Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke!

Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke!

Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke!

“Eluigwe na-akọ nsọpụrụ [ma ọ bụ “ebube”] Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.”—ABỤ ỌMA 19:1.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-enweghị ike iji hụ ebube Chineke n’ụzọ nkịtị? (b) Olee otú ndị okenye 24 ahụ si enye Chineke otuto?

“Ị PỤGHỊ ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” (Ọpụpụ 33:20) Jehova si otú a dọọ Mozis aka ná ntị. N’ihi na e ji anụ ahụ́ na-esighị ike mee ụmụ mmadụ, ha apụghị ịhụ ebube Chineke n’ụzọ nkịtị ma dị ndụ. Otú ọ dị, n’ọhụụ, e mere ka Jọn onyeozi hụ Jehova n’ocheeze Ya dị ebube.—Mkpughe 4:1-3.

2 N’adịghị ka ụmụ mmadụ, ndị mmụọ e kere eke na-eguzosi ike n’ihe nwere ike ịhụ ihu Jehova. Ndị so n’ime ha bụ “ndị okenye iri abụọ na anọ” ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ eluigwe ya, bụ́ ndị na-anọchi anya 144,000 ahụ. (Mkpughe 4:4; 14:1-3) Olee otú ha si emeghachi omume mgbe ha na-ahụ ebube Chineke? Dị ka Mkpughe 4:11 si kwuo, ha na-akpọsa, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.”

Ihe Mere Ha Ji Ghara ‘Inwe Ihe Ngọpụ’

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ikwere na Chineke na-ejighị bụrụ ihe na-ekwekọghị na nkà mmụta sayensị? (b) N’ọnọdụ ụfọdụ, gịnị na-akpata ịjụ ikwere na Chineke?

3 À na-akpali gị inye Chineke otuto? Ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ adịghị eme otú ahụ, ọbụna ụfọdụ na-arụ ụka na Chineke adịghị. Dị ka ihe atụ, otu onye na-enyocha mbara igwe kwuru, sị: “Ọ̀ bụ Chineke bụ onye gbataara anyị ọsọ enyemaka ma kee eluigwe na ụwa dị n’usoro maka abamuru anyị? . . . Nke a bụ nnọọ echiche na-akpali akpali. N’ụzọ dị mwute, ekweere m na nke ahụ bụ echiche efu. . . . Ikwu na ọ bụ Chineke kere ha abụghị nkọwa na-eju afọ.”

4 A kpaara nnyocha nkà mmụta sayensị ókè—ọ dabeere nanị n’ihe ụmụ mmadụ pụrụ n’ezie ịhụ na ịmụ banyere ha. Ma ọ́ bụghị ya, ya abụrụ nanị nchepụta echiche ma ọ bụ ịkọ nkọ efu. Ebe “Chineke bụ Mmụọ,” ndị ọkà mmụta sayensị apụghị nnọọ inyocha ya. (Jọn 4:24) Ya mere, ọ bụ mmadụ ịfụli onwe ya elu ikwu na ikwere na Chineke ekwekọghị na nkà mmụta sayensị. Ọkà mmụta sayensị bụ́ Vincent Wigglesworth nke Mahadum Cambridge kwuru na usoro nkà mmụta sayensị bụ n’onwe ya “usoro okpukpe.” N’ụzọ dị aṅaa? “Ọ na-adabere n’okwukwe siri ike na ihe ndị na-emere onwe ha na-ekwekọ ‘n’iwu okike.’” Ya mere, mgbe mmadụ na-asị na ya ekweghị na Chineke, ihe ọ na-eme ọ́ bụghị nanị iji otu ụdị okwukwe gbanwere ụdị ọzọ? N’ọnọdụ ụfọdụ, ekweghị na Chineke na-eyi ka ọ̀ bụ ịma ụma jụ ịnakwere eziokwu. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Onye na-emebi iwu, ka imi ya si dị elu, na-asị, Ọ dịghị ajụjụ Ọ ga-ajụ. Nzube ya nile na-asị, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.”—Abụ Ọma 10:4.

