nke ikpe ekpere. Enwela afọ ojuju nanị n’ịsị “amen” mgbe papa gị ma ọ bụ Onye Kraịst ibe gị n’ọgbakọ duru n’ekpere. Ọ̀ dịtụla mgbe ị gwara Jehova ihe dị gị n’obi n’ekpere ma gwa ya ihe ị na-eche, ihe na-atụ gị egwu, na ihe ịma aka ndị ị na-eche ihu? Ị̀ gwatụla ya ihe ihere na-agaghị ekwe gị gwa mmadụ? Ekpere ndị sitere n’ezi obi na-eme ka anyị nwee udo nke obi. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ha na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso ma nwee mmetụta na ọ na-abịaru anyị nso.
9. Olee otú onye ntorobịa pụrụ isi na-ege Jehova ntị?
9 Anyị na-ahụ ụzọ ọzọ isi bịaruo Jehova nso n’okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ikpeazụ gị.” (Ilu 19:20) Ee, ọ bụrụ na i gee Jehova ntị ma rubere ya isi, ị na-eme atụmatụ maka ọdịnihu gị. Olee otú ị pụrụ isi gosipụta na ị na-ege Jehova ntị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya ma na-ege ntị n’usoro ihe omume. Ọzọkwa, ị ‘na-asọpụrụ nne na nna gị’ site n’ịnọ ya n’ọmụmụ Bible ezinụlọ unu. (Ndị Efesọs 6:1, 2; Ndị Hibru 10:24, 25) Nke ahụ amaka. Otú ọ dị, tụkwasị na nke ahụ, ị̀ ‘na-azụpụta oge’ iji kwadebe maka nzukọ, iji na-agụchi Bible anya, iji na-eme nnyocha? Ị̀ na-etinye ihe ndị ị na-agụ n’ọrụ ka i wee na-eje ije dị ka ‘onye maara ihe’? (Ndị Efesọs 5:15-17; Abụ Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị na-abịaru Jehova nso.
10, 11. Abamuru dị aṅaa dị ukwuu ka ndị na-eto eto na-enweta mgbe ha na-ege Jehova ntị?
10 N’okwu mmalite nke akwụkwọ Ilu, onye dere ya e nyere ike mmụọ nsọ na-akọwa nzube nke akwụkwọ Bible ahụ. Ọ na-ekwu na ọ bụ maka “ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị; ịghọta okwu ọnụ nile nke nghọta; ịnara ịdọ aka ná ntị nke inwe uche, na ezi omume na ikpe na izi ezi; inye ndị na-enweghị uche ezi uche, inye nwa okorobịa ihe ọmụma na izuzu.” (Ilu 1:1-4) N’ihi ya, ka ị na-agụ ma na-etinye okwu ndị dị n’Ilu—nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible—n’ọrụ, ị ga-azụlite ezi omume na izi ezi, Jehova ga-enwekwa obi ụtọ ime ka ị bịaruo ya nso. (Abụ Ọma 15:1-5) Ka ị na-azụlite ikpe, ezi uche, ihe ọmụma, na izuzu, otú ahụ ka mkpebi ndị ị na-eme na-aka mma.
11 Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịtụ anya ka onye na-eto eto jiri amamihe na-eme ihe n’ụzọ dị otú a? Ee e, n’ihi na ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-eme otú ahụ. N’ihi nke a, ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù, ha ‘adịghịkwa 1 Timoti 4:12) Ndị mụrụ ha ziri ezi iji ha na-eme ọnụ, Jehova na-ekwukwa na ha na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọ bụ ezie na ha na-eto eto, ha pụrụ inwe obi ike na okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ metụtara ha: “Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo.”—Abụ Ọma 37:37.
elelị ntorobịa ha bụ anya.’ (Mee Nhọrọ Ndị Ziri Ezi
12. Gịnị bụ otu n’ime nhọrọ ndị dị mkpa ndị na-eto eto na-eme, n’ihi gịnịkwa ka nhọrọ ahụ ji arụpụta ihe ndị na-adịte aka?
