Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnọpụiche Ọ̀ Na-egbochi Ịhụnanya Ndị Kraịst?

Nnọpụiche Ọ̀ Na-egbochi Ịhụnanya Ndị Kraịst?

Nnọpụiche Ọ̀ Na-egbochi Ịhụnanya Ndị Kraịst?

ỊBỤ Onye Kraịst na-agụnye ihe karịrị ịgụ Bible, ikpe ekpere, na ikwe ukwe n’ụbọchị Sunday. Ọ na-agụnye imere ma Chineke ma ndị mmadụ ihe. Bible na-ekwu, sị: “Ka anyị na-ahụ n’anya, ọ bụghị n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Jizọs nwere ezi nchegbu banyere ndị ọzọ, Ndị Kraịst kwesịkwara iṅomi ya. Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha na-enwe “ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Ma gịnị bụ ọrụ Onyenwe anyị? Ọ̀ na-agụnye ịgbalị ịgbanwe ụkpụrụ gọọmenti maka abamuru nke ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu? Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Jizọs mere?

Ọ bụ ezie na a gbara Jizọs ume itinye aka n’okwu metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịkwado otu akụkụ, ọ jụrụ ime otú ahụ. Ọ jụrụ ike nke ịchị alaeze nile nke ụwa bụ́ nke Setan kwere nkwa inye ya, ọ jụrụ ịbụ onye a dọbara n’arụmụka banyere ịkwụ ụtụ isi, o wezụgakwara onwe ya mgbe otu ìgwè mmadụ chọrọ ime ya eze. (Matiu 4:8-10; 22:17-21; Jọn 6:15) Ma nnọpụiche ya egbochighị ya ịrụ ọrụ maka abamuru nke ndị ọzọ.

Jizọs lekwasịrị anya n’ihe ga-ewetara ndị ọzọ abamuru na-adịgide adịgide. Ọ bụ ezie na inye puku mmadụ ise nri na ịgwọ ndị ọrịa wetaara mmadụ ole na ole ahụ́ efe ruo nwa oge, ozizi ya mere ka ihe nile a kpọrọ mmadụ nwee ike inweta ngọzi ndị na-adịgide adịgide. A bịara mara Jizọs, ọ bụghị dị ka onye na-ahazi ọrụ enyemaka, kama dị nnọọ ka “Onye Ozizi.” (Matiu 26:18; Mak 5:35; Jọn 11:28) Ọ sịrị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.”—Jọn 18:37.

Ikwusa Ihe Ka Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Mma

Eziokwu Jizọs kụziri abụghị banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama nke ahụ, o lekwasịrị anya n’Alaeze nke ya onwe ya ga-abụ Eze ya. (Luk 4:43) Alaeze a bụ ọchịchị eluigwe, ọ ga-anọchikwa ọchịchị nile nke mmadụ ma wetara ihe a kpọrọ mmadụ udo na-adịgide adịgide. (Aịsaịa 9:6, 7; 11:9; Daniel 2:44) N’ihi ya, ọ bụ ya bụ nanị ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ́ bụghị ihe na-egosi ịhụnanya ikwusa banyere ụdị olileanya a e ji n’aka maka ọdịnihu karịa ịgba ndị mmadụ ume ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi iweta ọdịnihu dị nchebe? Bible na-ekwu, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya.” (Abụ Ọma 146:3-5) Ya mere, kama izipụ ndị na-eso ụzọ ya ikwusa banyere ụzọ ka mma isi na-ahazi ọchịchị, Jizọs kụziiri ha ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze.’—Matiu 10:6, 7; 24:14.

Ya mere, ọ bụ nke a bụ “ọrụ Onyenwe anyị” nke e nyere Ndị Kraịst na-eme nkwusa iwu ịrụ. Ebe ọ bụ na a chọrọ ka ndị Alaeze Chineke ga-achị na-ahụrịta ibe ha n’anya, Alaeze ahụ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ikpochapụ ịda ogbenye site n’ikesa ihe onwunwe nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ ha nhata. (Abụ Ọma 72:8, 12, 13) Nke a bụ ozi ọma, o kwesịkwara ka e kwusaa ya.

Taa, a haziri Ndịàmà Jehova ịrụ ‘ọrụ a nke Onyenwe anyị’ n’ala 235. N’ikwekọ n’ihe Jizọs nyere n’iwu, ha na-akwanyere ọchịchị nile ùgwù. (Matiu 22:21) Ma, ha na-erubekwara okwu ndị a ọ gwara ụmụazụ ya isi: “Unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa.”—Jọn 15:19.

