Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imere Ndị Ọzọ Ihe Ọma Ka Ọ̀ Bụ Emela Ha Ihe Ọjọọ?

Imere Ndị Ọzọ Ihe Ọma Ka Ọ̀ Bụ Emela Ha Ihe Ọjọọ?

Imere Ndị Ọzọ Ihe Ọma Ka Ọ̀ Bụ Emela Ha Ihe Ọjọọ?

“IHE ị na-achọghị ka e mee gị, emela ya onye ọzọ.” E kwuru na ọ bụ onye nkụzi China na ọkà ihe ọmụma a ma ama bụ́ Confucius kwupụtara ụkpụrụ omume a ndị mmadụ na-ekwughachikarị. Taa, ihe dị ka afọ 2,500 ka e mesịrị, ọtụtụ ndị ka kweere na mmadụ emewo omume ọma nanị site n’izere ime ndị ọzọ ihe ọjọọ.

N’ezie, ụkpụrụ omume Confucius a bara uru ruo n’ókè ụfọdụ. Bible, n’aka nke ọzọ, na-ekpughe akụkụ ọzọ nke akparamàgwà na mkpakọrịta ụmụ mmadụ. Tụkwasị n’ihe a pụrụ ịkpọ mmehie nke ime ihe na-ezighị ezi, ya bụ, ime mmadụ ibe anyị ihe ọjọọ, Bible na-ekwu banyere mmehie nke emeghị ihe ziri ezi. Onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ maara ụzọ isi mee ihe ziri ezi ma o meghịkwa ya, ọ bụụrụ ya mmehie.” (Jems 4:17) Kama ịkụziri Ndị Kraịst nanị ka ha ghara ime ndị ọzọ ihe ọjọọ, Jizọs Kraịst nyere ndụmọdụ a: “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

Ná mmalite, Chineke zubere ka ihe a kpọrọ mmadụ na-emeso ibe ha ihe dị ka ọ ga-amasị ha ka e si na-emeso ha. O setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma nke igosipụta nchegbu maka ọdịmma ndị ọzọ n’ụzọ o si kee ụmụ mmadụ: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” (Jenesis 1:27) Nke a pụtara na Chineke ji ịhụnanya nye ụmụ mmadụ akọ na uche, bụ́ nke, mgbe a zụrụ ya nke ọma, ga-eduzi ha imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ha onwe ha ga-achọ ka e si na-emeso ha.

Ọtụtụ ndị taa na-ahụju anya n’enweghị olileanya na n’enweghị onye enyemaka n’aka ndị na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche na ndị na-eche nanị banyere onwe ha. N’ụzọ doro anya, ihe dị mkpa abụghị nanị izere ime ndị ọzọ ihe ọjọọ na ihe ga-emerụ ha ahụ́, kama nke ahụ, imere ha ihe ọma na ihe ga-enyere ha aka. N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova na-eji afọ ofufo eme ihe ndị doro anya iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere olileanya dị ebube a na-achọta n’Okwu Chineke. Mgbe ha ji ozi ọma sitere na Bible jekwuru ndị agbata obi ha, ha na-eji mmụọ nke ịhụnanya eme ya, na-emere ndị ọzọ ihe ha ga-achọ ka e meere ha onwe ha.