5. Gịnị mere na ndị na-ekweghị na Chineke enweghị ihe ngọpụ?

5 Otú ọ dị, ikwere na Chineke abụghị okwukwe na-enweghị ihe ndabere, n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Chineke dị adị. (Ndị Hibru 11:1) Onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Allan Sandage kwuru, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ihe na-agaghị ekwe omume na usoro dị otú ahụ a haziri ahazi [dị n’eluigwe na ụwa] si n’ọgba aghara pụta. A ghaghị inwe onye nhazi. Nye m, Chineke bụ ihe omimi, ma ọ bụ ya mere e ji nwee ọrụ ebube nke ịdị adị, onye mere ihe nile ji dịrị.” Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Rom na ‘àgwà Chineke ndị a na-apụghị ịhụ anya bụ ndị a na-ahụ nke ọma site n’okike nke ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ ike ebighị ebi na ịbụ Chineke ya, nke mere na ndị na-ekweghị na Chineke enweghị ihe ngọpụ.’ (Ndị Rom 1:20) Site “n’okike nke ụwa”—karịsịa site n’okike nke ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi, bụ́ ndị pụrụ ịghọta ịdị adị nke Chineke—o dowo anya na e nwere Onye Okike nke nwere ike dị ukwuu, Chineke nke kwesịrị ka e fee ya ofufe. N’ihi ya, ndị jụrụ inye Chineke otuto enweghị ihe ngọpụ. Otú ọ dị, ihe àmà dị aṅaa ka ihe e kere eke na-enye?

Eluigwe na Ụwa Na-akpọsa Ebube Jehova

6, 7. (a) Olee otú eluigwe si akpọsa ebube Chineke? (b) N’ihi gịnị ka eluigwe ji gbasaa “eriri ọ̀tụ̀tụ̀”?

6 Abụ Ọma 19:1 na-aza, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ [ma ọ bụ “ebube”] Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” Devid ghọtara na kpakpando na mbara ala ndị a na-esi na “mbara eluigwe,” ma ọ bụ mbara ikuku ahụ na-enye ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha nke ịdị adị nke Chineke dị ebube. Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Otu ụbọchị na-agwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwupụtakwara abalị ibe ya ihe ọmụma.” (Abụ Ọma 19:2) Kwa ụbọchị na kwa abalị, eluigwe na-egosipụta amamihe na ike ike ihe nke Chineke. Ọ dị ka à ga-asị na a na-anụ “n’ụba” okwu ọnụ ndị na-eto Chineke site n’eluigwe.

7 Otú ọ dị, ọ chọrọ nghọta iji nụ àmà a. “Okwu ọnụ adịghị, ọ dịghịkwa okwu dị; a nụghị olu ha.” N’agbanyeghị nke ahụ, àmà eluigwe na-agba n’ekwughị okwu dị ike. “N’ụwa nile ka eriri ọ̀tụ̀tụ̀ ha pụworo jezuo, ná nsọtụ elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.” (Abụ Ọma 19:3, 4) Ọ dị ka à ga-asị na eluigwe na-agbasa “eriri ọtụtụ” ya iji hụ na àmà ọ na-agba n’ekwughị okwu ruru akụkụ nile nke ụwa.

8, 9. Olee ihe ụfọdụ pụtara ìhè banyere anyanwụ?

8 Devid na-akọwazi ịdị ebube ọzọ nke ihe Jehova kere eke, sị: “O doworo anyanwụ ụlọikwuu n’ime ha [eluigwe a na-ahụ anya]. Anyanwụ ahụ dịkwa ka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ nke na-esi n’ụlọ ndina ya pụta, obi na-atọ ya ụtọ dị ka nwoke dị ike ịgbaso ụzọ ya. Site n’otu nsọtụ eluigwe ka mpụta ya dị, ịgba gburugburu ya dịrukwara nsọtụ ya nile: ọ dịghịkwa ihe e zonarịworo okpomọkụ ya.”—Abụ Ọma 19:4-6.

9 E jiri anyanwụ tụnyere kpakpando ndị ọzọ, ọ bụ nnọọ kpakpando na-ebuchaghị ibu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ kpakpando dị ịrịba àmà, na-eme ka mbara ala ndị na-agba ya gburugburu pee nnọọ mpe. Otu akwụkwọ na-ekwu na ọ dị “otu ijeri ijeri tọn ụzọ abụọ n’ibu—pasent 99.9 nke ibu usoro mbara igwe anyị! Ike ndọda ya na-eme ka ụwa na-agba ya gburugburu n’ebe ịdị anya ya dị nde kilomita 150 n’apụghị n’ọnọdụ ya ma ọ bụ bụrụ nke a dọtakwuru nso n’anyanwụ. Ọ bụ nanị ihe dị ka otu ụzọ n’ime ijeri abụọ nke ikike anyanwụ na-erute na mbara ala anyị, ma nke ahụ zuru ime ka ndụ dịgide.