12 Oge ntorobịa bụ oge ime nhọrọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-arụpụta ihe ndị na-adịgide adịgide. Ụfọdụ nhọrọ ndị ị na-eme ugbu a ga-emetụta gị ruo ọtụtụ afọ n’ọdịnihu. Nhọrọ ndị amamihe dị na ha na-eme ka a dị ndụ obi ụtọ na nke na-aga nke ọma. Nhọrọ ndị amamihe na-adịghị na ha pụrụ imebi ndụ anyị dum. Tụlee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu banyere nhọrọ abụọ ndị ị na-aghaghị ime. Nke mbụ: Ònye ka ị na-ahọrọ iso na-akpakọrịta? N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị mkpa? Ilu e dere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị na-emesị dịrị ka ndị anyị na ha na-akpakọrịta—ma hà bụ ndị maara ihe ma hà bụ ndị nzuzu. Olee ndị nke ị ga-achọ ịdị ka ha?
13, 14. (a) E wezụga iso ndị mmadụ na-akpakọrịta, gịnị ka mkpakọrịta gụnyere? (b) Ihie ụzọ dị aṅaa ka ndị na-eto eto kwesịrị izere?
13 Mgbe i chere banyere mkpakọrịta, eleghị anya ị na-eche banyere iso ndị mmadụ na-anọkọ. Nke ahụ ziri ezi, ma ọ gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Mgbe ị na-ekiri ihe omume telivishọn, na-ege egwú, na-agụ akwụkwọ, na-aga ikiri sinima, ma ọ bụ na-ekiri ihe ụfọdụ n’Intanet, ị na-enwe mkpakọrịta. Ọ bụrụ na mkpakọrịta ahụ metụtara ime ihe ike na omume ndị rụrụ arụ ma ọ bụ na-agba ume ka a na-aṅụ ọgwụ ike, na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ na-agba ume ime ihe ọ bụla megidere ụkpụrụ Bible, i so “onye nzuzu,” bụ́ onye na-eme omume ka à ga-asị na Jehova adịghị, na-akpakọrịta.—Abụ Ọma 14:1.
14 Eleghị anya ị na-eche na ebe ọ bụ na ị na-aga nzukọ Ndị Kraịst ma na-ejechi ozi anya n’ọgbakọ, i siri nnọọ ike nke na ihe nkiri sinima na-egosi ime ihe ike ma ọ bụ egwú ndị ụda ha dị mma ma ha nwere okwu uri ndị a na-enyo enyo, apụghị imetụta gị. Ikekwe ị 1 Ndị Kọrint 15:33) N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-enwe ọganihu ekwewo ka mkpakọrịta amamihe na-adịghị na ha mebie àgwà ọma ha. N’ihi ya, kpebisie ike ịjụ mkpakọrịta ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị na-agbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.”—Ndị Rom 12:2.
na-eche na ọ dịghị ihe ga-eme gị ma ọ bụrụ na i gwunyetụ anya n’ógbè na-egosi ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet. Pọl onyeozi na-agwa gị na ị dara ya! Ọ na-ekwu, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (15. Gịnị bụ nhọrọ nke abụọ ndị na-eto eto na-aghaghị ime, nrụgide ndị dịkwa aṅaa ka ha na-enwe mgbe ụfọdụ n’akụkụ a?
15 Nke a bụ nhọrọ nke abụọ na-eche gị ihu. Oge ga-abịa mgbe ị na-aghaghị ikpebi ihe ị ga-achọ ime ma ị gụsịa akwụkwọ. Ọ bụrụ na i bi n’ala ebe ọrụ kọrọ ụkọ, ị pụrụ inwe nrụgide ịnara nke kasị mma aka gị ruru. Ọ bụrụ na i bi ná mba bara ọgaranya, a pụrụ inwe ọtụtụ nhọrọ, ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịbụ ndị na-adọrọ adọrọ. N’ibu ezi ihe n’obi, ndị nkụzi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị pụrụ ịgba gị ume ịchụso ọrụ ga-enye gị ego ga-ezuru gị, ikekwe ọbụna mee gị ọgaranya. Otú ọ dị, inweta ọzụzụ maka ọrụ dị otú ahụ pụrụ ibelata nnọọ oge ị pụrụ itinye n’ijere Jehova ozi.
16, 17. Kọwaa otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche pụrụ isi nyere onye na-eto eto aka inwe echiche ziri ezi banyere ọrụ.
