Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebreham na Sera—Ị Pụrụ Iṅomi Okwukwe Ha!

Ebreham na Sera—Ị Pụrụ Iṅomi Okwukwe Ha!

Ebreham na Sera—Ị Pụrụ Iṅomi Okwukwe Ha!

A NA-AKPỌ ya “nna nke ndị nile nwere okwukwe.” (Ndị Rom 4:11) Nwunye ya ọ hụrụ n’anya nwekwara àgwà ahụ. (Ndị Hibru 11:11) Ndị a na-ekwu banyere ha bụ nna ochie ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Ebreham na nwunye ya na-atụ egwu Chineke, bụ́ Sera. N’ihi gịnị ka ha ji bụrụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke okwukwe? Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ule ndị ha tachiri obi na ha? Uru dịkwa aṅaa ka akụkọ ha baara anyị?

Ebreham gosipụtara okwukwe mgbe Chineke nyere ya iwu ka ọ hapụ ebe obibi ya. Jehova kwuru, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya.” (Jenesis 12:1) Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi rubere isi, n’ihi na a gwara anyị, sị: “Site n’okwukwe, Ebreham, mgbe a kpọrọ ya, rubere isi n’ịpụ jee n’ebe a kara aka na ọ ga-enweta dị ka ihe nketa; o wee pụọ, ọ bụ ezie na ọ maghị ebe ọ na-eje.” (Ndị Hibru 11:8) Tụlee ihe nkwapụ ahụ gụnyere.

Ebreham biri na Ua, ebe dị n’ebe ndịda Iraq ugbu a. Ua bụ obodo Mesopotemia bara ọgaranya nke ya na mba ndị dị n’akụkụ Ọwara Oké Osimiri Peasia na ma eleghị anya ndị dị na Ndagwurugwu Indus na-azụkọrịta ahịa. Sir Leonard Woolley, bụ́ onye duziri ogwugwu ihe e ji nlezianya gwuo na Ua, na-ekwu na n’oge Ebreham, e ji brik wuo ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị dị n’ebe ahụ, tee ahụ́ ha etee ma tee ha ágbá. Dị ka ihe atụ, ụlọ otu nwa amaala bara ọgaranya bụ ụlọ elu dị okpukpu abụọ ma nwee ogige dị n’ime nke e tere ala ya ete. Okpukpu nke ala ya bụ maka ndị odibo na ndị ọbịa. N’okpukpu nke mbụ ya, veranda e ji osisi rụọ gbara ahụ́ ájá ya gburugburu, bụrụ ebe ndị e si abanye n’ọnụ ụlọ ndị bụ́ maka ndị ezinụlọ ahụ. N’inwe ọnụ ụlọ 10 ruo 20, ụdị ụlọ ndị ahụ “satụrụ mbara ma na-enye ohere maka ibi ndụ dị mma, nke ntụsara ahụ́, nakwa dị ka ọnọdụ obibi ndụ nke ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa si dị, nke okomoko,” ka Woolley na-ekwu. “N’ụzọ pụtara ìhè [ha bụ] ebe obibi nke ndị mepere anya ma mejuo mkpa nke ndụ n’obodo mepere nnọọ emepe.” Ọ bụrụ na Ebreham na Sera hapụrụ ebe obibi dị otú ahụ iji biri n’ụlọikwuu, ha chụrụ àjà dị ukwuu iji rubere Jehova isi.

Nkwapụ Ebreham bu ụzọ buga ezinụlọ ya Heran, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu Mesopotemia, mgbe ahụzi, ha kwagara Kenan. Ịdị anya ya bụ ihe dị ka kilomita 1,600—njem siri nnọọ ike maka di na nwunye meworo agadi! Mgbe ha hapụrụ Heran, Ebreham dị afọ 75 ebe Sera dị afọ 65.—Jenesis 12:4.

