Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi

Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi

Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi

“Chigharịkwuru Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ onye mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe nile dị n’ime ha.”—ỌRỤ 14:15.

1, 2. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ile Jehova anya dị ka “Chineke ahụ dị ndụ”?

KA Pọl onyeozi na Banabas gwọsịrị otu nwoke, Pọl mesiri ndị na-ekiri ihe na-emenụ na Listra obi ike, sị: “Anyị onwe anyị bụkwa mmadụ ndị nwere otu ụdị ahụ́ esighị ike ahụ nke unu nwere, anyị na-akpọsakwa ozi ọma nye unu, ka unu wee si n’ihe efu ndị a chigharịkwuru Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ onye mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe nile dị n’ime ha.”—Ọrụ 14:15.

2 Lee ka o si bụrụ nnọọ eziokwu na Jehova abụghị arụsị na-adịghị ndụ, kama “Chineke ahụ dị ndụ”! (Jeremaịa 10:10; 1 Ndị Tesalonaịka 1:9, 10) E wezụga na ya onwe ya dị ndụ, Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ anyị. “Ya onwe ya na-enye mmadụ nile ndụ na ume na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) O nwere mmasị ka anyị nụ ụtọ ndụ, ugbu a na n’ọdịnihu. Pọl gbakwụnyere na Chineke ‘ahapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị, na-emejupụta obi unu n’ihe oriri na ezi obi ụtọ.’—Ọrụ 14:17.

3. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị nduzi nke Chineke na-enye obi?

3 Mmasị Chineke nwere ná ndụ anyị na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji tụkwasị nduzi ya obi. (Abụ Ọma 147:8; Matiu 5:45) Ụfọdụ pụrụ ịjụ ime nke ahụ mgbe ha hụrụ ntụziaka Bible nke ha na-aghọtaghị ma ọ bụ nke yiri ka ọ dịghị ekwe ha megharịa ahụ́. Otú ọ dị, a nwapụtawo na ịtụkwasị nduzi Jehova obi bụ ihe amamihe dị na ya. Iji maa atụ: Ọ bụrụgodị na onye Izrel aghọtaghị iwu ahụ megidere imetụ ozu aka, o ritere uru site n’irube isi na ya. Nke mbụ, ya irube isi na ya ga-eme ka ọ bịaruo Chineke ahụ dị ndụ nso karị; nke abụọ, ọ ga-enyere ya aka izere ọrịa.—Levitikọs 5:2; 11:24.

4, 5. (a) Tupu oge Ndị Kraịst, nduzi dị aṅaa ka Jehova nyere banyere ọbara? (b) Olee otú anyị si mara na nduzi Chineke nyere banyere ọbara metụtara Ndị Kraịst?

4 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere nduzi Chineke n’ihe metụtara ọbara. Ọ gwara Noa na ụmụ mmadụ ekwesịghị iri ọbara. Mgbe e mesịrị, n’Iwu ahụ, Chineke kpughere na nanị ebe a kwadoro ka e jiri ọbara na-eme ihe bụ n’elu ebe ịchụàjà—maka mgbaghara mmehie. Site ná ntụziaka ndị ahụ, Chineke nọ na-atọ ntọala maka ihe dị oké mkpa a ga-eji ọbara mee—nzọpụta nke ndụ site n’ihe mgbapụta nke Jizọs. (Ndị Hibru 9:14) Ee, nduzi Chineke bụ maka ndụ na ọdịmma anyị. Ka ọ na-atụle Jenesis 9:4, ọkà mmụta Bible na narị afọ nke 19 bụ́ Adam Clarke dere, sị: “Ndị Kraịst nke ebe ọwụwa anyanwụ ụwa ka na-erube nnọọ isi n’iwu a [e nyere Noa] . . . E righị ọbara ọ bụla n’okpuru iwu ahụ, n’ihi na ọ dọọrọ uche gaa n’ọbara nke a ga-awụsị maka mmehie nke ụwa; n’okpuru Oziọma ahụ kwa, e kwesịghị iri ya, n’ihi na e kwesịrị ile ya anya mgbe nile dị ka ihe na-anọchi anya ọbara nke a wụsịworo maka mgbaghara mmehie.”