10. (a) Olee otú anyanwụ si aba ma na-apụta ‘n’ụlọikwuu’ ya? (b) Olee otú o si agba ọsọ dị ka “nwoke dị ike”?

10 Ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere anyanwụ n’ụzọ ihe atụ, na-eji ya atụnyere “nwoke dị ike” nke na-esi n’otu nsọtụ mbara igwe agbaga ná nsọtụ nke ọzọ n’ehihie ma na-alakpu ‘n’ụlọikwuu’ n’abalị. Mgbe kpakpando ahụ dị ike na-abami ná nsọtụ nke mbara igwe, site n’ebe anyị nọ na-ahụ ya n’ụwa, ọ na-eyi ka ọ̀ na-aba ‘n’ụlọikwuu,’ dị ka à ga-asị na ọ na-aga izu ike. N’ụtụtụ, ọ na-eyi ka ọ̀ na-etiwapụta, na-egbukepụ nnọọ ‘dị ka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ nke na-esi n’ụlọ ndina ya pụta.’ Dị ka onye ọzụzụ atụrụ, Devid maara banyere oké oyi na-atụ n’abalị. (Jenesis 31:40) O chetara otú anyanwụ na-esi eme ka ahụ́ ya na ala dị ya gburugburu kporo ọkụ ngwa ngwa. N’ụzọ doro anya, ike adịghị agwụ anyanwụ na “njem” ya site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda anyanwụ kama ọ dị ka “nwoke dị ike,” na-adị njikere imeghachi njem ahụ.

Kpakpando na Ụyọkọ Kpakpando Ndị Dị Ebube

11, 12. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere ojiji Bible ji kpakpando tụnyere ájá? (b) Olee otú eluigwe na ala pụrụ iburu n’ibu?

11 Ebe ọ na-enweghị teliskop, Devid pụrụ ịhụ nanị puku kpakpando ole na ole. Otú ọ dị, dị ka otu ihe ọmụmụ e mere na nso nso a si gosi, ọnụ ọgụgụ kpakpando dị na mbara igwe bụ́ ndị a pụrụ iji teliskop ọgbara ọhụrụ hụ bụ otu ijeri ụzọ iri puku ijeri asaa! Jehova gosiri na ọnụ ọgụgụ ha buru nnọọ ibu mgbe o jiri ọnụ ọgụgụ kpakpando tụnyere “ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.”—Jenesis 22:17.

12 Ruo ogologo oge, ndị na-enyocha mbara igwe hụrụ ihe a kọwara dị ka “obere ógbè ndị na-egbukepụ egbukepụ bụ́ ndị nwere ọdịdị dị inyoghi inyoghi, ndị a na-adịghị ahụ nke ọma.” Ndị ọkà mmụta sayensị weere ya na ‘ógbè ndị a dị inyoghi inyoghi ma gbaa gburugburu’ bụ ihe ndị dị n’ụyọkọ kpakpando Milky Way anyị. Na 1924, a chọpụtara na nke kasị nso n’ógbè ndị a, bụ́ Andromeda, bụ n’ezie ụyọkọ kpakpando n’onwe ya—dịrị n’ebe ga-ewe ìhè si n’ụyọkọ kpakpando Milky Way anyị nde afọ abụọ iru! * Ndị ọkà mmụta sayensị na-eme atụmatụ ugbu a na e nwere ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando, ndị nke ọ bụla n’ime ha nwere ọtụtụ puku—mgbe ụfọdụ ọtụtụ ijeri—kpakpando. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova “na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando; ha nile ka Ọ na-akpọ aha.”—Abụ Ọma 147:4.

13. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere ìgwè kpakpando? (b) Olee otú o si pụta ìhè na ndị ọkà mmụta sayensị amaghị “ụkpụrụ nile nke eluigwe”?