Olee otú ọ gaara adịworị Sera mgbe Ebreham gwara ya na ha ga-esi na Ua pụọ? Ịhapụ ịnọ ná nchebe nke ebe obibi o nwere ntụsara ahụ́ na ya, ịkwaga n’ala ọ na-amaghị, bụ́kwa ebe ọ pụrụ ịbụ na ndị bi na ya enweghị omume enyi, na ịnakwere ọnọdụ obibi ndụ dị ala karị pụrụ ichegbuwo ya. Ka o sina dị, Sera doro onwe ya n’okpuru, na-ewere Ebreham dị ka “onyenwe” ya. (1 Pita 3:5, 6) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ewere ya na nke a bụ ngosipụta nke “omume nkwanye ùgwù [Sera] nweburu n’ebe ọ nọ,” ihe àmà nke “ezi àgwà nke iche echiche na inwe mmetụta.” Karịsịa ihe nile, Sera tụkwasịrị Jehova obi. Ido onwe onye n’okpuru na okwukwe ya bụ ezi ihe nlereanya nye Ndị Kraịst bụ́ nwunye.

N’eziokwu, a dịghị agwa anyị ka anyị hapụ ebe obibi anyị iji rubere Chineke isi, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile ahapụwo ala nna ha iji kwusaa ozi ọma ahụ ná mba ndị ọzọ. N’agbanyeghị ebe anyị nọ na-ejere Chineke ozi, ọ bụrụhaala na anyị na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ anyị, ọ ga na-egbo mkpa anyị.—Matiu 6:25-33.

Ma Sera ma Ebreham adịghị nke kwara ụta maka mkpebi ha mere. “A sị na ha nọgidere n’ezie na-echeta ebe ahụ ha siworo pụọ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi,” ka Pọl onyeozi kwuru. Ma ha alaghachighị. N’inwe obi ike na Jehova “bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ,” ha gosiri okwukwe ná nkwa ya. Anyị aghaghịkwa ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-efe Jehova ofufe site ná mkpụrụ obi dum.—Ndị Hibru 11:6, 15, 16.

Akụ̀ na Ụba Ime Mmụọ na Ndị nke Anụ Ahụ́

Ka Ebreham rutesịrị Kenan, Chineke gwara ya, sị: “Mkpụrụ gị ka M ga-ewere ala nke a nye.” Ebreham meghachiri omume site n’iwuru Jehova ebe ịchụàjà na site ‘n’ịkpọku aha Jehova.’ (Jenesis 12:7, 8) Jehova mere ka Ebreham baa ọgaranya, ndị nọkwa n’ọmụma ụlọikwuu ya bara ụba. Ebe ọ bụ na n’otu mgbe, ọ kpọkọrọ ndị ikom 318 a zụrụ azụ, bụ́ ndị ohu a mụrụ n’ụlọ ya, e mewo atụmatụ na “ngụkọta nke ndị nile so ya aghaghị ịkarị otu puku mmadụ.” N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ndị mmadụ weere ya dị ka “onyeisi nke Chineke.”—Jenesis 13:2; 14:14; 23:6.

Ebreham butere ụzọ n’ofufe, na-akụziri ndị ezinụlọ ya ‘idebe ụzọ Jehova, ime ezi omume na ihe e kpere n’ikpe.’ (Jenesis 18:19) Ndị isi ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst taa pụrụ inweta agbamume site n’ihe nlereanya Ebreham dị ka onye nwere ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ndị ezinụlọ ya ịdabere na Jehova na ime ezi omume. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ohu nwanyị Sera bụ́ onye Ijipt bụ́ Hega, odibo nna ochie ahụ nke kasị okenye, na nwa Ebreham bụ́ Aịzik dabeere n’ebe Jehova Chineke nọ.—Jenesis 16:5, 13; 24:10-14; 25:21.

Ebreham Chọrọ Udo

Ihe ndị mere ná ndụ Ebreham gosiri na Ebreham nwere àgwà nsọpụrụ Chineke. Kama ikwe ka esemokwu dịgide n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ ya na ndị nke nwa nwanne ya bụ́ Lọt, Ebreham tụrụ aro ka ha kewaa ma gwa Lọt bụ́ onye ọ tọrọ ka ọ họrọ ala ebe ka ya mma. Ebreham bụ onye na-eme udo.—Jenesis 13:5-13.

