Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaịa
Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaịa
“Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.”—ABỤ ỌMA 27:14.
1. Ngọzi dị aṅaa bara ụba ka Ndịàmà Jehova na-enweta?
NDỊÀMÀ JEHOVA bi na paradaịs ime mmụọ. (Aịsaịa 11:6-9) N’ime ụwa a nọ ná nsogbu, ha na Ndị Kraịst ibe ha, bụ́ ndị ha na Jehova Chineke na ụmụnna ha dị n’udo, nọkọta ọnụ n’ógbè ime mmụọ pụrụ iche. (Abụ Ọma 29:11; Aịsaịa 54:13) Paradaịs ime mmụọ ha na-agbasawanyekwa agbasawanye. Ndị nile ‘ji obi ha dum na-eme uche Chineke’ so na-agbasawanye ya. (Ndị Efesọs 6:6) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible nakwa site n’ịkụziri ndị ọzọ ime otu ihe ahụ, si otú ahụ na-akpọ ha òkù ịbịa soro kere ókè ná ngọzi bara ụba nke paradaịs ahụ.—Matiu 28:19, 20; Jọn 15:8.
2, 3. Gịnị ka ezi Ndị Kraịst na-aghaghị idi?
2 Otú ọ dị, anyị ibi na paradaịs ime mmụọ ahụ apụtaghị na anyị agaghị enweta ọnwụnwa. Anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, na-enwekwa ihe mgbu nke ọrịa, ịka nká, ma na-emesị nwụọ. Ọzọkwa, anyị na-ahụ mmezu nke amụma ndị metụtara ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1) Agha, mpụ, ọrịa, ụnwụ nri, na oké ihe isi ike ndị ọzọ na-emetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ, a gụpụghịkwa Ndịàmà Jehova.—Mak 13:3-10; Luk 21:10, 11.
3 E wezụga ihe a nile, anyị maara nke ọma na n’agbanyeghị nchebe anyị na-enweta na paradaịs ime mmụọ anyị, anyị ka na-enweta mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka ndị na-anọghị n’ime ya. Jizọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “N’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị. Burunụ okwu m gwara unu n’uche, Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:18-21) Otu ihe ahụ na-eme taa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ adịghị nnọọ aghọta ụdị ofufe anyị ma ọ bụ jiri ya kpọrọ ihe. Ụfọdụ na-akatọ anyị, na-akwa anyị emo, ma ọ bụ ọbụna—dị ka Jizọs dọrọ aka ná ntị—na-akpọ anyị asị. (Matiu 10:22) Ọtụtụ mgbe, a na-akọwahie anyị ma na-ekwu ihe ndị na-eduhie eduhie banyere anyị n’usoro mgbasa ozi. (Abụ Ọma 109:1-3) Ee, anyị nile na-eche ọnọdụ ndị na-ama aka ihu, ụfọdụ n’ime anyị pụkwara ịmalite inwe nkụda mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi die ha?
4. Ebee ka anyị na-elega anya maka enyemaka iji na-atachi obi?
4 Jehova ga-enyere anyị aka. Site n’ike mmụọ nsọ, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19; 1 Ndị Kọrint 10:13) Ọtụtụ n’ime anyị pụrụ ịgba akaebe na mgbe anyị tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam, ọ na-enye anyị ume ịtachi obi n’ihe isi ike ọ bụla. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na ọṅụ e debere n’ihu anyị na-enyere anyị aka ịlụso nkụda mmụọ na egwu ọgụ. (Ndị Hibru 12:2) N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe isi ike, anyị na-anọgidesi ike.
Okwu Chineke Wusiri Jeremaịa Ike
5, 6. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere banyere ndị na-efe ezi ofufe bụ́ ndị tachiliri obi? (b) Olee otú Jeremaịa si meghachi omume mgbe a kpọrọ ya ịbụ onye amụma?