13 Jehova jụrụ Job, sị: “Ị̀ na-ekekọta ihu ụtọ [ìgwè kpakpando] Pleiades, ma ọ bụ tọsaa ihe ọdụdụ nile nke [ìgwè kpakpando] Orion?” (Job 38:31) Ìgwè kpakpando bụ kpakpando ndị nọkọtara ọnụ n’otu usoro. Ọ bụ ezie na kpakpando dị iche iche pụrụ ịdị nnọọ n’ebe dị anya site n’ebe ibe ha dị, ha na-anọgide n’ọnọdụ ha dị ka e si ahụ ha site n’ụwa. N’ihi na ọnọdụ ha adịghị nnọọ agbanwe agbanwe, kpakpando “na-enye aka n’iduzi ụgbọ mmiri, ndị na-amụ ịnya ụgbọ mbara igwe, na n’ịmata kpakpando dị iche iche.” (The Encyclopedia Americana) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị onye ghọtazuru ‘ihe nkekọ’ na-ejikọta ìgwè kpakpando ọnụ. Ee, ndị ọkà mmụta sayensị enwebeghị ike ịza ajụjụ ahụ a jụrụ na Job 38:33: “Ị̀ mawo ụkpụrụ nile nke eluigwe?”

14. N’ụzọ dị aṅaa ka nkesa ìhè si bụrụ ihe omimi?

14 Ndị ọkà mmụta sayensị apụghị ịza ajụjụ ọzọ a jụrụ Job: “Olee ebe ọ dị, bụ́ ụzọ ebe a na-ekesa ìhè?” (Job 38:24) Otu onye edemede kpọrọ ajụjụ a a jụrụ banyere ìhè “ajụjụ nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ nke siri ike nghọta.” N’ụzọ dị iche, ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Gris kweere na ìhè na-esi n’anya mmadụ apụta. N’oge ndị na-adịchabeghị anya, ndị ọkà mmụta sayensị chere na ihe mejupụtara ìhè bụ́ ụmụ irighiri ihe. Ndị ọzọ chere na ọ na-aga dị ka ụzarị. Taa, ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ìhè na-eme ka ma ụzarị ma ụmụ irighiri ihe. Otú ọ dị, a ghọtachabeghị otú ìhè dị nakwa otú o si ‘ekesa onwe ya.’

15. Dị ka Devid, mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe mgbe anyị na-atụle ihe banyere eluigwe?

15 Ịtụle ihe a nile na-akpali mmadụ inwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?”—Abụ Ọma 8:3, 4.

Ụwa na Ihe Ndị E Kere Eke Dị n’Ime Ya Na-eto Jehova

16, 17. Olee otú ihe e kere eke ndị dị ‘n’ogbu mmiri’ si enye Jehova otuto?

16 Abụ Ọma nke 148 kwuru ụzọ ndị ọzọ ihe e kere eke si akpọsa ebube Chineke. Amaokwu nke 7 na-agụ, sị: “Toonụ Jehova site n’ụwa, unu ogologo anụ mmiri, na ogbu mmiri nile.” Ee, “ogbu mmiri” jupụtara n’ihe ndị dị ebube na-eme ka amamihe na ike Chineke pụta ìhè. Nkezi ịdị arọ nke anụ blue whale bụ tọn 120—ihe dị ka ịdị arọ nke enyí 30! Nanị obi ya dị kilogram 450 n’arọ, ọ pụkwara ibugharị ihe dị ka ọbara dị kilogram 6,400 n’akụkụ ahụ́ ya nile! Nnukwu anụ mmiri ndị a hà na-aga nwayọọ nwayọọ n’ime mmiri? Ọ dịghị ma ọlị. Ha “na-egwugharị n’oké osimiri” n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ịrịba ama, ka otu akụkọ sitere n’aka Òtù Europe Na-egbochi Ogbugbu nke Nnukwu Anụ Ndị Bi na Mmiri na-ekwu. Ozi satellite gosiri na “otu anụmanụ gara ihe karịrị kilomita 16,000 n’ọnwa 10.”

17 Anụ dolphin nke nwere imi mpịọ mpịọ na-amabarukarị mita 45 n’ime mmiri, ma ebe kasị omimi anụ dolphin mabatụrurula bụ mita 547! Olee otú anụ a na-enye nwa ara si adịgide ndụ ka ọ na-amabaru ebe dị omimi otú ahụ? Ọkụkụ nke obi ya na-ebelata mgbe ọ na-amaba n’ime mmiri, ọbara na-agawazi n’obi, akpa ikuku, na n’ụbụrụ ya. Ọzọkwa, uru ahụ́ ya nwere mmiri ọgwụ nke na-echekwa ikuku oxygen. Anụ elephant seal na sperm whale pụrụ ịmaba ọbụna ebe dị omimi karị. “Kama iguzogide ikike nke mmiri,” ka magazin bụ́ Discover na-ekwu, “ha na-ekwe ka o mee ka ikuku gwụ kpam kpam n’akpa ikuku ha.” Ha na-echekwa ihe ka ukwuu n’ikuku oxygen dị ha mkpa n’uru ahụ́ ha. N’ụzọ doro anya, ihe ndị a e kere eke bụ ihe akaebe a na-ahụ anya nke amamihe nke Chineke nwere ike kasịnụ!