Ọ bụrụ na e nwee mgbe anyị na-aghaghị ime nhọrọ n’etiti isi ọnwụ inweta ihe ruuru anyị na ịgba nkịtị n’ihe ụfọdụ ka udo wee dịrị, anyị pụrụ ịrịba ama na Jehova ekweghị ka Ebreham taa ahụhụ n’ihi na o gosiri Lọt nchebara echiche. Kama nke ahụ, Chineke mesịrị kwe Ebreham na mkpụrụ ya nkwa inye ha ala nile Ebreham pụrụ ịhụ n’akụkụ nile. (Jenesis 13:14-17) “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo,” ka Jizọs kwuru, “ebe ọ bụ na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’”—Matiu 5:9.

Ònye Ga-abụ Onye Nketa Ebreham?

N’agbanyeghị nkwa ndị e kwere ha maka mkpụrụ, Sera nọgidere n’amụghị nwa. Ebreham chere okwu ahụ n’ihu Chineke. Ọ̀ bụ odibo ya bụ́ Elieza ga-eketa ihe nile o nwere? Ee e, n’ihi na Jehova kwuru, sị: “Nwoke a agaghị enweta ihe gị; kama onye ga-esi n’afọ gị pụta, onye ahụ ga-enweta ihe gị.”—Jenesis 15:1-4.

N’agbanyeghị nke a, ha enweghị nwa, Sera bụ́ onye dị afọ 75 enweghịzikwa olileanya ịtụrụ ime. N’ihi ya, ọ sịrị Ebreham: “Jehova egbochiwo m ịmụ nwa; biko, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi; eleghị anya a ga-esite na ya wulie m elu dị ka ụlọ.” Mgbe ahụ, Ebreham kpọọrọ Hega dị ka iko nwanyị, soro ya nwee mmekọahụ, ya atụrụkwa ime. Ozugbo Hega chọpụtara na ya dị ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu anya. Sera wee jiri obi ilu kpesara ya Ebreham ma wedaa Hega ala, nke mere ka ohu nwanyị ahụ gbapụ.—Jenesis 16:1-6.

Ebreham na Sera mere ihe ha chere na ọ dị mma, na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ndị e weere dị ka ihe ziri ezi n’oge ha. Otú ọ dị, ọ bụghị otú Jehova chọrọ isi nye Ebreham mkpụrụ. Ọdịnala anyị nwere ike ikwu na ihe ụfọdụ kwesịrị ekwesị n’ọnọdụ ụfọdụ, ma nke a apụtaghị na Jehova nabatara ya. Otú o si ele ọnọdụ anyị anya pụrụ ịdị nnọọ iche. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịchọ nduzi Chineke, na-arịọ ya ka ọ gwa anyị ụzọ ọ chọrọ ka anyị si mee omume.—Abụ Ọma 25:4, 5; 143:8, 10.

Ọ Dịghị “Ihe Karịrị Jehova Ime”

N’ikpeazụ, Hega mụụrụ Ebreham nwa nwoke aha ya bụ Ishmael. Ma, ọ bụghị ya bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Sera n’onwe ya ga-amụ onye nketa ahụ, n’agbanyeghị na ọ kaala nká.—Jenesis 17:15, 16.

Mgbe Chineke kwuru kpọmkwem na Sera ga-amụrụ di ya nwa nwoke, “Ebreham wee daa kpuo ihu ya n’ala, chịkwaa ọchị, sị n’obi ya, Ọ̀ bụ onye gbara [otu narị afọ] ka a ga-amụrụ nwa? Sera kwa, nke gbara [iri afọ itoolu], ọ̀ ga-amụ nwa?” (Jenesis 17:17) Mgbe otu mmụọ ozi zighachiri ozi ahụ n’ebe Sera nụrụ ya, o mere ka “[Sera] chịa ọchị n’ime onwe ya.” Ma ọ dịghị ihe “karịrị Jehova ime.” Anyị pụrụ inwe okwukwe na ọ pụrụ ime ihe ọ bụla bụ́ uche ya.—Jenesis 18:12-14.

