Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Na-eme Ka E Bie Ogologo Ndụ na Ndụ Obi Ụtọ

Ihe Na-eme Ka E Bie Ogologo Ndụ na Ndụ Obi Ụtọ

Ihe Na-eme Ka E Bie Ogologo Ndụ na Ndụ Obi Ụtọ

“MMADỤ nile na-achọ ịdị ogologo ndụ; ma ọ dịghị onye na-achọ ịka nká.” Nke ahụ bụ ihe a na-ekwukarị. Ọtụtụ ndị na-eru afọ ndụ ịla ezumike nká na-atụ anya inwekwu oge na inwe ibu ọrụ ole na ole. Ma, ha na-atụ ụjọ ịghọ ndị na-enweghị nzube ná ndụ na ndị na-abaghị uru. Ha na-atụkwa ụjọ ịbụ ndị a gbahapụrụ, ndị na-enweghị obi ụtọ, na ndị ahụ́ ike ha na-ebelata ebelata.

Mgbe ahụ, gịnị bụ isi ihe na-eme ka e bie ndụ obi ụtọ? Inwe ezi ndị enyi na ezinụlọ na-ahụ n’anya na-enye aka iwetara ma ndị na-eto eto ma ndị agadi obi ụtọ. Ma, ụtụ ndị ọzọ na-atụnye ná ndụ onye agadi abụghị ihe kasị mkpa. Ọbụna ihe ka mkpa bụ ihe onye meworo agadi pụrụ imere ndị ọzọ.

Ihe ọmụmụ were ogologo oge e mere banyere ndị di na nwunye 423 meworo agadi na-egosi na “inyere ndị ọzọ aka ná ndụ pụrụ inye aka gbatịkwuo ndụ nke anyị.” Stephanie Brown, bụ́ onye haziri ihe ọmụmụ ahụ na-akọwa, sị: “Nchọpụta ndị a na-enye echiche na ihe na-eme ka mmekọrịta anyị na ndị ọzọ baa uru abụghị ihe anyị na-enweta na ha; ọ bụ ihe anyị na-enye.” Inye ihe dị otú ahụ pụrụ ịgụnye inyere ndị ọzọ aka n’ọrụ ụlọ, ilekọta ụmụaka, ijere ha ozi, iji ụgbọala kwọga ha ebe ha na-eje, ma ọ bụ ige onye chọrọ onye ga-ege ya ntị ntị.

Ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ihe na-eme ka e bie ogologo ndụ na ndụ obi ụtọ abụghị inwe nnukwu ego n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ usoro ọgwụgwọ na nri ndị na-egbochi ịka nká. Kama, ọ bụ ịnọgide na-arụsi ọrụ ike na mmadụ iji oge, ike na ume ọrụ ya na-eme ka ndụ ndị ọzọ ka mma.

Otú ọ dị, ọ ga-ewe ihe karịrị inye ihe iji zọpụta anyị n’aka ịka nká, ọrịa, na ọnwụ. Ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe ndị dị otú ahụ. N’okpuru ịchịisi ya, ọrịa agaghị adị, ọbụnakwa “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4; Aịsaịa 33:24) N’ezie, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-ebi ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43) Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ inwe ike inye ndị ọzọ ihe a dabeere na Bible na-eme ka e bie ogologo ndụ na ndụ obi ụtọ.