18. Olee otú mmiri nke oké osimiri si egosipụta amamihe Jehova?

18 Ọbụna mmiri nke oké osimiri na-egosipụta amamihe Jehova. Akwụkwọ bụ́ Scientific American na-ekwu, sị: “Ntapụ mmiri ọ bụla dị na 100 mita site n’elu oké osimiri nwere ọtụtụ puku ahịhịa ndị na-ese n’elu ha a na-akpọ phytoplankton, bụ́ ndị a pụrụ iji nanị ígwè microscope hụ.” ‘Ọhịa a a na-adịghị ahụ anya’ na-azacha ikuku anyị site n’iwepụ ọtụtụ ijeri tọn ikuku carbon dioxide na ya. Phytoplankton na-ewepụta ihe karịrị ọkara nke ikuku oxygen anyị na-ekuru.

19. Olee otú ọkụ na snow si emezu uche Jehova?

19 Abụ Ọma 148:8 na-ekwu, sị: “Ọkụ, na akụ́ mmiri igwe, na snow, na alụlụ; oké ifufe nke na-eme okwu Ya.” Ee, Jehova na-ejikwa ikike ndị na-adịghị ndụ e kere eke emezu uche ya. Tụlee ihe banyere ọkụ. Ọtụtụ iri afọ gara aga, e lere ọkụ na-agba n’oké ọhịa anya dị ka nanị ihe na-ebibi ihe. Ndị nchọpụta kweere ugbu a na ọkụ na-arụ ọrụ dị mkpa n’ebe ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha dị, na-ewepụ osisi ndị mere ochie ma ọ bụ ndị na-anwụ anwụ, na-eme ka ọtụtụ mkpụrụ na-epupụta, na-eme ka ala na-eme nri ma na-ebelata nnọọ ihe ize ndụ nke ajọ ọkụ ọgbụgba. Snow dịkwa mkpa, ọ na-ede ala ma na-eme ka ala na-emepụta nri, na-emejupụta osimiri, na-egbochi ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ịnwụ n’oké oyi.

20. Olee otú ugwu na osisi si abara ihe a kpọrọ mmadụ uru?

20 “Ugwu nile na ugwu nta nile; osisi nile na-amị mkpụrụ na osisi cedar nile,” ka Abụ Ọma 148:9 na-akọ. Ugwu ndị dị ebube bụ ihe akaebe nke ike dị ukwuu nke Jehova. (Abụ Ọma 65:6) Ma ha bakwara uru. Otu akụkọ si n’Ụlọ Akwụkwọ Na-akụzi Nkà Mmụta Ọdịdị Mbara Ala dị na Bern, Switzerland, na-akọ, sị: “Isi iyi nke osimiri nile bụ́ isi n’ụwa dị n’ugwu. Ihe karịrị ọkara ihe a kpọrọ mmadụ na-adabere ná mmiri na-agbakọ n’ugwu . . . ‘Ebe nchekwa mmiri’ ndị a dị mkpa maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ.” Ọbụna osisi nkịtị bụ ihe otuto nye Onye Mere ya. Otu akụkọ si ná Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi na-ekwu na osisi “dị mkpa maka ọdịmma nke ndị bi ná mba nile . . . Ọtụtụ ụdị osisi bụ ihe ndị e ji nnọọ enweta ego dị ka ebe ndị e si enweta osisi ndị e ji ewu ụlọ, mkpụrụ osisi, na mgbá. Gburugburu ụwa, nde mmadụ 2 na-adabere n’osisi maka iji sie ihe na iji menwuo ọkụ.”

