Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Kụziiri Anyị Ịkwanyere Okpukpe Ya Ùgwù’

‘Ọ Kụziiri Anyị Ịkwanyere Okpukpe Ya Ùgwù’

‘Ọ Kụziiri Anyị Ịkwanyere Okpukpe Ya Ùgwù’

OTU n’ime Ndịàmà Jehova si n’ógbè Rovigo, Ịtali, chọpụtara na ya nwere akpụ nakwa na ọnọdụ ya dị njọ. Ka ọ nọsịrị n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ ugboro, bụ́ mgbe ọ rịọrọ ka a gwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara, ndị nọọsụ si n’ụlọ ọrụ ahụ́ ike ógbè ahụ nke na-elekọta ndị ọrịa cancer nyeere ya aka n’ebe obibi ya.

Okwukwe siri ike nke onye ọrịa a dị afọ 36 na ịdị njikere ya iso ndị ọrụ ahụ́ ike rụkọọ ọrụ masịrị ndị ọrụ ahụ́ ike lekọtara ya nke ukwuu. Obere oge tupu ọrịa cancer ahụ egbuo onye ọrịa ahụ, otu n’ime ndị nọọsụ nyeere ya aka dere banyere ahụmahụ ya na onye ọrịa ahụ bụ́ onye ọ kpọrọ Angela n’otu magazin ndị nọọsụ.

“Ume juru Angela n’ahụ́, ọ chọsikwara ike ịdị ndụ. Ọ maara banyere ọnọdụ ya na ọrịa ya siri ike, dịkwa ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme, ọ na-achọ ọgwụgwọ, ihe ngwọta, ma ọ bụ ọgwụ. . . . Anyị bụ́ ndị nọọsụ ji nwayọọ nwayọọ mata ya. Ọ jụghị enyemaka anyị. N’ụzọ megidere nke ahụ, ezoghị ọnụ Angela mere ka ihe nile dị mfe. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ilekọta ya, ebe anyị maara na ọ ga-abụ oge izute onye nwere obi eziokwu na oge ga-abara ma ya ma anyị uru. . . . Anyị ghọtara ozugbo na okpukpe ya ga-abụ ihe mgbochi n’ilekọta ya n’ọrịa ya.” Nke ahụ bụ echiche ya n’ihi na o chere na e kwesịrị ịmịnye Angela ọbara, bụ́ nke Angela jụrụ.—Ọrụ 15:28, 29.

“Dị ka ndị ọrụ ahụ́ ike maara ọrụ ha, anyị gwara Angela na anyị ekwenyeghị ná mkpebi ya, ma site n’enyemaka ya, anyị ghọtara ihe ndụ pụtara nye ya. Anyị ghọtakwara otú okpukpe ya dịruru ma ya ma ezinụlọ ya mkpa. Angela adabeghị mbà. O kwebeghị ka ọrịa ya kụda ya mmụọ. O siri ike. Ọ chọrọ ịdị ndụ, ịgba mgba, na ịnọgide na-adị ndụ. O kwupụtawo mkpebi ya siri ike, nkwenkwe ya. O nwere mkpebi siri ike nke anyị onwe anyị na-adịghị enwekarị, okwukwe, nke nke anyị na-esirughị ike ka ya. . . . Angela akụziworo anyị mkpa ọ dị ịkwanyere okpukpe ya ùgwù, bụ́ ihe dị nnọọ iche n’ụkpụrụ na-eduzi ọrụ anyị. . . . Anyị kweere na ihe Angela kụziiri anyị dị mkpa nke ukwuu, n’ihi na anyị na-ezute ụdị mmadụ nile, ụdị ọnọdụ nile, na ụdị okpukpe nile, anyị pụkwara ịmụta ihe site n’aka onye ọ bụla anyị zutere, kụziekwara onye ahụ ihe.”

Mgbe ahụ, isiokwu magazin ahụ dọọrọ uche gaa n’Ụkpụrụ Na-eduzi Ndị Nọọsụ Ịtali, bụ́ nke a kwadoro na 1999, nke na-asị: “Onye nọọsụ na-arụ ọrụ ya, na-eburu n’uche okpukpe, ụkpụrụ omume, na ọdịnala nke onye ahụ, tinyere agbụrụ na ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ka ọ bụ nwanyị.” Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri ndị dọkịta na ndị nọọsụ ike ịkwanyere nkwenkwe okpukpe onye ọrịa ùgwù, ọ dịghịkwa n’ezie onye na-agaghị enwe ekele maka ndị dị njikere ime otú ahụ.

Mkpebi Ndịàmà Jehova na-eme n’ihe banyere ahụ́ ike na nlekọta ahụ́ ike ha, bụ ndị ha na-eche echiche nke ọma eme. Ha na-atụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ọma, dịkwa ka e gosiri n’ọnọdụ Angela, ha abụghị ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. (Ndị Filipaị 4:5) Gburugburu ụwa, ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ahụ́ ike bụ́ ndị dị njikere ịkwanyere akọ na uche ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà ha na-elekọta ùgwù na-arịwanye elu.