Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Chineke Ọ̀ Na-ewusi Gị Ike?

Okwu Chineke Ọ̀ Na-ewusi Gị Ike?

Okwu Chineke Ọ̀ Na-ewusi Gị Ike?

MGBE ị na-eche ule dị iche iche ihu, olee otú i si anagide ha? N’akụkụ nke Jizọs, icheta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ dabara adaba nyeere ya aka iche ule Setan ihu. (Matiu 4:1-11) N’otu aka ahụ, mgbe Eze Devid chere ule onwe onye dị iche iche ihu, o nwetara agbamume site n’Okwu Chineke. O kwuru, sị: “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:19.

N’ụzọ yiri nke ahụ, icheta akụkụ Akwụkwọ Nsọ kasị amasị anyị pụrụ ịkasi anyị obi ma ọ bụ nye anyị agbamume mgbe anyị na-eche ule dị iche iche ihu. Dị ka ihe atụ, Rex, onye dị afọ 89 ugbu a, abụwo onye na-ezisa ozi ọma oge nile kemgbe 1931. Ma, ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-adịkarị m ka ọ̀ bụ na mụ erughị eru mgbe e kenyere m ọrụ pụrụ iche n’ozi.” Olee otú o si nagide ya? “Ana m echeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ kasị amasị m bụ́ Ilu 3:5, bụ́ nke na-asị: ‘Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị.’ Icheta na itinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n’ọrụ nyeere m aka ịrụ ọrụ ndị e kenyere m n’ụzọ gara nke ọma.”

Ọbụna ndị na-eto eto na-erite uru site n’inwe akụkụ Akwụkwọ Nsọ kasị amasị ha. Jack bụ́ onye dị afọ isii na-ekwu na akụkụ Akwụkwọ Nsọ kasị amasị ya bụ Matiu 24:14. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-akpali ya iso ndị mụrụ ya aga ime nkwusa. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-atọ m ụtọ iso mama m, papa m na nwanne m nwanyị aga ịgba àmà kwa Saturday.”

Dị ka Jizọs, ọ̀ dị mgbe ụfọdụ ị na-ezute ule dị iche iche nye okwukwe gị? Mgbe ahụ, Ndị Filipaị 4:13 pụrụ ịghọ otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kasị amasị gị. Dị ka Eze Devid, ị̀ na-enwe “nchegbu”? Mgbe ahụ, icheta Ndị Filipaị 4:6, 7 pụrụ inyere gị aka ịnagide ya. Ọ̀ dị mgbe ụfọdụ ị na-eche na ozi ị na-ejere Chineke bụ n’efu? Mgbe ahụ, icheta 1 Ndị Kọrint 15:58 ga-agba gị ume.

Site n’ibu akụkụ Akwụkwọ Nsọ dabara adaba n’isi, anyị na-ekwe ka Okwu Chineke na-akpa ike ná ndụ anyị. (Ndị Hibru 4:12) Ụdị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ kasị amasị anyị pụrụ inye anyị ma ume ma nkasi obi.—Ndị Rom 15:4.