Ọ bụ “sitekwa n’okwukwe [ka] Sera n’onwe ya nwetara ike ịtụrụ ime mkpụrụ nke afọ, ọbụna mgbe ọ gafeworo ogo ịmụ nwa, ebe o weere onye ahụ kweworo nkwa n’onye na-ekwesị ntụkwasị obi.” (Ndị Hibru 11:11) Ka oge na-aga, Sera mụrụ Aịzik, onye aha ya pụtara “Ọchị.”

Ntụkwasị Obi Siri Ike ná Nkwa Chineke

Jehova gosiri na Aịzik bụ onye nketa ahụ a tụwara anya ya eri ogologo oge. (Jenesis 21:12) Ya mere, ọ ghaghị ijuwo Ebreham anya mgbe Chineke gwara ya ka o jiri nwa ya nwoke chụọ àjà. Ma Ebreham nwere ezi ihe ndị mere ọ ga-eji tụkwasị Chineke obi kpam kpam. Ọ̀ bụ na Jehova enweghị ike ịkpọlite Aịzik n’ọnwụ? (Ndị Hibru 11:17-19) Ọ̀ bụ na Chineke egosibeghị ike ya site n’ịtụteghachi ike ọmụmụ Ebreham na Sera n’ụzọ ọrụ ebube iji mee ka a mụọ Aịzik? N’ịbụ onye kwenyesiri ike n’ikike Chineke nwere imezu nkwa Ya, Ebreham dị njikere irube isi. N’eziokwu, e gbochiri ya igbu nwa ya nwoke n’ezie. (Jenesis 22:1-14) Ka o sina dị, ihe Ebreham mere n’ọnọdụ a na-enyere anyị aka ịhụ otú ọ na-aghaghị isiwo siere Jehova Chineke ike ‘inye Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.’—Jọn 3:16; Matiu 20:28.

Okwukwe Ebreham nwere n’ebe Chineke nọ mere ka o doo ya anya na onye nketa nke ihe ndị Jehova kwere ná nkwa apụghị ịlụ onye na-efe chi ụgha nke mba Kenan. Olee otú nne ma ọ bụ nna na-atụ egwu Chineke pụrụ isi nabata nwa ya ịlụ onye na-adịghị ejere Jehova ozi? N’ihi ya, Ebreham chọọrọ Aịzik nwunye kwesịrị ekwesị n’etiti ndị ikwu ya nọ na Mesopotemia, bụ́ ebe ịdị anya ya dị ihe karịrị kilomita 800. Chineke gọziri mgbalị ahụ site n’igosi na Ribeka bụ nwanyị ọ họpụtara ịbụ nwunye ọhụrụ Aịzik na nne ochie nke Mezaịa ahụ. Ee, Jehova ‘gọziri Ebreham n’ihe nile.’—Jenesis 24:1-67; Matiu 1:1, 2.

Ngọzi Maka Mba Nile

Ebreham na Sera kwesịrị nṅomi n’ihe banyere ịtachi obi n’ule na igosipụta okwukwe ná nkwa Chineke. Mmezu nke nkwa ndị dị otú ahụ nwere ihe jikọrọ ya na atụmanya ebighị ebi nke ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi na Jehova mesiri Ebreham obi ike, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jenesis 22:18.

N’ezie, Ebreham na Sera ezughị okè, ọbụna dị ka anyị na-ezughị. Otú ọ dị, mgbe uche Chineke doro ha anya, ha rubeere ya isi ngwa ngwa—n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha. N’ihi ya, a na-echeta Ebreham dị ka “enyi Jehova,” Sera kwa dị ka “nwanyị dị nsọ na-enwe olileanya na Chineke.” (Jems 2:23; 1 Pita 3:5) Site n’ịgbalịsi ike iṅomi okwukwe Ebreham na Sera, anyị na Chineke pụkwara inwe mmekọrịta chiri anya nke dị oké ọnụ ahịa. Anyị pụkwara irite uru ná nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa ndị Jehova kwere Ebreham.—Jenesis 17:7.

[Foto dị na peeji nke 26]

N’ihi okwukwe ha, Jehova ji nwa nwoke gọzie Ebreham na Sera n’agadi ha

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ihe nlereanya Ebreham na-enyere anyị aka ịhụ ihe ọ pụtara nye Jehova ikwe ka Ọkpara ọ mụrụ nanị ya nwụọ