21. Kọwaa otú akwụkwọ osisi nkịtị si egosipụta ihe àmà nke nkà.

21 A na-ahụ ihe àmà na-egosi na e nwere onye okike maara ihe n’otú e si nnọọ mee osisi. Tụlee akwụkwọ osisi nkịtị. Elu elu ya nwere ihe na-eme ka ọ nọgide na-adị udè bụ́ nke na-egbochi akwụkwọ osisi ahụ ịkpọnwụ. A gafee nnọọ elu elu ya, o nwere ọtụtụ akụkụ ndị nwere chloroplast. Ha nwere chlorophyll, bụ́ nke na-amịkọrọ ikike sitere n’ìhè anyanwụ. Site n’usoro a na-akpọ photosynthesis, akwụkwọ osisi na-aghọ “ụlọ ọrụ ndị na-emepụta nri.” Site ‘n’usoro dị mgbagwoju anya yiri otú mmiri si esi na paịpụ aga,’ mkpọrọgwụ osisi na-amịta mmiri ma na-ebugoro ya akwụkwọ osisi. Ọtụtụ puku obere ihe ndị yiri “ọnụ” (ndị a na-akpọ stomata) bụ́ ndị dị n’okpuru akwụkwọ osisi ahụ na-emeghe ma na-emechi, na-eme ka ikuku carbon dioxide na-abanye n’ime akwụkwọ osisi ahụ. Ìhè na-enye ike nke na-eme ka mmiri na ikuku carbon dioxide gwakọta ma mepụta nri ndị na-enye osisi ahụ ike. Osisi ahụ pụziri iri nri ya onwe ya siri. N’agbanyeghị nke a, ‘ụlọ mmepụta ihe a’ adịghị eme mkpọtụ, ọ makwara mma. Kama imetọ ikuku, ọ na-emepụta ikuku oxygen!

22, 23. (a) Ikike ndị dị aṅaa dị ịrịba ama ka ụfọdụ nnụnụ na anụ ndị bi n’ala nwere? (b) Olee ajụjụ ọzọ ndị dị mkpa ka a tụlee?

22 “Anụ ọhịa na anụ ụlọ nile; ihe na-akpụ akpụ na nnụnụ nwere nkù,” ka Abụ Ọma 148:10 na-ekwu. Ọtụtụ anụmanụ ndị bi n’ala na anụ ufe na-egosipụta ikike ndị dị ịtụnanya. Nnụnụ Laysan albatross pụrụ iferu ebe dị nnọọ anya (n’otu oge, o feruru kilomita 40,000 nanị n’ụbọchị 90). Nnụnụ blackpoll warbler na-esi n’Ebe Ugwu America efega n’Ebe Ndịda America, na-efe n’ikuku ruo ihe karịrị awa 80 n’akwụsịghị akwụsị. Kamel na-echekwa mmiri, ọ bụghị ná mkpumkpu azụ ya dị ka ọtụtụ ndị na-eche, kama n’usoro mgbari nri ya, na-eme ka o nwee ike ime njem dị anya n’abụghị nke mmiri kọrọ n’ahụ́. Ka a sịkwa ihe mere ndị injinia ji eji nlezianya ekiri ụmụ anụmanụ dị iche iche mgbe ha na-arụpụta ngwá ọrụ na ihe ọhụrụ ndị ọzọ. “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịrụ ihe ga-arụ ọrụ nke ọma . . . ma na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ na gburugburu ebe obibi,” ka onye edemede bụ́ Gail Cleere na-ekwu, “o yikarịrị ka ị̀ ga-achọta ihe atụ ya n’ihe ndị e kere eke.”

23 Ee, ihe e kere eke na-akpọsa ebube Chineke n’ezie! Site na kpakpando nke eluigwe ruo n’ihe ọkụkụ na anụmanụ, nke ọ bụla na-ewetara Onye Okike ya otuto n’ụzọ nke ya. Ma gịnị banyere anyị bụ́ ụmụ mmadụ? Olee otú anyị pụrụ isi sonyere ihe ndị e kere eke n’ịbụ abụ otuto nye Chineke?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke ìhè bụ kilomita 300,000 kwa sekọnd.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere na ndị na-ekwu na Chineke adịghị enweghị ihe ngọpụ?

• Olee otú kpakpando na mbara ala dị iche iche si enye Chineke otuto?

• Olee otú anụ ndị dị n’oké osimiri na ndị bi n’ala si enye ihe àmà na e nwere Onye Okike na-ahụ n’anya?

• Olee otú ikike ndị na-adịghị ndụ ndị e kere eke si emezu uche Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị ọkà mmụta sayensị na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ kpakpando ndị a pụrụ ịhụ anya dị otu ijeri ụzọ iri puku ijeri asaa!

[Ebe E Si Nweta Foto]

Frank Zullo

[Foto dị na peeji nke 12]

Anụ “dolphin” nke nwere imi mpịọ mpịo

[Foto dị na peeji nke 13]

Mpekere snow

[Ebe E Si Nweta Foto]

snowcrystals.net

[Foto dị na peeji nke 13]

Obere nnụnụ “Laysan albatross”