5 Ọ pụrụ ịbụ na ọkà mmụta a na-ezo aka n’ozi ọma ahụ bụ́ isi nke hiwere isi n’ebe Jizọs nọ. Nke ahụ na-agụnye Chineke izite Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị, ịbịa wụsịa ọbara ya ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8, 9) Okwu ya metụtakwara iwu e mesịrị nye ka ụmụazụ Kraịst zere ọbara.

6. Ntụziaka dị aṅaa banyere ọbara ka e nyere Ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Ị maara na Chineke nyere ụmụ Izrel ọtụtụ narị iwu nduzi. Ozugbo Jizọs nwụsịrị, iwu ejighị ndị na-eso ụzọ ya idebe iwu ndị ahụ nile. (Ndị Rom 7:4, 6; Ndị Kọlọsi 2:13, 14, 17; Ndị Hibru 8:6, 13) Otú ọ dị, ka oge na-aga, ajụjụ bilitere banyere otu iwu bụ́ isi—ibi ndị ikom úgwù. Ọ̀ bụ iwu na a ghaghị ibi ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị chọrọ irite uru site n’àjà Kraịst úgwù, na-egosi na ha ka nọ n’okpuru Iwu ahụ? Na 49 O.A., òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst lebara anya n’okwu ahụ. (Ọrụ, isi 15) Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ndịozi ahụ na ndị okenye kwubiri na obibi úgwù nke bụ́ iwu so Iwu ahụ bịa ná njedebe. N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ihe ndị ọzọ Chineke chọrọ n’aka Ndị Kraịst. N’akwụkwọ ozi ha degaara ọgbakọ dị iche iche, òtù ahụ na-achị isi dere, sị: “Mmụọ nsọ na anyị onwe anyị akwadowo ịghara ịtụkwasịkwuru unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa, bụ́ ịnọgide na-ezere ihe ndị a chụrụ n’àjà nye arụsị, nakwa ọbara na anụ ndị a nyagburu anyagbu na ịkwa iko. Ọ bụrụ na unu ejiri nlezianya zere ihe ndị a, unu ga-enwe ihe ịga nke ọma.”—Ọrụ 15:28, 29.

7. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst ‘na-ezere ọbara’?

7 N’ụzọ doro anya, òtù na-achị isi lere ‘izere ọbara anya’ dị ka ihe dị oké mkpa ime dị ka izere mmekọahụ rụrụ arụ ma ọ bụ ife arụsị. Nke ahụ gosiri na ihe mgbochi e tinyere n’ihe banyere ọbara dị mkpa. Ndị Kraịst bụ́ ndị na-ekpere arụsị ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ n’egosighị nchegharị “agaghị eketa Alaeze Chineke”; “òkè ha ga-abụ . . . ọnwụ nke abụọ.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8; 22:15) Rịba ama ọdịiche e nwere: Ileghara nduzi Chineke banyere ịdị nsọ nke ọbara ndụ anya pụrụ ịkpata ọnwụ ebighị ebi. Igosi nkwanye ùgwù maka àjà Jizọs pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi.

8. Gịnị na-egosi na Ndị Kraịst oge mbụ ji nnọọ nduzi Chineke banyere ọbara kpọrọ ihe?

8 Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si ghọta ma tinye nduzi Chineke banyere ọbara n’ọrụ? Cheta ihe Clarke kwuru: “N’okpuru Oziọma ahụ kwa, e kwesịghị iri ya, n’ihi na e kwesịrị ile ya anya mgbe nile dị ka ihe na-anọchi anya ọbara nke a wụsịworo maka mgbaghara mmehie.” Akụkọ ihe mere eme gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ lere okwu ahụ anya dị ka ihe dị oké mkpa. Tertullian dere, sị: “Tụlee ihe banyere ndị ahụ na-eji oké ọchịchọ, n’oge ihe omume a na-eme n’ámá egwuregwu, na-ewere ọbara ka gbapụtara n’ahụ́ ajọ ndị omekome . . . wee buru ya laa iji gwọọ ọrịa àkwụ́kwụ̀ ha.” Ọ bụ ezie na ndị ọgọ mmụọ riri ọbara, Tertullian kwuru na Ndị Kraịst “adịghị eri ọbụna ọbara nke ụmụ anụmanụ n’oge nri [ha] . . . N’oge a na-ekpe Ndị Kraịst ikpe unu na-eche ha nri ndị e ji ọbara sie n’ihu. Otú ọ dị, o doro unu anya na [ọ] bụ ihe na-ezighị ezi n’iwu nye ha.” Ee, n’agbanyeghị iyi egwu nke ọnwụ, Ndị Kraịst erighị ọbara. Nke ahụ bụ otú ha jiruru nduzi Chineke kpọrọ ihe.