5 N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi enwetawo ọṅụ n’agbanyeghị ọnọdụ ndị tara akpụ. Ụfọdụ Ndị Rom 15:4) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Jeremaịa.
biri ndụ n’oge ikpe mgbe Jehova mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Jeremaịa na mmadụ ole na ole ndị ha na ya dịkọrọ ndụ, nakwa Ndị Kraịst narị afọ mbụ so ná ndị dị otú ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi fee ofufe. E dekọrọ ihe atụ ndị ahụ mere eme na Bible ka ha bụụrụ anyị ihe agbamume, anyị pụkwara ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịmụ ha. (6 Mgbe ọ bụ nwata, a kpọrọ Jeremaịa ije ozi dị ka onye amụma na Juda. Nke a abụghị ọrụ dị mfe. Ọtụtụ ndị nọ na-efe chi ụgha. Ọ bụ ezie na Josaịa, onye bụ́ eze mgbe Jeremaịa malitere ozi ya, kwesịrị ntụkwasị obi, ndị eze nile nọchiri ya ekwesịghị ntụkwasị obi, ihe kakwa n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọ bụ ọrụ ha izi ndị ahụ ihe—ndị amụma na ndị nchụàjà—adịghị akwado eziokwu ahụ. (Jeremaịa 1:1, 2; 6:13; 23:11) Oleezi otú ọ dị Jeremaịa mgbe Jehova kpọrọ ya ịbụ onye amụma? Egwu tụrụ ya! (Jeremaịa 1:8, 17) Jeremaịa chetara mmeghachi omume mbụ ya: “M wee sị, Ewo, Onyenwe anyị Jehova! lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.”—Jeremaịa 1:6.
7. Mmeghachi omume dị aṅaa ka Jeremaịa nwetara n’ókèala ya, gịnịkwa ka o mere?
7 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi n’ókèala Jeremaịa anabataghị ozi ya, o nwetakwara mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ọtụtụ mgbe. N’otu oge Pashụa, bụ́ onye nchụàjà, tiri ya ihe ma mee ka e tinye ya n’ọtọsị. Jeremaịa kọrọ otú ọ dị ya mgbe ahụ: “M wee sị, M gaghị ehota Ya [Jehova], m gaghị ekwukwa okwu ọzọ n’aha Ya.” Ikekwe ọ dịtụwo gị otú ahụ—ị chọọ ịda mbà. Rịba ama ihe nyeere Jeremaịa aka ịnọgidesi ike. O kwuru, sị: “O [okwu, ma ọ bụ ozi Chineke] wee dị n’obi m dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ m nile, ike gwụkwara m ịnagide ya, enweghịkwa m ike.” (Jeremaịa 20:9) Okwu Chineke ọ̀ na-enwe mmetụta dị otú ahụ n’ahụ́ gị?
Ndị Ibe Jeremaịa
8, 9. (a) Adịghị ike dị aṅaa ka Ụraịja gosipụtara, gịnị si na ya pụta? (b) N’ihi gịnị ka Beruk ji daa mbà n’obi, oleekwa otú e si nyere ya aka?
8 Ọ bụghị nanị Jeremaịa na-arụ ọrụ amụma ya. O nwere ndị ibe, nke ahụ aghaghịkwa ịgbawo ya ume. Otú ọ dị, n’oge ụfọdụ, ndị ibe ya emeghị ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Dị ka ihe atụ, onye amụma ibe ya aha ya bụ Ụraịja nọ na-akpọsa ịdọ aka ná ntị megide Jeruselem na Juda “dị ka okwu nile nke Jeremaịa si dị.” Otú ọ dị, mgbe Eze Jehoiakim nyere iwu ka e gbuo Ụraịja, onye amụma ahụ ji ụjọ gbaga Ijipt. Nke ahụ azọpụtaghị ya. Ndị ikom eze ahụ chụwara ya, jide ya ma kpọghachite ya Jeruselem, bụ́ ebe ha nọ gbuo ya. Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiwo wụọ Jeremaịa akpata oyi n’ahụ́!—Jeremaịa 26:20-23.
9 Onye ibe ọzọ nke Jeremaịa bụ odeakwụkwọ ya, bụ́ Beruk. Beruk nyere Jeremaịa nkwado dị ukwuu, ma n’otu oge, ya onwe ya kwụsịkwara ilekwasị anya n’ihe ime mmụọ. Ọ malitere ime mkpesa, na-asị: “Ahụhụ na-adịrị m! n’ihi na Jehova atụkwasịwo ihe mwute n’elu ihe mgbu m; adọgbuwo m onwe m n’ọrụ n’ize ume m, ma achọtaghị m ebe izu ike.” N’ịbụ onye dara mbà n’obi, Jeremaịa 45:1-5) Lee ka Jeremaịa na-aghaghị isiwo bụrụ onye a gbara ume mgbe Beruk kwụsighachiri ike n’ụzọ ime mmụọ!
