Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Inwe Chọọchị Ị Na-aga?

Ì Kwesịrị Inwe Chọọchị Ị Na-aga?

Ì Kwesịrị Inwe Chọọchị Ị Na-aga?

‘Ọ DỊGHỊ m mkpa inwe chọọchị m na-aga ma ọ bụ ịgachi chọọchị anya iji kwere na Chineke!’ Nke ahụ bụ mmetụta ọtụtụ mmadụ nwere banyere inwe otu chọọchị ma ọ bụ okpukpe ha nọ na ya. N’ezie, ụfọdụ na-ekwu na ha na-enwe mmetụta nke ịnọ Chineke nso karị mgbe ha nọ n’èzí na-ekiri ihe ndị e kere eke karịa mgbe ha gara ihe omume okpukpe na chọọchị. Taa, echiche ọtụtụ ndị nwere bụ na ịnọ n’otu okpukpe ma ọ bụ chọọchị abụghị ihe dị mkpa iji kwere na Chineke.

Otú ọ dị, ndị ọzọ nwere nnọọ echiche dị iche. Ha na-ekwu na ịnọ n’otu chọọchị na ịga ya dị mkpa, ọbụna dị oké mkpa, ma ọ bụrụ na mmadụ ga-enweta ihu ọma Chineke. Ya mere, ajụjụ ma ọ̀ dị mkpa mmadụ inwe okpukpe ọ na-ekpe karịrị nnọọ inwe mmasị n’ịmata ọnụ ọgụgụ ndị nwere okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụ n’ịmụ ihe banyere okpukpe. Ka o sina dị, ebe o metụtara mmekọrịta anyị na Chineke, ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya ịchọpụta ihe bụ́ uche Chineke n’okwu ahụ? Gịnịzi ka anyị pụrụ ịmụta n’Okwu ya, bụ́ Bible, banyere okwu a?

Otú Chineke Si Mesoo Ndị Mmadụ Ihe n’Oge Gara Aga

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 4,400 gara aga, otu oké iju mmiri kpatara mbibi rikpuru ụwa dum. A pụghị ichefu ihe omume dị otú ahụ ngwa ngwa, ndị mmadụ n’akụkụ nile nke ụwa nwekwara akụkọ banyere ya n’akụkọ oge ochie ha. Ọ bụ ezie na akụkọ ndị ahụ dịtụcha iche n’ibe ha, ha nwekọrọ ọtụtụ ihe ọnụ, gụnyere eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na ụfọdụ ụmụ anụmanụ lanarịrị.

Ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ hà bụ nanị ndị ọ dabaara na mberede ịgbanahụ mbibi ahụ? Ihe ndekọ Bible na-egosi na nke a abụghị ihe merenụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, Chineke agwaghị ndị mmadụ n’otu n’otu banyere Iju Mmiri ahụ na-abịanụ. Kama nke ahụ, ọ gwara Noa, bụ́ onye, n’aka nke ya, dọrọ ndị ya na ha dịkọrọ ndụ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ na-eru nso.—Jenesis 6:13-16; 2 Pita 2:5.

Ịlanarị dabeere n’ịbụ akụkụ nke ìgwè a dị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ nakwa n’ịdị njikere ịnakwere nduzi Chineke nyere Noa. Ọbụna ụmụ anụmanụ nọ n’ụgbọ ahụ bụ́ ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ lanarịrị n’ihi na ha na ìgwè a nọ. E nyere Noa ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ ime ndokwa kwesịrị ekwesị maka ichebe ndụ ụmụ anụmanụ.—Jenesis 6:17–7:8.

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, ụmụ Noa site ná nwa ya bụ́ Shem ghọrọ ohu n’Ijipt. Ma, nzube Chineke bụ ịtọhapụ ha ma kpọga ha n’ala o kweworo nna nna ha bụ́ Ebreham ná nkwa. Ọzọkwa, e kpughereghị ndị mmadụ n’otu n’otu nke a, kama nke ahụ, e bu ụzọ kpugheere ya ndị a họpụtara ịbụ ndị ndú ha—Mozis na nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn. (Ọpụpụ 3:7-10; 4:27-31) Ka a napụtasịrị ndị ahụ bụbu ndị ohu dị ka otu ìgwè n’Ijipt, e nyere ha Iwu Chineke n’Ugwu Saịnaị, meekwa ka ha ghọọ mba Izrel.—Ọpụpụ 19:1-6.

Nanị ihe mere o ji kwe omume ịnapụta ndị Izrel n’otu n’otu bụ na ha sonyeere ìgwè ahụ Chineke guzobere ma gbasoo ntụziaka nke ndị ndú a họpụtara ahọpụta nke ìgwè a. Ọbụna e mere ndokwa maka ndị Ijipt n’otu n’otu isonyere ìgwè a nke o doro anya na o nwere ihu ọma Chineke. Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt, ndị a so ha pụọ, si otú a na-etinye onwe ha n’ọnọdụ nke inweta ngọzi Chineke.—Ọpụpụ 12:37, 38.

Mgbe ahụ, na narị afọ mbụ, Jizọs malitere ọrụ nkwusa ya, na-achịkọta ndị mmadụ dị ka ndị na-eso ụzọ ya. O mesoro ha ihe dị ka otu ìgwè, ọ bụ ezie na o jikwa ịhụnanya lekọta ndị mmadụ n’otu n’otu dị ka mkpa ha si dị. Jizọs gwara ndịozi 11 ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze.” (Luk 22:28, 29) Mgbe e mesịrị, mmụọ nsọ Chineke dakwasịrị ndị na-eso ụzọ ahụ mgbe ha nọkọtara ọnụ dị ka otu ìgwè.—Ọrụ 2:1-4.

Ihe atụ ndị a na-egosi n’ụzọ doro anya na n’oge gara aga, Chineke mesoro ndị ya ihe mgbe nile dị ka ìgwè a haziri ahazi. Mmadụ ole na ole ha na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya—Noa, Mozis, Jizọs, na ndị ọzọ—bụ, n’ezie, ndị O ji gwa ìgwè ndị ha na ha na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya okwu. Ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji chee na Chineke na-emeso ndị ohu ya ihe n’ụzọ dị iche taa. N’ezie, nke a na-ewelite ajụjụ ọzọ: Ịnọ nnọọ n’òtù okpukpe ọ bụla ò zuru? Anyị ga-atụle ajụjụ a dị mkpa n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ọ dịwo anya Chineke mesowere ndị ya ihe dị ka otu ìgwè a haziri ahazi