9. Izere ọbara gụnyere gịnị ma e wezụga ịghara iri ya n’ụzọ nkịtị?

9 Ụfọdụ pụrụ iche na ihe òtù ahụ na-achị isi bu n’uche bụ nanị na Ndị Kraịst agaghị eri ma ọ bụ ṅụọ ọbara n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ rie anụ a na-afọghị mma n’akpịrị ma ọ bụ nri a gwakọtara ya na ọbara. N’ezie, nke ahụ bụ ihe mbụ iwu Chineke nyere Noa pụtara. Iwu ahụ ndịozi nyere gwakwara Ndị Kraịst ka ha ‘zere anụ a nyagburu anyagbu,’ anụ ọbara dị n’ime ya. (Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 21:25) Otú ọ dị, Ndị Kraịst narị afọ mbụ maara na o nwere ihe ọzọ ọ gụnyere. Mgbe ụfọdụ e riri ọbara n’ihi ihe ndị metụtara ahụ́ ike. Tertullian kwuru na ụfọdụ ndị ọgọ mmụọ riri ọbara ná mgbalị iji gwọọ àkwụ́kwụ̀. Ọ pụkwara ịbụ na ọ dị ụzọ ndị ọzọ e si jiri ọbara mee ihe n’ịgwọ ọrịa ma ọ bụ jiri ya mee ihe n’ụzọ ndị e chere ga-eme ka ahụ́ ike ka mma. N’ihi ya, nye Ndị Kraịst, izere ọbara gụnyere ịghara ịnara ya n’ihi ihe ndị “metụtara ahụ́ ike.” Ha nọgidere na-ezere ya ọbụna ma a sị na ime otú ahụ tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ.

Iji Ọbara Eme Ihe Dị Ka Ọgwụ

10. Olee ụzọ ụfọdụ e si eji ọbara eme ihe n’ihe metụtara ahụ́ ike, na-ewelite ajụjụ dị aṅaa?

10 A na-ejikarịzi ọbara eme ihe n’ihe metụtara ahụ́ ike. Ọbara ndị a minyeere ndị mmadụ n’oge ndị gara aga bụ ọbara n’ozuzu ya—mịpụta ya n’ahụ́ onye nyere ya n’afọ ofufo, chekwaa ya, ma mịnye ya onye ọrịa, ikekwe onye merụrụ ahụ́ n’ọgbọ agha. Ka oge na-aga, ndị nchọpụta mụtara ikewasị ọbara gaa n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ya. Site n’ịmịnyere ndị mmadụ ihe ndị mejupụtara ọbara, ndị dọkịta pụrụ ikesara ọtụtụ ndị ọrịa ọbara e nwetara n’afọ ofufo, ikekwe na-amịnyere otu onye merụrụ ahụ́ plasma ma mịnyere onye ọzọ mkpụrụ ndụ ọbara uhie. Nchọpụta ndị a nọgidere na-eme gosiri na a pụrụ isi n’otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara, dị ka plasma, wepụta ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ, bụ́ ndị a pụrụ inyekwu ndị ọrịa ọzọ. A nọgidere na-eme mgbalị n’akụkụ a, a na-akọkwa banyere ihe ndị ọzọ a na-eji irighiri ihe ndị e si n’ọbara wepụta eme. Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi emeghachi omume? O kpebisiwo ike ịghara ịnara mmịnye ọbara, ma dọkịta ya gbara ya ume ịnara otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụta ọbara, ikekwe mkpụrụ ndụ ọbara uhie e chekwara echekwa. Ma ọ bụ ọgwụgwọ ahụ pụrụ ịgụnye iji irighiri ihe e si n’otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara wepụta eme ihe. Olee otú ohu Chineke pụrụ isi mee mkpebi n’okwu dị otú ahụ, na-eburu n’uche na ọbara dị nsọ nakwa na ọbara Kraịst na-azọpụta ndụ n’ụzọ kasịnụ?