Ụfọdụ ndị na-ekwusa ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbanwewo mgbe ha jisịrị nlezianya nyochaa Bible. Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ịtali, bụ́ onye òtù nke Catholic Action, bụ́ òtù chọọchị na-achịkwa, kwuru, sị: “Abanyere m na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-eche na mmadụ kwesịrị ịtụnye ụtụ pụtara ìhè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta nke ọha mmadụ.” Mgbe ọ gbasịrị arụkwaghịm dị ka onyeisi obodo iji nwee ike ikwusa Alaeze Chineke dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ kọwara ihe mere mgbalị nke ndị nwere ezi obi nọ n’ọchịchị ji akụ afọ n’ala. “Ụwa bụ ihe ọ bụ ugbu a, ọ bụghị n’ihi na ndị ezi mmadụ agbalịbeghị ime ka ọnọdụ ka mma, kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi na ihe ọjọọ nke ọtụtụ ndị na-eme ekpuchiwo mgbalị sitere n’ezi obi nke mmadụ ole na ole na-eme.”

Ịghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji nwee ike ikwusa nanị ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ adịghị egbochi ezi Ndị Kraịst inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ndị dị irè. Ndị ha na-enyere aka ịghọ ndị Alaeze Chineke ga-achị na-amụta ịgbanwe àgwà ndị na-emebi ihe, ịkwanyere ndị ọchịchị ùgwù, ime ka ndụ ezinụlọ ha ka mma, nakwa ile ihe onwunwe anya n’ụzọ kwesịrị kwesị. Ọbụna nke ka mkpa bụ na Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya.

Ndị nkwusa nke Alaeze Chineke na-abara ọha mmadụ ha bi n’etiti ha uru. Ma nke ka nke bụ na ha na-eduzi ndị mmadụ gaa n’inwe ntụkwasị obi n’ọchịchị nke bụ́ ezigbo ya, nke ga-ewetakwara ndị nile hụrụ Chineke n’anya udo na-adịgide adịgide. N’ihi nnọpụiche ha, Ndị Kraịst a nweere onwe ha iweta enyemaka kasị adịgide adịgide na nke kasị dị irè e nwere taa.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Site n’Ikwusa Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Gaa n’Ikwusa Alaeze Chineke

Dị ka nwa okoro, Átila mụrụ nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe n’aka ụkọchukwu parish dị na Belém, Brazil. Ọ na-amasị ya ịnụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-emesị nwere onwe ha pụọ ná mmegide, o sonyekwara n’òtù na-akpali ndị ọchịchị ịrụ ọrụ ha, bụ́ ebe ọ mụtara ịhazi ngagharị iwe na nnupụisi megide ọchịchị.

Ma, ọ na-amasịkwa Átila ịkụziri ụmụ ndị òtù ya ihe, na-eji otu akwụkwọ o nwetara bụ́ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, eme ihe. * Akwụkwọ ahụ kwuru banyere omume ọma na irubere ndị ọchịchị isi. Nke a mere ka Átila na-eche ihe mere na ndị na-akwado nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe anaghị agbaso ụkpụrụ omume dị elu nke Jizọs nakwa ihe mere ụfọdụ ji echefu ndị a na-emegbu emegbu mgbe ha nwetara ike ọchịchị. Ọ pụrụ n’òtù ahụ. Mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya ma soro ya kwurịta banyere Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịmụ Bible ma na-amụta ihe bụ́ ezi ihe ngwọta nye mmegbu a na-emegbu ihe a kpọrọ mmadụ.

N’ihe dị ka n’oge ahụ, Átila gara nzukọ ọmụmụ ihe ndị Katọlik banyere okwukwe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. “Ihe abụọ a na-agakọ,” ka ndị duziri ya kọwara. Ọ gakwara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Lee nnukwu ọdịiche e nwere! Otu ihe bụ na e nweghị onye na-ese siga, onye na-aṅụ mmanya, ma ọ bụ onye na-egwu egwuregwu rụrụ arụ. O kpebiri isonyere ha n’ọrụ nkwusa ha, e mekwara ya baptizim n’oge na-adịghị anya. Ọ pụrụ ịhụ ugbu a ihe mere na nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe abụghị ezi ihe ngwọta nye nsogbu ndị ogbenye.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Nnọpụiche nke ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst adịghị egbochi ha inyere ndị ọzọ aka