16 Cheta ịtụle Bible tupu ị na-eme mkpebi. Bible na-agba anyị ume ịrụ ọrụ iji kpata ihe anyị ga-eri, na-egosi na ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịkpa afọ anyị. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10-12) Ma, ọ dị ihe ndị ọzọ ọ gụnyere. Anyị na-agba gị ume ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ ma chee echiche otú ha pụrụ isi nyere onye na-eto eto aka inwe echiche ziri ezi n’okwu banyere ịhọrọ ọrụ: Ilu 30:8, 9; Eklisiastis 7:11, 12; Matiu 6:33; 1 Ndị Kọrint 7:31; 1 Timoti 6:9, 10. Ka ị gụsịrị amaokwu ndị ahụ, ị̀ na-ahụ echiche Jehova n’okwu ahụ?
17 Ọrụ ego ekwesịghị ma ọlị ịghọ ihe dị oké mkpa nke na ọ ga-akpagbu ozi anyị na-ejere Jehova. Ọ bụrụ na ị pụrụ iru inweta ọrụ dị mma ma ị gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị, nke ahụ dị mma. Ọ bụrụ na ị chọkwuru ọzụzụ mgbe ị gụsịrị akwụkwọ sekọndrị, nke ahụ bụ ihe gị na ndị mụrụ gị ga-ekwurịta. Otú ọ dị, echefula “ihe ndị ka mkpa”—ihe ime mmụọ. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Ehiela ụdị ụzọ Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa, hiere. Ọ kwụsịrị iji ihe ùgwù ije ozi ya akpọrọ ihe ma malite ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu.’ (Jeremaịa 45:5) O chefutụrụ na ọ dịghị “ihe ukwu” dị n’ụwa a nke ga-adọta ya nso n’ebe Jehova nọ ma ọ bụ nyere ya aka ịlanarị mbibi nke Jeruselem. A pụkwara ikwu ihe yiri nke ahụ banyere anyị taa.
Jiri Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe
18, 19. (a) Gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị agbata obi gị nọ na ya, oleekwa mmetụta i kwesịrị inwe n’ahụ́ ha? (b) N’ihi gịnị ka agụụ na-ejighị agụ ụfọdụ ndị n’ụzọ ime mmụọ?
18 Ị̀ hụtụla ụmụaka nọ ná mba ndị ụnwụ nri na-akpa aka ọjọọ n’usoro mgbasa ozi? Ọ bụrụ na ị hụtụla, ihe ịrụ ụka adịghị ya na i meteere ha ebere. Ị̀ na-emetekwara ndị agbata obi gị ebere n’ụzọ dị otú ahụ? N’ihi gịnị ka i ji kwesị imetere ha ebere? Ọ bụ n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha nọ agụụ. Ha nọ n’ụnwụ nri nke Emọs buru n’amụma: “Ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta), mgbe M ga-ezite oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.”—Emọs 8:11.
19 N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ agụụ ime mmụọ a ‘amaghị mkpa nke ime mmụọ ha.’ (Matiu 5:3) Agụụ nri ime mmụọ adịghị agụ ọtụtụ n’ime ha. Ụfọdụ pụrụ ọbụna iche na ha na-eriju afọ. Ma, ọ bụrụ na ha na-eche otú ahụ, ọ bụ n’ihi na ha na-enweta “amamihe nke ụwa” bụ́ nke na-abaghị uru, bụ́ nke na-agụnye ịhụ ihe onwunwe n’anya, ịkọ nkọ nke ndị ọkà mmụta sayensị, echiche dị iche iche banyere omume, na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ụfọdụ na-eche na “amamihe” nke oge a na-eme ka ozizi Bible bụrụ ihe oge ya gafeworo. Otú ọ dị, “ụwa esiteghị n’amamihe ya mara Chineke.” Amamihe nke ụwa agaghị enyere gị aka ịbịaru Chineke nso. Ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị “ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—1 Ndị Kọrint 1:20, 21; 3:19.
20. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịchọ iṅomi ndị na-adịghị efe Jehova?