11. Nguzo dị aṅaa kwekọrọ n’ihe ọmụma e nwere banyere nkà ahụ́ ike n’ihe metụtara ọbara ka Ndịàmà wewooro eri oge?

11 Ọtụtụ iri afọ gara aga, Ndịàmà Jehova mere ka nguzo ha doo anya. Dị ka ihe atụ, ha nyere ndị na-ebipụta akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association otu isiokwu (November 27, 1981; e bipụtaghachiri ya na broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? peeji nke 27-29). * Isiokwu ahụ hotara ihe site na Jenesis, Levitikọs, na Ọrụ Ndịozi. O kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na e jighị okwu ndị ọrụ ahụ́ ike ji eme ihe dee amaokwu ndị a, Ndịàmà na-ele ha anya dị ka ihe ndị na-akagbu mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya, nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie e chekwara echekwa, na plasma, nakwa mmịnye nke mkpụrụ ndụ ọbara ọcha na platelet.” Akwụkwọ e bipụtara na 2001 bụ́ Emergency Care, n’okpuru isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Mejupụtara Ọbara” kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ihe ndị mejupụtara ọbara: plasma, mkpụrụ ndụ ọbara uhie na nke ọcha, na platelet.” Ya mere, n’ikwekọ n’ihe ọmụma ndị e nwere banyere nkà ahụ́ ike, Ndịàmà na-ajụ mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya ma ọ bụ nke ihe anọ ndị bụ́ isi mejupụtara ya.

12. (a) Nguzo dị aṅaa ka a kọwaworo banyere ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara wepụta? (b) Ebee ka a pụrụ ịchọtakwu ihe ọmụma banyere nke a?

12 Isiokwu ahụ na-ekwu banyere ahụ́ ike gara n’ihu ikwu, sị: “Nkwenkwe okpukpe nke Ndịàmà adịghị amachibido kpam kpam iji [irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta] dị ka albumin, immunoglobulin, na ọgwụ ndị na-akwụsị oké ọbara ọgbụgba eme ihe; Onyeàmà nke ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-anara ihe ndị a.” Kemgbe 1981, e siwo n’ihe anọ ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara kewapụta ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ iji jiri ha na-eme ihe. N’ihi ya, Ụlọ Nche nke June 15, 2000 nyere ihe ọmụma ndị na-enye aka n’okwu a n’isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ.” Maka abamuru nke ọtụtụ nde ndị na-agụ akwụkwọ anyị ugbu a, e bipụtaghachiri azịza ahụ na peeji nke 29-31 nke magazin a. Ọ na-enye nkọwa zuru ezu na arụmụka ndị ezi uche dị na ha, ma, ị ga-ahụ na ihe ọ na-ekwu kwekọrọ n’isi ihe ndị ahụ e bipụtara na 1981.

Òkè Akọ na Uche Gị Na-ekere

13, 14. (a) Gịnị bụ akọ na uche, oleekwa otú o si arụ ọrụ n’okwu metụtara ọbara? (b) Nduzi dị aṅaa banyere iri anụ ka Chineke nyere Izrel, ma ajụjụ ndị dị aṅaa pụrụ ibilitewo?

13 Ihe ọmụma dị otú ahụ na-achọ ka e jiri akọ na uche mee ihe. N’ihi gịnị? Ndị Kraịst kwekọrịtara na ọ dị mkpa ịgbaso nduzi Chineke, ma n’ọnọdụ ụfọdụ, onye nke ọ bụla aghaghị imere onwe ya mkpebi, e jikwa akọ na uche eme nke a. Akọ na uche bụ ikike e bu pụta ụwa e ji atụle okwu ma mee mkpebi, ọtụtụ mgbe n’okwu ndị metụtara omume. (Ndị Rom 2:14, 15) Otú ọ dị, ị maara na akọ na uche dịrịta iche. * Bible na-ekwu na ụfọdụ ndị nwere ‘akọ na uche na-adịghị ike,’ na-egosi na akọ na uche ndị ọzọ dị ike. (1 Ndị Kọrint 8:12) Ndị Kraịst na-enwe ọganihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche n’ịmụta ihe Chineke na-ekwu, n’ịma ihe bụ́ echiche ya, nakwa n’itinye ihe ndị dị otú ahụ n’ọrụ ná mkpebi ha. Anyị pụrụ iji ndị Juu na iri anụ mee ihe atụ nke a.

