Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Gafeta Nyere Anyị Aka’

‘Gafeta Nyere Anyị Aka’

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

‘Gafeta Nyere Anyị Aka’

NA JULY 2000, a kpọrọ òkù n’Austria, Germany, nakwa na Switzerland maka Ndịàmà na-asụ German ịkwaga Bolivia. N’ihi gịnị? N’ihi na n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ ndị ọrụ ugbo bi na ha ndị dị kilomita 300 site na Santa Cruz, Bolivia, ndị òtù okpukpe Menno na-asụ German na-egosi mmasị na Bible.

Ihe dị ka Ndịàmà 140 zara òkù ahụ. Ụfọdụ gara nọọ izu ole na ole, ndị ọzọ nọrọ otu afọ ma ọ bụ karịa. N’ime otú ahụ, ha gosiri mmụọ yiri nke ndị ozi ala ọzọ nke narị afọ mbụ bụ́ ndị gere ntị n’òkù ahụ bụ́: “Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.”—Ọrụ 16:9, 10.

Gịnị ka ọ dị ka ya ịrụ ọrụ n’ókèala ahụ? Otu okenye n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ na-akọwa, sị: “Ịgaru n’otu n’ime ógbè 43 nke ndị òtù okpukpe Menno pụrụ iwe ihe ruru awa asatọ n’ụzọ uzuzu n’ụgbọala injin ya na-arụ ọrụ na wiil ya anọ. Ileta ógbè ndị dị anya karị na-ewekarị abalị anọ, na-apụtakwa ihi n’ụlọ ntu n’abalị ụfọdụ. Ma o ruru nnọọ mgbalị e tinyere maka ya, n’ihi na ndị a anụtụbeghị ozi ọma ahụ.”

Na mbụ, ọtụtụ n’ime ndị òtù okpukpe Menno ahụ anabataghị nleta ndị ahụ. Ma mgbalị e mere ugboro ugboro enyeworo ha aka ịghọta ihe Ndịàmà ahụ nwere inye. Dị ka ihe atụ, otu onye ọrụ ugbo kwuru na ya anọwo na-agụ magazin Teta! ruo otu afọ. Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “Amaara m na ọtụtụ ndị bi ebe a ekwenyeghị n’ihe unu na-ekwu, ma ekweere m na ọ bụ eziokwu.” N’ógbè ọzọ, otu nwoke kwuru, sị: “Ụfọdụ n’ime ndị agbata obi m na-ekwu na unu bụ ndị amụma ụgha, ndị ọzọ na-ekwu na unu nwere eziokwu ahụ. Achọrọ m ịchọpụta n’onwe m.”

E nwere otu ọgbakọ na-asụ German na Bolivia ugbu a, nke nwere ndị nkwusa 35, gụnyere mmadụ 14 na-ezisa ozi ọma oge nile. Ka ọ dị ugbu a, mmadụ 14 bụbu ndị òtù okpukpe Menno aghọwo ndị nkwusa Alaeze, 9 ndị ọzọkwa na-abịachi nzukọ anya. Otu nwoke meworo agadi, bụ́ onye e mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya kwuru, sị: “Anyị na-ahụ nduzi Jehova nke ọma. O ziteworo anyị ụmụnna nwoke na ndị nwanyị na-asụ German, bụ́ ndị nwere ahụmahụ, inyere anyị aka. Anyị nwere ekele dị ukwuu.” Nwa nwanyị nwoke ahụ dị afọ 17, bụ́kwa onye e meworo baptizim, kwuru, sị: “Ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna nwoke na ndị nwanyị na-eto eto bịaworo ebe a na-efe efe. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ, na-etinye oge na ego ha n’inyere ndị ọzọ aka. Ọ na-eme ka m chọọ ime otu ihe ahụ.”

N’ezie, ndị tinyere mgbalị ‘ịgafeta’ iji nye aka, na-aghọrọ mkpụrụ nke oké ọṅụ na afọ ojuju.