20 Mgbe ị na-ekiri ụmụaka ahụ agụụ na-agụgbu, ọ̀ dị mgbe ị na-achọ ịdị ka ha? Ọ dịghị ma ọlị! Ma, ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’ezinụlọ Ndị Kraịst egosiwo na ha chọrọ ịdị ka ndị gbara ha gburugburu nọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Eleghị anya, ndị na-eto eto dị otú ahụ na-eche na ndị ntorobịa nọ n’ụwa nweere onwe ha, na-ekpori ndụ. Ha chefuru na e kewapụrụ ndị ntorobịa dị otú ahụ n’ebe Jehova nọ. (Ndị Efesọs 4:17, 18) Ha chefukwara ihe dị njọ ịnọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ na-akpata. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ na-akpata bụ ịtụrụ ime a na-achọghị nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na nsogbu anụ ahụ́ na nke uche bụ́ nke omume rụrụ arụ, ise siga, ịṅụbiga mmanya ókè, na ịṅụ ọgwụ ike na-akpata. Ịnọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ na-akpata mmụọ nnupụisi, enweghị olileanya nke ya na ya so aga, na enweghị nduzi ná ndụ.
21. Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ n’ịkpa àgwà ọjọọ ndị ndị na-adịghị efe Jehova na-akpa?
21 N’ihi ya, mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ n’etiti ndị na-esoghị gị na-efe Jehova, ekwela ka àgwà ha na-achịkwa nke gị. (2 Ndị Kọrint 4:18) Ụfọdụ pụrụ ikwu okwu nlelị banyere ihe ime mmụọ. Tụkwasị na nke ahụ, usoro mgbasa ozi ga-agbasa echiche aghụghọ ndị na-eduhie eduhie, na-akọwa na ọ dịghị njọ ime omume rụrụ arụ, ịṅụgiba mmanya ókè, ma ọ bụ iji okwu rere ure na-eme ihe. Lụsoo mmetụta dị otú ahụ ọgụ. Nọgide na-eso ndị “na-enwe okwukwe na ezi akọ na uche” na-akpakọrịta. ‘Na-enwe ọtụtụ ihe ime mgbe nile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Timoti 1:19; 1 Ndị Kọrint 15:58 ) Na-arụsi ọrụ ike n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’ozi ubi. Mgbe ị na-aga akwụkwọ, na-ekere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Mee ka ikike ịhụ ụzọ ime mmụọ gị dịkwuo nkọ, n’ụzọ dị otú a, ụkwụ gị agaghịkwa agbụchapụ.—2 Timoti 4:5.
22, 23. (a) N’ihi gịnị ka Onye Kraịst na-eto eto ga-eji na-emekarị nhọrọ ndị ndị ọzọ na-agaghị aghọta? (b) Gịnị ka a na-agba ndị ntorobịa ume ka ha na-eme?
22 Ile ihe anya n’ụzọ ime mmụọ ga-eduba gị ma eleghị anya n’ime mkpebi ndị ndị ọzọ na-agaghị aghọta. Dị ka ihe atụ, otu onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst nwere nkà n’egwú ma na-eme nnọọ nke ọma n’ihe ọmụmụ nile n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, o sonyeere papa ya n’ọrụ ihicha windo ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ ọ họọrọ dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile, ma ọ bụ ọsụ ụzọ. Ndị nkụzi ya aghọtatụghị ihe mere o ji mee mkpebi o mere, ma ọ bụrụ na ị bịaruwo Jehova nso, anyị ji n’aka na ị ga-aghọta.
23 Ka ị na-atụle otú ị ga-esi jiri ihe ndị dị oké ọnụ ahịa i nwere dị ka onye ntorobịa mee ihe, ‘na-atọrọ onwe gị ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka i wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ (1 Timoti 6:19) Kpebisie ike ‘icheta Onye kere gị’ mgbe ị dị na ntorobịa—nakwa ná ndụ gị nile. Nke ahụ bụ nanị ụzọ isi mee atụmatụ maka ọdịnihu ga-aga nke ọma, bụ́ ọdịnihu na-enweghị njedebe.
Gịnị Bụ Nkwubi Okwu Gị?
• Ndụmọdụ dị aṅaa sitere n’ike mmụọ nsọ na-enyere ndị na-eto eto aka n’ime atụmatụ maka ọdịnihu?
• Olee ụzọ ụfọdụ ndị ntorobịa pụrụ isi ‘bịaruo Chineke nso’?
• Olee ụfọdụ mkpebi onye na-eto eto na-eme bụ́ ndị ga-emetụta ọdịnihu ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ị̀ ga-ekwe ka nchụso onwe onye wekọrọ ume ọrụ na ịnụ ọkụ n’obi ntorobịa gị nile?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ndị Kraịst na-eto eto maara ihe na-eme ka anya ime mmụọ ha nọgide na-ahụ ụzọ nke ọma