14 Bible mere ka o doo anya na onye na-erubere Chineke isi agaghị eri anụ a na-afọghị mma n’akpịrị. Nke ahụ dị oké mkpa nke na ọbụna mgbe e nwere ọnọdụ mberede bụ́ mgbe ndị agha Izrel riri anụ a na-afọghị mma n’akpịrị, ikpe mmehie dị oké njọ mara ha. (Deuterọnọmi 12:15, 16; 1 Samuel 14:31-35) Ma, ọtụtụ ajụjụ pụrụ ibilitewo. Mgbe onye Izrel gburu atụrụ, oge ha aṅaa ka o nwere iji gbapụsịa ọbara ya? Ọ̀ ga-afọ anụmanụ ahụ mma n’akpịrị iji mee ka ọbara ya gbapụsịa? Ọ̀ dị mkpa ikonye atụrụ ahụ ụkwụ n’elu? Ruo ogologo oge ha aṅaa? Gịnị ka ọ ga-eme ma ọ bụrụ nnukwu ehi? Ọbụna mgbe ọ gbapụsịrị ọbara ya, ọbara ụfọdụ pụrụ ịfọdụ n’ime anụ ahụ. Ọ̀ ga-eri anụ dị otú ahụ? Ònye ga-ekpebi?

15. Olee otú ụfọdụ ndị Juu si meghachi omume n’ihe banyere iri anụ, ma gịnị ka Chineke nyere ntụziaka ka a na-eme?

15 Cheedị banyere onye Juu na-anụ ọkụ n’obi nke chere ọnọdụ ndị dị otú ahụ ihu. Ọ pụrụ ichewo na ọ kasị mma ịghara ịzụ anụ n’ahịa anụ, dị nnọọ ka onye ọzọ ga-ajụ anụ ma ọ bụrụ na ọ dị otú o si yie ka è buwo ụzọ chụọrọ ya arụsị n’àjà. Ndị Juu ndị ọzọ pụrụ iriwo anụ nanị mgbe ha mezuchara omenala iji wepụ ọbara ya. * (Matiu 23:23, 24) Gịnị ka i chere banyere mmeghachi omume ndị a dịrịta iche? Ọzọ, ebe ọ bụ na Chineke ekwughị ka a na-eme ihe n’ụzọ ndị dị otú ahụ, ọ̀ ga-akasị mma ka ndị Juu zigara òtù ndị rabaị ọtụtụ ajụjụ iji mata ihe a ga-eme n’ọnọdụ nke ọ bụla? Ọ bụ ezie na omenala ahụ malitere n’okpukpe ndị Juu, anyị pụrụ inwe obi ụtọ na Jehova enyeghị ndị na-efe ezi ofufe ntụziaka isi otú ahụ na-eme mkpebi n’ihe banyere ọbara. Chineke nyere nduzi bụ́ isi banyere igbu anụmanụ ndị dị ọcha na ịgbapụsị ọbara ha, ma o kwughị ihe karịrị nke ahụ.—Jọn 8:32.

16. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst pụrụ iji nwee echiche dịgasị iche banyere ịgbanye ha irighiri ihe sitere n’otu n’ime ihe ndị mejupụtara ọbara n’ahụ́?

16 Dị ka e kwuru na paragraf nke 11 na nke 12, Ndịàmà Jehova adịghị anakwere mmịnye nke ọbara n’ozuzu ya ma ọ bụ nke ihe anọ bụ́ isi mejupụtara ya—plasma, mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, na platelet. Gịnị banyere ụmụ irighiri ihe ndị e si n’otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara wepụta, dị ka serum nke nwere ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ ma ọ bụ ihe e ji egbu èlù agwọ? (Lee peeji nke 30, paragraf nke 4.) Ụfọdụ ndị ekwubiwo na n’ezie ụmụ irighiri ihe ndị ahụ abụghịzi ọbara, n’ihi ya kwa, iwu bụ́ ‘zere ọbara’ emetụtaghị ha. (Ọrụ 15:29; 21:25; peeji nke 31, paragraf nke 1) Ha ga-eburu ihe si ná mkpebi ha pụta. Akọ na uche ndị ọzọ na-akpali ha ịjụ ihe ọ bụla e si n’ọbara (nke mmadụ ma ọ bụ nke anụmanụ) wepụta, ọbụna irighiri ihe e si na nanị otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara wepụta. * Ndị ọzọ kwa pụrụ ikwe ka a gbanye ha protein sitere na plasma n’ahụ́ iji lụsoo ọrịa ọgụ ma ọ bụ iji gbuo èlù agwọ, ma ha pụrụ ịjụ irighiri ihe ndị ọzọ. Ọzọkwa, ihe ụfọdụ ndị e si n’otu n’ime ihe anọ bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta pụrụ ịdị na-arụ nnọọ ọrụ ka ihe anọ nile ahụ bụ́ isi mejupụtara ọbara ma na-arụ ọrụ n’ụzọ na-eme ka ndụ dịgide n’ahụ́ nke na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndị Kraịst ga-ajụ ha.

