Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ihe Ọma n’Oge Mkpa

Ime Ihe Ọma n’Oge Mkpa

Ime Ihe Ọma n’Oge Mkpa

“KA ANYỊ na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ,” ka Pọl onyeozi gbara ume ya, “ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ji ịdị uchu na-agbalị itinye ụkpụrụ ahụ n’ọrụ ná ndụ ha, na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, karịsịa n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ. A na-ahụ nke a mgbe mgbe n’oge mkpa. Ka anyị tụlee ihe atụ ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya bụ́ ndị sitere ná mba atọ.

Na December 2002, ajọ ifufe dị ike tibatara na Guam, na-eferu ihe karịrị kilomita 300 n’otu awa. Ọtụtụ ebe obibi dakasịrị, e bibikwara ụfọdụ kpam kpam. Ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ haziri ngwa ngwa ndị nzacha na mkpocha iji nyere ezinụlọ Ndịàmà ọ kasị metụta aka. Alaka ụlọ ọrụ Guam wetara ngwá ọrụ na ndị ọrụ ịrụzi ebe obibi ndị e bibiri ebibi, alaka Hawaii nyekwara nkwado. N’ime izu ole na ole, otu ìgwè ndị kapịnta si Hawaii bịa inye aka n’ọrụ mwughachi ahụ, iji nyere ha aka, ụfọdụ ụmụnna n’ógbè ahụ weere ezumike n’ebe ọrụ ha. Mmụọ iji ọṅụ arụkọ ọrụ ọnụ nke ha gosipụtara gbaara ndị ógbè ahụ nile àmà.

N’otu ógbè dịpụrụ adịpụ n’obodo Mandalay, Myanmar, ọkụ malitere ịgba n’ebe na-adịghị anya site n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụlọ otu nwanna nwanyị na-adịghị ejekwa ozi na ezinụlọ ya dị nso n’ebe ahụ. Ifufe chere ihu n’ebe ụlọ ya dị, ya mere, ọ gbagara n’ụlọ nzukọ ahụ ịrịọ maka enyemaka. N’oge ahụ, a nọ na-arụzigharị ụlọ nzukọ ahụ, n’ihi ya, e nwere ọtụtụ ụmụnna nọ n’ebe ahụ. O juru ha anya ịhụ nwanna nwanyị ahụ n’ihi na ha amaghị na o bi n’ógbè ahụ. Ozugbo ahụ, ụmụnna ahụ nyere aka n’ịkwaga ngwongwo ezinụlọ ahụ n’ebe dị nchebe. Mgbe di ya, onye na-abụghị Onyeàmà, nụrụ banyere ọkụ ahụ, ọ gbalara ụlọ ma hụ ka ụmụnna ahụ na-elekọta ezinụlọ ya. N’ịbụ onye nwere obi ụtọ na ekele, obi rukwara ya ala n’ihi na ndị ohi na-ejikarị ohere dị otú ahụ akwakọrọ ihe ndị mmadụ. Ngosipụta obiọma a nke ụmụnna ahụ kpaliri nwanna nwanyị ahụ na nwa ya nwoke ịmaliteghachi isonyere ọgbakọ Ndị Kraịst, ha na-abịakwa nzukọ nile ugbu a.

N’ime afọ ije ozi a gara aga, ụnwụ nri kpara ọtụtụ ndị nọ na Mozambique aka ọjọọ n’ihi ụkọ mmiri ozuzo na ihe ọkụkụ na-emeghị nke ọma. Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ mere ihe ozugbo site n’iwegara ndị nọ ná mkpa ihe oriri. A na-ekesa nri ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe ụfọdụ, ma a gbasasịa nzukọ ọgbakọ. Otu nwanna nwanyị, onye bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ kwuru, sị: “Enwere m nkụda mmụọ mgbe m bịara nzukọ, n’amaghị ihe m ga-enye ụmụ m ka ha rie mgbe anyị lara.” Enyemaka ịhụnanya nke ụmụnna ndị ahụ gbara ya ume. “Ọ dị m ka mbilite n’ọnwụ!” ka o kwuru.

Ndịàmà ‘na-emekwa ihe ọma’ n’ụzọ ime mmụọ site n’ikwusa ozi Bible na-enye nkasi obi na olileanya. Ha kweere otu ihe ahụ nwoke oge ochie ahụ maara ihe kweere: “Ma onye na-ege [amamihe Chineke] ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.”—Ilu 1:33.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

1, 2. Ikesara ndị nọ ná mkpa nri na Mozambique

3, 4. Ajọ ifufe fere na Guam bibiri ọtụtụ ebe obibi

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Nwatakịrị, n’aka ekpe: Andrea Booher/Foto FEMA News; nwanyị, n’elu: Foto AP/Pacific Daily News, Masako Watanabe