Beruk malitere ịkwụsị iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ji obiọma nye Beruk ndụmọdụ amamihe dị na ya, a gbazikwara ya. E mesiziri ya obi ike na ọ ga-alanarị mbibi Jeruselem. (Jehova Kwadoro Onye Amụma Ya
10. Nkwa dị aṅaa nke nkwado ka Jehova kwere Jeremaịa?
10 Nke kasị mkpa, Jehova agbahapụghị Jeremaịa. Ọ ghọtara mmetụta onye amụma ya nwere ma nye ya ike na nkwado dị ya mkpa. Dị ka ihe atụ, ná mmalite nke ozi Jeremaịa mgbe o kwupụtara obi abụọ o nwere banyere iru eru ya, Jehova gwara ya, sị: “Atụla egwu ihu ha: n’ihi na gị ka M nọnyeere ịnapụta gị, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” Mgbe ahụ, mgbe Jehova nyesịrị onye amụma ya ihe ọmụma banyere ọrụ ya, Ọ gwara ya, sị: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:8, 19) Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-akasi obi! Jehova mezukwara okwu ya.
11. Olee otú anyị si mara na Jehova mezuru nkwa o kwere ịkwado Jeremaịa?
11 N’ihi ya, mgbe e tinyere ya n’ọtọsị ma kwaa ya emo n’ihu ọha, Jeremaịa ji obi ike kwuo, sị: “Jehova nọnyeere m dị ka dike nke na-eme ka a maa jijiji: n’ihi nke a ndị na-esogbu m ga-asụ ngọngọ, ha agaghị enwekwa ike: ihere ga-eme ha nke ukwuu.” (Jeremaịa 20:11) N’afọ ndị sochirinụ, mgbe a nwara igbu Jeremaịa, Jehova nọgidere na-anọnyere ya, dịkwa ka Beruk, Jeremaịa lanarịrị mbibi nke Jeruselem dị ka onye nweere onwe ya, ebe ndị na-akpagbu ya na ndị leghaara ịdọ aka ná ntị ya anya lara n’iyi ma ọ bụ bụrụ ndị a dọkpụụrụ laa Babilọn.
12. N’agbanyeghị ihe ndị pụrụ ịkpata nkụda mmụọ, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche?
12 Dị ka Jeremaịa, taa, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-edi nhụjuanya. Dị ka e kwuru n’elu, ihe na-akpata ụfọdụ n’ime nhụjuanya ndị a bụ ezughị okè nke anyị, ihe na-akpata ndị ọzọ bụ ọgba aghara nke ụwa nọ na ya, ebe ihe na-akpata ndị ọzọkwa bụ ndị na-emegide ọrụ anyị. Nhụjuanya ndị dị otú ahụ pụrụ ịkụda mmụọ. Dị ka Jeremaịa, ọ pụrụ iru n’ọnọdụ nke na anyị pụrụ ịdị na-eche ma ànyị pụrụ ịga n’ihu. N’ezie, anyị pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị nwere nkụda mmụọ site n’oge ruo n’oge. Nkụda mmụọ na-anwale otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ miruru emi. Ya mere, ka anyị kpebisie ike ịghara ikwe ka nkụda mmụọ mee ka anyị kwụsị ije ozi Jehova dị ka Ụraịja mere. Kama nke ahụ, ka anyị ṅomie Jeremaịa ma nwee obi ike na Jehova ga-akwado anyị.
Ụzọ Isi Lụsoo Nkụda Mmụọ Ọgụ
13. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya nke Jeremaịa na Devid?