17. (a) Olee otú akọ na uche anyị pụrụ isi bụrụ ihe enyemaka mgbe anyị na-eche okwu ndị metụtara ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta ihu? (b) N’ihi gịnị ka ime mkpebi n’okwu a ji bụrụ ihe dị oké mkpa?

17 Ihe Bible na-ekwu banyere akọ na uche na-enye aka mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị otú ahụ. Nzọụkwụ mbụ bụ ịmụta ihe Okwu Chineke na-ekwu na ịgbalịsi ike iji ya kpụzie akọ na uche gị. Nke ahụ ga-akwadebe gị ime mkpebi kwekọrọ ná nduzi Chineke kama ikwe ka onye ọzọ meere gị mkpebi. (Abụ Ọma 25:4, 5) Banyere ịnara ihe ndị e si n’ọbara nweta, ụfọdụ echewo, sị, ‘Ihe a bụ okwu metụtara akọ na uche, n’ihi ya, ọ bụghị ihe mmadụ ga-enyewere ndụ ya nsogbu.’ Nke ahụ bụ echiche hiere ụzọ. Na ihe bụ okwu metụtara akọ na uche apụtaghị na ọ dịghị mkpa. Ọ pụrụ ịrụpụta ihe dị nnọọ njọ. Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ọ pụrụ imetụta ndị akọ na uche ha dị iche na nke anyị. Anyị hụrụ nke ahụ na ndụmọdụ Pọl nyere banyere anụ ndị ọ pụrụ ịbụ na a chụrụ ha n’àjà nye arụsị ma mesịa ree ha n’ahịa. Onye Kraịst kwesịrị inwe nchegbu banyere ịghara ‘imerụ akọ na uche na-adịghị ike ahụ́.’ Ọ bụrụ na o mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ, ọ pụrụ ‘ibibi nwanna ya bụ́ onye Kraịst nwụrụ n’ihi ya’ ma na-eme mmehie megide Kraịst. N’ihi ya, ọ bụ ezie na okwu metụtara ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, e kwesịrị nnọọ iji mkpebi ndị dị otú ahụ kpọrọ ihe.—1 Ndị Kọrint 8:8, 11-13; 10:25-31.

18. Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi zere igbu akọ na uche ya n’ihe metụtara ime mkpebi banyere ọbara?

18 Isi ihe ọzọ ya na ya nwere njikọ mesiri ike ịdị mkpa nke mkpebi banyere ọbara. Nke a bụ mmetụta mkpebi ndị dị otú ahụ pụrụ inwe n’ebe ị nọ. Ọ bụrụ na ịnara ụmụ irighiri ihe ndị sitere n’ọbara ga-enye akọ na uche gị e ji Bible zụọ nsogbu, i kwesịghị ileghara ya anya. I kwesịghịkwa ịgbachi akọ na uche gị nkịtị nanị n’ihi na mmadụ gwara gị, sị, “Ọ dịghị ihe o mere ịnara nke a; ọtụtụ ndị anarawo ya.” Cheta, ọtụtụ nde mmadụ taa na-eleghara akọ na uche ha anya, ọ na-anwụkwa, na-ekwezi ka ha na-agha ụgha ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ ndị ọzọ n’akwaghị ụta. N’ezie, Ndị Kraịst kwesịrị izere àgwà dị otú ahụ.—2 Samuel 24:10; 1 Timoti 4:1, 2.

