Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Okpukpe I Kwesịrị Ịhọrọ?

Olee Okpukpe I Kwesịrị Ịhọrọ?

Olee Okpukpe I Kwesịrị Ịhọrọ?

‘OKPUKPE dị iche iche bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduga n’otu ebe. E kwuwerị, ọ bụ nanị otu Chineke ka e nwere, ọ́ bụghị ya?’ Nke ahụ bụ echiche ọtụtụ ndị nwere bụ́ ndị na-eche na ọ bụ ezie na mmadụ inwe okpukpe ọ na-ekpe dị mkpa, okpukpe nke mmadụ họọrọ ikpe adịchaghị ihe o mere.

E lee ya anya elu elu, arụmụka a pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya, ebe ọ bụ eziokwu na e nwere nanị otu Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. (Aịsaịa 44:6; Jọn 17:3; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Otú ọ dị, anyị apụghị ileghara ọdịiche ndị doro anya—ọbụna mmegiderịta—dị n’etiti ọtụtụ òtù okpukpe ndị na-azọrọ na ha na-ejere ezi Chineke ahụ ozi, anya. Ha dịrịta nnọọ iche n’omume ha, nkwenkwe ha, ozizi ha, na n’ihe ndị ha na-achọ n’aka mmadụ. Ọdịiche ndị ahụ dị nnọọ ukwuu nke na ọ na-esiri ndị nọ n’otu okpukpe ike ịghọta ma ọ bụ nabata ihe ndị nke ọzọ na-akụzi ma ọ bụ kwere.

N’aka nke ọzọ, Jizọs kwuru, sị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ife Chineke n’eziokwu ọ̀ na-enye ohere inwe ọtụtụ echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere onye Chineke bụ, ihe nzube ya bụ, na otú ọ chọrọ ka e si fee ya? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile achọghị ịma otú anyị si na-efe ya?

Ezi Ndị Kraịst n’Oge Gara Aga na n’Oge A

Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nwere echiche dịgasị iche iche banyere ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ndị nọ na Kọrint, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị ụlọ Kloi mere ka m mara banyere unu, ụmụnna m, na esemokwu dị n’etiti unu. Ihe m na-ekwu bụ nke a, na onye ọ bụla n’ime unu na-asị: ‘Abụ m nke Pọl,’ ‘Ma abụ m nke Apọlọs,’ ‘Ma abụ m nke Sifas,’ ‘Ma abụ m nke Kraịst.’”—1 Ndị Kọrint 1:11, 12.

Pọl ò lere ndịrịta iche ndị a anya dị ka ihe na-adịchaghị mkpa? Onye ọ bụla ọ̀ nọ nnọọ na-agbaso ụzọ nke ya iji nweta nzọpụta? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Pọl dụrụ ọdụ, sị: “M na-agba unu ume, ụmụnna m, site n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka a gharakwa inwe nkewa n’etiti unu, kama ka e mee ka unu dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche.”—1 Ndị Kọrint 1:10.

N’ezie, a pụghị ịmanye ndị mmadụ amanye ịdị n’otu na nkwenkwe. Ndị mmadụ na-adị n’otu nanị mgbe onye nke ọ bụla n’ime ha ji nlezianya nyochaa ihe wee ruo na ma nakwere otu nkwubi okwu. N’ihi ya, ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke na ọchịchọ si n’ezi obi itinye ihe ndị a na-amụta n’ọrụ bụ ihe ndị dị oké mkpa ime iji nwee ụdị ịdị n’otu ahụ Pọl kwuru okwu ya. À pụrụ ịchọta ịdị n’otu dị otú ahụ? Dị ka anyị hụworo, ọ dịwo anya Chineke mesowere ndị ya ihe dị ka otu ìgwè. Ọ̀ ga-ekwe omume ịmata ìgwè ahụ taa?

Abamuru nke Isonyere Òtù Ziri Ezi

N’otu oge, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid jụrụ, sị: “Jehova, ònye ga-anọ dị ka ọbịa n’ụlọikwuu Gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ Gị?” Nke ahụ bụ n’ezie ajụjụ na-akpali iche echiche. Devid nyere azịza ya: “Onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.” (Abụ Ọma 15:1, 2) Ezi nghọta Bible ga-enyere mmadụ aka ịmata okpukpe ruru ihe ndị Chineke chọrọ. Mgbe ahụ, site n’iso òtù ahụ na-akpakọrịta, onye ahụ na ndị na-efe Chineke n’ịdị n’otu na “n’ime mmụọ na n’eziokwu” ga na-enwe mkpakọrịta na-ewuli elu.

Ndịàmà Jehova egosipụtawo na ọ ga-ekwe omume inwe ịdị n’otu na nkwenkwe na n’omume ọbụna n’ụwa nke taa na-adịghị n’otu. N’etiti ha, e nwere ndị nọbu n’okpukpe na ndị si n’agbụrụ dị iche iche. Ndịàmà ndị ọzọ bụbu ndị kweere na a pụghị ịmata Chineke amata ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Chineke dị. Ndị ọzọkwa etinyechaghị uche n’ihe banyere okpukpe. Site n’okpukpe, ọdịnala, na nkà ihe ọmụma ndị a dịgasị iche, e nwewo ugbu a ndị nwere ịdị n’otu okpukpe bụ́ nke a na-adịghị ahụ n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa taa.