13 Jeremaịa so Jehova Chineke nwee nkwurịta okwu n’ụzọ chiri anya, na-agwa ya mmetụta ya kasị mie emie ma na-arịọ maka ike. Nke ahụ bụ ezi ihe nlereanya nke anyị ga-agbaso. Devid oge ochie, bụ́ onye legaara otu Isi Iyi ahụ nke ike anya, dere, sị: “Gee ntị n’okwu ọnụ m, Jehova, ghọta ntụgharị uche m. Ṅaa ntị n’olu ntiku m na-etiku Gị, Eze m, na Chineke m: n’ihi na ọ bụ Gị ka m na-ekpere.” (Abụ Ọma 5:1, 2) Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ndụ Devid na-egosi na Jehova zara ekpere Devid maka enyemaka ugboro ugboro. (Abụ Ọma 18:1, 2; 21:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe nrụgide na-anyịgbu anyị ma ọ bụ mgbe nsogbu anyị yiri ihe a na-apụghị imeri emeri, ọ bụ ihe na-akasi nnọọ obi ichigharịkwuru Jehova n’ekpere ma gwa ya ihe nile dị anyị n’obi. (Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Ndị Tesalonaịka 5:16-18) Jehova adịghị ajụ ige anyị ntị. Kama nke ahụ, ọ na-emesi anyị obi ike na ‘ya na-eche banyere anyị.’ (1 Pita 5:6, 7) Otú ọ dị, ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ikpegara Jehova ekpere ma ghara ige ntị n’ihe ọ na-ekwu, ọ̀ ga-abụ?
14. Mmetụta dị aṅaa ka okwu Jehova nwere n’ahụ́ Jeremaịa?
14 Olee otú Jehova si agwa anyị okwu? Tụleghachi ihe banyere Jeremaịa. Ebe ọ bụ na Jeremaịa bụ onye amụma, Jehova gwara ya okwu n’onwe ya. Jeremaịa kọwara mmetụta okwu Chineke nwere n’obi ya, sị: “A chọpụtawo okwu Gị, m wee rie ha; okwu Gị wee ghọọrọ m ihe obi ụtọ na ọṅụ obi m: n’ihi na a kpọkwasịwo m aha Gị, Jehova, Chineke nke usuu nile nke ndị agha.” (Jeremaịa 15:16) Ee, Jeremaịa nwere obi ụtọ n’eziokwu ahụ bụ́ na a kpọkwasịrị ya aha Chineke, okwu Ya dịkwa oké ọnụ ahịa n’anya onye amụma ahụ. N’ihi ya, dị ka Pọl onyeozi, Jeremaịa nwere ọchịchọ siri ike izisa ozi e ziri ya.—Ndị Rom 1:15, 16.
15. Olee otú anyị pụrụ isi kụnye okwu Jehova n’obi anyị, ịtụle ihe ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka ikpebisi ike ịghara ịgbachi nkịtị?
15 Jehova adịghị agwa onye ọ bụla okwu n’onwe ya taa. Otú ọ dị, anyị nwere okwu Chineke n’ime Bible. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ejiri ọmụmụ Bible anyị kpọrọ ihe ma na-atụgharị uche n’ụzọ miri n’ihe anyị na-amụta, okwu Chineke ga-aghọkwara anyị “ihe obi ụtọ na ọṅụ.” Anyị pụkwara inwe obi ụtọ na anyị pụrụ ịkpọsa aha Jehova mgbe anyị na-aga ịgwa ndị ọzọ okwu ndị ahụ. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịghị ndị ọzọ n’ụwa taa na-akpọsa aha Jehova. Ọ bụ nanị Ndịàmà ya na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo ma na-akụziri ndị dị umeala n’obi ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. (Matiu 28:19, 20) Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi! Mgbe anyị tụlesịrị ihe Jehova jiworo ịhụnanya nye anyị, olee otú anyị ga-esi gbachie nkịtị?
Ka Anyị Kpachara Anya Banyere Ndị Anyị na Ha Na-akpakọrịta
16, 17. Gịnị bụ echiche Jeremaịa banyere mkpakọrịta, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya?
16 Jeremaịa kọrọ ihe ọzọ nyeere ya aka Jeremaịa 15:17) Jeremaịa ga-ahọrọ ịnọ nanị ya karịa ịbụ onye ndị enyi ọjọọ merụrụ. Anyị na-ele ihe anya otú ahụ taa. Anyị adịghị echefu ịdọ aka ná ntị nke Pọl onyeozi na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru,” ọbụna àgwà ndị bara uru anyị nweworo ruo ọtụtụ afọ.—1 Ndị Kọrint 15:33.