19. Mgbe anyị na-eme mkpebi n’okwu ahụ́ ike bụ́ ndị metụtara ọbara, gịnị kwesịrị ịbụ ihe mbụ anyị ga-eburu n’uche?

19 Ka ọ na-eru ná ngwụsị ya, azịza ahụ e bipụtaghachiri na peeji nke 29-31 na-ekwu, sị: “Eziokwu ahụ bụ́ na echiche na mkpebi ndị dabeere n’akọ na uche pụrụ ịdịrịta iche ọ̀ pụtara na okwu a bụ nke na-adịghị mkpa? Ee e. Ọ bụ okwu siri ike.” Ọ dị otú ahụ karịsịa n’ihi na o metụtara mmekọrịta gị na “Chineke ahụ dị ndụ.” Mmekọrịta ahụ bụ nanị nke pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi, na-adabere n’ike nzọpụta nke ọbara Jizọs a wụsịrị. Zụlite nkwanye ùgwù miri emi maka ọbara n’ihi ihe Chineke ji ya na-eme—ịzọpụta ndụ. Pọl dere n’ụzọ dabara adaba, sị: “Unu enweghịkwa olileanya, unu bụkwa ndị na-enweghị Chineke n’ụwa. Ma ugbu a n’ịdị n’otu nke unu na Kraịst Jizọs, unu ndị nọbu n’ebe dị anya abịawo nọrọ nso site n’ọbara nke Kraịst ahụ.”Ndị Efesọs 2:12, 13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 13 N’otu oge, Pọl na Ndị Kraịst anọ ọzọ gara n’ụlọ nsọ iji mee onwe ha ka ha dị ọcha dị ka omenala si dị. Iwu ahụ adịghịzi irè, ma Pọl mere ihe kwekọrọ na ndụmọdụ ndị okenye nọ na Jeruselem. (Ọrụ 21:23-25) Otú ọ dị, ụfọdụ Ndị Kraịst pụrụ iche na ha agaghị aga n’ụlọ nsọ ahụ ma ọ bụ kere òkè n’ihe omume ahụ. Akọ na uche dịrịta iche mgbe ahụ, ha dịrịtakwa iche taa.

^ par. 15 Encyclopædia Judaica depụtara ụkpụrụ nduzi ndị “dị ọtụtụ ma kapịa ụmụ irighiri ihe ọnụ” banyere “ịkwadebe” anụ. O kwuru minit ole a ga-abanye anụ ná mmiri, otú a ga-esi agbasa ya n’elu bọọdụ ka ọ kọọ, ụdị nnu a ga-ete ya, na ugboro ole a ga-eji mmiri oyi saa ya.

^ par. 16 Isi ihe ndị mejupụtara ọgwụ ụfọdụ a na-agbanye n’ahụ́ na-abụwanye mmiri ọgwụ ndị a na-esighị n’ọbara nweta. Ma n’ọnọdụ ụfọdụ, a pụrụ itinye ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ihe e si n’ọbara nweta, dị ka albumin na ha.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke October 1, 1994.

Ị̀ Pụrụ Icheta?

• Nduzi dị aṅaa banyere ọbara ka Chineke nyere Noa, ụmụ Izrel, na Ndị Kraịst?

• N’ihe banyere ọbara, gịnị ka Ndịàmà Jehova na-ajụ kpam kpam?

• N’echiche dị aṅaa ka ịnakwere ụmụ irighiri ihe ndị sitere n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara dabeere n’akọ na uche onwe onye, ma gịnị ka nke ahụ na-adịghị apụta?

• Mgbe anyị na-eme mkpebi, n’ihi gịnị ka mmekọrịta anyị na Chineke ji kwesị ịbụ ihe mbụ anyị ga-eburu n’uche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 22]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NGUZO ANYỊ BỤ́ ISI N’IHE METỤTARA ỌBARA

ỌBARA N’OZUZU YA

▾ ▾ ▾ ▾

IHE NDỊ ANYỊ Mkpụrụ ndụ Mkpụrụ ndụ Platelet Plasma

NA-ADỊGHỊ ọbara uhie ọbara ọcha

ANABATA

▾ ▾ ▾ ▾

IHE NDỊ ONYE Ụmụ irighiri ihe Ụmụ irighiri ihe Ụmụ irighiri ihe Ụmụ irighiri ihe

KRAỊST ndị sitere ná ndị sitere ná ndị sitere ndị sitere

GA-EKPEBIRI mkpụrụ ndụ mkpụrụ ndụ na platelet na plasma

ONWE YA ọbara uhie ọbara ọcha

[Foto dị na peeji nke 20]

Òtù na-achị isi kwubiri na Ndị Kraịst aghaghị ‘izere ọbara’

[Foto dị na peeji nke 23]

Elegharala akọ na uche gị anya mgbe i nwere mkpebi ime banyere ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ọbara nweta