Ebe ịdị n’otu dị otú ahụ dabeere bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. N’ezie, Ndịàmà Jehova maara na ha apụghị ịgwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Ma ha nwere ekele maka ihe ùgwù nke ịgba ndị ọzọ ume ịmụta ihe site na Bible iji mee ka nhọrọ ha na-eme n’ihe metụtara ofufe gbado ụkwụ na ntọala ahụ siri ike. N’ụzọ dị otú a, ọtụtụ ndị ọzọ pụrụ iso rite uru ndị na-esite n’ife Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.”

Taa, ihe ize ndụ nke ịbụ onye mmetụta ọjọọ na ihe nrata ndị ọzọ nwetara dị ukwuu. Ịhọrọ isonyere òtù ziri ezi dị oké mkpa. Bible na-ekwu na ‘onye na-ejeso ndị maara ihe, ga-amakwa ihe’ nakwa na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33) Iso ezi ndị na-efe Chineke na-akpakọrịta bụ ihe nchebe. N’ihi ya, Bible na-echetara anyị, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Lee ngọzi ọ bụ mgbe ezi ndị enyi, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ, ji ịhụnanya na-enyere ibe ha aka ịrụzu ọrụ dịịrị ha n’ebe Chineke nọ!

Ottmar na-egosipụta eziokwu dị n’echiche a. N’ịbụ onye a zụlitere n’ezinụlọ na-ekpe Katọlik bi na Germany, ọ kwụsịrị ịga chọọchị. Ọ na-akọwa, sị: “Mgbe ọ bụla m gara chọọchị, m na-alọta na-enwe mmetụta nke enweghị nzube ná ndụ dị ka m nwere mgbe m gawara.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-ekwere na Chineke. Mgbe ahụ, o zutere Ndịàmà Jehova ma bịa kwenyesie ike na ha bụ ezi ndị ohu Chineke. Ọ hụrụ mkpa ọ dị isonyere ha. Ugbu a, ọ na-ekwu, sị: “N’ịbụ onye na-arụsi ọrụ ike n’òtù zuru ụwa ọnụ, m na-enwe udo nke uche na nke obi. A na-enyere m aka n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu inwetakwu ezi ihe ọmụma nke Bible. Nke ahụ bụ nnọọ ihe dị oké ọnụ ahịa nye m.”

Ọkpụkpọ Òkù Maka Ndị Na-achọ Eziokwu Ahụ

Ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka otu ìgwè ma nwee otu echiche pụrụ ịrụzu ọrụ n’ụzọ dị irè karịa ndị na-arụ iche iche. Dị ka ihe atụ, ntụziaka ikpeazụ ndị Jizọs nyere ụmụazụ ya bụ: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Olee otú a pụrụ isi rụzuo ọrụ dị otú ahụ n’ụzọ juru afọ ma ọ bụrụ na e nweghị nduzi ma ọ bụ nhazi? Olee otú mmadụ pụrụ isi rubere iwu Akwụkwọ Nsọ a isi ma ọ bụrụ na ọ nwaa ijere Chineke ozi n’onwe ya n’esonyereghị ndị ọzọ?

N’ime afọ a gara aga, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa kesara akwụkwọ ndị dabeere na Bible, akwụkwọ nta, na broshuọ 91,933,280, tinyere magazin 697,603,247, si otú a na-ewegara ọtụtụ narị nde mmadụ bi n’ala 235 ozi sitere n’Okwu Chineke. Lee ka nke a si bụrụ ihe àmà pụtara ìhè na-egosi na mgbalị òtù dị n’otu a haziri nke ọma gbakọtara aka mee na-arụzu ihe dị nnọọ ukwuu karịa mgbalị ndị mmadụ n’otu n’otu mere n’enwetaghị enyemaka!

Tụkwasị n’ikesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, Ndịàmà Jehova na-eduzi ọmụmụ Bible n’efu iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta n’ụzọ miri emi ihe Chineke chọrọ ha n’aka. N’afọ gara aga, ná nkezi, e duziiri ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ ìgwè dị iche iche ọmụmụ Bible 5,726,509 kwa izu. Ntụziaka Bible a enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka inweta ihe ndabere siri ike ha ga-agbakwasị ụkwụ na ya mee nhọrọ n’ihe banyere ofufe. A na-akpọ gị òkù ịbịa mụta ihe Chineke chọrọ dị ka e depụtara ha na Bible. Mgbe ahụ, ị pụrụ ime nhọrọ nke gị.—Ndị Efesọs 4:13; Ndị Filipaị 1:9; 1 Timoti 6:20; 2 Pita 3:18.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ dị gị nnọọ mkpa isonyere otu òtù okpukpe—ma ọ bụghị nnọọ òtù okpukpe ọ bụla. Ọ dị mkpa ka nhọrọ gị n’ihe banyere okpukpe ị ga-ekpe dabere n’ezi ihe ọmụma Bible, ọ bụghị n’ozizi ndị a na-anwapụtaghị anwapụta ma ọ bụ n’ihe ị nụrụ n’ọnụ mmadụ. (Ilu 16:25) Mụta ihe ndị a chọrọ mmadụ n’aka iji bụrụ onye na-ekpe ezi okpukpe. Were ha tụnyere ihe ndị gị onwe gị kweere. Mezie nhọrọ kwekọrọ na nke ahụ.—Deuterọnọmi 30:19.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ụwa nke na-adịghị n’otu