inwe obi ike. O kwuru, sị: “Anọdụghị m ala n’izu nzuzo nke ndị na-achị ọchị nke ukwuu, aṅụrịghịkwa m ọṅụ: n’ihi aka Gị nanị m otu nọdụrụ ala; n’ihi na oké iwe ka I jiworo mejuo m.” (17 Mkpakọrịta ọjọọ pụrụ ime ka mmụọ nke ụwa merụọ echiche anyị. (1 Ndị Kọrint 2:12; Ndị Efesọs 2:2; Jems 4:4) N’ihi ya, ka anyị zụọ ikike iche echiche anyị ịmata mkpakọrịta ndị dị ize ndụ ma jụ ha kpam kpam. (Ndị Hibru 5:14) Ọ bụrụ na Pọl dị ndụ n’ụwa taa, gịnị ka i chere ọ ga-agwa Onye Kraịst na-ekiri ihe nkiri sinima ndị na-egosi omume rụrụ arụ na ime ihe ike ma ọ bụ egwuregwu ime ihe ike? Olee ndụmọdụ ọ ga-enye nwanna nke ya na onye ọ na-amatụghị na-eme enyi n’Intanet? Gịnị ka ọ ga-eche banyere Onye Kraịst na-eji ọtụtụ awa egwu egwuregwu vidio ma ọ bụ na-ekiri telivishọn ma o nweghị àgwà ọmụmụ ihe onwe onye dị mma?—2 Ndị Kọrint 6:14b; Ndị Efesọs 5:3-5, 15, 16.
Nọgide na Paradaịs Ime Mmụọ Ahụ
18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ?
18 Anyị ji paradaịs ime mmụọ anyị kpọrọ ihe. Ọ dịghị ihe ọ bụla yitụrụ ya n’ụwa taa. Ọbụna ndị na-ekweghị ekwe na-ekwu okwu banyere ịhụnanya, nchebara echiche, na obiọma nke Ndị Kraịst nwere n’ebe ibe ha nọ. (Ndị Efesọs 4:31, 32) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịlụso nkụda mmụọ ọgụ. Mkpakọrịta dị mma, ekpere, na àgwà ọmụmụ ihe dị mma pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ. Ha ga-ewusi anyị ike iji obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ na-eche ọnwụnwa ọ bụla ihu.—2 Ndị Kọrint 4:7, 8.
19, 20. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi? (b) Ole ndị ka isiokwu na-esonụ lekwasịrị anya, oleekwa ndị ọ ga-amasị?
19 Ya adịla mgbe anyị ga-ekwe ka ndị kpọrọ ozi anyị sitere na Bible asị menye anyị ụjọ ma mee ka anyị mebie okwukwe anyị. Dị ka ndị iro ahụ bụ́ ndị kpagburu Jeremaịa, ndị na-alụso anyị ọgụ na-alụ ọgụ megide Chineke. Ha agaghị enwe mmeri. Jehova, bụ́ onye karịrị nnọọ ndị iro anyị ike na-agwa anyị, sị: “Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.” (Abụ Ọma 27:14) Ka olileanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-agbanyesi mkpọrọgwụ ike n’obi anyị, ka anyị kpebisie ike ịghara ịda mbà n’ime ezi ihe. Ka anyị nwee obi ike na, dị ka Jeremaịa na Beruk, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.—Ndị Galeshia 6:9.
20 Ịlụso nkụda mmụọ ọgụ bụụrụ ọtụtụ Ndị Kraịst ọgụ na-aga n’ihu n’ihu. Otú ọ dị, ndị na-eto eto na-eche ihe ịma aka ndị pụrụ iche ihu. Ma ha nwekwara ohere ndị magburu onwe ha. Ọ bụ ndị ntorobịa nọ n’etiti anyị ka isiokwu na-esonụ lekwasịrị anya. Ọ ga-amasịkwa ndị nne na nna na ndị nile toworo eto raara onwe ha nye nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ nke inyere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ aka site n’okwu ọnụ, n’ihe nlereanya, na site n’inye ha nkwado kpọmkwem.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụọ anya ọnọdụ ndị na-akụda mmụọ, ònyekwa ka anyị kwesịrị ilegara anya maka enyemaka?
• Olee otú Jeremaịa si merie nkụda mmụọ n’agbanyeghị inwe ọrụ siri ike?
• Gịnị ga-eme ka anyị nwee ‘obi ụtọ na ọṅụ’ ọbuna mgbe anyị nọ n’ihe isi ike?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 9]
Jeremaịa chere na ya bụ nnọọ nwata na onye na-enweghị ahụmahụ ịbụ onye amụma
[Foto dị na peeji nke 10]
Ọbụna mgbe a na-akpagbu ya, Jeremaịa maara na Jehova nọnyeere ya “dị ka dike nke na-eme ka a maa jijiji”